“Achọtara M Ọbụbụenyi, Ịhụnanya, na Nlebara Anya”
“Achọtara M Ọbụbụenyi, Ịhụnanya, na Nlebara Anya”
“MMADỤ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Dị nnọọ ka Jizọs kwuru, ịhụnanya ghọrọ ihe e ji amata òtù ụmụnna Ndị Kraịst oge mbụ. Tertullian, mgbe ọ na-ede ihe n’ihe karịrị otu narị afọ mgbe Kraịst nwụsịrị, kwuru na ndị na-ahụ ha na-ekwu, sị: ‘Lee otú ha si hụ ibe ha n’anya na otú ha si ọbụna dị njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.’
À ka pụrụ ịchọta ụdị ịhụnanya ahụ n’ụwa? Ee. Dị ka ihe atụ, tụlee otu akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brazil natara. Onye detara akwụkwọ ozi ahụ bụ́ otu nwanyị aha ya bụ́ Marília, dere, sị:
“Mgbe o bi na Villa Mercedes, Argentina, mama m, onye bụ́ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, bidoro ịrịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage, nke mere ka ahụ́ ya kpọnwụọ site n’úkwù gbadaa. N’ime ọnwa asatọ mbụ nke ọrịa ya, ọ bụ Ndịàmà nọ na Villa Mercedes bụ ndị ji ịhụnanya na nchebara echiche lekọta ya. Ha hụrụ maka ihe nile, idebe ebe obibi ya ọcha na isiri ya nri. Ọbụna mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, a na-enwerịrị onye ya na mama m na-anọ, ma n’ehihie ma n’abalị.
“Mụ na mama m alọghachila Brazil kemgbe, bụ́ ebe ọ ka nọ na-agbake n’ọrịa ya. Ndịàmà nọ n’ebe anyị bi ugbu a na-eme ihe nile ha pụrụ ime iji nyere mama m aka ịgbake.”
Marília mechiri akwụkwọ ozi ya, na-asị: “Ekweere m na mụ onwe m abụghị Onyeàmà, ma achọtara m ọbụbụenyi, ịhụnanya, na nlebara anya n’etiti Ndịàmà.”
Ee, a ka nwere ndị ji ezi ịhụnanya Ndị Kraịst eme ihe. N’ime otú ahụ, ha na-egosipụta ike ozizi Jizọs pụrụ inwe ná ndụ anyị.