Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Abụọ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Abụọ

AKWỤKWỌ Jenesis kọrọ ihe mere n’afọ 2,369 nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, site n’okike mmadụ mbụ bụ́ Adam ruo n’ọnwụ nke nwa Jekọb bụ́ Josef. A tụlere isiakwụkwọ 10 mbụ nakwa amaokwu 9 mbụ nke isi nke 11 bụ́ ndị kọrọ banyere okike ruo n’owuwu nke ụlọ elu Bebel ná mbipụta magazin a nke bu nke a ụzọ. * Isiokwu a na-atụle isi ihe ndị sitere n’isiakwụkwọ ndị fọdụrụnụ nke Jenesis, bụ́ ndị metụtara otú Chineke si mesoo Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef.

EBREHAM AGHỌỌ ENYI CHINEKE

(Jenesis 11:10–23:20)

Ihe dị ka afọ 350 ka Iju Mmiri ahụ gasịrị, a mụọ otu nwoke nke ghọrọ onye pụrụ iche nye Chineke n’eriri usoro ọmụmụ Shem bụ́ nwa Noa. Aha ya bụ Ebram, nke e mesiri gbanwee ịbụ Ebreham. Dị ka Chineke nyere ya n’iwu, Ebram ahapụ Ua nke Kaldia wee bụrụ onye na-ebi n’ụlọikwuu n’ala nke Jehova kwere nkwa inye ya na mkpụrụ ya. N’ihi okwukwe ya na nrubeisi ya, a bịa na-akpọ Ebreham “enyi Jehova.”—Jems 2:23.

Jehova emee ihe megide ndị mmebi iwu bi na Sọdọm na n’obodo nile dị ya gburugburu, ebe e chebere Lọt na ụmụ ya ndị inyom ndụ. E mezuo nkwa Chineke site n’ọmụmụ Aịzik bụ́ nwa Ebreham. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, e lee okwukwe Ebreham ule mgbe Jehova gwara ya ka o were ọkpara a chụọ àjà. Ebreham dị njikere irube isi ma mmụọ ozi gbochiri ya. Ya edoo anya na Ebreham bụ nwoke nwere okwukwe, e mesiekwa ya obi ike na mba nile ga-esite ná mkpụrụ ya gọzie onwe ha. Ọnwụ Sera bụ́ nwunye ọ hụrụ n’anya akpatara Ebreham iru újú dị ukwuu.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

12:1-3—Olee mgbe ọgbụgba ndụ Ebreham malitere ịdị irè, ogologo oge ha aṅaa ka ọ dịruru? Ihe àmà na-egosi na ọgbụgba ndụ Jehova na Ebram na “a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime [Ebram]” malitere ịdị irè mgbe Ebram gafere Yufretis ka ọ na-aga Kenan. Ọ ghaghị ịbụ na nke a mere na Naịsan 14, 1943 T.O.A.—afọ 430 tupu a gbapụta Izrel n’Ijipt. (Ọpụpụ 12:2, 6, 7, 40, 41) Ọgbụgba ndụ Ebreham bụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi.” Ọ ga-anọgide na-adị irè ruo mgbe a rụzuru ọrụ nke ịgọzi agbụrụ nile nke ụwa nakwa ibibi ndị iro nile nke Chineke.—Jenesis 17:7; 1 Ndị Kọrint 15:23-26.

15:13—Olee mgbe amụma ndị e buru banyere iweda mkpụrụ Ebram n’ala ruo afọ 400 mezuru? Oge iweda n’ala a malitere na 1913 T.O.A. mgbe a napụrụ Aịzik nwa Ebreham ara mgbe ọ dị afọ 5, onye otu nna ji ya na ya, bụ́ Ishmael, nke dị afọ 19, nọkwa ‘na-achị ya ọchị nke ukwuu.’ (Jenesis 21:8-14; Ndị Galeshia 4:29) Ọ kwụsịrị mgbe a gbapụtara ndị Izrel n’agbụ Ijipt na 1513 T.O.A.

16:2—Ò ziri ezi Seraị inyefe Ebram ohu ya nwanyị bụ́ Hega dị ka nwunye? Ihe Seraị mere kwekọrọ n’omenala nke oge ahụ—na iwu ji nwanyị aga inye di ya iko nwanyị ga-amụtara ya onye nketa. Ịlụ karịa otu nwanyị malitere n’eriri ọmụmụ Ken. Ka e mesịrị, ọ bịara bụrụ omenala, bụrụkwa nke ụfọdụ ndị na-efe Jehova nakweere. (Jenesis 4:17-19; 16:1-3; 29:21-28) Otú ọ dị, ọ dịbeghị mgbe Jehova hapụrụ ụkpụrụ ya mbụ nke ịlụ otu di ma ọ bụ nwunye. (Jenesis 2:21, 22) O yikarịrị ka Noa na ụmụ ya, bụ́ ndị e nyeghachiri iwu ‘ịmụ ọmụmụ jupụta ụwa’ hà bụcha ndị lụrụ nanị otu nwunye. (Jenesis 7:7; 9:1; 2 Pita 2:5) Jizọs Kraịst mesighachikwara ụkpụrụ a nke ịlụ otu di ma ọ bụ nwunye ike.—Matiu 19:4-8; 1 Timoti 3:2, 12.

19:8—Ọ̀ bụ na ọ dịghị njọ na Lọt kwere nkwa inyefe ndị Sọdọm ụmụ ya ndị inyom? Dị ka ụkpụrụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa si dị, ọ bụ ibu ọrụ onye nwe ụlọ ichebe ndị ọbịa nọ n’ụlọ ya, ịhụ na ọ dịghị ihe mere ha, ọbụna ruo n’ókè nke ịnwụ ma ọ dị mkpa. Lọt dị njikere ime otú ahụ. N’atụghị egwu, ọ pụrụ n’èzí mechie ụzọ, ma gwa ìgwè ahụ jupụtara n’ihu ụlọ ya okwu, nanị ya. Ka ọ na-erule mgbe ahụ o kwere nkwa inyefe ha ụmụ ya, o yiri ka Lọt ọ̀ matawo na ndị ọbịa ya bụ ndị ozi si n’ebe Chineke nọ, ọ pụkwara ịbụ na o chewo na Chineke pụrụ ichebe ụmụ ya dị ka O chebere Sera bụ́ nwanne nna ya n’Ijipt. (Jenesis 12:17-20) N’ezie dị ka o mesịrị mee, e chebere Lọt na ụmụ ya.

19:30-38—Jehova ọ̀ kwadoro nṅụbiga mmanya ókè nke Lọt na ya isite n’ụmụ ya ndị inyom abụọ mụta ụmụ? Jehova adịghị akwado ma ịṅụbiga mmanya ókè ma idina onye ikwu. (Levitikọs 18:6, 7, 29; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) N’ezie “omume mmebi iwu” nke ndị bi na Sọdọm wutebigara Lọt ókè. (2 Pita 2:6-8) Eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ ndị inyom Lọt mere ka ọ ṅụbiga mmanya ókè gosiri na ha maara na ọ gaghị ekwe iso ha nwee mmekọahụ ma a sị na anya doro ya. Ma ebe ha bụ ndị ọbịa n’ala ahụ, ụmụ ya ndị inyom chere na nke a bụ nanị ụzọ a pụrụ isi gbochie ámá Lọt ichi. Ihe mere e ji dee ihe ahụ na Bible bụ iji gosi ihe jikọrọ ndị Izrel, bụ́ ụmụ Ebreham, ndị Moab (site na Moab) na ndị Amọn (site na Benammi).

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

13:8, 9. Lee ezi ihe nlereanya Ebreham setịpụrụ n’idozi esemokwu! Anyị ekwesịghị ma ọlị ịchụ mmekọrịta udo n’àjà n’ihi uru ego, ihe na-amasị anyị ma ọ bụ nganga.

15:5, 6. Mgbe Ebreham na-eme agadi ọ mụtabeghịkwa nwa, ọ gwara Chineke ya banyere nke ahụ. N’aka nke ya, Jehova mesiri ya obi ike. Gịnị si na ya pụta? Ebreham “wee kwere na Jehova.” Ọ bụrụ na anyị agwa Jehova obi anyị nile n’ekpere, nara mmesi obi ike ya ndị dị na Bible ma rubere ya isi, a ga-ewusi okwukwe anyị ike.

15:16. Jehova emezughị ikpe ya megide ndị Amọraịt (ma ọ bụ ndị Kenan) ruo ọgbọ anọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ Chineke nke nwere ndidi. O cheere ruo mgbe olileanya na-adịzighị maka mmekwata. Dị ka Jehova, ọ dị anyị mkpa ịdị na-enwe ndidi.

18:23-33. Jehova anaghị ebibi ndị mmadụ n’akpaghị ókè. Ọ na-echebe ndị ezi omume.

19:16. Lọt “nọ na-egbu oge,” (NW) ọ fọkwara nke nta ka ndị mmụọ ozi ahụ dọkpụrụ ya na ezinụlọ ya adọkpụrụ pụọ n’obodo Sọdọm. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịghara ịkwụsị inwe echiche nke ịdị ngwa ka anyị na-eche ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a.

19:26. Lee ihe nzuzu ọ ga-abụ ịbụ ndị a dọpụrụ uche ma ọ bụ anyị ejiri oké ọchịchọ na-ele anya n’azụ n’ihe ndị anyị hapụrụ n’ụwa!

JEKỌB ENWEE ỤMỤ NDỊ IKOM 12

(Jenesis 24:1–36:43)

Ebreham emee ndokwa ka Aịzik lụọ Ribeka, bụ́ nwanyị nwere okwukwe na Jehova. Ya amụta ụmụ ejima bụ́ Ịsọ na Jekọb. Ịsọ eledaa ọnọdụ ọkpara ya anya ma resị ya Jekọb, onye mesịrị nara ngọzi nna ya. Jekọb agbaga Paddan-eram, ebe ọ nọ lụọ Lia na Rechel ma lekọta ìgwè atụrụ nna ha ruo ihe dị ka afọ 20 tupu ọ kpọrọ ezinụlọ ya laa. Site n’aka Lia, Rechel na ndị inyom ha abụọ na-eje ozi, Jekọb amụta ụmụ nwoke 12 na otu nwanyị. Jekọb na mmụọ ozi agbaa mgba, a gọziekwa ya, gbanweekwa aha ya ịbụ Izrel.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

28:12, 13—Gịnị ka nrọ ahụ Jekọb rọrọ banyere “ubube” pụtara? “Ubube” ahụ nke pụrụ ịdịwo ka steepụ, gosiri na eluigwe na ala na-enwe mmekọrịta. Ndị mmụọ ozi Chineke ịrịgo na ịrịda na ya na-egosi na ndị mmụọ ozi na-eje ozi n’ụzọ ụfọdụ dị mkpa n’agbata Jehova na ụmụ mmadụ ndị nwere ihu ọma ya.—Jọn 1:51.

30:14, 15—Gịnị mere Rechel ji were ohere o nwere ịtụrụ ime gbanwere ụfọdụ mandrake? N’oge ochie, a na-eji mkpụrụ nke ihe ọkụkụ bụ́ mandrake eme ọgwụ na-akụjụ ahụ́, jirikwa ya na-egbochi ma ọ bụ na-ebelata njikọta nke uru ahụ́. E kwenyekwara na mkpụrụ mandrake nwere ike nke ịkwalite agụụ inwe mmekọahụ na ịmụba ohere ịmụ ụmụ ma ọ bụ na-enye aka n’ịtụrụ ime. (Abụ nke Abụ 7:13) Ọ bụ ezie na Bible ekpugheghị ebumnobi Rechel maka ime mgbanwere ahụ, ọ pụrụ ịbụ na o chere na mandrake ahụ ga-enyere ya aka ịtụrụ ime ma weta nkọcha ọ na-enweta n’ihi amụtaghị nwa ná njedebe. Otú ọ dị, ọtụtụ afọ gafere tupu Jehova ‘emeghee akpa nwa ya.’—Jenesis 30:22-24.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

25:23. Jehova nwere ikike ịmata ọdịdị mkpụrụ ndụ nke nwa a na-amụbeghị amụ ma jiri ikike ya ịhụ ọdịnihu họpụta onye ọ chọrọ maka nzube ya tupu oge eruo. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ naghị ekpebi tupu oge eruo ihe ga-abụ ọdịnihu ikpeazụ nke ụmụ mmadụ.—Hosea 12:3; Ndị Rom 9:10-12.

25:32, 33; 32:24-29. Nchegbu Jekọb nwere inweta ọnọdụ ọkpara na mgba ọ gbasoro mmụọ ozi ogologo abalị nile iji nata ngọzi gosiri na o nwere nnọọ ekele maka ihe ndị dị nsọ. Jehova enyewo anyị ọtụtụ ihe ndị dị nsọ, dị ka mmekọrịta anyị na ya nakwa ọgbakọ ya, ihe mgbapụta, Bible, na olileanya anyị maka Alaeze ya. Ka anyị dị ka Jekọb n’igosi ekele maka ha.

34:1, 30. Nsogbu buteere Jekọb ‘mmekpa ahụ́’ malitere n’ihi na Daịna metere enyi ndị na-ahụghị Jehova n’anya. Anyị aghaghị iji amamihe họrọ ndị anyị na ha na-akpakọ.

JEHOVA AGỌZIE JOSEF N’IJIPT

(Jenesis 37:1–50:26)

Ekworo emee ka ụmụ ndị ikom Jekọb renye nwanne ha bụ́ Josef n’ịbụ ohu. N’Ijipt, a tụrụ Josef mkpọrọ n’ihi na o ji obi ike na ikwesị ntụkwasị obi nọgide na-agbaso ụkpụrụ Chineke. Ka oge na-aga, a kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ ịkọwa nrọ Fero, bụ́ nke gosiri na a ga-enwe afọ asaa nke ụbara ihe oriri ndị afọ asaa nke oké ụnwụ ga-esochi. E mezie Josef onye na-elekọta ihe oriri n’Ijipt. N’ihi ụnwụ nri ahụ, ụmụnne ya abịa Ijipt ịchọ nri. E jikọtaghachi ezinụlọ ahụ, ha ebirikwa n’ala Goshen bụ́ ala na-eme nri. N’àkwà ọnwụ ya, Jekọb agọzie ụmụ ya ma buo amụma mere ka ha nwee olileanya e ji n’aka na ha ga-enweta ngọzi ọtụtụ narị afọ n’ọdịnihu. E bulaa ozu Jekọb Kenan maka olili. Mgbe Josef nwụrụ ka ọ dị afọ 110, a gbasie ozu ya iji nwee ike ibula ya Ala Nkwa ahụ.—Ọpụpụ 13:19.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

43:32—Gịnị mere iso ndị Hibru erikọ nri ji bụrụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt? Nke a pụrụ ịbụ n’ụzọ ka ukwuu n’ihi ịkpọasị okpukpe ma ọ bụ nganga nke agbụrụ. Ndị Ijipt na-asọkwa ndị ọzụzụ atụrụ oyi. (Jenesis 46:34) N’ihi gịnị? Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ndị na-azụ atụrụ nọ n’ala ala n’usoro ọkwá ndị Ijipt. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ebe ọ bụ na ala a ga-akọ ihe na ya adịghị nnukwu, ndị Ijipt na-eleda ndị na-achọrọ ìgwè atụrụ ebe ịta nri anya.

44:5—Josef ò ji iko wee mee mgbaasị n’ezie? O doro anya na iko ọlaọcha ahụ na ihe e kwuru banyere ya bụ nanị aghụghọ efu. Josef bụ onye na-efe Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. N’ezie o jighị iko ahụ mee mgbaasị, ọbụna dị ka Benjamin na-ezughị ya n’ohi n’ezie.

49:10—Gịnị ka “mkpanaka eze” na “mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ” pụtara? Mkpanaka eze bụ mkpara onye na-achị achị na-eji dị ka ihe àmà nke inwe ikike ịbụ eze. Mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ bụ ogologo ígwè nke na-egosipụta ikike o nwere inye iwu. Jekọb izo aka na ha gosiri na ọchịchị na ike dị otú ahụ ga-adị n’agbụrụ Juda ruo mgbe Shaịlo ga-abịa. Onye a nke si n’agbụrụ Juda pụta bụ Jizọs Kraịst, onye ọ bụ ya ka Jehova nyefere ọchịchị eluigwe. Kraịst nwere ikike onye eze, o nwekwara ike nke inye iwu.—Abụ Ọma 2:8, 9; Aịsaịa 55:4; Daniel 7:13, 14.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

38:26. Juda mere ihe ọjọọ n’otú o si mesoo nwunye nwa ya nke di ya nwụrụ, bụ́ Tema. Otú ọ dị, mgbe a gwara ya na ọ bụ ya tụwara ya ime, Juda ji obi umeala kweta mmehie ya. Anyị kwesịkwara ịdị ngwa ịnakwere mmejọ anyị.

39:9. Nzaghachi Josef nyere nwunye Pọtịfa gosiri na echiche ya n’ihe banyere omume kwekọrọ n’echiche nke Chineke nakwa na ụkpụrụ Chineke na-eduzi akọ na uche ya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalị ime otu ihe ahụ ka anyị na-eto n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ?

41:14-16, 39, 40. Jehova pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ndị na-atụ egwu ya. Mgbe ihe ọdachi mere, anyị ga-abụ ndị maara ihe ịtụkwasị Jehova obi ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.

Ha Nwere Okwukwe Na-adịgide Adịgide

Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef bụ n’ezie ndị na-atụ egwu Chineke nwere okwukwe. Ihe ndekọ banyere ndụ ha, ndị dị n’akwụkwọ Jenesis, na-ewusi okwukwe ike n’ezie ma na-akụziri anyị ọtụtụ ihe ndị bara uru.

Ị pụrụ irite uru n’akụkọ ndị a mgbe ị na-akwado ọgụgụ Bible dịịrị izu maka ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ịtụle ihe ndị e kwuru n’ebe a ga-enye aka mee ka akụkọ ahụ yie ka ọ̀ na-eme n’ihu anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee isiokwu bụ́ “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ” n’Ụlọ Nche nke January 1, 2004.

[Foto dị na peeji nke 26]

Jehova agọzie Josef

[Foto dị na peeji nke 26]

Ebreham bụ nwoke nwere okwukwe

[Foto dị na peeji nke 26]

E chebere Lọt onye ezi omume na ụmụ ya ndị inyom

[Foto dị na peeji nke 29]

Jekọb nwere ekele maka ihe ndị dị nsọ. Ì nwere?