Nkwa Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
Nkwa Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
“NKWA ya dị ike dị ka ya onwe ya dị mgbe ahụ; ma ọ dịghị ihe ọ na-eme dị ka ọ na-adịghị ihe ọ bụ ugbu a.”—King Henry the Eighth, nke William Shakespeare dere.
Nkwa ndị ahụ dị ike Shakespeare kwuru okwu ha bụ ndị nke onye kadinal bụ́ onye England bụ́ Thomas Wolsey, onye kpara ike dị ukwuu n’ọchịchị England na narị afọ nke 16. Ụfọdụ ndị ga-ekwu na nkọwa Shakespeare nyere kwesịkwara nnọọ ihe ka ọtụtụ ná nkwa ndị ha na-anụ taa. Ugboro ugboro, a na-ekwe ndị mmadụ ọtụtụ nkwa ma, ọ bụ ole na ole ka a na-emezu. N’ihi ya, o sighị ike ịghọta ihe mere ha ji enyo nkwa ọ bụla enyo.
Emezughị Nkwa Juru Ebe Nile
Dị ka ihe atụ, n’oge agha ahụ dị egwu a lụrụ n’ógbè Balkan n’afọ ndị 1990, Kansụl Nchebe nke Mba Ndị Dị n’Otu kwupụtara na obodo Bosnia nke Srebrenica ga-abụ “ebe dị nchebe.” Nke ahụ yiri nkwa e ji n’aka nke mba ụwa kwere. Ọtụtụ puku ndị Alakụba bụ́ ndị gbagara ọsọ ndụ na Srebrenica chekwara otú ahụ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, nkwa e kwere na ebe ahụ ga-abụ ebe dị nchebe enweghị isi ma ọlị. (Abụ Ọma 146:3) Na July nke afọ 1995, ihe ndị agha mwakpo mere bụ nnọọ ịkwazụga ndị agha òtù UN n’akụkụ ma bibie obodo ahụ. Ihe karịrị ndị Alakụba 6,000 funyụrụ anya, e gbukwara ọ dịkarịa ala ndị Alakụba 1,200 na-abụghị ndị agha.
Nkwa ndị a na-emezughị emezu jupụtara n’akụkụ nile nke ndụ mmadụ. Ndị mmadụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e rigburu site “n’ọtụtụ mkpọsa ngwá ahịa ụgha na ndị na-eduhie eduhie” e ji emechisị ha ntị kwa ụbọchị. “Nkwa ndị a na-adịghị emezu emezu nke ọtụtụ puku ndị ọchịchị na-ekwe” na-akụda ha mmụọ. (The New Encyclopædia Britannica, Mpịakọta nke 15, peeji nke 37) Ndị ndú okpukpe a tụkwasịrị obi bụ́ ndị na-ekwe nkwa ilekọta atụrụ ha na-emetọ ha n’ụzọ kasị asọ oyi. Ọbụna n’ọrụ ndị metụtara agụmakwụkwọ na ahụ́ ike—ndị e weere ya na ọ bụ ọmịiko na nchegbu maka ndị ọzọ na-achịkwa—ụfọdụ aghọwo nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, rigbuo ma ọ bụ ọbụna gbuo ndị ha na-elekọta. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji na-adọ anyị aka ná ntị ịghara ịtụkwasị obi n’okwu ọ bụla!—Ilu 14:15.
Nkwa Ndị A Na-emezu
N’ezie, ọtụtụ ndị na-emezu nkwa ha, bụ́ nke na-efu ha ọtụtụ ihe mgbe ụfọdụ. (Abụ Ọma 15:4) Okwu ọnụ ha bụ nkwa ha, ha na-emezukwa ya. Ndị ọzọ na-achọ n’ezie imezu nkwa ndị ha bu nnọọ ezi ihe n’uche kwee. Ha dị njikere ma nwee ọchịchọ imezu ihe ha kwere ná nkwa ma ha apụghị nnọọ ime otú ahụ. Mgbanwe nke ọnọdụ pụrụ imebi ọbụna atụmatụ kasị mma.—Eklisiastis 9:11.
N’agbanyeghị ihe kpatara ya, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-esiri nnọọ ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị nkwa onye ọ bụla obi. Ya mere ajụjụ na-ebilite bụ: È nwere nkwa ndị anyị pụrụ ịtụkwasị obi? Ee. Anyị pụrụ ịtụkwasị nkwa ndị a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, obi. Gịnị ma ị tụlee ihe isiokwu na-esonụ na-ekwu n’okwu a? Ị pụrụ ikwubi, dị ka ọtụtụ nde mmadụ kwubiworo, na ị pụrụ n’ezie ịtụkwasị nkwa dị iche iche nke Chineke obi.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Foto AP/Amel Emric