Ị Pụrụ Ịnagide Ejighị Ihe n’Aka
Ị Pụrụ Ịnagide Ejighị Ihe n’Aka
“KPỌMKWEM!” “O nweghị mgbagha!” “E ji ya n’aka!” Obi abụọ adịghị ya na ị nụwo okwu ndị dị otú ahụ ọtụtụ ugboro. Otú ọ dị, ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, ọ bụ nanị ihe ole na ole ka anyị pụrụ iji n’aka. Ndụ bụ nnọọ ihe a na-ejighị n’aka ruo n’ókè nke na anyị na-echekarị ma ọ̀ dị ihe ọ bụla anyị pụrụ nnọọ iji n’aka. Obi abụọ na ejighị ihe n’aka yiri ka hà bụ akụkụ nke ndụ.
N’ụzọ kwere nghọta, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-achọ ka ha na ezinụlọ ha nọrọ ná nchebe ma nwee obi ụtọ. Ha na-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe ndị ha kweere na ọ bụ ha ga-eme ka ha nwee obi ụtọ ma nọrọ ná nchebe—nke na-abụkarị ego na ihe onwunwe. Otú ọ dị, ala ọma jijiji, ajọ ifufe, ihe mberede ma ọ bụ mpụ ime ihe ike pụrụ ibibi ihe onwunwe ndị ahụ n’otu ntabi anya. Ọrịa siri ike, ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ enweghị ọrụ pụrụ ịgbanwe ndụ na mberede. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ihe ndị dị otú ahụ agaghị eme gị. Ma, nanị ịma na ọdachi pụrụ ịdapụta mgbe ọ bụla na-enye nsogbu n’obi. Ma o jedebeghị n’ebe ahụ.
Okwu ndị bụ́ ejighị ihe n’aka na obi abụọ yiri ibe ha, otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwakwa “obi abụọ” dị ka “inwe mgbagwoju anya banyere ihe e kweere ma ọ bụ echiche e nwere, bụ́ nke na-emetụtakarị ime mkpebi.” Ọzọkwa, dị ka akwụkwọ bụ́ Managing Your Mind si kwuo, “ejighị ihe dị mkpa n’aka bụ isi ihe na-akpata nchekasị na nchegbu.” Ọ bụrụ na e wepụghị obi abụọ, ọ pụrụ iduga ná nchekasị, obi nkoropụ, na iwe. Ee, ichegbu onwe anyị banyere ihe pụrụ ime na ihe na-apụghị ime pụrụ imetụta ahụ́ ike uche na nke anụ ahụ́ anyị.
N’ihi ya, ụfọdụ na-emebiga ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ. Ha dị ka onye ntorobịa Brazil nke kwuru, sị: “Gịnị mere ị ga-eji na-echegbu onwe gị banyere ihe ga-emenụ? Taa bụ taa, echi bụkwa echi.” Àgwà “ka anyị rie ma ṅụọ” dị otú ahụ nke ikwere na a kara ọdịnihu mmadụ aka pụrụ iduga nanị ná ndakpọ olileanya, ahụhụ na, n’ikpeazụ, ọnwụ. (1 Ndị Kọrint 15:32) Ọ kaara anyị nnọọ mma ilegara Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, anya, bụ́ onye Bible na-ekwu na “e nweghịkwa mgbanwe nke ntụgharị nke onyinyo n’ebe ọ nọ.” (Jems 1:17) Ọ bụrụ na anyị enyochaa Okwu Chineke, bụ́ Bible, anyị ga-ahụ ndụmọdụ na nduzi bụ́ ịgba banyere otú e si anagide ihe ndị a na-ejighị n’aka nke ndụ. Ọ pụkwara inyere anyị aka ịghọta ihe mere e ji nwee ọtụtụ ihe ndị a na-ejighị n’aka.
Ihe Na-akpata Ejighị Ihe n’Aka
Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ụzọ kwesịrị ekwesị anyị ga-esi na-ele ndụ anya ma na-enyere anyị aka ịzụlite echiche ziri ezi banyere ejighị ihe n’aka na mgbanwe. Ọ bụ ezie na njikọ ezinụlọ, ọnọdụ mmadụ n’obodo, otú mmadụ Eklisiastis 9:11, 12.
nweruru n’ọgụgụ isi, ezi ahụ́ ike na ihe ndị ọzọ pụrụ iweta nchebe ruo n’ókè ụfọdụ, Bible na-egosi na anyị apụghị iji ihe ndị ahụ n’aka ma ọ bụ tụọ anya ibi ndụ e ji “ọgwụ” chebe. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị.” N’ihi gịnị? N’ihi na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” N’ihi nke a, Solomọn dụrụ ọdụ, sị: “Dị ka azụ nke a na-anwụde n’ụgbụ ọjọọ, na dị ka ụmụ nnụnụ nke na-ama n’ọnyà, dị ka ndị a ka ụmụ mmadụ na-ama n’ọnyà na mgbe ọjọọ, mgbe ọ na-adakwasị ha na mberede.”—Jizọs Kraịst kwukwara banyere oge oké nchekasị na ejighị ihe n’aka nke ga-abịakwasị otu ọgbọ dum nke ụmụ mmadụ. O kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “A ga-enwe ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando, mba dị iche iche ga-anọkwa ná nhụjuanya n’elu ụwa, n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na mmali ya, ka ndị mmadụ na-atụbọ n’ihi egwu na atụmanya nke ihe ndị na-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi; n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji.” N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru ihe dị mma maka ndị nwere obi eziokwu taa: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-ewere ọnọdụ, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:25, 26, 31) N’otu aka ahụ, kama ịnọ n’ụjọ n’ihi ọdịnihu a na-ejighị n’aka, anyị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ bụ́ nke na-enyere anyị aka ile anya gabiga ejighị ihe n’aka ahụ ma hụ ọdịnihu dị ebube nke dị nchebe.
‘Inwe Obi Ike Zuru Ezu n’Olileanya Ahụ’
Ọ bụ ezie na anyị apụghị iji ihe nile anyị nụrụ, nke anyị gụrụ ma ọ bụ nke anyị hụrụ n’aka, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Onye Okike anyị obi. Ọ bụghị nanị Onye Kasị Elu kamakwa ọ bụ Nna na-ahụ n’anya nke na-eche banyere ụmụ elu ala ya. Banyere okwu nke ya, Chineke kwuru, sị: “Ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.
Jizọs kụziri eziokwu sitere n’aka Chineke, ọtụtụ ndị gere ya ntị jikwa nkwenye siri ike na obi ike nakwere ya. Dị ka ihe atụ, otu ìgwè nke ndị Sameria nwere obi eziokwu gwara nwanyị ahụ nke buworo ụzọ gee Jizọs ntị, sị: “Ọ bụkwaghị n’ihi okwu gị ka anyị ji ekwere; n’ihi na anyị anụwo n’onwe anyị, anyị makwaara na nwoke a bụ n’ezie onye nzọpụta nke ụwa.” (Jọn 4:42) N’otu aka ahụ taa, n’agbanyeghị na anyị na-ebi n’oge ndị na-adịghị nchebe, anyị ekwesịghị inwe obi abụọ banyere ihe anyị kweere.
N’ihe banyere nkwenkwe okpukpe, ọtụtụ ndị na-ekwu na kama anyị ịgbalịwa ịghọta ihe, anyị kwesịrị nanị ikwere ya. Otú ọ dị, onye so dee Bible bụ́ Luk enweghị echiche dị otú ahụ. O mere nchọpụta ma nye ihe ọmụma ziri ezi ka ndị ọzọ wee “mara n’ụzọ zuru ezu ịbụ eziokwu nke ihe” ndị o dere. (Luk 1:4) Ebe ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị bụ́ ndị anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe pụrụ ịdị na-atụ ụjọ na anyị ga-enwe nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya, ọ dị mkpa ka anyị nwee ike ịgọpụrụ okwukwe anyị. (1 Pita 3:15) Ọ bụ nanị site n’ịmara nke ọma ihe mere anyị ji kwere ihe anyị kweere ka anyị pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịtụkwasị Chineke obi. Bible ji okwu ndị a na-akọwa Jehova: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.”—Deuterọnọmi 32:4.
Ọrụ 10:34, 35) Pita kwuru okwu ndị a n’ihi na ọ ka hụpụrụ otú aka Chineke n’onwe ya si duzie ihe nke na otu ezinụlọ ndị Jentaịl, bụ́ ndị a na-elebu anya dị ka ndị na-adịghị ọcha na ndị a na-apụghị ịnabata anabata sizi ghọọ ndị Ọ nakweere. Dị ka Pita, anyị pụkwara ikwenyesi ike na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, na ọ bụkwa onye ezi omume mgbe anyị ji anya anyị na-ahụ “oké ìgwè mmadụ”—ihe karịrị nde mmadụ isii—sitere n’ihe karịrị ala 230 gburugburu ụwa, bụ́ ndị hapụworo ụzọ ndụ mbụ ha ma na-eje ije n’ụzọ ezi omume.—Mkpughe 7:9; Aịsaịa 2:2-4.
Tụlee okwu ikpeazụ ahụ: “Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” Olee ihe àmà anyị nwere mere anyị ga-eji jide nke a n’aka? Pita onyeozi kwenyesiri ike na nke ahụ. Ọ gwara otu onye ọrụ Rom na ezinụlọ ya, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị achọghị ịbụ ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na ndị na-ekwesi olu ike, kama anyị chọrọ ịbụ ndị dị umeala n’obi na ndị nwere ezi uche. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị abụghị ndị na-ejighị ihe anyị kweere na ihe anyị na-atụ anya ya maka ọdịnihu n’aka. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.” (Ndị Hibru 6:11) N’otu aka ahụ, ozi ọma ahụ nke sitere na Bible emewo ka anyị nwee “obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ.” Olileanya ahụ, bụ́ nke dabesiiri ike n’Okwu Chineke, “adịghịkwa eduga ná mmechuihu,” dịkwa ka Pọl kọwara.—Ndị Rom 5:5.
Ọzọkwa, anyị kwenyesiri nnọọ ike na izi ndị ọzọ ozi ọma ahụ sitere na Bible pụrụ iwetara ha nchebe na iji ihe n’aka n’ụzọ ime mmụọ, ọbụnakwa n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́. Anyị pụrụ isonyere Pọl n’ikwu, sị: “Ozi ọma anyị na-ekwusa eruteghị n’etiti unu nanị n’okwu ọnụ, kamakwa n’ike nakwa na mmụọ nsọ na nkwenye siri ike.”—1 Ndị Tesalonaịka 1:5.
Ngọzi Ndị A Na-enweta Ugbu A ná Nchebe Ime Mmụọ
Ọ bụ ezie na anyị agaghị atụ anya nchebe zuru ezu ná ndụ taa, ọ dị ihe ndị anyị pụrụ ime bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ibi ndụ kwụsiri ike ma dị nchebe ruo n’ókè ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, iso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya ná nzukọ na-atụnye ụtụ n’inwe nkwụsi ike n’ihi na a na-akụziri anyị ụkpụrụ ndị bụ́ ịgba n’ebe ahụ. Pọl dere, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” (1 Timoti 6:17) Site n’ịmụta ịtụkwasị Jehova obi, kama ịtụkwasị obi n’ihe onwunwe na ihe ụtọ ndị na-adịghị adịte aka, ọtụtụ enwerewo onwe ha pụọ ná nchekasị na obi nkoropụ ndị ha na-aghaghị ịnagide na mbụ.—Matiu 6:19-21.
N’ime ọgbakọ, anyị nwere òtù ụmụnna na-ekpo ọkụ, bụ́ nke na-enye aka ma na-enye nkwado n’ọtụtụ ụzọ. N’otu oge n’ozi ya, Pọl onyeozi na ndị ha na ya so eme njem nwetara “oké nrụgide,” ha “ejighị ọbụna ndụ [ha] n’aka.” N’ole ebe ka Pọl chọtara nkwado na ahụ́ efe? N’ezie, obi ike ya n’ebe Chineke nọ adalataghị. Ka o sina dị, Ndị Kraịst ibe ya, bụ́ ndị bịara nyere ya aka, gbara ya ume ma kasie ya obi. (2 Ndị Kọrint 1:8, 9; 7:5-7) Taa, mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ mere, mgbe mgbe, ụmụnna anyị Ndị Kraịst na-abụ ndị mbụ na-abịarute n’ebe ahụ inyere Ndị Kraịst ibe ha na ndị ọzọ nọ ná mkpa aka n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ.
Ikpe ekpere bụ ụzọ ọzọ anyị si enweta enyemaka iji nagide ọnọdụ ndị a na-ejighị n’aka ná ndụ. Anyị pụrụ ịgakwuru Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya mgbe ọ bụla anyị nọ ná nrụgide anyị na-atụghị anya ya. “Jehova bụkwaara onye a na-azọpịa ụlọ elu, bụ́ ụlọ elu nke dịịrị Abụ Ọma 9:9) Ndị nne na nna bụ́ mmadụ pụrụ ịla azụ n’ichebe ụmụ ha. Otú ọ dị, Chineke dị njikere inyere anyị aka ịnagide ụjọ na mmetụta nke ejighị ihe n’aka. Site n’ịtụkwasị Jehova nchegbu anyị n’ekpere, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ pụrụ ime “ihe n’ụzọ bara oké ụba karịa ihe nile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.”—Ndị Efesọs 3:20.
mgbe nile nke mkpa.” (Ị̀ na-ekpegara Chineke ekpere mgbe nile? Ì kweere na Chineke na-aza ekpere gị? “Mama m gwara m na m kwesịrị ikpegara Chineke ekpere,” ka otu nwa agbọghọ na-eto eto bi na São Paulo kwuru. “Ma m jụrụ onwe m, sị: ‘N’ihi gịnị ka m ga-eji kpegara onye m na-amaghị ekpere?’ Otú ọ dị, Ilu 18:10 nyeere m aka ịghọta na enyemaka Chineke dị anyị mkpa, nakwa na anyị kwesịrị ịgwa ya okwu n’ekpere.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” N’ezie, olee otú anyị ga-esi zụlite ntụkwasị obi na obi ike n’ebe Jehova nọ ma ọ bụrụ na anyị emeghị ka ọ bụrụ àgwà anyị ịgwa ya okwu? Iji nweta ngọzi ndị dị n’ịnọ ná nchebe n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa ime ka ikpe ekpere sitere n’obi kwa ụbọchị bụrụ àgwà anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:36.
Ihe ọzọ anyị pụrụ ijide n’aka bụ olileanya anyị nke Alaeze Chineke. Rịba ama okwu ndị dị na Daniel 2:44: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Olileanya ahụ siri ike ma bụrụ nke anyị pụrụ ijide n’aka. Nkwa ụmụ mmadụ na-adakarị ada, ma anyị pụrụ ịtụkwasị okwu Jehova obi mgbe nile. Kama ịbụ onye a na-apụghị ịdabere na ya, Chineke dị ka oké nkume nke anyị pụrụ ịdabere na ya. Anyị pụrụ inwe otu echiche ahụ Devid nwere, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke nke oké nkume m, ana m agbaba n’ime Ya; Ọ bụ ọta m na mpi nke nzọpụta m, na ụlọ elu m, na ebe mgbalaga m; Onye nzọpụta m, Ị na-azọpụta m n’ihe ike.”—2 Samuel 22:3.
Akwụkwọ ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ bụ́ Managing Your Mind gara n’ihu ikwu, sị: “Ka mmadụ na-echekwu banyere ihe ọjọọ ndị pụrụ ime, otú ahụ ka ha na-eyiwanye ihe ndị pụrụ ime eme, otú ahụkwa ka ọ na-esikwu ike ịhụ otú a pụrụ isi nagide ha.” Ya mere, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji kwere ka nchekasị na obi abụọ nke ụwa a na-anyịgbu anyị? Kama nke ahụ, jiri ihe ndị e ji n’aka nke Chineke na-enye dochie anya ihe ndị a na-ejighị n’aka nke ụwa a. Site n’ịnọgide na-enwe okwukwe ná nkwa ndị na-adịghị ada ada nke Jehova, anyị ga-enwe mmesi obi ike a: “Ọ dịghị onye na-eme ka okwukwe ya dabere na ya nke a ga-emechu ihu.”—Ndị Rom 10:11.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
Okwu Chineke na-ekwe nkwa ngọzi nye ihe a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]
“Ọ dịghị onye na-eme kaokwukwe ya dabere na ya nke a ga-emechu ihu”
[Foto dị na peeji nke 31]
Ozi ọma Alaeze ahụ na-ewetara ụmụ mmadụ nchebe