Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbakọta “n’Etiti Ụwa”

Ịgbakọta “n’Etiti Ụwa”

Ịgbakọta “n’Etiti Ụwa”

Ị̀ nụtụwo okwu bụ́ “Te Pito o Te Henua”? Na Rapa Nui, bụ́ asụsụ mbụ a na-asụ n’Easter Island, ọ pụtara “Etiti Ụwa.” Gịnị mere mgbakọ e nwere n’ebe a ji pụọ nnọọ iche?

EBE dịpụrụ adịpụ, ebe dị mgbagwoju anya, ebe pụrụ iche. Ndị a bụ ụfọdụ okwu ndị e ji akọwa Easter Island, ma ọ bụ Rapa Nui dị ka ndị bi na ya na-akpọ ya. Ọ bụ nnọọ ebe dịpụrụ adịpụ nke dị nnọọ n’Oké Osimiri South Pacific, ọ dị kilomita 3,790 site na Santiago, Chile. Ọ ghọrọ ógbè ndị Chile na September 9, 1888.

N’ịbụ nke dị square kilomita 166, àgwàetiti a nwere akụkụ atọ bụ nke ugwu atọ na-agbọpụ ọkụ na-adịghị akpazi ike mejupụtara. N’ezie, dị ka ọtụtụ àgwàetiti Pacific, ọ bụ nanị ọnụ ọnụ nnukwute ugwu ndị dị n’okpuru mmiri mejupụtara ya. A kpọwo àgwàetiti ahụ dum ihe ncheta sitere n’okike. Ọ bụghị ihe ijuanya na ihe a kasị jiri mara àgwàetiti a bụ ihe oyiyi okwute ya ndị dị mgbagwoju anya, bụ́ ndị a maara dị ka moai. *

E wezụga ọdịdị ala ndị na-adọrọ mmasị na ebe ndị a kpọtụrụ aha n’akụkọ ihe mere eme dị na ya, Easter Island nwekwara ụbara ihe oriri ndị na-atọ ụtọ. A na-enweta mkpụrụ osisi ndị dị ka akwụoro, ube bekee, pọpọ, na ụdị unere itolu dịgasị iche iche n’ala ya. A na-enwetakwa ụdị azụ na nri ndị ọzọ dịgasị iche iche n’oké osimiri ya.

Ọnọdụ ihu igwe na-adị jụụ n’Easter Island, ọ na-enwekwa mmiri ozuzo na eke na ogwurugwu mgbe mgbe, bụ́ nke na-eme ka ndị ọbịa na-enweta ikuku dị ọcha ma na-ahụ ebe ndị mara mma. E nwere ihe dị ka mmadụ 3,800 bi na ya ugbu a. Ndị bi na ya n’oge a si n’agbụrụ nke ndị mbụ biri ebe ahụ, tinyere ndị Europe, Chile, na ndị ọzọ. Ọtụtụ narị ndị na-eme njem mkpagharị si Europe na Eshia na-eleta àgwàetiti a, na-eme ka njem nleta bụrụ akụkụ dị mkpa nke ọnọdụ akụ̀ na ụba ya.

A Kụọ Mkpụrụ Alaeze Ndị Mbụ

1982 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ, sị: “Ruo oge ụfọdụ, anyị nwere otu onye nkwusa n’Easter Island. O nwetara enyemaka ime mmụọ site na ya na otu nwanna nwanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ nọ n’alaka [dị na Chile] iderịta akwụkwọ ozi. Ọ bụ ezie na ọ laghachiwo Chile eri oge, e nwere ndị na-atụ ọda Ụlọ Nche n’àgwàetiti ahụ. N’ụzọ tụrụ anyị n’anya, n’April 1980, anyị nwetara òkù telifon si ebe dị anya site n’aka otu onye nwere mmasị nke chọrọ ịmata mgbe a ga-eme Ememe Ncheta. Ka e mesịrị n’otu afọ ahụ, otu di na nwunye si Valparaiso kwaga ebe ahụ, ha anọwokwa na-eduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible. N’April nke 1981, e nwere nzukọ Ememe Ncheta nke mbụ ya n’àgwàetiti a, na-enwe mmadụ 13 bịaranụ. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na ‘ozi ọma’ ahụ na-abami n’ebe a dịpụrụ adịpụ!”

Mgbe e mesịrị, na January 30, 1991, alaka ahụ zigara otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, Dario na Winny Fernandez, n’àgwàetiti ahụ. Nwanna Fernandez na-echeta, sị: “Njem ụgbọelu were awa ise butere anyị n’ebe kasị dịpụ adịpụ n’ụwa, butekwa anyị n’ọdịbendị jupụtara n’ihe mgbagwoju anya.” A haziri nzukọ na ọrụ nkwusa ozugbo site ná nkwado nke otu nwanna nwoke bụ́ onye ebe ahụ na otu nwanna nwanyị nke ya na ụmụ ya abụọ kwagara ebe ahụ n’oge na-adịbeghị anya. N’agbanyeghị nrụgide sitere n’aka ndị òtù ezinụlọ, ịnụ ọkụ n’obi okpukpe na ụdị ndụ a na-ebi n’ọdịbendị ndị Polynesia, ha hụrụ ngọzi Jehova ná mgbalị ha. Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Fernandez abụghịzi ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ha nọgidere n’àgwàetiti ahụ, bụ́ ebe ha nọ na-azụlite nwa ha nwoke, onye a mụrụ ebe ahụ. Taa, e nwere ndị nkwusa Alaeze 32 nwere ọṅụ n’ebe ahụ. Ndị Rapa Nui so na ha, tinyekwara ndị kwagara n’àgwàetiti ahụ ma ọ bụ ndị gara ebe ahụ iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze.

Nkwadebe Maka Mgbakọ Sekit

N’ihi otú àgwàetiti ahụ si dị anya site na kọntinent ahụ, ọgbakọ ahụ na-enweta vidio teepu nke usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit, na mgbakọ distrikti ugboro atọ n’afọ. Ma ka ọ na-erule ná ngwụsị 2000, Kọmitii Alaka dị na Chile malitere ịtụle echiche ndị bi n’àgwàetiti ahụ nwere inwe mgbakọ nke ha, nke mbụ ya n’ebe ahụ. N’ikpeazụ, e kpebiri inwe mgbakọ na November 2001, a kpọrọ ụmụnna ole na ole site n’akụkụ dị iche iche nke Chile ịga ihe omume a pụrụ iche. N’ihi ndokwa ọpụpụ ụgbọelu, a ga-enwe mgbakọ ahụ na Sunday na Monday.

Mmadụ 33 a kpọrọ òkù ịga nwere obi ụtọ n’echiche nke ịga n’àgwàetiti ahụ iji kere òkè ná mgbakọ sekit nke mbụ ya a ga-enwe n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ. Mgbe ha mesịrị njem ụgbọelu were ogologo oge gafee Oké Osimiri Pacific, ndị ahụ na-aga mgbakọ nwere ahụ́ efe ịbụ ndị ụmụnna ndị bi ebe ahụ, bụ́ ndị nọ na-eche ha n’ọdụ ụgbọelu nabatara. E ji ihe olu mara mma e ji okooko osisi mee nabata ha, nke bụ́ ihe e jikarị enye onyinye n’àgwàetiti ahụ. A kpọgaziri ha n’ebe ha ga-anọ, mgbe ha legharịtụchakwara anya n’àgwàetiti ahụ, ndị nile ga-ekere òkè n’ihe omume mgbakọ ahụ zukọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Mkpọsa Site n’Ebe A Na-atụghị Anya Ya

Ka ha kwọ ụgbọala na-aga mgbakọ ahụ, o juru ụfọdụ ndị ahụ bịara mgbakọ anya ịnụ na redio ka ụkọchukwu bi ebe ahụ nọ na-ekwu banyere nleta ha. O kwuru okwu banyere ndị njem nleta si na kọntinent ahụ bụ́ ndị ga-abịa n’ụlọ ha ikwu banyere ọgwụgwụ ụwa nke na-eru nso. Ọ bụ ezie na ọ gbara ndị parish ya ume ka ha ghara ige ndị ọbịa ahụ ntị, ịma ọkwa ya nyere aka mee ka a mata na e nwere ìgwè Ndịàmà Jehova bịara n’àgwàetiti ahụ. Nke a mere ka ndị bi n’àgwàetiti ahụ na-atụ anya ha. N’ụbọchị ndị sochirinụ, ndị ahụ bịara mgbakọ ji akọ soro ha kerịta ozi agbamume nke ozi ọma ahụ.

Mgbakọ ahụ Amalite

N’ụtụtụ Sunday, ụmụnna bi ebe ahụ cheere n’ọnụ ụzọ mbata nke Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nabata ndị ahụ bịara mgbakọ ka ha na-abịa maka ụbọchị nke mbụ nke mgbakọ ahụ. “Iorana Koe! Iorana Koe!” “Nnọọnụ!” Ụmụnna nwanyị ụfọdụ yi uwe ọdịnala ma jiri okooko osisi chọọ agịrị isi ha mma dị nnọọ ka ndị Polynesia na-eme.

Mgbe olu ụtọ gasịrị, otu narị mmadụ sonyere n’ịbụ abụ bụ́ “Bụrụ Onye Na-eguzosi Ike, Onye A Na-apụghị Ịkwapụ Akwapụ!” dị ka a na-anụtụbeghị mbụ n’àgwàetiti ahụ. A kpaliri ụmụnna ndị bi ebe ahụ ibe ákwá mgbe onyeisi oche jiri asụsụ ha, bụ́ Rapa Nui, nabata mmadụ nile. N’oge nkwụsịtụ ehihie, Ndịàmà ọhụrụ atọ gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na baptizim ime mmiri. Mgbe ihe omume nke ụbọchị mbụ ahụ mechiri, onye ọ bụla nwere mmetụta nke ịnọ Jehova na òtù ụmụnna dum nso karị.—1 Pita 5:9.

Ịgba Àmà Ụtụtụ

N’ihi ọnọdụ pụrụ iche e nwere n’àgwàetiti ahụ, ihe omume ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ sekit ahụ malitere mgbe e risịrị nri ehihie. N’ihi ya, ndị ahụ bịaranụ jiri ọnọdụ ahụ mee ihe ma jiri ụtụtụ ahụ kere òkè n’ozi ubi. Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-echere ha?

Otu agadi nwanyị nke nwere ụmụ asatọ gwara Ndịàmà ahụ na ya apụghị iso ha kwurịta okwu n’ihi na ya bụ onye Katọlik. Ka ha gwasịrị ya na ha chọrọ ikwu banyere nsogbu mmadụ nile na-eche ihu, dị ka nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na nsogbu ezinụlọ, o kwetara ige ntị.

Otu agadi nwanyị bi ebe ahụ anabataghị otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà nke ọma. Ọ gwara ha ka ha gaa kwusawara ndị bi na kọntinent ahụ bụ́ ndị na-emeso nnọọ ndị ọzọ ihe n’ụzọ obi ọjọọ. Di na nwunye ahụ gwara ya na a na-ekwusara onye ọ bụla “ozi ọma nke a nke alaeze,” nakwa na nzube ha ji bịa n’àgwàetiti ahụ bụ ịga mgbakọ nke ga-enyere mmadụ nile aka ito n’ịhụnanya ha maka Chineke. (Matiu 24:14) Ha jụrụ ya ma ọ̀ ga-amasị ya ịdị ogologo ndụ n’ọnọdụ paradaịs yiri nke e nwere n’àgwàetiti ahụ ma bụrụ nke ọrịa na ọnwụ na-adịghị na ya. Mgbe ha na ya kwurịtasịrị afọ ole etiti ugwu na-agbọpụ ọkụ dị n’àgwàetiti ahụ nọworo, ọ tụgharịrị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ ma jụọ, sị: “N’ihi gịnị ka anyị ji ebi ndụ dị mkpụmkpụ otú ahụ?” Ọ tụrụ ya n’anya mgbe ọ gụrụ Abụ Ọma 90:10.

Ozugbo ahụ, Ndịàmà ahụ nụrụ mkpu n’ọnụ ụzọ nke ọzọ. Ọ bụ ezie na ha aghọtaghị ihe a na-eti ná mkpu ahụ, nwanyị ahụ gwara ha na ndị agbata obi ya na-akparị Ndịàmà ahụ, na-egosikwa na ha achọghị ka ha bịa leta ha. Otú ọ dị, ọ bụ nwanyị a bụ nua, ma ọ bụ ada nke ezinụlọ ahụ. Ebe ọ bụ na nna ya anwụọla, ọ bụ ọrụ ya ikpebi ihe ga-akasị baara ezinụlọ ahụ uru. O jiri asụsụ ha gbachitere ụmụnna ahụ n’ihu ndị ikwu ya ma jiri obiọma nara akwụkwọ ndị ha nyere ya. Mgbe e mesịrị n’izu ahụ, ka ha na-agbafe Ndịàmà ahụ, ọ gwara nwanne ya nwoke ka ọ kwụsị ụgbọala ha. N’agbanyeghị na o doro anya na obi adịghị nwanne ya nwoke ahụ mma, nwanyị ahụ sịrị ha gaa nke ọma ma kwuo ka ihe gaziere ha n’ozi ha.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ jụrụ ozi nke Ndịàmà ahụ si na kọntinent ahụ kwusara na mbụ, ọ bịara doo ndị ọbịa ahụ anya na ndị Rapa Nui nwere obiọma na omume enyi. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha gere ntị nke ọma n’ozi ọma ahụ. N’ezie, 6 n’ime Ndịàmà 20 e meworo baptizim n’àgwàetiti ahụ bụ ndị bi ebe ahụ. Otu mụtara eziokwu Bible nke mbụ ya site n’ịnọ n’ọnụ ụlọ dị nso n’ebe a nọ na-eduziri nwunye ya ọmụmụ Bible na-ege ntị. Ugbu a, ya na nwunye ya bụ Ndịàmà e mere baptizim, ọ bụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.

Ihe Omume Ime Mmụọ ahụ Agaa n’Ihu

Ụbọchị nke abụọ nke usoro ihe omume ahụ malitere mgbe e risịrị nri ehihie. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị nwere mmasị sonyeere ụmụnna 32 ndị bi ebe ahụ na 33 ndị si esi bịa mgbakọ ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị mmadụ gere ntị n’usoro ihe omume ahụ, gụnyere okwu ihu ọha bụ́ “Otú Ịhụnanya na Okwukwe Si Emeri Ụwa.” N’ezie, ndị ahụ bịaranụ hụrụ ngosipụta a na-ahụ anya nke ịhụnanya dị n’etiti ndị Jehova, ọbụna n’etiti ndị si n’ọdịbendị dị iche iche.—Jọn 13:35.

N’oge mgbakọ sekit ahụ, onye nlekọta sekit na nke distrikti soro ndị ọsụ ụzọ nwee nnọkọ pụrụ iche. Ndị bịara abịa bụ́ ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke pụrụ iche sonyeere ndị ọsụ ụzọ oge nile atọ nọ n’àgwàetiti ahụ. A gbara ha nile ume n’ụzọ dị ukwuu.

N’ụbọchị na-esonụ, ụfọdụ ụmụnna bi ebe ahụ dugharịrị ndị ahụ bịara mgbakọ n’àgwàetiti ahụ. Ha letara ebe mgbari okwute bụ́ ebe a na-apị moai, ugwu ndị a na-anọ enwe asọmpi oge ochie, nakwa ụsọ oké osimiri Anakena na-acha edo edo mara mma, bụ́ ebe ndị mbụ biri n’àgwàetiti ahụ kwụsịrị ụgbọ ha. *

Ohere ikpeazụ e nwere iso ụmụnna ndị bi ebe ahụ nọkọọ bụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Mgbe e nwesịrị nzukọ, Ndịàmà bi ebe ahụ mere ihe tụrụ ndị ọbịa ahụ n’anya site n’inye ha nri ọdịnala. Ka e mesịrị, n’ejiji e ji mara ha, ha gbara egwu ọdịnala. O doro ndị ahụ bịara mgbakọ ahụ na ụmụnna Rapa Nui anya na mgbalị e mere iji kwadebe maka mgbakọ ahụ ruru ya nnọọ.

Ndị nile si esi bịa nwere mmetụta nke ịbụ ndị ha na ụmụnna ha bi n’ebe a dịpụrụ adịpụ, bụ́ ndị ha soworo nọkọọ otu izu dị ụtọ nwere nkekọ chiri anya. O siiri ha ike ịhapụ àgwàetiti ahụ. Ha ga-eji ndị enyi ọhụrụ ha metara na agbamume ime mmụọ ha nwetara kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ọdụ ụgbọelu, ụmụnna ndị bi ebe ahụ jiri ihe olu e ji mkpokoro eju mmiri mee chọọ olu ndị ahụ bịaranụ mma.

Ka ndị ahụ bịara abịa na-ala, ha kwere nkwa, sị: “Iorana! Iau he hoki mai e Rapa Nui ee,” nke pụtara: “Ka e mesịa! M ga-abịaghachi na gị, Rapa Nui.” Ee, ọ na-agụsi ha agụụ ike ịlaghachi iji leta ndị enyi ha metara ọhụrụ na ndị ezinụlọ ime mmụọ ha bụ́ ndị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ, ebe dị mgbagwoju anya, ebe pụrụ iche, nakwa iji leta Easter Island nwere omume enyi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee Teta! (Bekee) nke June 22, 2000, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 27 E nwere ọtụtụ ihe ndị a tụrụ atụ n’ahụ́ okwute ndị dị n’etiti ugwu na-agbọpụ ọkụ nke Rano Raraku. Ebe a bụ ebe a na-amalite asọmpi nke ndị na-achọ ịchị àgwàetiti ahụ. Nke a gụnyere ịkpọda ugwu ahụ, igwuru mmiri gaa n’otu n’ime àgwàetiti ndị ntakịrị dị ebe ahụ, iweta àkwá otu nnụnụ e nwere ebe ahụ, igwuru mmiri lọghachi n’àgwàetiti ahụ bụ́ isi, na ijiri àkwá ahụ gbagoo ugwu ahụ n’akụwaghị ya.

[Igbe dị na peeji nke 24]

Ịgba Àmà n’Easter Island

Ihe dị ka afọ abụọ tupu e nwee mgbakọ a kwesịrị ncheta, otu onye nlekọta sekit na nwunye ya letara àgwàetiti a ma nwee ọtụtụ ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere ihe ijuanya ha nwere mgbe nwanna nwanyị kpọgara ha ebe ha ga-anọ chetaara ha na ha mụụrụ ya Bible n’ebe ndịda Chile mgbe ọ dị afọ iri na ụma ihe dị ka afọ 16 tupu mgbe ahụ. Ka e mesịrị mkpụrụ ahụ a ghara na Rapa Nui mịrị mkpụrụ.

Ha nwekwara ahụmahụ a na-atọ ọchị: Otu onye nwe ụlọ ahịa ebe a na-ere ihe ncheta natara New World Translation of the Holy Scriptures, na akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, bụ́cha ndị Ndịàmà Jehova bipụtara. Mgbe ha laghachiri ileta ya, ọ gwara ha na ya apụghị ịgụ Bible ahụ. Ha nyere ya Bible n’asụsụ French, ọ bụghị Spanish! E doziri nsogbu ahụ ozugbo, ọ chọpụtakwara site n’enyemaka nke Ndịàmà bi ebe ahụ, nakwa n’ezie, site n’enyemaka nke Bible dị n’asụsụ ya na Bible esighị oké ike nghọta dị ka o chere.

[Map dị na peeji 22]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EASTER ISLAND

CHILE

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Abụọ n’ime ndị ahụ e mere baptizim ná mgbakọ sekit ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Mkpọda ugwu Rano Raraku na-agbọpụ ọkụ; n’ime: Mkpụrụ osisi ọhịa a na-akpọ guayaba na-eto n’àgwàetiti ahụ