Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Afọ Ojuju Chineke Na-enye Akwagidewo M

Afọ Ojuju Chineke Na-enye Akwagidewo M

Akụkọ Ndụ

Afọ Ojuju Chineke Na-enye Akwagidewo M

DỊ KA BENJAMIN IKECHUKWU OSUEKE SI KỌỌ

N’oge na-adịghị anya ka m malitesịrị ikere òkè n’ụzọ zuru ezu n’ozi Ndị Kraịst, agara m na nke ndị mụrụ m. Mgbe papa m hụrụ m, o jidere m n’uwe ma malite iti mkpu, sị, “Onye ohi o!” O weere mma ya pịa m. N’ịbụ ndị mkpọtụ ahụ dọtara, ndị obodo gbakọtara n’ụlọ anyị. Gịnị ka m zuru? Ka m kọwaa.

A MỤRỤ m na 1930 n’obodo Umuariam nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria, abụkwa m nwa mbụ n’ime ụmụ asaa. Ada nne m nwụrụ mgbe ọ dị afọ 13. Ndị mụrụ m bụ ndị Anglịkan. Papa m bụ onye ọrụ ugbo, mama m na-agbakwa mgbere ahịa. Ọ na-eji ụkwụ aga ahịa ndị dị n’obodo anyị ndị dị ihe dị ka kilomita 30 site n’ụlọ anyị ịzụta otu tin mmanụ ma lọghachi n’abalị n’otu ụbọchị ahụ. Mgbe ahụ, n’isi ụtụtụ echi ya, ọ na-eji ụkwụ aga n’obodo nwere ọdụ ụgbọ okporo ígwè nke dị ihe dị ka kilomita 40 site n’ụlọ anyị ire mmanụ ahụ. Ọ bụrụ na o rite uru, bụ́ nke na-adịkarịghị akarị ihe dị ka kobo iri [peni iri], ọ na-azụta ihe e ji esi nri maka ezinụlọ anyị ma lọghachi n’otu ụbọchị ahụ. O mere nke ahụ ihe dị ka afọ 15 ruo mgbe ọ nwụrụ na 1950.

Amalitere m akwụkwọ n’obodo anyị n’ụlọ akwụkwọ ndị Chọọchị Anglịkan, ma iji gụsịa akwụkwọ elementrị, aghaghị m ịnọ n’ụlọ ndị ọbịa nke dị ihe dị ka kilomita 35 site n’ụlọ anyị. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m enweghị ego ịzụkwu m n’akwụkwọ, amalitere m ịchọ ọrụ. Na mbụ, agbaara m otu onye nche nke ọdụ ụgbọ okporo ìgwè dị na Lagos, n’ebe ọdịda anyanwụ Nigeria, odibo, mesịa gbaara onye ọrụ bekee bi na Kaduna, n’ebe ugwu nke Nigeria, odibo. Na Benin City, n’etiti ebe ọdịda anyanwụ Nigeria, achọtara m ọrụ dị ka odeakwụkwọ nke otu ọkàiwu, ma mesịa rụọ ọrụ ngo n’ebe a na-akwọ osisi. Esi m ebe ahụ gaa Cameroon na 1953 ịnọnyere nwanne mama m bụ́ onye nyeere m aka ịchọta ọrụ n’ọdọ rọba. Ụgwọ ọnwa m bụ ihe dị ka naịra isii na kobo iri [pam atọ na shịnị anọ]. Ọ bụ nanị ọrụ ndị dị ala ka m rụrụ, ma afọ na-eju m ma ọ bụrụhaala na m na-enweta ihe oriri na-ezuru m.

Ogbenye Ọnụ Ntụ Enye Akụ̀ na Ụba

Silvanus Okemiri, bụ́ onye ọrụ ibe m, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O ji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji soro m kerịta ihe ọmụma Bible ka anyị na-asụ ahịhịa ma na-ehi ya gburugburu osisi rọba. Ọ bụ ezie na m gere ya ntị, ọ dịghị ihe ọzọ m mere mgbe ahụ. Otú o sina dị, mgbe nwanne mama m chọpụtara na mụ na Ndịàmà na-akpakọrịta, o mere ike ya nile iji kụda m mmụọ. Ọ dọrọ m aka ná ntị, sị: “Benji, agakwala na nke Maazị Okemiri ọzọ. Ọ bụ onye Jehova na ogbenye ọnụ ntụ. Onye ọ bụla ya na ya na-akpakọrịta ga-adị nnọọ ka ya.”

Ná mmalite 1954, n’ihi enweghịzi ike ịnagide ọnọdụ ọrụ tara akpụ e nwere n’ụlọ ọrụ anyị, alaghachiri m n’ụlọ. N’oge ahụ, Chọọchị Anglịkan ejighị omume ọma egwuri egwu. Etolitere m na-akpọ omume rụrụ arụ asị. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, abịara m kpọọ ihu abụọ nke ndị chọọchị ibe m asị. Ọ bụ ezie na ha na-ekwusi ike na ha na-agbaso ụkpụrụ Bible, ụzọ ndụ ha megidere ihe ha na-ekwu. (Matiu 15:8) Mụ na papa m rụrụ ụka ọtụtụ ugboro, bụ́ nke mebiri nnọọ mmekọrịta mụ na ya. Otu abalị, ahapụrụ m ụlọ.

Akwagara m Omoba, bụ́ obere obodo nke nwere ọdụ ụgbọ okporo ígwè. N’ebe ahụ, ezutekwara m Ndịàmà Jehova ọzọ. Priscilla Isiocha, bụ́ onye m matara n’obodo anyị, nyere m akwụkwọ nta bụ́ “Ozi Ọma Nka Nke Ala-Eze” na Ha-Magedon GasiaUwa Ọhu nke Chineke. * Agụchapụrụ m ha ozugbo, na-ekwenyesi ike na achọtala m eziokwu ahụ. Na chọọchị anyị, anyị adịghị amụ Bible; anyị na-elekwasị anya n’ọdịnala nke mmadụ. Otú ọ dị, akwụkwọ Ndịàmà hotara ọtụtụ ihe site na Bible.

Mgbe ihe na-erughị otu ọnwa gasịrị, ajụrụ m Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Isiocha mgbe ha ji aga chọọchị ha. Mgbe m gara nzukọ Ndịàmà Jehova nke mbụ ya, ọ dịghị ihe ọ bụla m ghọtara. Isiokwu Ụlọ Nche bụ banyere mwakpo nke ‘Gọg nke Megọg,’ nke a kpọtụrụ uche n’akwụkwọ amụma Izikiel. (Ezikiel 38:1, 2) Ọtụtụ okwu ndị e ji mee ihe dị m ọhụrụ ná ntị, ma nnabata na-ekpo ọkụ e nyere m masịrị m nke ukwuu nke na m kpebiri ịgaghachi na Sunday na-eso ya. Ná nzukọ nke abụọ m gara, anụrụ m banyere ime nkwusa. N’ihi ya, ajụrụ m Priscilla mgbe ha ji aga eme nkwusa. Na Sunday nke atọ ya, esooro m ha, na-eji obere Bible. Enweghị m akpa ozi ọma ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, aghọrọ m onye nkwusa Alaeze ma nye akụkọ ozi ná ngwụsị ọnwa ahụ!

Ọ dịghị onye mụụrụ m Bible, ma mgbe ọ bụla m letara ezinụlọ Isiocha, m na-anụ okwu ndị na-ewusi okwukwe ike ma na-agba ume site n’Akwụkwọ Nsọ, na-enwetakwa akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible. Na December 11, 1954, ná mgbakọ distrikti e mere n’Aba, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptizim ime mmiri. Nwanne papa m bụ́ onye mụ na ya bi na onye m na-amụ ọrụ n’aka ya kwụsịrị inye m nri na ọzụzụ, ọ kwụghịkwa m peni ọ bụla maka ozi m jeere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ebughịrị m ya iro; enwere m nnọọ ekele na mụ na Chineke nwere mmekọrịta. Nke a nyere m nkasi obi na udo nke uche. Ndịàmà nọ n’obodo anyị gbataara m ọsọ enyemaka. Ezinụlọ Isiocha nyere m nri, ndị ọzọ nyekwara m ego iji malite ịgba mgbere ahịa. N’etiti afọ 1955, azụrụ m ịnyịnya ígwè ochie, na March 1956 kwa, amalitere m ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, akwụrụ m ụgwọ ndị m ji. Uru m na-erite n’ahịa m pere nnọọ mpe, ma m pụrụ ilekọta onwe m ugbu a. Ihe Jehova na-enye m zuuru m.

“Izuru” Ụmụnne M

Ozugbo m nọọrọ onwe m, ihe mbụ dị m mkpa bụ inyere ụmụnne m aka n’ụzọ ime mmụọ. Papa m, n’ihi ajọ mbunobi na n’ihi na ọ na-enyo m nnọọ enyo, megidere ọbụbụ m bụ Onyeàmà. Oleezi otú m pụrụ isi nyere ụmụnne m aka ịmụta eziokwu Bible? Ekwuru m ka m nyere nwanne m nke m tọrọ bụ́ Ernest aka, n’ihi ya, papa m kwere ka mụ na ya nọrọ. Ernest nakweere eziokwu ahụ ngwa ngwa, e meekwa ya baptizim na 1956. Mgbanwe ya mere ka mmegide papa m sikwuo ike. Otú o sina dị, nwanne m nwanyị, bụ́ onye lụwororị di, na di ya batakwara n’eziokwu ahụ. Mgbe m mere ndokwa ka nwanne m nwanyị nke abụọ, bụ́ Felicia, bịa nọọ oge ezumike ụlọ akwụkwọ ya na nke m, papa m jisiri ike kwere. N’oge na-adịghị anya, e mekwara Felicia baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Na 1959, alara m ụlọ ịga kpọrọ Bernice, nwanne nwanyị nke atọ, ka ya na Ernest nọrọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka papa m wakporo m, na-ebo m ebubo na m na-ezuru ụmụ ya. Ọ ghọtaghị na ha mere mkpebi n’onwe ha ijere Jehova ozi. Papa m ṅụrụ iyi na ya enweghị ike ikwe ka Bernice soro m. Ma aka Jehova adịghị mkpụmkpụ, n’ihi na kpọmkwem n’afọ na-eso ya, Bernice bịara ịnọ oge ezumike ya na nke Ernest. Dị nnọọ ka nwanne ya nwanyị, ọ nakweere eziokwu ahụ, e meekwa ya baptizim.

‘Ịmụta Ụzọ Isi Nọrọ n’Ụkọ’

Na September 1957, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche, na-etinye ihe dị ka awa 150 n’ọrụ nkwusa kwa ọnwa. Mụ na onye mụ na ya na-ejekọ ozi, bụ́ Sunday Irogbelachi, jere ozi n’ókèala sara mbara dị n’Akpu-na-abuo, Etche. Ná mgbakọ sekit mbụ anyị gara mgbe anyị nọ n’ebe ahụ, e mere mmadụ 13 si n’ìgwè anyị baptizim. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ ugbu a ịhụ ọgbakọ 20 n’ebe ahụ!

Na 1958, amatara m Christiana Azuike, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile nke so Ọgbakọ East dị n’Aba na-amụ ihe. Ịnụ ọkụ n’obi ya masịrị m, na December nke afọ ahụ kwa, anyị lụrụ. Ná mmalite 1959, a họpụtara m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, na-eleta ma na-ewusi ọgbakọ dị iche iche nke ụmụnna ime mmụọ anyị ike. Site mgbe ahụ ruo 1972, mụ na nwunye m letara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ nile nke ndị Jehova dị n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’etiti ebe ọdịda anyanwụ Nigeria.

Ọgbakọ dị iche iche dị nnọọ anya site n’ibe ha, ihe bụ́ isi anyị jikwa eme njem bụ ịnyịnya ígwè. Mgbe anyị letara ọgbakọ ndị dị n’obodo ukwu, ụmụnna anyị na-agbazite tagzi iji buga anyị n’ọgbakọ ọzọ. N’ebe ụfọdụ, ọnụ ụlọ ndị anyị na-anọ na ha bụ ndị e ji ájá ọcha tee ala ha na ndị na-enweghị uko ụlọ. Anyị na-ehi ụra n’àkwà ndị e ji okporo ngwọ mee. Ụfọdụ n’ime àkwà ndị ahụ nwere matarasị ahịhịa ndị e ji ute kpuchie; ndị ọzọ enweghịdị enwe. Otú nri anyị na-eri hà na ihe ndị e ji sie ha abụghịrị anyị nsogbu. Ebe anyị mụtaworo n’oge ndị gara aga inwe afọ ojuju ná ntakịrị ihe anyị nwere, anyị riri ihe ọ bụla e nyere anyị, ndị anyị nọrọ na nke ha nwekwara ekele maka nke ahụ. Obodo ụfọdụ enweghị ọkụ eletrik n’oge ahụ, n’ihi ya, anyị na-ebu oriọna anyị ka anyị na-ejegharị. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe isi ike, anyị soro ọgbakọ ndị ahụ nwee ọtụtụ nnọkọ ndị na-enye obi ụtọ.

N’ime afọ ndị ahụ, anyị bịara ghọta uru ndụmọdụ Pọl onyeozi bara: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) Site n’ahụhụ, Pọl mụtara ihe nyeere ya aka ịnọgide na-enwe afọ ojuju. Gịnị ka ọ bụ? Ọ kọwara, sị: “Amaara m n’ezie ụzọ isi nwee ihe dị nta, amaara m n’ezie ụzọ isi nwee ihe n’ụba. N’ihe ọ bụla nakwa n’ọnọdụ nile amụtawo m ma ụzọ isi nọrọ n’ùjú ma ụzọ isi nọrọ n’agụụ, ma ụzọ isi nwee ihe n’ụba ma ụzọ isi nọrọ n’ụkọ.” Anyị mụtara otu ihe ahụ. Pọl kwukwara, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ [Chineke] nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:12, 13) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ọnọdụ anyị! Anyị nwere afọ ojuju, kere òkè dị ukwuu n’ọrụ na-ewuli elu nke Ndị Kraịst ma nwee udo nke uche.

Ijere Ọgbakọ Dị Iche Iche Ozi Dị Ka Ezinụlọ

Ná ngwụsị 1959, anyị mụrụ nwa anyị nwoke mbụ bụ́ Joel, na 1962 kwa, nwa anyị nwoke nke abụọ, bụ́ Samuel, sochiri. Mụ na Christiana nọgidere n’ọrụ njegharị, na-eleta ọgbakọ dị iche iche, anyị na ụmụ anyị. Na 1967, agha obodo Nigeria dara. E mechiri ụlọ akwụkwọ n’ihi bọmbụ e ji ụgbọelu na-atụ n’esepụghị aka. Nwunye m bụ onye nkụzi tupu ya esonyere m n’ọrụ njegharị, n’ihi ya, n’oge agha ahụ, ọ kụziiri ụmụ anyị ihe n’ụlọ. Samuel pụrụ ịgụ na ide ihe mgbe ọ dị afọ isii. Mgbe ọ malitere akwụkwọ ka agha bisịrị, o ji klas abụọ karịa ndị ọgbọ ya.

N’oge ahụ, anyị aghọtachaghị ihe isi ike dị n’ịzụlite ụmụ ka anyị nọ n’ọrụ njegharị. Otú ọ dị, ịbụ ndị e kenyere ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1972 baara anyị uru. Nke a mere ka anyị nọrọ otu ebe iji wee nwee ike ilebara ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ anyị anya. Site na nwata, anyị kụziiri ụmụ anyị uru afọ ojuju nke Chineke na-enye bara. Na 1973, e mere Samuel baptizim, Joel banyekwara ozi oge nile n’otu afọ ahụ. Ụmụ anyị abụọ lụrụ ezigbo ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst, ha na-azụlitekwa ezinụlọ ha ugbu a n’eziokwu ahụ.

Nhụjuanya nke Agha Obodo

Mgbe agha obodo ahụ malitere, m nọ na-eleta ọgbakọ dị n’Onitsha dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, mụ na ezinụlọ m. Agha ahụ mere ka anyị ghọtakwuo ihe efu dị n’ịkwakọba ihe onwunwe ma ọ bụ ịtụkwasị ha obi. Ahụrụ m ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ—na-agbahapụ ihe onwunwe ha ndị dị oké ọnụ ahịa n’okporo ámá.

Ka agha ahụ na-akawanye njọ, e debanyere aha ndị ikom nile bụ́ dimkpa n’agha. E mekpọrọ ọtụtụ ụmụnna nwoke bụ́ ndị jụrụ ịbanye n’òtù ndị agha, ọnụ. Anyị apụghị ịgagharị n’enweghị nsogbu. Ụkọ nri kpara mkpamkpa n’obodo. Ọnụ ahịa otu abọ akpụ si na kobo 5 ruo naịra 10 [peni 6 ruo 100 shịnị], ọnụ ahịa otu iko nnu sikwa na naịra 6 ruo naịra 30 [shịnị 60 ruo pam 15]. Mmiri ara ehi, bọta, na shuga lara kpam kpam. Iji dị ndụ, anyị na-akwọ pọpọ na-achaghị acha ma na-agwakọta ya na obere ntụ akpụ. Anyị rikwara ụkpara, mkpo akpụ, akwụkwọ okooko osisi hibiscus, na achara—ahịhịa ọ bụla anyị hụrụ. Anụ bụ nri ndị aka ji akụ̀, n’ihi ya, m na-egbutere ụmụ anyị ngwere ka ha rie. Otú o sina dị, n’agbanyeghị otú ihe si dị njọ, Jehova nyere anyị ihe dị anyị mkpa mgbe nile.

Otú ọ dị, ihe ka dịrị ize ndụ bụ ụkọ nri ime mmụọ nke agha ahụ kpatara. Ọtụtụ ụmụnna anyị si n’ebe a na-alụ agha gbaba n’ime ọhịa ma ọ bụ gbaga n’obodo ndị ọzọ, ka ha na-emekwa nke a, ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ma ọ bụrụdị na ọ bụghị ha nile, funahụrụ ha. Tụkwasị na nke ahụ, nnọchibido nke ndị agha ọchịchị etiti gbochiri akwụkwọ ndị ọhụrụ e ji amụ Bible ịbata na Biafra. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ọgbakọ gbalịrị inwe nzukọ, ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụnna anyị kara njọ n’ihi na ha apụghị inweta nduzi site n’alaka ụlọ ọrụ.

Ịlụso Ịnọ Agụụ n’Ụzọ Ime Mmụọ Ọgụ

Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị gbalịrị ike ha nile iji nọgide ná ndokwa nke ileta ọgbakọ dị iche iche. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụmụnna esiwo n’obodo ha gbapụ, achọgharịrị m ha ebe ọ bụla m pụrụ ịchọta ha. N’otu oge, ahapụrụ m nwunye m na ụmụ m n’ebe dị nchebe ma mee njem nanị m ruo izu isii, na-eleta obodo dị iche iche na ọhịa ụfọdụ, na-achọ ụmụnna anyị.

Mgbe m na-eleta otu ọgbakọ dị n’Ogbunka, anụrụ m na e nwere ebe ọtụtụ Ndịàmà nọ n’Isuochi nke dị n’ógbè Okigwe. Ya mere, eziri m mmadụ ka o zie ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ ka ha gbakọta n’ọdọ kashuu dị n’obodo Umuaku. Mụ na otu nwanna nwoke meworo agadi gbaara ígwè gaa ihe dị ka kilomita 15 ruo n’ọdọ kashuu ahụ, bụ́ ebe ihe dị ka Ndịàmà 200, gụnyere ndị inyom na ụmụaka, gbakọtara. Site n’enyemaka nke otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ, achọtara m ìgwè ọzọ nke dị ihe dị ka otu narị Ndịàmà, bụ́ ndị gbagara ọsọ ndụ n’ọhịa Lomara.

Lawrence Ugwuegbu so n’otu ìgwè ụmụnna nwere obi ike bụ́ ndị bi n’obodo agha tisasịrị bụ́ Owerri. Ọ gwara m na e nwere imerime Ndịàmà n’ógbè Ohaji. Ha apụghị ịgagharị n’enweghị nsogbu, n’ihi na ndị agha weghaara ebe ahụ. Anyị abụọ gbaara ígwè n’abalị gaa n’ebe ahụ ma soro ihe dị ka Ndịàmà 120 nwee nzukọ n’ụlọ otu nwanna. Anyị jikwa ohere ahụ leta ụfọdụ Ndịàmà n’ebe ndị ha zoro.

Nwanna Isaac Nwagwu tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ iji nyere m aka ịchọta ụmụnna ndị ọzọ si n’ebe obibi ha gbapụ. O ji ụgbọ epeepe kwọfee m Osimiri Otamiri iji soro ihe karịrị Ndịàmà 150 gbakọtara n’Egbu-Etche nwee nzukọ. Otu nwanna nwoke nọ n’ebe ahụ kwupụrụ, sị: “Nke a bụ ụbọchị kasị mma ná ndụ m! Ọ dịghị mgbe m chere na m ga-adị ndụ hụ onye nlekọta sekit ọzọ. Ọ bụrụ na mụ anwụọ ugbu a n’agha a, enwere m afọ ojuju.”

Anọ m n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a kpụbara n’agha, ma enwetara m nchebe Jehova ugboro ugboro. N’otu ehihie, ka m na-alọghachi n’ebe m bi ka mụ na ihe dị ka ụmụnna 250 nwesịrị nzukọ, otu ìgwè ndị agha kwụsịrị m n’ebe ha na-eche nche. “Gịnị mere na i sonyebeghị n’òtù ndị agha?” ka ha jụrụ. Akọwaara m ha na m bụ onye ozi nke na-ekwusa Alaeze Chineke. Aghọtara m na ha kpebisiri ike ịnwụde m. Mgbe m kpesiri ekpere ngwa ngwa n’ime obi, agwara m onyeisi ha, sị, “Biko tọhapụ m.” N’ụzọ tụrụ m n’anya, ọ zaghachiri, sị, “Ị̀ sị anyị tọhapụ gị ka ị laa?” “Ee,” ka m zara, “tọhapụ m.” Ọ sịrị, “I nweere onwe gị ịla.” Ọ dịghị onye agha ọ bụla kwuru okwu ọzọ.—Abụ Ọma 65:1, 2.

Inwe Afọ Ojuju Ewetakwuo Ngọzi

Mgbe agha ahụ biri na 1970, anọgidere m na-eje ozi n’ọrụ sekit. Ọ bụ ihe ùgwù inye aka ịhazigharị ọgbakọ dị iche iche. Mgbe e mesịrị, mụ na Christiana jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo 1976, bụ́ mgbe a họpụtaghachiri m dị ka onye nlekọta sekit. Ka ọ na-erule n’etiti afọ ahụ, e kenyere m ọrụ distrikti. Afọ asaa ka e mesịrị, a kpọrọ mụ na nwunye m òkù ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria, bụ́ ebe anyị bi ugbu a. N’alaka ụlọ ọrụ ebe a, ọ bụ ihe oké ọṅụ mgbe nile ịhụghachi ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị mụ na ha zutere n’oge agha obodo ahụ na n’oge ndị ọzọ, bụ́ ndị ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.

Kemgbe ọtụtụ afọ, Christiana enyewo m nkwado dị ukwuu ma bụụrụ m onye ibe na-eguzosi ike n’ihe. Mmụọ inwe nchekwube na nke nnọgidesi ike ya, n’agbanyeghị nsogbu ahụ́ ike ndị ọ nọworo na-edi kemgbe 1978, enyeworo m aka ịnọgide na-ebu ibu ọrụ m. Anyị ahụwo ịbụ eziokwu nke okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa.”—Abụ Ọma 41:3.

N’ileghachi anya azụ n’afọ ndị ahụ jupụtara n’ọrụ ọchịchị Chineke, ọ dịghị ihe m maara m ga-eme ma ọ́ bụghị ikele Jehova maka ngọzi ya ndị magburu onwe ha. N’inwe afọ ojuju maka ihe ndị ọ na-enye, apụrụ m ikwu n’ezie na enwetawo m obi ụtọ dị ukwuu. Ọṅụ nke ịhụ ụmụnne m, ụmụ m, na ezinụlọ ha ka ha nile so mụ na nwunye m na-ejere Jehova ozi bụ ngọzi na-enweghị atụ. Jehova ejiwo ndụ jupụtara n’ezi ihe na nke nwere nzube mee ka afọ ju m. Ọ dịghị ọchịchọ m ọ bụla nke a na-emezubeghị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. A dịghịzi ebipụta ha.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Ndokwa Bịara n’Ezi Oge Enye Aka Kwagide Òtù Ụmụnna

N’etiti afọ ndị 1960, ibu iro nke dị n’etiti agbụrụ ndị dị n’ebe ugwu na n’ebe ọwụwa anyanwụ Nigeria dugara n’ọgba aghara, nnupụisi, mmebi iwu, na ime ihe ike agbụrụ. Nke a kpataara Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị kpebisiri ike ịnọpụ nnọọ iche n’ọgba aghara ahụ, ọtụtụ ihe isi ike. E gburu ihe dị ka mmadụ 20 n’ime ha. Ihe onwunwe nile nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ funahụrụ ha.

Na May 30, 1967, steeti ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Nigeria kewapụrụ onwe ha n’ọchịchị etiti, na-eguzobe Republic of Biafra. E zipụrụ ndị agha ọchịchị etiti, a nọchibidokwara ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ihe sochiri ya bụ agha obi ọjọọ na nke a kwafuru ọtụtụ ọbara na ya.

Nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova n’ógbè Biafra mere ka ha bụrụ ndị a wakporo. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche bipụtara okwu ọjọọ, na-eme ka ọha na eze na-ekwu okwu megide ha. Otú ọ dị, Jehova hụrụ na ndị ohu ya nwetara nri ime mmụọ. N’ụzọ dị aṅaa?

Ná mmalite afọ 1968, e zigara otu onye ọrụ bekee ịrụ ọrụ na Europe, ziga onye nke ọzọ n’ọdụ ụgbọelu Biafra. Ha abụọ bụcha Ndịàmà. Ọrụ ha mere ka ha nọrọ n’akụkụ abụọ nke nanị ụzọ nzirịta ozi dị n’etiti Biafra na akụkụ ụwa ndị ọzọ. Ndịàmà abụọ a wepụtara onwe ha maka ọrụ dị ize ndụ nke iwebata nri ime mmụọ na Biafra. Ha nyekwara aka inye ụmụnna anyị ndị na-ahụsi anya ihe enyemaka. Ụmụnna abụọ ndị a hụrụ na ndokwa a dị oké mkpa nọgidere na-aga n’ihu n’oge nile nke agha ahụ, bụ́ nke biri na 1970. Otu n’ime ha mesịrị kwuo, sị, “Ndokwa a karịrị ihe ụmụ mmadụ pụrụ imeworị atụmatụ ya.”

[Foto dị na peeji nke 23]

Na 1956

[Foto dị na peeji nke 25]

Na 1965, anyị na ụmụ anyị, bụ́ Joel na Samuel

[Foto dị na peeji nke 26]

Lee ngọzi ọ bụ ijere Jehova ozi dị ka ezinụlọ!

[Foto dị na peeji nke 27]

Taa, mụ na Christiana na-eje ozi n’alaka Nigeria