“Rụọ Ọrụ Onye Na-ezisa Ozi Ọma”
“Rụọ Ọrụ Onye Na-ezisa Ozi Ọma”
“Nọgide na-enwe uche ziri ezi n’ihe nile, . . . rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.”—2 TIMOTI 4:5.
1. Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs nyere ụmụazụ ya?
A NA-EKWUSA aha Jehova na nzube ya n’ụwa nile. Nke a bụ n’ihi na ndị Chineke raara onwe ha nye ji ọrụ Jizọs Kraịst nyere ụmụazụ ya kpọrọ ihe, bụ́ nke o nyere ha mgbe ọ sịrị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
2. Ntụziaka dị aṅaa ka onye nlekọta bụ́ Timoti natara, oleekwa otu ụzọ Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta taa ga-esi na-eje ozi ha n’ụzọ zuru ezu?
2 Ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ ji ọrụ ahụ kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gbara Onye Kraịst ibe ya bụ́ onye nlekọta bụ́ Timoti ume, sị: “Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jee ozi gị n’ụzọ zuru ezu.” (2 Timoti 4:5) Taa, otu ụzọ onye nlekọta si ejezu ozi ya bụ site n’ịbụ onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi, onye na-ekerechi òkè anya n’ozi ubi. Dị ka ihe atụ, onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nwere ihe ùgwù na-enye afọ ojuju nke ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa na ịzụ ndị ọzọ na ya. Pọl rụzuru ọrụ nke ya bụ́ ikwusa ozi ọma ahụ, o nyekwara aka n’ịzụ ndị ọzọ maka ozi ahụ.—Ọrụ 20:20; 1 Ndị Kọrint 9:16, 17.
Ndị Na-ezisa Ozi Ọma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Oge Gara Aga
3, 4. Ahụmahụ ndị dị aṅaa ka Filip nwere dị ka onye na-ezisa ozi ọma?
3 A maara Ndị Kraịst oge mbụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi. Tụlee ihe banyere onye na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip. O so ná “ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà . . . bụ́ ndị jupụtara na mmụọ nsọ na amamihe,” ndị a họpụtara ịrụ ọrụ ikesara ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ Ndị Kraịst na-asụ Grik na ndị nke na-asụ Hibru ihe oriri kwa ụbọchị n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 6:1-6) Mgbe ozi ahụ pụrụ iche gasịrị, mkpagbu achụsasịakwa mmadụ nile ma e wezụga ndịozi, Filip gara Sameria. N’ebe ahụ, o kwusara ozi ọma ahụ, mmụọ nsọ nyekwara ya ike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ngwụrọ na ndị nwere ahụ́ mkpọnwụ. Ọtụtụ ndị Sameria nakweere ozi Alaeze ahụ, e meekwa ha baptizim. Mgbe ha nụrụ nke a, ndịozi nọ na Jeruselem zigara Pita na Jọn Sameria ka ndị ahụ e mere baptizim ọhụrụ wee nwee ike ịnata mmụọ nsọ.—Ọrụ 8:4-17.
4 Mmụọ Chineke duruziiri Filip jekwuru ọnaozi Etiopia n’okporo ụzọ na-aga Geza. Mgbe Filip kọwasịrị amụma Aịzaịa n’ụzọ doro anya, ‘nwoke a ike dị n’aka bụ́ onye nọ n’okpuru Kandes bụ́ eze nwanyị ndị Etiopia’ nwere okwukwe na Jizọs Kraịst, e meekwa ya baptizim. (Ọrụ 8:26-38) Filip mesịrị gaa Ashdọd ma sizie ebe ahụ gaa Sesaria, “na-akpọsara obodo nile ozi ọma” ka ọ na-aga. (Ọrụ 8:39, 40) N’ezie, o setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ịrụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma!
5. Gịnị karịsịa ka e ji mara ụmụ nwanyị anọ nke Filip?
5 Filip ka na-ejechi ozi anya na Sesaria ihe dị ka afọ 20 ka e mesịrị. Mgbe Pọl na Luk nọrọ n’ụlọ ya, o “nwere ụmụ agbọghọ anọ, ndị na-amaghị nwoke, bụ́ ndị na-ebu amụma.” (Ọrụ 21:8-10) Ihe ama na-egosi na a zụrụ ha nke ọma n’ụzọ ime mmụọ, na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ozi, nakwa ọbụna na ha nwere ihe ùgwù nke ibu amụma. Ịnụ ọkụ n’obi nke ndị nne na nna n’ozi a pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị taa, na-akpali ha ime ka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma bụrụ ọrụ ha ná ndụ.
Ndị Na-ezisa Ozi Ọma Na-anụ Ọkụ n’Obi Taa
6. Olee ihe ịga nke ọma nke ndị na-ezisa ozi ọma nke narị afọ mbụ nwere?
6 N’oké amụma ya nke na-ezo aka n’oge anyị na oge ọgwụgwụ, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) Ọgwụgwụ ga-abịa mgbe e kwusasịworo ozi ọma ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Ka Pọl na ndị ọzọ na-ezisa ozi ọma nke narị afọ mbụ na-ekwusa ozi ọma ahụ, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe, e guzobekwara ọgbakọ dị iche iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ n’akụkụ nile nke Alaeze Ukwu Rom. Ndị okenye a họpụtara ijere ọgbakọ ndị a ozi so ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị kere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ ma were ọrụ nkwusa ahụ ruo n’ebe ndị dị anya. Okwu Jehova nọgidere na-eto ma na-enwe mmeri n’oge ahụ, dị nnọọ ka ọ na-eme taa n’ihi na ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nke ndị na-ezisa ozi ọma. (Ọrụ 19:20) Ì sonyewo ná ndị a ji obi ụtọ na-eto Jehova?
7. Gịnị ka ndị nkwusa Alaeze na-eme taa?
7 Ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze nke oge a na-eji ohere dị iche iche eme ihe iji mụbaa òkè ha na-ekere n’ọrụ izisa ozi ọma. Ọtụtụ puku mmadụ abanyewo n’ozi ala ọzọ, ọtụtụ narị puku na-ekerekwa òkè n’ọrụ izisa ozi ọma oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke inyeaka. Leekwa ọrụ kwesịrị ịja mma nke ndi ikom, ndị inyom, na ụmụaka ndị na-eje ozi dị ka ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi na-arụ! N’ezie, ndị Jehova nile na-enweta ngọzi ya n’ụba ka ha na-ejere ya ozi n’otu ubu dị ka Ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma.—Zefanaịa 3:9.
8. Ọrụ ịka akara dị aṅaa ka a na-arụ ugbu a, oleekwa ndị na-arụ ya?
8 Chineke enyewo ụmụazụ Jizọs e tere mmanụ ibu ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile. Ndị na-enyere ha aka n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ bụ ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke “atụrụ ọzọ” nke Kraịst. (Jọn 10:16) N’ụzọ amụma, e ji ọrụ a na-azọpụta ndụ tụnyere ịka akara n’egedege ihu nke ndị na-eze ume ma na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ ndị na-eme ugbu a. N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ. Ka ọ dịgodị, lee ihe ùgwù ọ bụ ikwusara ndị bi n’ụwa eziokwu nke na-azọpụta ndụ!—Ezikiel 9:4-6, 11.
9. Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka n’ozi?
9 Ọ bụrụ na anyị anọwo na-ekere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ ruo oge ụfọdụ, o yikarịrị nnọọ ka anyị pụrụ ime ihe iji nyere ndị ọhụrụ nọ n’ọgbakọ aka. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ inwe ike ime ka ha sonyere anyị n’ozi. Ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye kwesịrị ime ike ha nile iji wulie ndị kwere ekwe ibe ha elu n’ụzọ ime mmụọ. Ezi mgbalị nke ndị nlekọta dị umeala n’obi pụrụ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ dị ukwuu ịbụ ndị na-ezisa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi ma na-arụpụta ihe.—2 Pita 1:5-8.
Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
10. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Kraịst na ụmụazụ ya setịpụrụ n’ozi?
10 Jizọs Kraịst setịpụụrụ ụmụazụ ya ihe nlereanya magburu onwe ya dị ka onye na-ezisa ozi ọma. Banyere ozi Kraịst na ndịozi ya, Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ọ gawara site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, nakwa site n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke. Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya.” (Luk 8:1) Gịnị banyere ndịozi ahụ n’onwe ha? Mgbe a wụsasịrị ha mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., “kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—Ọrụ 5:42.
11. Dị ka Ọrụ 20:20, 21 si gosi, gịnị ka Pọl onyeozi mere n’ozi ya?
11 N’ihi ọrụ izisa ozi ọma nke o ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nọ n’Efesọs, sị: ‘Alaghị m azụ ịgwa unu nke ọ bụla n’ime ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ Mgbe Pọl ‘na-ezi ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ,’ ọ̀ nọ na-aga n’ụlọ ndị ya na ha na-efekọ Jehova, na-eme nleta ọzụzụ atụrụ na nke ndị kwere ekwe ibe ya? Ee e, n’ihi na ọ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Agbasiiri m ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 20:20, 21) N’ozuzu, ọ gaghị adị ndị rarawororị onwe ha nye Jehova mkpa ka e zie ha ihe banyere “nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.” Pọl zụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nọ n’Efesọs n’ozi ụlọ n’ụlọ ebe ọ kụziiri ndị na-ekweghị ekwe ihe banyere nchegharị na okwukwe. Site n’ime otú a, Pọl nọ na-agbaso usoro Jizọs guzobere.
12, 13. N’ikwekọ ná Ndị Filipaị 1:7, gịnị ka ndị Jehova meworo banyere ikike ha nwere ime nkwusa?
12 Ozi ụlọ n’ụlọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Dị ka ihe atụ, ọ na-ewe ụfọdụ iwe mgbe anyị ji ozi Bible bịa n’ụlọ ha. Ọ bụghị ọchịchọ anyị ịkpasu ndị mmadụ iwe. N’agbanyeghị nke ahụ, ozi ụlọ n’ụlọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi na-akpalikwa anyị ịgba àmà n’ụzọ dị otú a. (Mak 12:28-31) Iji ‘gbachitere ikike anyị nwere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ na ime ka o guzosie ike n’ụzọ iwu kwadoro,’ anyị ewegawo ọtụtụ okwu n’ụlọikpe, gụnyere Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. (Ndị Filipaị 1:7) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile, ikpe ndị ahụ e kpere n’ụlọikpe laara anyị. Otu ihe atụ bụ mkpebi ikpe na-esonụ:
13 “Ikesa mpempe akwụkwọ okpukpe n’aka n’aka bụ ụdị ikwusa ozi ọma nke ndị ozi ala ọzọ na-eji eme ihe eri mgbe—eri mgbe e meputara ígwè e ji ebi akwụkwọ. O nwewo ike dị ukwuu n’ime òtù nile eri afọ nile. E ji ụdị ịgbasa ozi ọma nke a na-eme ihe taa, n’ụzọ dị ukwuu site n’aka òtù okpukpe dị iche iche, bụ́ ndị ndị na-asụrụ ha ụzọ na-eburu Oziọma ahụ na-aga na puku kwuru puku ebe obibi, na-achọkwa inweta ndị ga-agbaso okwukwe ha site n’ije na nke ndị mmadụ n’onwe ha na-eleta ha. . . . Ụdị ịrụ ọrụ okpukpe nke a nọ n’otu ọkwá ahụ dị elu n’ime Ndozigharị Iwu nke Mbụ [nke Iwu Mba United States] dị ka ofufe a na-efe n’ime ụlọ chọọchị na nkwusa a na-ekwusa site n’elu pulpit nọ.”—Murdock v. Pennsylvania, 1943.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nọgide Na-eme Nkwusa?
14. Mmetụta dị ukwuu dị aṅaa ka ozi anyị pụrụ inwe?
14 E nwere ọtụtụ ihe mere a ga-eji na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbe ọ bụla anyị gara na nke onye nwe ụlọ, anyị na-agbalị ịkụ mkpụrụ nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ. Site n’ime nletaghachi, anyị na-achọ ịgba ya mmiri. Ọ pụkwara inwe nnọọ ezi mmetụta, n’ihi na Pọl dere, sị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs kwọsara ya mmiri, ma Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto.” (1 Ndị Kọrint 3:6) Ya mere, ka anyị nọgide ‘na-akụ ma na-akwọsa mmiri,’ na-enwe obi ike na Jehova ‘ga-eme ka ọ na-eto.’
15, 16. N’ihi gịnị ka anyị ji aga na nke ndị mmadụ ugboro ugboro?
15 Anyị na-arụ ọrụ nke ndị na-ezisa ozi ọma n’ihi na ndụ ọtụtụ mmadụ dị n’ihe ize ndụ. Site n’ime nkwusa, anyị pụrụ ịzọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị. (1 Timoti 4:16) Ọ bụrụ na anyị maara na ndụ mmadụ dị n’ihe ize ndụ, ànyị ga-eme nanị otu obere mgbalị iji nyere ya aka? Ọ dịghị ma ọlị! Ebe o metụtara nzọpụta, anyị na-aga na nke ndị mmadụ ugboro ugboro. Ọnọdụ nọgidere na-agbanwe. Onye ji nnọọ ọrụ n’aka nke na o geghị anyị ntị n’otu oge pụrụ ịdị njikere ịnụ ozi Bible n’oge ọzọ. Onye ọzọ n’ezinụlọ ahụ pụrụ ịbịa megheere anyị ụzọ, nke ahụ pụkwara iduga ná mkparịta ụka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
16 Ọ bụghị nanị ọnọdụ ndị nwe ụlọ kamakwa àgwà ha pụrụ ịgbanwe. Dị ka ihe atụ, ọnwụ na-agbawa obi nke onye a hụrụ n’anya pụrụ ịkpali mmadụ ige ntị n’ozi Alaeze ahụ. Anyị na-atụ anya ịkasi onye ahụ obi, mee ka ọ mara mkpa ime mmụọ ya, ma gosi otú a pụrụ isi gboo ya.—Matiu 5:3, 4.
17. Gịnị bụ ihe mbụ mere anyị ji arụ ọrụ nkwusa anyị?
17 Nke mbụ n’ime ihe ndị mere anyị ji agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ na-ekere òkè n’ụdị ndị ọzọ nke ozi Ndị Kraịst bụ ọchịchọ nke ikere òkè n’ime ka a mara aha Jehova. (Ọpụpụ 9:16; Abụ Ọma 83:18) Lee ka o si bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ ọrụ mgbe ọrụ izisa ozi ọma anyị nyeere ndị hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya aka ịghọ ndị na-eto Jehova! “Ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. “Ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.”—Abụ Ọma 148:12, 13.
Izisa Ozi Ọma Na-abara Anyị Uru n’Onwe Anyị
18. Olee otú anyị si erite uru site n’ịrụ ọrụ izisa ozi ọma?
18 Ịrụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma na-abara anyị uru n’onwe anyị n’ụzọ dịgasị iche iche. Iji ozi ọma ahụ aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-enyere anyị aka ịzụlite ịdị umeala n’obi, karịsịa mgbe a na-ejighị obiọma nabata anyị. Iji bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma dị irè, ọ dị anyị mkpa ịdị ka Pọl, bụ́ onye ‘ghọrọ ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ ka o wee nwee ike ịzọpụta ụfọdụ.’ (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Inwe ahụmahụ n’ozi ahụ na-enyere anyị aka ịdị akọ. Site n’ịdabere na Jehova na ịhọrọ okwu anyị nke ọma, anyị pụrụ itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, nke bụ́: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.
19. Olee otú mmụọ nsọ si enyere ndị na-ezisa ozi ọma aka?
19 Ọrụ izisa ozi ọma na-akpalikwa anyị ịdabere ná mmụọ nsọ Chineke. (Zekaraịa 4:6) N’aka nke ya, mkpụrụ ya—“ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye”—na-apụta ìhè n’ozi anyị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ọ na-emetụta otú anyị si emeso ndị mmadụ ihe, n’ihi na ikwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị na-enyere anyị aka ịdị na-egosipụta ịhụnanya, ịdị na-enwe ọṅụ ma na-eme udo, inwe ogologo ntachi obi na obiọma, igosipụta ịdị mma na okwukwe, na igosipụta ịdị nwayọọ na njide onwe onye mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ.
20, 21. Gịnị bụ ụfọdụ ngọzi na uru ndị dị n’ịrụsi ọrụ ike dị ka onye na-ezisa ozi ọma?
20 Ngọzi ọzọ na-abịara anyị dị ka ndị na-ezisa ozi ọma bụ na anyị na-aghọ ndị nwere ọmịiko karị. Mgbe ndị mmadụ kwupụtara 2 Ndị Kọrint 4:4) Lee ngọzi ọ bụ inyere ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” aka n’ụzọ ime mmụọ!—Ọrụ 13:48.
nsogbu ha—ọrịa, enweghị ọrụ, nsogbu ezinụlọ—anyị adịghị eme ka ndị ndụmọdụ, kama nke ahụ anyị na-eso ha atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-agba ume ma na-akasi obi. Anyị na-enwe nchegbu banyere ndị mmadụ bụ́ ndị e meworo ka ha kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị o yiri ka hà hụrụ ezi omume n’anya. (21 Ikerechi òkè anya n’ọrụ izisa ozi ọma na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ime mmụọ. (Luk 11:34) N’ezie, nke ahụ bara uru, ebe ọ bụ na, ma ọ́ bụghị ya, anyị pụrụ ịdaba n’ọnwụnwa nke ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ́ nke jupụtara n’ụwa a. Jọn onyeozi gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa. Ọzọkwa, ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Ịrụsi ọrụ ike dị ka onye na-ezisa ozi ọma, na-enwe ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị, na-enyere anyị aka ịghara ịhụ ụwa n’anya.—1 Ndị Kọrint 15:58.
Na-akpakọba Akụ̀ Eluigwe
22, 23. (a) Akụ̀ dị aṅaa ka Ndị Kraịst bụ́ ndị na-ezisa ozi ọma na-akpakọba? (b) Olee otú isiokwu na-esonụ pụrụ isi nyere anyị aka?
22 Iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-eweta abamuru ndị na-adịgide adịgide. Jizọs gosiri na nke a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’elu ala, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-awabanyekwa ma na-ezu ohi. Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awabanye ma na-ezu ohi. N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Matiu 6:19-21.
23 Ka anyị nọgide na-akpakọba akụ̀ n’eluigwe, na-amara na anyị apụghị inwe ihe ùgwù karịrị nke ịnọchite anya Eze Onyenwe anyị Jehova dị ka Ndịàmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Ka anyị na-arụ ọrụ anyị dị ka ndị ozi Chineke, anyị pụrụ nnọọ inwe mmetụta yiri nke nwanyị Onye Kraịst dị afọ 90 na ụma bụ́ onye kwuru banyere ogologo oge o jiworo jeere Chineke ozi, sị: “N’ihe nile, ana m ekele Jehova maka ịnagide m n’afọ ndị a nile, m na-ekpesikwa ekpere ike ka ọ bụrụ Nna m nke na-ahụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.” N’ụzọ yiri ya, ọ bụrụ na anyị ejiri mmekọrịta anyị na Chineke kpọrọ ihe, n’ezie, anyị ga-achọ ịrụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma n’ụzọ zuru ezu. Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịhụ otú anyị pụrụ isi jee ozi anyị n’ụzọ zuru ezu.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-arụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma?
• Gịnị ka ị pụrụ ikwu banyere ọrụ nke ndị na-ezisa ozi ọma n’oge gara aga na n’oge a?
• N’ihi gịnị ka anyị ji agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ?
• Olee otú i si erite uru n’onwe gị site n’ịrụ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ndị na-ezisa ozi ọma dị ka Filip na ụmụ ya nwere ndị ogbo ha nwere ọṅụ n’oge a
[Foto dị na peeji nke 14]
Olee otú i si erite uru n’onwe gị ka ị na-ezisara ndị ọzọ ozi ọma ahụ?