Ọnọdụ Gị Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
Ọnọdụ Gị Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
ỌNỌDỤ ndị na-akpata nchegbu na nsogbu jupụtara ebe nile ‘n’oge ndị a pụrụ iche.’ (2 Timoti 3:1) Nsogbu ụfọdụ pụrụ ịdịru nwa oge, n’ihi ya kwa, ha ga-emesị gabiga. Ndị ọzọ na-adịgide ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-enwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye tikuru Jehova, sị: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara: mee ka m si ná mkpa m nile pụta.”—Abụ Ọma 25:17.
Gị na nsogbu ndị siri ike ọ̀ na-alụ? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịchọta enyemaka na agbamume na Bible. Ka anyị tụlee ndụ nke ndị ohu Jehova abụọ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịnagide ihe isi ike: Josef na Devid. Site n’inyocha otú ha si meghachi omume n’ahụhụ, anyị pụrụ ịmụta ihe ndị bara uru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịnagide ihe ịma aka ndị yiri ndị nke ha taa.
Ha Chere Ihe Ịma Aka Ndị Siri Ike Ihu
Ka ọ na-erule mgbe ọ dị afọ 17, Josef nwere nsogbu siri ike n’ime ezinụlọ nke ya. Ụmụnne ya ndị nwoke tọrọ ya hụrụ na Jekọb, bụ́ nna ha, “hụrụ [Josef] n’anya karịa ụmụnne ya nile.” N’ihi ya, “ha wee kpọọ ya asị, ha apụghịkwa ịgwa ya okwu n’udo.” (Jenesis 37:4) Anyị pụrụ iji anya nke uche anyị hụ obi erughị ala na nchegbu ọnọdụ a wetaara Josef. N’ikpeazụ, ịkpọasị nke ụmụnne Josef bịara sie ike ruo n’ókè nke na ha renyere ya n’ịbụ ohu.—Jenesis 37:26-33.
Mgbe Josef bụ ohu n’Ijipt, o guzogidere ọchịchọ nwunye nna ya ukwu nwere iso ya mee omume rụrụ arụ. N’ịbụ onye iwe ji n’ihi ọjụjụ a jụrụ ya, o boro Josef ebubo ụgha na ọ chọrọ idina ya n’ike. ‘E tinyere Josef n’ụlọ mkpọrọ,’ bụ́ ebe “ha weere agbụ kesie ụkwụ ya abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’ígwè.” (Jenesis 39:7-20; Abụ Ọma 105:17, 18) Lee ka nke a na-aghaghị isiwo bụụrụ ya ọnwụnwa! Ruo ihe dị ka afọ 13, ma ọ́ bụghị na Josef bụ ohu, ọ bụrụ na ọ bụ onye mkpọrọ n’ihi ikpe na-ezighị ezi sitere n’aka ndị ọzọ, gụnyere ndị òtù ezinụlọ nke ya.—Jenesis 37:2; 41:46.
Devid nke Izrel oge ochie chekwara ule dị iche iche ihu dị ka nwa okorobịa. Ruo ọtụtụ afọ, a manyere ya ibi ndụ dị ka onye na-agba ọsọ ndụ, bụ́ onye Eze Sọl na-achụgharị dị ka anụmanụ. Ndụ Devid nọ n’ihe ize ndụ mgbe nile. N’otu oge, ọ gakwuuru Ahimelek bụ́ onye nchụàjà maka nri. (1 Samuel 21:1-7) Mgbe Sọl nụrụ na Ahimelek nyeere Devid aka, o nyere iwu ka e gbuo, ọ bụghị nanị Ahimelek, kamakwa ndị nchụàjà nile na ezinụlọ ha. (1 Samuel 22:12-19) Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche oké mwute Devid na-aghaghị inweworị n’ihi ịbụ onye e jiri maka ya gbuo ndị a?
Cheedị banyere ọtụtụ afọ nke nhụsianya na mmeso ọjọọ ndị Josef na Devid nagidere. Site n’inyocha otú ha siri mee ihe banyere ọnọdụ ndị siri ike ha nọrọ na ha, anyị pụrụ ịmụta ihe ndị bara uru. Ka anyị tụlee akụkụ atọ ebe ndị anyị kwesịrị iṅomi ndị ikom a.
Ebula Iwe n’Obi, Enwekwala Obi Ilu
Nke mbụ, ndị ikom a enweghị obi ilu, ha ebughịkwa iwe n’obi. Mgbe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ ịdịworo ya mfe ịnọgide na-enwe echiche na-ezighị ezi banyere nrara nke ụmụnne ya raara ya nye, ma eleghị anya na-eche otú ọ ga-esi emegwara ma ọ bụrụ na o jiri anya ya hụ ha ọzọ. Olee otú anyị si mara na Josef jụrụ echiche dị otú ahụ na-emebi ihe? Tụlee otú o si meghachi omume mgbe o nwere ohere nke imegwara ụmụnne ya, bụ́ ndị bịara ịzụrụ ọka n’Ijipt, ihe ha mere ya. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “[Josef] wee sị n’ebe ha nọ chigharịa onwe ya, kwaa ákwá; . . . Josef wee nye iwu, [ndị ohu ya] wee kpojuo ihe nile [nke ụmụnne ya] n’ọka, o nyekwa iwu inyeghachi ego ha, nke onye ọ bụla n’akpa ya, na inye ha ihe ha ga-eri n’ụzọ.” Ka e mesịrị, mgbe ọ na-eziga ụmụnne ya ịga kpọta nna ha n’Ijipt, Josef ji okwu ndị a gbaa ha ume: “Unu esela okwu n’ụzọ.” Ma n’okwu ọnụ ma n’omume, Josef gosiri na ya ekweghị ka obi ilu na ibu iwe n’obi bibie ndụ ya.—Jenesis 42:24, 25; 45:24.
N’otu aka ahụ, Devid ebughịrị Eze Sọl iwe n’obi. Ohere dapụtaara Devid ugboro abụọ igbu Sọl. Ma, mgbe ndị ikom ya gbara ya ume ime otú ahụ, Devid kwuru, sị: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova; m gaghị eme onyenwe m, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, ihe a ma ọlị bụ́ isetị aka m megide ya, n’ihi na onye Jehova e tere mmanụ ka ọ bụ.” Devid hapụụrụ Jehova okwu ahụ, na-agwa ndị ikom ya, sị: “Jehova na-adị ndụ, Jehova aghaghị itigbu ya; ma ọ bụ ụbọchị ya ga-abịaru, o wee nwụọ; ma ọ bụ ọ ga-arịda n’agha, e wee kpochapụ ya.” N’ikpeazụ, ọbụna Devid rọrọ abụ ákwá iji ruo újú ọnwụ Sọl na nwa 1 Samuel 24:3-6; 26:7-13; 2 Samuel 1:17-27.
Sọl bụ́ Jonatan. Dị ka Josef, Devid ebughị iwe n’obi.—Ànyị na-ebu iwe n’obi ma ọ bụ na-enwe obi ilu mgbe ikpe na-ezighị ezi kpataara anyị ihe mgbu? Nke a pụrụ ime n’ụzọ dị mfe. Ọ bụrụ na-anyị ekwe ka mmetụta uche anyị na-achịkwa anyị, ihe ndị ga-esi na ya pụta pụrụ imebi ihe karịa ikpe na-ezighị ezi ahụ n’onwe ya. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Ọ bụ ezie na anyị apụchaghị ịchịkwa ihe ndị ọzọ na-eme, anyị pụrụ ịchịkwa mmeghachi omume anyị. Ọ na-adị mfe karị ịghara ibu iwe n’obi ma ọ bụ inwe obi ilu mgbe anyị nwere okwukwe na Jehova ga-edozi okwu mgbe oge ya ruru.—Ndị Rom 12:17-19.
Mee Ihe Nile I Nwere Ike Ime n’Ọnọdụ Gị
Ihe nke abụọ anyị pụrụ ịmụta bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ọnọdụ anyị bibie ndụ anyị. Anyị pụrụ ịnọ nnọọ na-eche banyere ihe ndị anyị na-apụghị ime nke na anyị agaghị ahụ ihe ndị anyị pụrụ ime. Ọnọdụ anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-amalite ịchịkwa anyị. Nke a gaara eme Josef. Kama ikwe ka nke ahụ mee ya, o họọrọ ime ihe nile o nwere ike ime n’ọnọdụ ya. Mgbe ọ na-eje ozi dị ka ohu, Josef “wee hụta amara n’ihu [nna ya ukwu], wee jeere ya ozi: o mee ya onye na-elekọta ụlọ ya anya.” Josef mekwara otu ihe ahụ mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi ngọzi Jehova na ịdị uchu Josef, “onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ wee tinye n’aka Josef ndị mkpọrọ nile ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ; ihe ọ bụla ha na-emekwa n’ebe ahụ, ya onwe ya bụ onye na-eme ya.”—Jenesis 39:4, 21-23.
N’afọ ndị Devid biri ndụ dị ka onye na-agba ọsọ ndụ, ya onwe ya mere ihe nile o nwere ike ime n’ọnọdụ ya. Mgbe o bi n’ịkpa Peran, ya na ndị ikom ya chebere ìgwè atụrụ Nebal pụọ n’aka usuu ndị na-apụnara mmadụ ihe. “Ha bụụrụ anyị mgbidi ma abalị ma ehihie,” ka otu n’ime ndị ọzụzụ atụrụ Nebal kwuru. (1 Samuel 25:16) Ka e mesịrị, mgbe ọ nọ na Ziklag, Devid wakporo ma kwakọrọ ihe n’obodo ndị dị n’aka ndị iro Izrel n’ebe ndịda, si otú a chebe ókèala Juda.—1 Samuel 27:8; 1 Ihe E Mere 12:20-22.
Ọ̀ dị anyị mkpa itinyekwu mgbalị iji na-eme ihe nile anyị nwere ike ime n’ọnọdụ anyị? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ime otú ahụ, anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. N’ịtụgharị uche ná ndụ ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Amụtawo m, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya, inwe afọ ojuju. . . . N’ihe ọ bụla nakwa n’ọnọdụ nile amụtawo m ma ụzọ isi nọrọ n’ùjú ma ụzọ isi nọrọ n’agụụ, ma ụzọ isi nwee ihe n’ụba ma ụzọ isi nọrọ n’ụkọ.” Olee otú Pọl si malite ile ndụ anya otú a? Site n’ịnọgide na-adabere n’ebe Jehova nọ. O kwetara, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:11-13.
Chere Jehova
Ihe mmụta nke atọ bụ na kama iji ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị gbanwee ọnọdụ anyị, anyị kwesịrị ichere Jehova. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:4) Anyị kwesịrị ikwe ka ntachi obi “rụzuo ọrụ ya” site n’anyị ikwe ka ọnwụnwa ruo n’ọgwụgwụ ya n’ejighị ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị weta ya ná njedebe ngwa ngwa. Mgbe ahụ, a ga-anwale ma nụchaa okwukwe anyị, a ga-ekpughekwa ikike o nwere ịkwagide anyị. Josef na Devid nwere ụdị ntachi obi a. Ha anwaghị ịchọ ihe ngwọta nke pụrụ ịkpasu Jehova iwe. Kama nke ahụ, ha mere ihe nile ha nwere ike ime n’ọnọdụ ha. Ha cheere Jehova, leekwa ngọzi ndị ha nwetara n’ihi ime otú ahụ! Jehova ji ha abụọ napụta ma duo ndị ya.—Jenesis 41:39-41; 45:5; 2 Samuel 5:4, 5.
Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịdaba n’ọnọdụ ndị pụrụ ime ka a nwaa anyị ịchọ ihe ngwọta ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-enwe nkụda mmụọ n’ihi na ị chọtabeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị? Ya bụrụ otú ahụ, zere ọchịchọ nke 1 Ndị Kọrint 7:39) Ị̀ na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị? Kama inwe mmụọ nke ụwa bụ́ nke na-agba ndị mmadụ ume ikewa na ịgba alụkwaghịm, gị na di ma ọ bụ nwunye gị rụkọọ ọrụ ọnụ iji merie ihe isi ike ndị ahụ. (Malakaị 2:16; Ndị Efesọs 5:21-33) Ọ̀ na-esiri gị ike ilekọta ezinụlọ gị n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba gị? Ichere Jehova na-agụnye izere ime ihe ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ ihe ndị iwu na-akwadoghị iji gbalịa inweta ego. (Abụ Ọma 37:25; Ndị Hibru 13:18) Ee, anyị nile aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji mee ihe nile anyị nwere ike ime n’ọnọdụ anyị ma tinye mgbalị iji nye Jehova ihe ọ ga-agọzi. Ka anyị na-eme otú ahụ, ka anyị kpebisie ike ichere Jehova maka ihe ngwọta kasị mma.—Maịka 7:7.
inupụrụ iwu Chineke nke ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị” isi. (Jehova Ga-akwagide Gị
Ịtụgharị uche n’otú ndị e kwuru okwu ha na Bible dị ka Josef na Devid si nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ndakpọ olileanya na ọnọdụ ndị siri ike pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ebe anyị nọ. Ọ bụ ezie na a kọrọ akụkọ ha nanị na peeji ole na ole nke Bible, ule ha were ọtụtụ afọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ndị ohu Chineke dị otú ahụ si nagide ọnọdụ ha? Olee otú ha si nọgide na-enwe ọṅụ? Olee àgwà ndị ha na-aghaghị ịzụlite?’
Anyị pụkwara irite uru site n’ịtụle ntachi obi nke ndị ohu Jehova nke oge a. (1 Pita 5:9) Magazin Ụlọ Nche na Teta! na-enwe ọtụtụ akụkọ ndụ kwa afọ. Ị̀ na-agụ ma na-atụgharị uche n’ihe nlereanya nke Ndị Kraịst a na-ekwesị ntụkwasị obi? Tụkwasị na nke ahụ, n’ọgbakọ anyị dịgasị iche iche, e nwere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọnọdụ ọjọọ. Ị̀ na-eso ha akpachi anya ma na-amụta ihe site n’aka ha ná nzukọ ọgbakọ?—Ndị Hibru 10:24, 25.
Mgbe ọnọdụ ndị siri ike na-eche gị ihu, jide n’aka na Jehova na-eche banyere gị, na ọ ga-akwagidekwa gị. (1 Pita 5:6-10) Gbalisie ike ịghara ikwe ka ọnọdụ gị na-achịkwa ndụ gị. Gbasoo ihe nlereanya nke Josef, Devid na ndị ọzọ site n’ịghara ibu iwe n’obi, site n’ime ihe nile i nwere ike ime n’ọnọdụ gị, na site n’ichere Jehova maka ihe ngwọta kasị mma. Bịaruo ya nso site n’ekpere na ihe omume ime mmụọ. N’ụzọ dị otú a, gị onwe gị kwa ga-ahụ na ị pụrụ inwe ọṅụ na obi ụtọ ọbụna n’oge ihe isi ike.—Abụ Ọma 34:8.
[Foto dị na peeji nke 20, 21]
Josef rụrụ ọrụ iji mee ihe nile o nwere ike ime n’ọnọdụ ya
[Foto dị na peeji nke 23]
Devid cheere Jehova maka ihe ngwọta kasị mma nye nsogbu ya