Ọrụ Ebube Jizọs—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?
Ọrụ Ebube Jizọs—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ịmụta?
Ọ PỤRỤ iju gị anya ịmata na ihe ndekọ Bible banyere ndụ Jizọs n’ụwa adịghị mgbe o jiri okwu Grik e ji mee ihe maka “ọrụ ebube” mee ihe. Okwu Grik bụ́ (dyʹna·mis) a sụgharịrị mgbe ụfọdụ ịbụ “ọrụ ebube” pụtara n’ụzọ nkịtị “ike.” (Luk 8:46) A pụkwara ịsụgharị ya ịbụ “ikike” ma ọ bụ ‘ọrụ ndị dị ike.’ (Matiu 11:20; 25:15) Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, okwu Grik a “na-emesi ike ọrụ dị ike a rụworo, nakwa, karịsịa, ike e ji rụọ ya. A kọwara ihe omume ahụ dị ka ike Chineke nọ n’ọrụ.”
A na-asụgharịkarị okwu Grik ọzọ bụ́ (teʹras) ịbụ “ihe àmà” ma ọ bụ “ihe ijuanya.” (Jọn 4:48; Ọrụ 2:19) Okwu a na-egosipụta mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ ndị na-ekiri ya. Ọtụtụ mgbe, ọrụ Jizọs ndị dị ike na-eju ìgwè mmadụ na ndị na-eso ụzọ ya anya.—Mak 2:12; 4:41; 6:51; Luk 9:43.
Okwu Grik nke atọ (se·meiʹon) nke na-ezo aka n’ọrụ ebube Jizọs pụtara “ihe ịrịba ama.” Ọ “na-elekwasị anya n’ihe ka mkpa ọrụ ebube ahụ pụtara,” ka ọkà mmụta bụ́ Robert Deffinbaugh na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe ịrịba ama bụ ọrụ ebube nke na-ekpughe eziokwu banyere Onyenwe anyị Jizọs.”
Mmegharị Anya Ka Ọ̀ Bụ Ike Sitere n’Aka Chineke?
Bible akọwaghị ọrụ ebube Jizọs dị ka aghụghọ ma ọ bụ ihe mmegharị anya ndị e mere iji mee ndị mmadụ obi ụtọ. Ha bụ ngosipụta nke “ike dị ukwuu nke Chineke,” dị ka ọ pụtara ìhè n’ihe banyere nwata nwoke Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ. (Luk 9:37-43) Ụdị ọrụ ndị dị ike dị otú ahụ hà ga-abụ ihe na-agaghị ekwe Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile—Onye a kọwara na ọ ‘bara ụba n’ike’—omume? (Aịsaịa 40:26) Ọ dịghị ma ọlị!
Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-ezo aka n’ihe dị ka ọrụ ebube 35 nke Jizọs. Ma e kwughị ọrụ ebube ole ọ rụrụ. Dị ka ihe atụ, Matiu 14:14 na-ekwu, sị: “Ọ [Jizọs] hụrụ oké ìgwè mmadụ; o wee nwee ọmịiko n’ahụ́ ha, o wee gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa.” A gwaghị anyị ndị ọrịa ole ọ gwọrọ n’oge ahụ.
Ọrụ ndị dị ike dị otú ahụ dị mkpa iji nwapụta ihe Jizọs kwuru bụ́ na ya bụ Ọkpara Chineke, Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. Akwụkwọ Nsọ gosiri n’ezie na ike sitere n’aka Chineke nyeere Jizọs aka ịrụ ọrụ ebube. Pita onyeozi zoro aka n’ebe Jizọs nọ dị ka “nwoke nke Chineke gosiri unu n’ihu ọha site n’ọrụ ndị dị ike na ihe àmà ndị dị ebube na ihe ịrịba ama ndị Chineke mere site n’aka ya n’etiti unu, dị nnọọ ka unu onwe unu maara.” (Ọrụ 2:22) N’oge ọzọ, Pita kwupụtara na ‘Chineke jiri mmụọ nsọ na ike tee Jizọs mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị nile Ekwensu na-emekpọ ọnụ; n’ihi na Chineke nọnyeere ya.’—Ọrụ 10:37, 38.
Ọrụ ebube Jizọs na ozi ya nwere njikọ chiri anya. Mak 1:21-27 na-ekpughe mmeghachi omume nke ìgwè mmadụ n’ozizi Jizọs na n’otu n’ime ọrụ ebube ndị ọ rụrụ. Mak 1:22 na-ekwu na ‘ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya,’ amaokwu nke 27 na-emekwa ka ọ pụta ìhè na ‘o juru ndị ahụ anya’ mgbe ọ chụpụrụ otu mmụọ ọjọọ. Ma ọrụ ndị dị ike Jizọs rụrụ ma ozizi ya nyere ihe nnwapụta na ọ bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa.
Ọ bụghị nanị na Jizọs kwuru na ya bụ Mezaịa ahụ; tinyere okwu ya na ọrụ ya ndị ọzọ, ike Chineke nyere ya nke e gosipụtara n’ọrụ ebube ya gbara akaebe nye ịbụ Mezaịa ya. Mgbe ajụjụ banyere ọrụ ya na ike ya bilitere, Jizọs ji obi ike zaghachi, sị: “M nwere àmà ka nke Jọn [Onye Na-eme Baptizim] ukwuu, n’ihi na ọrụ ndị ahụ Nna m kenyere m ịrụzu, bụ́ ọrụ ndị ahụ m na-arụ, na-agba àmà banyere m na Nna m zitere m.”—Jọn 5:36.
Ihe Ndị Na-egosi na Ha Mere Eme
N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọrụ ebube Jizọs mere eme n’ezie? Tụlee ihe ụfọdụ na-egosi na ha mere eme.
Ka ọ na-arụ ọrụ ndị dị ike, Jizọs adịghị mgbe ọ dọọrọ uche ndị mmadụ gaa n’onwe ya. Ọ hụrụ na e nyere Chineke otuto site n’ọrụ ebube ọ bụla ọ rụrụ. Dị ka ihe atụ, tupu ya agwọọ otu nwoke kpuru ìsì, Jizọs mesiri ya ike na a ga-agwọ ya “ka e wee mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè n’ebe ọ nọ.”—Jọn 9:1-3; 11:1-4.
N’adịghị ka ndị mmegharị anya, ndị majik, na ndị ji okwukwe agwọ ọrịa, Jizọs adịghị mgbe o ji ọgwụ kechie ndị mmadụ, ọ dịghị mgbe o ji aghụghọ, ihe ngosi ndị na-adọrọ adọrọ, majik, ma ọ bụ mmetụta uche ndị mmadụ mee ihe. O jighị nkwenkwe ụgha ma ọ bụ ihe onwunwe ndị senti mee ihe. Rịba ama otú Jizọs si gwọọ ndị ikom abụọ kpuru ìsì n’emeghị oké ngosi. “N’ịbụ onye nwere ọmịiko,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “Jizọs bitụrụ anya ha aka, ozugbo ahụkwa ha hụrụ ụzọ, ha wee soro ya.” (Matiu 20:29-34) Ọ dịghị ememe okpukpe ma ọ bụ ihe ngosi nke ahụ gụnyere. Jizọs rụrụ ọrụ ebube ya n’ihu ọha, ọtụtụ mgbe n’ebe ọtụtụ mmadụ hụrụ ya. O jighị ọkụ pụrụ iche, nnukwu ikpo okwu, ma ọ bụ ihe ndị e ji eme ihe n’ikpo okwu mee ihe. N’ụzọ dị iche, ọtụtụ mgbe, a dịghị enwe ike idetu ihe ndị a sịrị na ha bụ ọrụ ebube nke oge a edetu.—Mak 5:24-29; Luk 7:11-15.
Mgbe ụfọdụ, Jizọs kwetara na ndị ritere uru n’ọrụ ebube ya nwere okwukwe. Ma enweghị okwukwe nke mmadụ egbochighị Jizọs ịrụ ọrụ ebube. Mgbe ọ nọ na Kapaniọm nke Galili, “ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ ji; o wee were okwu ọnụ chụpụ ndị mmụọ ahụ, ọ gwọkwara ndị nile ahụ́ na-adịghị mma.”—Matiu 8:16.
Jizọs rụrụ ọrụ ebube iji gboo mkpa anụ ahụ́ ndị mmadụ nwere n’ezie, ọ bụghị iji mejuo ọchịchọ ịmata ihe nke mmadụ. (Mak 10:46-52; Luk 23:8) Jizọs arụghịkwa ọrụ ebube iji nwetara onwe ya uru n’ụzọ ọ bụla.—Matiu 4:2-4; 10:8.
Gịnị Banyere Ihe Ndekọ Oziọma Ndị Ahụ?
E mere ka anyị mata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ọrụ ebube Jizọs site n’ihe ndekọ Oziọma anọ ahụ. È nwere ihe ndị mere anyị ga-eji dabere n’ihe ndekọ ndị a ka anyị na-enyocha ma ọrụ ebube ndị a sịrị na Jizọs rụrụ hà mere eme? Ee, e nwere.
Dị ka e kwuworo, Jizọs rụrụ ọrụ ebube ya n’ihu ọha, n’ebe ọtụtụ mmadụ hụrụ ya. E dekọrọ Oziọma ndị mbụ mgbe ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ji anya ha hụ ihe ndị ahụ merenụ ka nọ ndụ. N’ikwu banyere ime ihe n’eziokwu nke ndị dere Oziọma ndị ahụ, akwụkwọ bụ́ The Miracles and the Resurrection na-ekwu, sị: “Ibo ndị dere Oziọma ahụ ebubo na ha ji nnọọ akụkọ nke ọtụtụ ọrụ ebube na-emeghị eme zochie eziokwu nke akụkọ ihe mere eme iji kpọsaa okpukpe ha ga-abụ nnọọ ihe na-ezighị ezi. . . . Ha bu n’uche ịbụ ndị ndekọ na-ekwu eziokwu.”
Ndị Juu na-emegide Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ha gbaghara ọrụ ndị dị ike a kọwara n’Oziọma ndị ahụ. Nanị ihe ha gbaghara bụ ike e ji rụọ ha. (Mak 3:22-26) Ndị nkatọ e nwere ka oge na-aga enweghịkwa ihe ịga nke ọma n’ịgọnahụ ọrụ ebube Jizọs. N’ụzọ dị iche, na narị afọ nke mbụ na nke abụọ O.A., e nwere ihe ndị na-ezo aka n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ. N’ụzọ doro anya, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji lee ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nke ọrụ ebube ya anya dị ka ihe ndị mere eme.
Onye Rụrụ Ọrụ Ebube Ndị Ahụ
Nnyocha nke ọrụ ebube Jizọs ga-abụ ihe na-ezughị ezu ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị arụmụka ezi uche dị na ya ka e ji mata na ha mere eme. N’ịkọwa ọrụ ndị dị ike Jizọs rụrụ, Oziọma ndị ahụ kpughere ya dị ka nwoke nwere mmetụta miri emi na ọmịiko na-enweghị oyiri, nke nwere mmasị miri emi n’ọdịmma ụmụ mmadụ ibe ya.
Tụlee ihe banyere onye ekpenta bịakwutere Jizọs na-arịọsi ya arịrịọ ike, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” ‘N’ịbụ onye nwere ọmịiko,’ Jizọs matịrị aka ya bitụ onye ekpenta ahụ aka, wee sị ya: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” A gwọrọ nwoke ahụ ozugbo. (Mak 1:40-42) Jizọs si otú a gosipụta ọmịiko nke kpaliri ya iji ike sitere n’aka Chineke arụ ọrụ ebube.
Gịnị mere mgbe Jizọs zutere ndị na-aga ili ozu si n’obodo Nen na-apụta? Nwa okorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ nanị nwa nwoke nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ nwere. ‘N’ịbụ onye nwere ọmịiko’ maka nwanyị ahụ, Jizọs gakwuuru ya ma sị ya: “Kwụsị ịkwa ákwá.” Mgbe ahụ, ọ kpọlitere nwa nwanyị ahụ.—Luk 7:11-15.
Ihe mmụta na-akasi obi a pụrụ inweta n’ọrụ ebube Jizọs bụ na “o nwere ọmịiko” ma mee ihe iji nyere ndị mmadụ aka. Ma ọrụ ebube ndị ahụ abụghị nanị akụkọ ihe mere eme. “Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ ụnyaahụ na taa, nakwa ruo mgbe ebighị ebi,” ka Ndị Hibru 13:8 na-ekwu. Ọ na-achị achị ugbu a dị ka Eze eluigwe, dị njikere ma nwee ike iji ike ịrụ ọrụ ebube ya sitere n’aka Chineke mee ihe n’ụzọ dị ukwuu karịa ka o mere mgbe ọ nọ n’ụwa dị ka mmadụ. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji ya eme ihe iji gwọọ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụtakwu banyere atụmanya a na-egbukepụ egbukepụ maka ọdịnihu.
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Ọrụ ebube Jizọs bụ ngosipụta nke “ike dị ukwuu nke Chineke”
[Foto dị na peeji nke 7]
Jizọs bụ nwoke nwere mmetụta miri emi