Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Mere Eme Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?
Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Mere Eme Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?
“NDỊ mmadụ kpọtaara ya [Jizọs Kraịst] ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ ji; o wee were okwu ọnụ chụpụ ndị mmụọ ahụ, ọ gwọkwara ndị nile ahụ́ na-adịghị mma.” (Matiu 8:16) “O [Jizọs] biliri wee baara ifufe ahụ mba ma gwa oké osimiri ahụ, sị: ‘Shịị! Daa jụụ!’ Ifufe ahụ wee dajụọ, ebe nile wee daa jụụ.” (Mak 4:39) Olee otú i si ele okwu ndị a anya? Ì kweere na ha na-akọwa ihe ndị mere eme n’ezie, ka ị̀ na-eche na ha bụ akụkọ ifo, akụkọ ọdịbendị nkịtị na-emeghị eme?
Ọtụtụ ndị taa na-enwe nnọọ obi abụọ ma ọrụ ebube Jizọs hà mere eme n’ezie. Ọgbọ a nke teliskop na microscope, nke nnyocha mbara igwe na nke mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa, yiri ka ọ naghị ekwe ndị mmadụ ikwere akụkọ nke ọrụ ebube na ihe ijuanya ndị sitere n’aka Chineke.
Ụfọdụ na-eche na ihe ndekọ nke ọrụ ebube bụ ihe ndị e chepụtara echepụta ma ọ bụ akụkọ ifo. Dị ka onye edemede nke otu akwụkwọ na-azọrọ na ya na-atụle ihe banyere “ezigbo” Jizọs si kwuo, akụkọ banyere ọrụ ebube Kraịst adịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị “ihe ndị e ji adọta ndị mmadụ” n’Iso Ụzọ Kraịst.
Ndị ọzọ na-ele ọrụ ebube Jizọs anya dị ka wayo chara acha. A na-ekwu mgbe ụfọdụ na Jizọs n’onwe ya na-aghọgbu ndị mmadụ. Dị ka Justin Martyr nke narị afọ nke abụọ O.A., si kwuo, ndị na-akatọ Jizọs “ọbụna kara anya kpọọ ya onye majik
na onye na-aghọgbu ndị mmadụ.” Ụfọdụ na-azọrọ na Jizọs “arụghị ọrụ ebube ya dị ka onye amụma ndị Juu, kama dị ka onye majik, onye a zụrụ n’ụlọ arụsị.”Ịkọwa Ihe Na-apụghị Ime Eme
Ị pụrụ iche na obi abụọ ndị dị otú ahụ na-ekpughe otu isi ihe mere ndị mmadụ na-ejighị ekwetacha n’ọrụ ebube. Ọ na-esiri ha nnọọ ike, ọbụna bụrụ ihe na-apụghị ikwe ha omume ịnabata echiche bụ́ na a pụrụ inwe ikike ndị karịrị nke mmadụ bụ́ ndị nọ n’ọrụ. “Ihe m ma bụ na e nweghị ihe dị ka ọrụ ebube,” ka otu onye na-eto eto kpọrọ onwe ya onye na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị kwuru. Mgbe ahụ, o hotara ihe ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 18 bụ́ onye Scotland bụ́ David Hume kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ọrụ ebube megidere iwu okike.”
Otú ọ dị, ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ike ikwubi na ihe ịtụnanya ụfọdụ bụ ihe na-apụghị ikwe omume. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akpọ ọrụ ebube “ihe omume a na-apụghị iji iwu okike ndị a maara kọwaa.” Dabere ná nkọwa ahụ, ịga na mbara igwe, iji telifon na-enweghị eriri akparịta ụka, ịdabere n’ígwè satellite na-eme njem gaara eyi “ọrụ ebube” n’anya ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nanị otu narị afọ gara aga. N’ezie, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwu na ọrụ ebube bụ ihe na-apụghị ikwe omume nanị n’ihi na anyị apụghị ịkọwa ha dabere n’ihe ọmụma nke oge a.
Ọ bụrụ na anyị enyochaa ụfọdụ ihe àmà ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị metụtara ọrụ ebube ndị a sịrị na Jizọs Kraịst rụrụ, gịnị ka anyị ga-achọpụta? Ọrụ ebube Jizọs hà bụ ihe mere eme ka hà bụ akụkọ ifo?