Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agụmakwụkwọ Dịruru Ogologo Ndụ M Nile

Agụmakwụkwọ Dịruru Ogologo Ndụ M Nile

Akụkọ Ndụ

Agụmakwụkwọ Dịruru Ogologo Ndụ M Nile

DỊ KA HAROLD GLUYAS SI KỌỌ

Anọgidere m na-echeta otu ihe osise m hụrụ mgbe m ka bụ nwatakịrị ruo ihe karịrị afọ 70. Anọ m ọdụ na kichin mama m, na-ele otu ihe a mapawara n’ahụ́ otu tii nke a kpọrọ “Ceylon Tea.” O nwekwara ihe osise nke ụmụ nwanyị na-akpa akwụkwọ tii n’ubi akwụkwọ ndụ jupụtara nke dị na Ceylon (nke bụzi Sri Lanka). Ebe a, bụ́ nke dị nnọọ anya site n’ebe obibi anyị bụ́ ala kpọrọ nkụ nke dị n’Ebe Ndịda Australia, kpaliri m iche echiche. Lee mba mara mma ma na-akpali akpali Ceylon na-aghaghị ịbụ! Amaghị m na m ga-anọ afọ 45 nke ndụ m dị ka onye ozi ala ọzọ n’agwaetiti ahụ mara mma.

N’April 1922, a mụpụtara m n’ụwa nke dị nnọọ iche n’ụwa nke taa. Ezinụlọ m na-arụ ọrụ n’ubi mkpụrụ akụ́kụ́ na-ada owu nke dị nso n’obodo nta dịpụrụ adịpụ bụ́ Kimba, nke dị n’etiti nnukwu kọntinent Australia nakwa n’ọnụ ọnụ ebe ndịda nke ọzara ukwu ahụ dịpụrụ adịpụ. Ndụ jupụtara n’ihe ize ndụ, na-agụnye oké ọkọchị a na-enwe mgbe mgbe, ihe otiti nke ụmụ ahụhụ, na oké okpomọkụ. Mama m rụsiri ọrụ ike iji lekọta anyị ụmụaka isii na papa anyị n’ebe obibi dị n’ime ọhịa nke a ga-akpọ bacha.

Otú ọ dị, nye m, ebe ahụ dịpụrụ adịpụ bụ ebe e nwere nnwere onwe na ebe na-akpali akpali. M na-echeta ibobo na-anwụ m n’ahụ́ dị ka onye na-eto eto ịhụ ìgwè oké ehi siri ike ka ha na-abụpụsị obere osisi n’ọhịa, ma ọ bụ oké ifufe na-eji uzuzu ekpuchi obodo nta ahụ. Ya mere, agụmakwụkwọ m malitere ogologo oge tupu mụ amalite ịga obere ụlọ akwụkwọ nwere nanị otu onye nkụzi nke dị kilomita ise site n’ụlọ anyị.

Ndị mụrụ m ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ha gara chọọchị—n’ụzọ bụ́ isi n’ihi ịdị anya nke ubi anyị site n’obodo. Ka o sina dị, ná mmalite nke afọ ndị 1930, mama m malitere ige okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible bụ́ ndị Ọkàikpe Rutherford na-ekwu, bụ́ ndị a na-akpọsa kwa izu n’ụlọ ọrụ redio dị n’Adelaide. Echere m na Ọkàikpe Rutherford bụ onye okwuchukwu si Adelaide, enwechaghịkwa m mmasị na ya. Ma kwa izu mama m na-eji ịnụ ọkụ n’obi echere okwu Rutherford ma na-ege ntị nke ọma ka olu ya na-adapụta na redio mgbe ochie anyị e ji batrị akpọ.

N’otu ehihie na-ekpo ọkụ na nke uzuzu jupụtara, otu ụgbọala pikọp ochie kwụsịrị n’ihu ụlọ anyị, ndị ikom abụọ jiri ejiji nke ọma si na ya pụta. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Mama m gere ntị n’ozi ha ma nye onyinye iji nweta ọtụtụ akwụkwọ, bụ́ ndị ọ malitere ịgụ ozugbo. Akwụkwọ dị ahụ nwere nnọọ mmetụta miri emi n’ahụ́ ya nke na n’oge na-adịghị anya, ọ gwara papa m ka ọ kwọga ya ebe ndị agbata obi anyị ka o wee nwee ike ịgwa ha banyere ihe ọ na-amụ.

Abamuru nke Mmetụta Ndị Ziri Ezi

N’oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, ọnọdụ siri ike nke ebe ahụ dịpụrụ adịpụ manyere anyị ịkwaga n’obodo Adelaide, nke dị kilomita 500. Ezinụlọ anyị malitere iso Ọgbakọ Adelaide nke Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta na inwe ọganihu ime mmụọ. Nkwapụ anyị mekwara ka m kwụsị ịga akwụkwọ. Agụchara m akwụkwọ mgbe m dị nanị afọ 13, mgbe m gụsịrị klas nke mbụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Abụ m onye na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe, bụ́ nke pụworo ịdọpụ m ná nchụso nke ihe ime mmụọ ma e wezụga enyemaka m nwetara n’aka ezi ụmụnna—ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile—bụ́ ndị gosiri mmasị n’ebe m nọ.

Ka oge na-aga, mmetụta nke ụmụnna a na-anụ ọkụ n’obi kpaliri ọnọdụ ime mmụọ na-apụtabeghị ìhè dị n’ime m. Ọ na-atọ m ụtọ ịnọnyere ha, mmụọ nke ịrụsi ọrụ ike ha na-amasịkwa m. Ya mere, mgbe a mara ọkwa na-agba ndị mmadụ ume ịbanye n’ozi oge nile n’otu mgbakọ e nwere n’Adelaide na 1940, emere m ihe tụrụ mụ onwe m n’anya site n’idebanye aha m. E mebedịghị m baptizim mgbe ahụ, enwechaghịkwa m ahụmahụ n’ịgba àmà. Otú o sina dị, ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, a kpọrọ m ịbịa sonyere otu ìgwè nta nke ndị ọsụ ụzọ na Warrnambool, obodo dị ọtụtụ narị kilomita site n’Adelaide, na steeti Victoria anyị na ya gbara.

N’agbanyeghị mmalite a na-esichaghị n’obi, n’oge na-adịghị anya, amalitere m inwe nnọọ mmasị n’ozi ubi, mmasị nke m nwere obi ụtọ ikwu na o belatabeghị kemgbe ọtụtụ afọ ndị a. N’ezie, nke ahụ gbanwere m, amalitekwara m inwe ọganihu ime mmụọ. Amụtara m uru dị n’ịbịaru ndị nwere mmasị n’ihe ime mmụọ nso. Achọpụtara m otú ezi mmetụta ha pụrụ isi mee ka anyị na-eme ike anyị nile n’agbanyeghị agụmakwụkwọ anyị nakwa otú ihe ndị anyị mụtara pụrụ isi baara anyị uru ruo ogologo ndụ anyị.

Onye Ọnwụnwa Wusiri Ike

Ọ dịbeghị anya m malitere ije ozi dị ka ọsụ ụzọ mgbe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. N’ejighị n’aka ihe m kwesịrị ime, achọrọ m nduzi n’aka ụmụnna, bụ́ ndị kọwaaara m na a machibidoghị ịgwa ndị mmadụ okwu banyere Bible iwu. Ya mere, mụ na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ malitere iji ozi dị mfe sitere na Bible na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Nke a wusiri m ike maka ule ndị dị n’ihu.

Ọnwa anọ ka e mesịrị, eruru m afọ 18, a kpọkwara m ịbịa jee ozi agha. Nke a nyere m ohere ịgbachitere okwukwe m n’ihu ọtụtụ ndị ọrụ agha na otu onye majie. N’oge ahụ, ihe dị ka ụmụnna 20 nọ n’ụlọ mkpọrọ Adelaide n’ihi nnọpụiche ha, esonyekwaara m ha n’oge na-adịghị anya. E nyere anyị ọrụ ike, ịgbari okwute na imezi ụzọ. Nke a nyeere m aka ịzụlite àgwà ndị dị ka ntachi obi na mkpebisi ike. Àgwà ọma na nguzosi ike anyị mesịrị mee ka ọtụtụ ndị nche ụlọ mkpọrọ na-akwanyere anyị ùgwù.

Mgbe a tọhapụrụ m ọnwa ole na ole ka e mesịrị, eriri m ezigbo nri ma maliteghachi ịsụ ụzọ. Otú ọ dị, ndị ọsụ ụzọ dị ụkọ, n’ihi ya, a jụrụ m ma m̀ ga-ejeli ozi nanị m n’ebe dịpụrụ adịpụ a na-arụ ọrụ ugbo n’Ebe Ndịda Australia. Ekwetara m ma jiri ụgbọ mmiri gaa n’Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Yorke, na-eji nanị ihe ndị m ga-eji gbaa àmà na otu ịnyịnya ígwè. Mgbe m ruru, otu ezinụlọ nwere mmasị dugara m n’otu obere ụlọ ndị ọbịa bụ́ ebe otu nwanyị nwere obiọma mesoro m omume dị ka nwa ya. N’ehihie, m na-eji ịnyịnya ígwè agba n’ụzọ uzuzu, na-eme nkwusa n’obodo nta ndị dịgasị n’ala ahụ dịịrị banye na mmiri. Iji rụzuo ebe ndị dị anya, m na-alaba na họtel ma ọ bụ n’ụlọ ndị ọbịa. N’ụzọ dị otú a, m na-eji ịnyịnya ígwè agba ọtụtụ narị kilomita ma na-enweta ahụmahụ ndị magburu onwe ha. Ọ dịghị mgbe m chegbubigara onwe m ókè banyere ije ozi nanị m, ka m na-enwetakwa nlekọta Jehova, abịarukwuru m ya nso.

Ịnagide Mmetụta nke Erughị Eru

Na 1946, anatara m akwụkwọ ozi nke e ji kpọọ m òkù ịrụ ọrụ njegharị dị ka ohu ụmụnna (nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit). Nke a gụnyere ileta ọtụtụ ọgbakọ n’otu sekit. Aghaghị m ikweta na ibu ọrụ ndị dị n’ọrụ a bụụrụ m ezigbo ihe ịma aka. Otu ụbọchị, anụrụ m ka otu nwanna nwoke na-asị, “Harold abụghị ọkà okwu, ma ọ na-eme nke ọma n’ozi ubi.” Okwu a gbara m ume nke ukwuu. Amaara m nke ọma erughị eru m n’ikwu okwu na n’ịhazi ihe, ma ekweere m na ọrụ nkwusa bụ ọrụ bụ́ isi nke Ndị Kraịst.

Na 1947, e nwere oké obi ụtọ banyere otu nleta nke Nwanna Nathan Knorr na Nwanna Milton Henschel site n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn. Nke a bụ nke mbụ a na-eme ụdị nleta ahụ kemgbe Nwanna Rutherford bịasịrị na 1938. E nwere otu mgbakọ buru ibu na Sydney n’oge nleta a. Dị ka ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ na-eto eto, enwere m mmasị n’ọzụzụ nke ndị ozi ala ọzọ bụ́ nke a na-enye na Watchtower Bible School of Gilead dị n’Ebe Ndịda Lansing, New York, U.S.A., bụ́ nke e hiwere ọhụrụ. Ọtụtụ n’ime anyị nọ ebe ahụ nọ na-eche ma ụlọ akwụkwọ ahụ ọ̀ ga-achọ mmadụ inwe agụmakwụkwọ dị elu tupu ya agaa ya. Otú ọ dị, Nwanna Knorr kọwara na ọ bụrụ na anyị pụrụ ịgụ otu isiokwu na magazin Ụlọ Nche ma cheta isi ihe ndị dị na ya, na anyị pụrụ ime nke ọma na Gilead.

Echere m na agụghị oké akwụkwọ m ga-eme ka m ghara iru eru. N’ụzọ juru m anya, ọnwa ụfọdụ ka e mesịrị, a gwara m ka m tinye akwụkwọ maka ọzụzụ Gilead. Mgbe e mesịrị, a nabatara m dị ka nwa akwụkwọ, agakwara m klas nke 16 e nwere na 1950. Nke a ghọrọ ahụmahụ magburu onwe ya nke wulitere nnọọ obi ike m. O mere ka m kweta na ime nke ọma n’agụmakwụkwọ abụghị ihe bụ́ isi dị mkpa maka inwe ihe ịga nke ọma. Kama nke ahụ, ịdị uchu na nrubeisi bụ ihe ndị bụ́ isi a chọrọ. Ndị nkụzi anyị gbara anyị ume ime ike anyị nile. Ka m gbasoro ndụmọdụ ha, anọgidere m na-enwewanye ọganihu ma nwee ike ịgbasochi ihe ọmụmụ ahụ anya.

Site na Kọntinent Kpọrọ Nkụ Gaa n’Agwaetiti Mara Mma

Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ, e zigara mụ na ụmụnna nwoke abụọ ọzọ si Australia na Ceylon (nke bụzi Sri Lanka). Anyị rutere n’isi obodo ya, bụ́ Colombo, na September 1951. Ọ bụ obodo na-ekpo ọkụ ma dị udè, e nwekwara ọtụtụ ihe ọhụrụ, ụda, na ísì ọma. Ka anyị si n’ụgbọ mmiri rịtuo, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ nọworo na-eje ozi ná mba ahụ jiri mpempe akwụkwọ na-akpọsa okwu ihu ọha a ga-ekwu na Sunday na-esonụ n’ámá obodo ahụ nabata m. N’ụzọ juru m anya, aha m dị ná mpempe akwụkwọ ahụ dị ka ọkà okwu! Ụjọ jidere m. Ma afọ ndị m jiworo sụọ ụzọ n’Australia kụziiri m ịnakwere ọrụ ọ bụla e nyere m. N’ihi ya, site n’enyemaka Jehova, ekwuru m okwu ihu ọha ahụ n’ụzọ gara nke ọma. Anyị atọ na ụmụnna nwoke anọ na-alụbeghị nwanyị nọ anọ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Colombo n’oge ahụ malitere ịmụ asụsụ Sinhala bụ́ nke siri ike mmụta na ije ozi ubi. Ọtụtụ mgbe, anyị na-arụ nanị anyị, anyị nwekwara obi ụtọ na ndị obodo ahụ nwere nkwanye ùgwù ma na-eleta ndị ọbịa. N’oge na-adịghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ malitere ito.

Ka oge na-aga, amalitere m ichesi echiche ike banyere otu nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ mara mma, bụ́ Sybil, bụ́ onye m zutere mgbe m ji ụgbọ mmiri na-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ọ na-aga mgbakọ mba nile na New York. Ka e mesịrị, ọ gara klas nke 21 nke Gilead, e zigakwara ya Hong Kong na 1953. Ekpebiri m idegara ya akwụkwọ ozi, anyị nọgidekwara na-ederịta akwụkwọ ozi ruo 1955 bụ́ mgbe Sybil sonyeere m na Ceylon, bụ́ ebe anyị lụrụ.

Ebe mbụ e kenyekọrọ anyị ọrụ dị ka di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ bụ Jaffna, obodo dị n’ebe ugwu Sri Lanka. N’etiti afọ ndị 1950, nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị malitere ikewasị ndị Sinhala na ndị Tamil, na-atọ ntọala maka agha a ga-alụ n’iri afọ ndị na-abịanụ. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka Ndịàmà bụ́ ndị Sinhala na ndị Tamil nọ na-echeberịta onwe ha ruo ọtụtụ ọnwa n’afọ ndị ahụ siri ike! Ọnwụnwa ndị a nụchara ma wusie okwukwe ụmụnna ike.

Ime Nkwusa na Izi Ihe na Sri Lanka

Ime ka ibi n’ógbè ndị Hindu na ndị Alakụba mara anyị ahụ́ chọrọ ndidi na nnọgidesi ike. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị bịara ghọta ọdịbendị abụọ ahụ na àgwà ha ndị magburu onwe ha. Ebe ọ bụ na a dịghị ahụkebe ndị ala ọzọ n’ụgbọ njem ọha na eze, ndị mmadụ na-ejikarị mgbagwoju anya ekiri anyị mgbe anyị bara ha. Sybil kpebiri na ya ga na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe ọ bụla nke ahụ mere. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka ndị ahụ ji ijuanya na-ekiri anyị mụmụkwara ọnụ ọchị!

N’otu oge, a kwụsịrị anyị n’ebe a na-enyocha ndị mmadụ. Mgbe onye nche nọ n’ọrụ jụchara anyị ebe anyị si na ebe anyị na-aga, ajụjụ ya ghọwanyere nke onwe onye.

“Ònye ka nwanyị a bụ?”

“Ọ bụ nwunye m,” ka m zara.

“Afọ ole ka unu lụworo?”

“Afọ asatọ.”

“Ùnu nwere ụmụ?”

“Ee e.”

“Chineke ekwela ihe ọjọọ! Ùnu ahụla dọkịta?”

Ọchịchọ ịmata ihe a juru anyị anya na mbụ, ma ka oge na-aga, anyị ghọtara na ọ bụ ezi ngosipụta nke mmasị onwe onye ndị obodo ahụ nwere n’ebe ndị ọzọ nọ. N’ezie, ọ bụ otu n’ime àgwà ha ndị magburu onwe ha. Mmadụ agaghị anọ ogologo oge n’ámá obodo ma ghara inwe onye ga-abịakwute ya ma jiri obiọma jụọ ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ya pụrụ isi nyere ya aka.

Mgbanwe na Ileghachi Anya Azụ

Ruo ọtụtụ afọ, anyị arụwo ọrụ dịgasị iche iche tụkwasị n’ozi ala ọzọ anyị na Sri Lanka. E kenyere m ịrụ ọrụ sekit na nke distrikti tinyekwara ije ozi dị ka onye so na Kọmitii Alaka. Ka ọ na-erule 1996, anọ m n’etiti afọ ndị 70 m. M nwere ọṅụ nke ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 45 nke ozi ala ọzọ na Sri Lanka. Ná nzukọ mbụ m gara na Colombo, e nwere ihe dị ka mmadụ 20. Ọnụ ọgụgụ ahụ amụbawo ruo ihe karịrị 3,500! Mụ na Sybil lere ọtụtụ n’ime ndị a anya dị ka ụmụ na ụmụ ụmụ ime mmụọ anyị. Ka o sina dị, a ka nwere ọrụ buru ibu a ga-arụ ná mba ahụ—ọrụ nke chọrọ ume na ikike nke ndị na-akatabeghị ahụ́ ka anyị. N’iburu nke a n’uche, anyị nakweere òkù Òtù Na-achị Isi kpọrọ anyị ịlaghachi Australia. Nke a enyewo ndị di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ bụ́ ndị ruru eru ohere ịga Sri Lanka dị ka ndị ozi ala ọzọ iji nọchie anyị.

Anọ m ugbu a n’afọ nke 83 nke ndụ m, ma mụ ma Sybil nwere ọṅụ na anyị ka nwere ahụ́ ike ịnọgide n’ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo m bụ́ Adelaide. Ozi anyị na-eme ka anyị mụrụ anya n’uche ma na-eme mgbanwe. O nyewokwara anyị aka ime mgbanwe iji kwekọọ n’ụzọ ndụ dị nnọọ iche e nwere ná mba a.

Jehova anọgidewo na-egbo mkpa anụ ahụ́ anyị nile, ụmụnna nwoke na ndị nwanyị nọ n’ọgbakọ anyị na-egosikwa anyị nnọọ ịhụnanya ma na-enye anyị nkwado. N’oge na-adịbeghị anya, enwetara m ọrụ ọhụrụ. M ga-eje ozi dị ka odeakwụkwọ ọgbakọ anyị. Ya mere, achọpụtawo m na ka m na-agbalị iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, ọzụzụ m nọgidere na-aga n’ihu. N’ileghachi anya azụ n’ọtụtụ afọ ndị a, ọ na-atụ m n’anya mgbe nile na nwatakịrị na-ejighị ihe kpọrọ ihe dị ka m si n’ime ọhịa pụrụ inweta agụmakwụkwọ dị otú ahụ magburu onwe ya—nke dịruru ogologo ndụ m nile.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị, na 1955

[Foto dị na peeji nke 27]

Ka mụ na Rajan Kadirgamar, nwanna nwoke onye obodo ahụ, nọ n’ozi ubi na 1957

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na Sybil taa