Ònye Bụ Onye Ndu Kwesịrị Ekwesị Maka Oge A?
Ònye Bụ Onye Ndu Kwesịrị Ekwesị Maka Oge A?
Na 1940, e nwere ọgba aghara n’ihe banyere idu ndu ná Nzukọ Ndị Isi nke Britain. David Lloyd George nke dị afọ 77, bụ́ onye gere ntị n’arụmụka ahụ, eduruwo ndị Britain gaa ná mmeri n’Agha Ụwa Mbụ, ọtụtụ afọ ọ nọwokwara n’ọchịchị mere ka o nwee ike iji amamihe nyochaa ndị nọ n’ọkwá dị elu. N’okwu ọ gwara Òtù Ndị Omeiwu nke Britain na May 8, o kwuru, sị: “Mba a dị njikere ịchụ ihe ọ bụla n’àjà ma ọ bụrụhaala na o nwere ndị ndu, ma ọ bụrụhaala na Gọọmenti na-egosi n’ụzọ doro anya na o nwere ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụrụhaalakwa na mba a nwere obi ike na ndị ndu ya na-eme ike ha nile.”
OKWU Lloyd George na-eme ka o doo anya na ndị mmadụ na-atụ anya ka ndị ndu ha bụrụ ndị ruru eru ma jiri obi ha nile na-eme ezi mgbalị iji mee ka ihe ka mma. Otu onye ọchụnta vootu si otú a tinye ya: “Mgbe ndị mmadụ na-atụ vootu maka president, ha na-atụrụ ya onye ha na-enyefe ndụ ha, ọdịnihu ha na ụmụ ha n’aka.” Ichebe ihe ndị a e nyefere ya n’aka bụ ọrụ dị ukwuu. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?
Ụwa anyị jupụtara ná nsogbu ndị na-ekweghị ngwọta. Iji maa atụ, olee onye ndu gosiworo na ya nwere amamihe na ike nke na ọ pụrụ ikpochapụ mpụ na agha? Ònye n’ime ndị ndu nke taa nwere ihe onwunwe na ọmịiko iji nye mmadụ nile nri, mmiri dị ọcha na ezi ahụ́ ike? Ònye nwere ihe ọmụma na mkpebi siri ike ichebe gburugburu ebe obibi anyị na ime ka ọ dịghachi otú ọ dị na mbụ? Ònye ruru eru ma nwee ike zuru ezu ịhụ na ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere ogologo ndụ na nke obi ụtọ?
Ụmụ Mmadụ Agaghị Emeli Ya
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ndu enwetụla ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, ọ dịkarịa ukwuu, ha pụrụ ịchị ruo iri afọ ole na ole—ma ònyezi ga-anọchi ha? Otu n’ime ndị ndu kasị ruo eruo nke dịworo ndụ, bụ́ Eze Solomọn nke Izrel oge ochie, chebaara ajụjụ a echiche. O kwubiri, sị: “Mụ onwe m kpọkwara ndọgbu m nile asị, bụ́ nke mụ onwe m na-adọgbu onwe m n’ọrụ n’okpuru anyanwụ: n’ihi na m ga-ahapụrụ ya mmadụ nke ga-anọ mgbe m gasịrị. Ma ònye maara ma ọ̀ ga-abụ onye maara ihe ma ọ bụ onye nzuzu? ma ọ ga-achị ndọgbu m nile nke m dọgbuworo onwe m n’ọrụ, na nke m meworo n’amamihe Eklisiastis 2:18, 19.
n’okpuru anyanwụ. Nke a bụkwa ihe efu.”—Solomọn amaghị ma onye ga-anọchi ya ọ̀ ga-ewere ọrụ ọma ya gaa n’ihu ka ọ̀ ga-emebisị ha nile. Nye Solomọn, usoro nke iji ndị ndu ọhụrụ na-edochi ndị ochie bụ “ihe efu.” Nsụgharị Bible ndị ọzọ kpọrọ usoro a “ihe na-abaghị uru” ma ọ bụ “ihe na-enweghị isi.” Otu nsụgharị na-ekwu, sị: “Ọ dịghị amamihe dị na ya.”
Mgbe ụfọdụ, a na-eji ime ihe ike agbanwe ndị ndu. E gbuwokwa ndị ndu ruru eru ka ha ka nọ na-arụ ọrụ ha. Abraham Lincoln, bụ́ president United States a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu, gwara ndị na-ege ya ntị n’otu oge, sị: “A họpụtawo m ịrụ ọrụ dị mkpa ruo obere oge, n’anya unu ugbu a kwa, e nyewo m ike ga-apụ n’anya n’isi nso.” N’ezie, ọchịchị ya adịteghị aka. N’agbanyeghị ihe nile o mere na ọchịchọ ya imekwuru ndị mmadụ ihe, President Lincoln chịrị mba ya nanị afọ anọ. Ná mmalite ọchịchị ya nke ugboro abụọ, otu nwoke nke chọrọ mgbanwe ọchịchị gburu ya.
Ọbụna ndị ndu bụ́ mmadụ kasị mma apụghị iji ọdịnihu ha n’aka. Ya bụrụ otú ahụ, ì kwesịrị ịtụkwasị ha obi ichebe ọdịnihu nke gị? Bible na-ekwu, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Nsụgharị Byington tinyere akụkụ ikpeazụ nke amaokwu nke 4 otú a: “N’ụbọchị ahụ, obiọma ya nile na-ala n’iyi kpam kpam.”—Abụ Ọma 146:3, 4.
Ndụmọdụ bụ́ ịghara ịtụkwasị ndị ndu bụ́ mmadụ obi pụrụ isi ike nnakwere. Otú ọ dị, Bible adịghị ekwu na ihe a kpọrọ mmadụ agatụghị enwe ezi onye ndu, nke ga-anọgide anọgide. “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze,” ka Aịsaịa 32:1 na-ekwu. Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike mmadụ, akwadebewo “otu eze,” Onye Ndu nke ga-eweghara ọchịchị ụwa n’ụzọ zuru ezu n’oge na-adịghị anya. Ònye ka ọ bụ? Amụma Bible na-akọwa onye ọ bụ.
Onye Ruru Eru n’Ezie Idu Ndu
Puku afọ abụọ gara aga, otu mmụọ ozi gwara otu nwa agbọghọ bụ́ onye Juu aha ya bụ Meri, sị: “Ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:31-33) Ee, Jizọs nke Nazaret bụ Eze ahụ e kwuru okwu ya n’amụma Bible.
Ihe oyiyi okpukpe na-egosikarị Jizọs dị ka nwa ọhụrụ, onye na-adịghị ike nke na-adịghị eri nri ndị na-edozi ahụ́ ma ọ bụ onye na-anapụ onwe ya ihe nke na-anabata ihe ọ bụla dakwasịrị ya n’emeghị ihe ọ bụla. Ihe oyiyi ndị a adịghị eme ka mmadụ nwee obi ike n’ebe ọ nọ dị ka Onye Ọchịchị. Otú ọ dị, ezigbo Jizọs Kraịst ahụ e kwuru okwu ya na Bible tolitere ịbụ nwoke gbasiri ike, nke tozuru okè, nke na-anụ ọkụ n’obi ma na-ebute ụzọ n’ime ihe. O nwekwara àgwà ndị ọzọ mere ka o ruo eruo ịbụ onye ndu. (Luk 2:52) Ihe ndị na-esonụ bụ akụkụ ole na ole nke àgwà ya ndị pụtara ìhè.
Jizọs jigidere iguzosi ike n’ezi ihe zuru okè. Àgwà ya nke ime ihe n’eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ ruru n’ókè nke na ọ mara ndị iro ya aka n’ihu ọha ibo ya otu ebubo bụ́ eziokwu. Ha emelighị ya. (Jọn 8:46) Ozizi ya nke ihu abụọ na-adịghị na ya mere ka ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu ghọọ ụmụazụ ya.—Jọn 7:46; 8:28-30; 12:19.
Jizọs raara onwe ya nye Chineke kpam kpam. O kpebisiri nnọọ ike ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya nke na ọ dịghị onye iro—mmadụ ma ọ bụ mmụọ ọjọọ—nke pụrụ ịkwụsị ya. Mwakpo obi ọjọọ emenyeghịkwa ya ụjọ. (Luk 4:28-30) Ike ọgwụgwụ na agụụ emeghị ka o nwee nkụda mmụọ. (Jọn 4:5-16, 31-34) Ọ bụ ezie na ndị enyi ya gbahapụrụ ya, ọ dịtụghị mgbe ọ hapụrụ ihe mgbaru ọsọ ya.—Matiu 26:55, 56; Jọn 18:3-9.
Jizọs nwere mmetụta miri emi maka ndị mmadụ. O nyere ndị agụụ na-agụ nri. (Jọn 6:10, 11) Ọ kasiri ndị dara mbà obi. (Luk 7:11-15) O mere ka ndị ìsì hụ ụzọ, mee ka ndị ntị chiri nụ ihe, gwọọkwa ndị ahụ́ na-esighị ike. (Matiu 12:22; Luk 8:43-48; Jọn 9:1-6) Ọ gbara ndịozi ya na-arụsi ọrụ ike ume. (Jọn, isi 13-17) O gosiri na ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ nke ihe banyere atụrụ ya na-emetụ n’obi.—Jọn 10:11-14.
Jizọs dị njikere ịrụ ọrụ. Ọ sara ụkwụ ndịozi ya iji kụziere ha otu ihe dị mkpa. (Jọn 13:4-15) Ụkwụ nke ya rukwara unyí ka ọ na-ekwusa ozi ọma n’okporo ụzọ ndị Izrel uzuzu juru na ha. (Luk 8:1) Ọbụna mgbe ọ na-eme atụmatụ izurutụ ike “n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị,” o meghachiri omume mgbe ìgwè mmadụ chọtara ya ka o zikwuo ha ihe. (Mak 6:30-34) O si otú a setịpụrụ Ndị Kraịst nile ihe nlereanya nke ịdị uchu.—1 Jọn 2:6.
Jizọs rụzuru ọrụ ya ma hapụ ụwa. Dị ka ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi ya, Jehova Chineke chiri ya Eze ma nye ya anwụghị anwụ n’eluigwe. Banyere Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, Bible na-ekwu, sị: “Kraịst, ebe e siworo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, adịkwaghị anwụ anwụ; ọnwụ abụkwaghị nna ukwu n’ebe ọ nọ.” (Ndị Rom 6:9) Ị pụrụ ijide n’aka na ọ bụ Onye Ndu kasị mma ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inwe. Ozugbo Kraịst Jizọs malitere ịchị ụwa n’ụzọ zuru ezu, ọ gaghị adị mkpa inye onye ọ bụla ọzọ ikike, ọ gaghịzikwa adị mkpa ịgbanwe onye ndu. Ọ dịtụghị onye ga-egbu ya ka ọ na-arụ ọrụ ya, onye na-erughị eru agaghịkwa anọchi ya ma mebie ihe ọ rụrụ. Ma gịnị kpọmkwem ka ọ ga-eme maka abamuru nke ihe a kpọrọ mmadụ?
Ihe Onye Ndu Ọhụrụ A Ga-eme
Abụ Ọma nke 72 na-enye anyị nkọwa zuru ezu n’ụzọ amụma nke otú Eze a zuru okè nke na-adịghị anwụ anwụ ga-esi chịa. N’amaokwu nke 7 na nke 8, anyị na-agụ, sị: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ́ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.” N’okpuru ọchịchị ya nke ga-abara ndị mmadụ uru, ndị ga-ebi n’ụwa ga-enwe nchebe ga-adịru ebighị ebi, nke na-agaghịkwa akwụsị akwụsị. Ọ ga-ebibi ngwá agha nile e nwere ugbu a, ọ ga-ewepụkwa ọbụna ọchịchọ nke ịlụ agha n’obi ụmụ mmadụ. Ndị ahụ na-awakpo ibe ha taa dị ka ọdụm agụụ ji ma ọ bụ ndị na-eme ka anụ ọhịa bea iwe ji ga-agbanweworị àgwà ha kpam kpam. (Aịsaịa 11:1-9) Udo ga-ejupụta ebe nile.
Abụ Ọma nke 72 gakwuru n’ihu na-ekwu n’amaokwu nke 12 ruo 14, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” Ndị na-enweghị ike, ndị ogbenye na ndị e wedara n’ala ga-aghọ akụkụ nke ezinụlọ mmadụ e jikọtara ọnụ n’okpuru idu ndu nke Eze Jizọs Kraịst. A ga-eji ọṅụ, ọ bụghị ihe mgbu na obi nkoropụ, mara ndụ ha.—Aịsaịa 35:10.
Amaokwu nke 16 na-ekwe nkwa, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” Ọtụtụ nde mmadụ na-anọ agụụ mgbe nile n’ụwa taa. Ndọrọ ndọrọ ọchịchị na anyaukwu na-emekarị ka a ghara iji eleghị mmadụ anya n’ihu kenye onye ọ bụla nri ga-ezuru ya, n’ihi ya ìgwè mmadụ, karịsịa ụmụaka, na-anwụ n’agụụ. Ma n’okpuru ọchịchị Jizọs Kraịst, nsogbu a ga-apụ n’anya. A ga-eji ezigbo nri ndị dị ụtọ gọzie ụwa. Ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-eriju afọ.
Ọ̀ ga-amasị gị inweta ngọzi ndị ahụ ezi idu ndu ga-eweta? Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-agba gị ume ịmụ banyere Onye Ndu ahụ nke ga-eweghara ọchịchị ụwa nile n’ụzọ zuru ezu n’oge na-adịghị anya. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ime otú ahụ. A gaghị eme ka ihere mee gị n’ihi na Jehova Chineke n’onwe ya na-ekwu banyere Ọkpara ya, sị: “Ma mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.”—Abụ Ọma 2:6.
[Igbe dị na peeji nke 5]
NDỊ ỌCHỊCHỊ A CHỤPỤRỤ N’IKE
Dị ka ọ na-adịkarị, onye ọchịchị pụrụ ịtụ anya ka ndị ọ na-achị na-akwanyere ya ùgwù ma na-akwado ya ma ọ bụrụ na o mee ka e nwee udo na ezi ọnọdụ obibi ndụ ruo n’ókè ụfọdụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị mmadụ atụkwasịghịzi ya obi n’ihi ihe ọ bụla, onye ọzọ pụrụ ịnọchi ya n’ọkwá ọchịchị n’oge na-adịghị anya. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe atụ ụfọdụ nke ọnọdụ ndị chụpụrụ ndị ọchịchị siri ike n’ọkwá na mberede.
Ajọ ọnọdụ obibi ndụ. Ná ngwụsị nke narị afọ nke 18, a manyere ọtụtụ ụmụ amaala France ibi ndụ nke jupụtara n’ịkwụ ụtụ isi na ụkọ nri. Ọnọdụ ndị a so n’ihe ndị kpatara Mgbanwe Ọchịchị France, bụ́ nke mere e ji gbupụ Eze Louis nke Iri na Isii isi n’afọ 1793.
Agha. Agha Ụwa Mbụ wetara ọchịchị nke ụfọdụ ndị eze ukwu kasị sie ike e nweworo n’akụkọ ihe mere eme ná njedebe. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1917, ụkọ nri nke agha kpatara na St. Petersburg, Russia, kpatara Mgbanwe Ọchịchị ahụ e nwere na February. Nnupụisi a wepụrụ Eze Ukwu Nicholas nke Abụọ n’ọchịchị ma duga n’ọchịchị Kọmunist. Na November 1918, Germany chọrọ udo, ma Mba Ndị Jikọrọ Aka jụrụ ịkwụsị ịlụ agha ọ gwụla ma à gbanwere onye ọchịchị. N’ihi ya, a manyere Eze Ukwu Wilhelm nke Abụọ nke Germany ije biri na Netherlands.
Ọchịchọ nke inwe ụdị gọọmenti dị iche. Na 1989, e wepụrụ Ihe Mgbochi Ígwè ahụ. Usoro ọchịchị ndị yiri ka hà siri ike dị ka nkume dara mgbe ndị ha na-achị jụrụ Ọchịchị Kọmunist ma guzobe ụdị ọchịchị ndị ọzọ.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Jizọs nyere ndị agụụ na-agụ nri, gwọọ ndị ahụ́ na-esighị ike ma setịpụrụ Ndị Kraịst nile ezi ihe nlereanya
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Lloyd George: Foto Kurt Hutton sere/Picture Post/Getty Images