Anyị Kpebisiri Ike Ịdịnyere Ịchịisi Chineke
Akụkọ Ndụ
Anyị Kpebisiri Ike Ịdịnyere Ịchịisi Chineke
DỊ KA MICHAL ŽOBRÁK SI KỌỌ
Mgbe m nọsịrị otu ọnwa n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ, a kpụgaara m otu onye na-agba ajụjụ ọnụ. N’oge na-adịghị anya, iwe juru ya obi, o tikwara mkpu, sị: “Unu ndị nledo! Ndị nledo America!” Gịnị mere o ji wee iwe otú ahụ? Ọ ka jụsịrị okpukpe m na-ekpe, m zaakwa ya, sị: “Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.”
NKE A mere ihe karịrị ọkara otu narị afọ gara aga. N’oge ahụ, mba m bi na ya nọ n’okpuru ọchịchị ndị Kọmunist. Otú ọ dị, ogologo oge tupu mgbe ahụ, anyị enwetawo mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi ọrụ izi ihe Ndị Kraịst anyị.
Anyị Anụ Ụfụ nke Agha
Mgbe Agha Ụwa Mbụ malitere na 1914, adị m afọ asatọ. N’oge ahụ, obodo m bụ́ Zálužice, nọ n’okpuru ọchịchị onyeeze nke Alaeze Ukwu Austria na Hungary. Ọ bụghị nanị na agha ahụ kpaghasịrị ọnọdụ ụwa kamakwa o mere ka m too n’ike. Papa m, bụ́ onye agha, nwụrụ nnọọ n’afọ mbụ nke agha ahụ. Nke a mere ka mụ, mama m na ụmụnne m ndị nwanyị m tọrọ daa ogbenye ọnụ ntụ. Dị ka nwa nwoke kasị okenye n’ụlọ, n’oge na-adịghị anya, amalitere m inwe ọtụtụ ibu ọrụ n’obere ubi anyị na n’ụlọ. Eji m okpukpe kpọrọ ihe site na nwata. Onye ụkọchukwu nke Chọọchị (Calvin) E Dozigharịrị Edozigharị anyị ọbụna na-agwa m ka m rụchitere ya ọrụ ma kụziere ụmụ akwụkwọ ibe m ihe mgbe ọ na-anọghị ya.
Na 1918, Agha Ukwu ahụ biri, anyị kudakwara ume. A kwaturu Alaeze Ukwu Austria na Hungary, anyị ghọkwara ụmụ amaala
nke Republic of Czechoslovakia. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị ógbè anyị bụ́ ndị kwagaworo United States lọghachiri. Otu n’ime ha bụ Michal Petrík, bụ́ onye bịara n’obodo nta anyị na 1922. Mgbe o letara otu ezinụlọ nọ n’agbata obi anyị, a kpọkwara mụ na mama m òkù ịbịa.Ịchịisi Chineke Aghọọrọ Anyị Ihe Dị Adị
Michal bụ Onye Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, o kwukwara banyere isiokwu ndị dị mkpa dabeere na Bible bụ́ ndị kpaliri mmasị m. Nke kasịnụ n’ime ha bụ ọbịbịa nke Alaeze Jehova. (Daniel 2:44) Mgbe o kwuru na a ga-enwe nzukọ Ndị Kraịst n’obodo nta bụ́ Záhor na Sunday na-esonụ, ekpebiri m ịga. Etetara m ụra n’elekere anya anọ nke ụtụtụ ma gaa ije ihe dị ka kilomita asatọ iji ruo n’ebe nwa nwanne nne m bi iji gbazite ịnyịnya ígwè. Mgbe m dozisịrị taya ya dara afọ, agbara m kilomita 24 ọzọ iji ruo Záhor. Amaghị m ebe a ga-enwe nzukọ ahụ, ya mere, ejiri m nwayọọ nwayọọ na-agba n’otu n’ime okporo ámá ndị dị ebe ahụ. Mgbe ahụ, anụrụ m ka a na-abụ abụ Alaeze n’otu ụlọ. Obi m jupụtara n’ọṅụ. Abara m n’ụlọ ahụ ma kọwaa ihe mere m ji bịa. A kpọrọ m isonyere ezinụlọ ahụ ná nri ụtụtụ, mgbe e mesịkwara, ha kpọọrọ m gaa nzukọ ahụ. Ọ bụ ezie na aghaghị m ịgba ígwè ma gaa ije ruo kilomita 32 ọzọ iji ruo ụlọ, ike agwụghị m ma ọlị.—Aịsaịa 40:31.
Nkọwa ndị doro anya dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova na-enye dọtara mmasị m. Atụmanya nke ịnụ ụtọ ndụ zuru okè na nke na-eju afọ n’okpuru ịchịisi Chineke metụrụ m n’ahụ́. (Abụ Ọma 104:28) Ma mụ ma mama m kpebiri idegara ndị chọọchị anyị akwụkwọ ozi iji kwuo na anyị esoghịzi ha. Nke a kpalitere nnọọ esemokwu n’obodo anyị. Ụfọdụ ndị kwụsịrị ọbụna ikwunyere anyị okwu ruo oge ụfọdụ, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị na ọtụtụ Ndịàmà nọ n’ógbè anyị nwere ezi mkpakọrịta. (Matiu 5:11, 12) Oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, e mere m baptizim n’Osimiri Uh.
Ozi ahụ Aghọọ Ụzọ Ndụ Anyị
Anyị jiri ohere ọ bụla kwusaa banyere Alaeze Jehova. (Matiu 24:14) Anyị lekwasịrị anya karịsịa n’ime nkwusa a haziri ahazi na Sunday. Ndị mmadụ na-etetakarị n’isi ụtụtụ n’oge ahụ, n’ihi ya, anyị na-amalite ime nkwusa n’oge. N’ehihie, a na-enwe nzukọ ihu ọha. Ndị nkụzi Bible adịghị ejikarị ihe ndepụta eme ihe. Ha na-echebara ọnụ ọgụgụ ndị nwere mmasị bịaranụ, okpukpe ha, na ihe ndị na-enye ha nsogbu echiche.
Eziokwu Bible anyị kwusara meghere anya ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi. Oge na-adịghị anya ka e mesịrị m baptizim, emere m nkwusa n’obodo nta bụ́ Trhovište. N’otu ụlọ, agwara m otu nwanyị nwere nnọọ obiọma nke nwere omume enyi, bụ́ Oriakụ Zuzana Moskal, okwu. Ya na ndị ezinụlọ na-aga okpukpe Calvin, dị ka m gaburu. N’agbanyeghị na ọ maara Bible nke ọma, o nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dabeere na Bible ọ na-enwetabeghị azịza ha. Anyị nwere nkwurịta okwu were otu awa, enyefekwara m ya akwụkwọ bụ́ The Harp of God. *
Ndị ezinụlọ Moskal malitere ozugbo ịdị na-agụ akwụkwọ Harp ahụ n’oge nnọkọ ọgụgụ Bible ha na-enwe mgbe nile. Ezinụlọ ndị ọzọ bi n’obodo nta ahụ gosiri mmasị ma malite ịbịa nzukọ anyị. Ụkọchukwu chọọchị Calvin ha dọsiri ha aka ná ntị ike ka ha zere anyị na akwụkwọ anyị. Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nwere mmasị tụụrụ ụkọchukwu ahụ aro ka ọ bịa ná nzukọ anyị ma gbaghaa ozizi anyị n’oge nrụrịta ụka ihu ọha.
Ụkọchukwu ahụ bịara, ma o wepụtalighị otu arụmụka doro anya site na Bible iji kwado ozizi ya. Iji zọrọ onwe ya, o kwuru, sị: “Anyị apụghị ikwere ihe nile dị na Bible. Ọ bụ ụmụ mmadụ dere ya, a pụkwara ịza ajụjụ banyere okpukpe n’ụzọ dịgasị iche.” Nke a kpaliri ọtụtụ ndị ime mgbanwe. Ụfọdụ gwara ụkọchukwu ahụ na ọ bụrụ na o kweghị na Bible na ha agaghịzi na-abịa ege okwuchukwu ya. N’ihi ya, ha kwụsịrị ịga Chọọchị
Calvin, ihe dịkwa ka mmadụ 30 si n’obodo nta ahụ weere nguzo siri ike maka eziokwu Bible.Ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ ghọrọ ụzọ ndụ anyị, n’ihi ya, dị ka ị pụrụ ịtụ anya ya, anọ m na-achọ onye ibe site n’ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Otu n’ime ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ozi bụ Ján Petruška, bụ́ onye natara eziokwu ahụ na United States. Nwa ya nwanyị bụ́ Mária kpaliri mmasị m site n’ịdị njikere ịgbara onye ọ bụla àmà dị nnọọ ka nna ya. Anyị lụrụ na 1936, Mária ghọkwara onye ibe m kwesịrị ntụkwasị obi ruo afọ 50, ruo mgbe ọ nwụrụ na 1986. Na 1938 a mụrụ Eduard, bụ́ nanị nwa anyị nwere. Ma n’oge ahụ, agha ọzọ na-eru ka mmiri na Europe. Olee otú ọ ga-esi metụta ọrụ anyị?
E Lee Nnọpụiche Ndị Kraịst Anyị Ule
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere, Slovakia, bụ́ nke ghọrọ mba kwụụrụ onwe ya, nọ n’okpuru ọchịchị Nazi. Ma, ọ dịghị ihe pụtara ìhè ọchịchị mere megide Ndịàmà Jehova dị ka nzukọ. N’ezie, anyị na-arụ ọrụ anyị na nzuzo, a na-enyochakwa akwụkwọ anyị. Otú o sina dị, anyị nọgidere jiri akọ na-arụ ọrụ anyị.—Matiu 10:16.
Ka agha ahụ siwanyere ike, e debanyere aha m ije agha, ọ bụ ezie na agafeela m afọ 35. N’ihi nnọpụiche m dị ka Onye Kraịst, ajụrụ m ikere òkè n’agha. (Aịsaịa 2:2-4) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, tupu ndị ọchịchị echeta ihe ha ga-eme m, a tọhapụrụ ndị nile nọ n’afọ ndụ m.
Anyị chọpụtara na ọ bụụrụ ụmụnna anyị ndị bi n’obodo ukwu ihe ịma aka inweta ihe e ji ebi ndụ karịa ka ọ dịịrị anyị bụ́ ndị bi n’ime obodo. Anyị chọrọ isoro ha kerịta ihe anyị nwere. (2 Ndị Kọrint 8:14) N’ihi ya, anyị buuru ihe oriri ókè anyị pụrụ ibu ma mee njem ihe karịrị kilomita 500 iji ruo Bratislava. Nkekọ ọbụbụenyi na ịhụnanya Ndị Kraịst anyị nwere n’afọ ndị ahụ a lụrụ agha kwagidere anyị n’afọ ndị siri ike na-abịa n’ihu.
Inweta Agbamume Dị Anyị Mkpa
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, Slovakia ghọkwara akụkụ nke Czechoslovakia ọzọ. Site na 1946 ruo 1948, a nọ na-enwe mgbakọ mba nke Ndịàmà Jehova na Brno ma ọ bụ na Prague. Anyị bụ́ ndị si n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Slovakia na-eji ụgbọ okporo ígwè pụrụ iche ndị e mere ndokwa ha maka ndị na-aga mgbakọ aga. Ị pụrụ ịkpọ ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ ụgbọ okporo ígwè na-abụ abụ, n’ihi na anyị na-abụ abụ ka anyị na-aga na ka anyị na-ala.—Ọrụ 16:25.
M na-echeta karịsịa mgbakọ e nwere na
Brno na 1947, nke ndị nlekọta atọ bụ́ Ndị Kraịst ndị si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile, gụnyere Nwanna Nathan H. Knorr, bịara. Iji kpọsaa okwu ihu ọha nke mgbakọ ahụ, ọtụtụ n’ime anyị ji kaadị mkpọsa nke e dere isiokwu ya gagharịa n’obodo ahụ. Obi adịghị nnọọ nwa anyị nwoke bụ́ Eduard, bụ́ onye dị nanị afọ itoolu mgbe ahụ, mma na e nyeghị ya nke ya. Ya mere, ụmụnna rụtaara ya na ụmụaka ndị ọzọ kaadị mkpọsa ndị obere. Ìgwè ụmụaka a rụrụ ọrụ dị mma n’ịkpọsa okwu ihu ọha ahụ!Na February 1948 ndị Kọmunist batara n’ọchịchị. Anyị maara na n’oge na-adịghị anya ndị ọchịchị ga-eme ihe iji gbochie ozi anyị. E nwere mgbakọ na Prague na September 1948, anyị nwekwara mmetụta siri ike ka anyị na-atụ anya mmachibido iwu ọzọ ná nzukọ ihu ọha anyị, nanị afọ atọ ka anyị nwesịrị nnwere onwe inwe mgbakọ. Tupu mgbakọ ahụ abịa ná njedebe, anyị mere nkwupụta nke akụkụ ya ụfọdụ na-ekwu, sị: “Anyị, dị ka Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị gbakọrọ . . . , kpebiri ịmụbakwu ozi a, nakwa site n’amara nke Onyenwe anyị, ịnọgide na-eje ya n’oge dị mma nakwa n’oge nsogbu, na iji ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu na-ekwusa oziọma nke Alaeze Chineke.”
“Ndị Iro nke Mba”
Nanị ọnwa abụọ ka e nwesịrị mgbakọ Prague ahụ, ndị uwe ojii nzuzo wabara n’ebe obibi Betel dịdewere Prague. Ha jichiri ya, chịkọrọkwa akwụkwọ ọ bụla ha hụrụ ma jichie ndị Betel na ụfọdụ ụmụnna ndị ọzọ. Ma ihe ka nke ahụ na-abịa n’ihu.
N’abalị nke February 3-4, 1952, ndị nche gazuru obodo ahụ dum ma jide ihe karịrị 100 Ndịàmà. Eso m na ha. N’ihe dị ka elekere anya atọ nke ụtụtụ, ndị uwe ojii kpọtere ndị ezinụlọ m nile. N’enyeghị nkọwa ọ bụla, ha gwara m ka m soro ha. A tụrụ m ịga ma kechie m anya, tụbakwa mụ na ndị ọzọ n’azụ ụgbọala. Enwetaziri m onwe m n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ.
Otu ọnwa gara n’enweghị onye kwunyeere m okwu. Nanị onye m na-ahụ bụ onye nche nke na-esi n’oghere dị n’ibo ụzọ atụbatara m obere nri. Mgbe ahụ, onye ahụ na-agba ajụjụ ọnụ m kwuru banyere ya ná mmalite kpọrọ m òkù. Mgbe ọ kpọsịrị m onye nledo, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ikpe okpukpe bụ amaghị ihe. Ọ dịghị Chineke dịnụ! Anyị apụghị ikwe ka unu ghọgbuo ndị na-arụrụ anyị ọrụ. Ma á kwụgbughị gị akwụgbu ị ga-anwụ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ bụrụkwa na Chineke gị abịa ebe a, anyị ga-egbukwa ya!”
Ebe ọ bụ na ndị ọchịchị maara na ọ dịghị iwu a kapịrị ọnụ machibidoro ozi Ndị Kraịst anyị, ha chọrọ ịkọwagharị ozi anyị ka o wee kwekọọ n’iwu ndị e nwere site n’ịkọwa anyị dị ka “ndị iro nke mba” na ndị nledo mba ọzọ. Iji mee nke ahụ, ọ dị ha mkpa imebi mkpebisi ike anyị ma mee ka anyị “kweta” ebubo ụgha ndị e boro anyị. Mgbe a gbachara m ajụjụ ọnụ n’abalị ahụ, e kweghị ka m hie ụra. Mgbe awa ole na ole gara, a gbara m ajụjụ ọnụ ọzọ. Na nke ugbu a, onye ahụ na-agba ajụjụ ọnụ chọrọ ka m bịanye aka n’akwụkwọ na-agụ, sị: “Mụ dị ka onye iro nke People’s Democratic Czechoslovakia esonyeghị [n’òtù gbakọtara aka] n’ihi na m na-eche ndị America.” Mgbe m jụrụ ịbịanye aka n’ụgha dị otú ahụ, e zigara m n’ụlọ mkpọrọ mgbazi.
A machibidoro m ihi ụra, idina ala, ma ọ bụ ọbụna ịnọdụ ala. Nanị ihe m
pụrụ ime bụ iguzo ọtọ ma ọ bụ ịgagharị agagharị. Mgbe ike gwụrụ m, edinara m n’ala siment. Mgbe ahụ, ndị nche kpọghachiri m n’ọfịs onye na-agba ajụjụ ọnụ. “Ị̀ ga-abịanye aka ugbu a?” ka onye ahụ na-agba ajụjụ ọnụ jụrụ. Mgbe m jụrụ ọzọ, ọ kụrụ m ihe n’ihu. Ọbara malitere ịgba m. O jizi iwe gwa ndị nche ahụ, sị: “Ọ chọrọ igbu onwe ya. Na-echenụ ya nche ka ọ ghara igbu onwe ya!” E zigaghachiri m n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ. Ruo ihe dị ka ọnwa isii, a nọgidere na-agba m ajụjụ ọnụ ọtụtụ ugboro. Ọ dịghị nrụgide ma ọ bụ mgbalị ọ bụla nke ime ka m kweta na m bụ onye iro nke mba mere ka mkpebi m mere ịnọgidesi ike n’ezi ihe nye Jehova belata.Otu ọnwa tupu uḅọchị a ga-ekpe m ikpe, otu ọkàiwu si Prague bịara ma gbaa onye ọ bụla n’ime ụmụnna 12 ahụ ajụjụ ọnụ. Ọ jụrụ m, sị: “Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ìgwè mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa abịa ịwakpo mba anyị?” “Ihe m mere mgbe mba a na Hitler wakporo USSR. Alụghị m agha mgbe ahụ, agaghịkwa m alụ agha ugbu a n’ihi na abụ m Onye Kraịst, anọpụkwara m iche.” Mgbe ahụ ọ gwara m, sị: “Anyị agaghị ahapụ Ndịàmà Jehova. Anyị chọrọ ndị agha ga-alụrụ anyị agha ma ọ bụrụ na ìgwè mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwu Ụwa awakpo anyị, anyị chọkwara ndị agha iji mee ka ndị anyị na-arụ ọrụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ nwere onwe ha.”
Na July 24, 1953, a kpọpụrụ anyị n’ụlọikpe. A kpọrọ anyị mmadụ 12 otu otu ịbịa n’ihu ndị ọkàikpe. Anyị jiri ohere ahụ gbaa àmà banyere okwukwe anyị. Mgbe anyị zaghachichara n’ebubo ụgha ndị e boro anyị, otu ọkàiwu biliri ọtọ ma kwuo, sị: “Abịawo m n’ụlọikpe a ọtụtụ ugboro. A na-enwekarị ọtụtụ nkwupụta, nchegharị, na ọbụna anya mmiri. Ma ndị ikom a ga-esi ebe a pụọ sie ike karịa ka ha siri mgbe ha batara.” Mgbe e mesịrị, a mara anyị mmadụ 12 ikpe ịkpa nkata ọjọọ megide mba. A mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ atọ na ịhapụrụ mba ihe onwunwe m.
Ime Agadi Emebeghị Ka M Kwụsị
Mgbe m lọtasịrị, ndị uwe ojii nzuzo ka na-eche m nche. N’agbanyeghị nke ahụ, amaliteghachiri m ọrụ ọchịchị Chineke, e nyekwara m ọrụ nlekọta ime mmụọ n’ọgbakọ anyị. Ọ bụ ezie na e kwere ka anyị ka biri n’ụlọ anyị e jichiri ejichi, e nyeghachiri anyị ya n’ụzọ iwu ihe dị ka afọ 40 ka e mesịrị, mgbe ọchịchị Kọmunist dara.
Ọ bụghị nanị m gara mkpọrọ n’ezinụlọ m. Anọwo m n’ụlọ nanị ihe dị ka afọ atọ mgbe e denyere aha Eduard ije agha. N’ihi akọ na uche ya e jiri Bible zụọ, ọ jụrụ, a tụkwara ya mkpọrọ. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọbụna nwa nwa m bụ́ Peter, nwekwara ahụmahụ dị otú ahụ, n’agbanyeghị na ahụ́ esichaghị ya ike.
Na 1989, ọchịchị Kọmunist nke Czechoslovakia dara. Lee obi ụtọ m nwere na mgbe ihe dị ka afọ iri anọ nke mmachibido iwu gasịrị, apụrụ m ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla! (Ọrụ 20:20) Ọ na-atọ m ụtọ ije ụdị ozi a ruo n’ókè ahụ́ ike m kwere m. Ugbu a m gbara afọ 98, ahụ́ ike m adịghịkwa ka ọ na-adịbu, ma enwere m obi ekele na m ka pụrụ ịgbara ndị mmadụ àmà banyere nkwa Jehova ndị dị ebube maka ọdịnihu.
Apụrụ m ịgụta ndị isi nke mba 12 dị iche iche bụ́ ndị chịrị obodo m. Ha gụnyere ndị ọchịchị aka ike, ndị president na otu eze. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha gwọtara nsogbu nke ndị nọ n’okpuru ọchịchị ha. (Abụ Ọma 146:3, 4) Ana m ekele Jehova na o mere ka m mata ya na nwata. N’ụzọ dị otú a, aghọtara m ihe ngwọta o nyere site n’aka Alaeze Mezaịa ahụ ma zere ihe efu nke ibi ndụ n’enweghị Chineke. Ejiriwo m ịdị uchu kwusaa ozi ọma ahụ ruo ihe karịrị afọ 75, o nyewokwa m nzube ná ndụ, afọ ojuju, na olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa. Gịnị ọzọ ka m pụrụ ịrịọ maka ya? *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.
^ par. 38 N’ụzọ dị mwute, ume gwụrụ Nwanna Michal Žobrák. Ọ nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, nakwa n’obi ike n’olileanya nke ndụ ebighị ebi, ka a na-akwadebe ibipụta isiokwu a.
[Foto dị na peeji nke 26]
Obere oge ka agbamakwụkwọ anyị gasịrị
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Eduard ná mmalite nke afọ ndị 1940
[Foto dị na peeji nke 27]
Ịkpọsa mgbakọ a ga-enwe na Brno, 1947