Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịdị Umeala n’Obi Jehova Pụtaara Anyị

Ihe Ịdị Umeala n’Obi Jehova Pụtaara Anyị

Ihe Ịdị Umeala n’Obi Jehova Pụtaara Anyị

DEVID bụ nwoke tara nnọọ ahụhụ. Ọgọ ya nwoke na-ekwo ekworo bụ́ Eze Sọl mesoro ya mmeso obi ọjọọ. Sọl nwara ugboro atọ iji ube tụgbuo Devid, ọ chụgharịkwara ya ọtụtụ afọ n’akwụsịghị akwụsị, na-amanye ya ịghọ onye na-agba ọsọ ndụ. (1 Samuel 18:11; 19:10; 26:20) Ma, Jehova nọnyeere Devid. Jehova zọpụtara ya ọ bụghị nanị n’aka Sọl kamakwa n’aka ndị iro ya ndị ọzọ. Ya mere, anyị pụrụ ịghọta okwu Devid, dị ka e dere n’abụ a: “Jehova bụ oké nkume m, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ. . . . I [Jehova enyewokwa m] ọta nzọpụta Gị: umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (2 Samuel 22:2, 36) Devid ghọrọ onye a ma ama n’Izrel. Oleezi otú nke a si metụta umeala n’obi Jehova?

Mgbe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere Jehova dị ka onye dị umeala n’obi, ọ dịghị apụta na o rughị eru n’ụzọ ọ bụla ma ọ bụ na ọ nọ n’okpuru ndị ọzọ. Kama nke ahụ, àgwà ọma a na-egosi na o nwere ọmịiko miri emi maka ụmụ mmadụ bụ́ ndị ji ezi obi na-agbalị inweta ihu ọma ya, ọ na-emekwara ha ebere. N’Abụ Ọma 113:6, 7, anyị na-agụ, sị: “[Jehova] na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie.” Ya ‘ime onwe ya ka ọ dị ala’ pụtara na “ọ na-ehuda ala iji hụ” ma ọ bụ na “ọ na-eweda onwe ya ala iji kirie.” (Today’s English Version; Young’s Literal Translation of the Holy Bible) Ya mere, site n’eluigwe, Jehova n’onwe ya ‘hudatara ala’ ma ọ bụ ‘weda onwe ya ala,’ iji hụ Devid, bụ́ onye na-ezughị okè ma bụrụ nwoke dị umeala n’obi nke chọrọ ijere Chineke ozi. N’ihi ya, Devid na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya.” (Abụ Ọma 138:6) Ụzọ obi ebere, ndidi, na ọmịiko Jehova si mesoo Devid kwesịrị ịgba ndị nile chọrọ ime uche Chineke ume.

Ọ bụ ezie na Jehova dị ka Eze Kasịnụ nọ n’ọkwá kachasị elu n’eluigwe na ala, ọ dị njikere iso onye ọ bụla n’ime anyị mekọọ ihe. Nke a na-emesi anyị obi ike na anyị pụrụ ịdabere n’enyemaka ya na-adịghị ada ada ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji tụọ ụjọ na ọ ga-echefu anyị. N’ihe banyere ndị ya bụ́ Izrel oge ochie, e kwuru banyere Jehova n’ụzọ dabara adaba dị ka “onye chetara [ha] n’ọnọdụ [ha] dị ala: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.”—Abụ Ọma 136:23.

Dị ka ndị ohu Jehova nke oge a, anyị pụrụ ịta ahụhụ dị ka Devid tara. Ọ pụrụ ịbụ na anyị na-eche ịkwa emo sitere n’aka ndị na-amaghị Chineke ihu, ma ọ bụ ikekwe anyị na ọrịa na-alụ ma ọ bụ bụrụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị, ọ bụrụ na obi anyị ziri ezi, anyị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere, na-arịọ maka ebere ya. Jehova ‘ga-ehuda ala’ iji hụ anyị ma nụ ekpere anyị. Ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya.” (Abụ Ọma 34:15) Ọ́ dịghị emetụ gị n’ahụ́ ịtụgharị uche n’àgwà ịdị umeala n’obi magburu onwe ya nke Jehova?

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Dị nnọọ ka ọ nụrụ ekpere Devid, Jehova dị njikere ịnụ ekpere anyị taa