Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Gịnị ka Onye Kraịst pụrụ ime mgbe o nwere ike ọgwụgwụ n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ?

Ọ dị anyị mkpa ịmata ihe na-akpatara anyị ike ọgwụgwụ. Ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye aka inyocha àgwà na ihe onwunwe anyị ma wepụsịa ibu nile na-adịghị mkpa. Anyị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị anyị pụrụ iru na-adabere n’ọnọdụ anyị. Ilekọta ahụ́ ike ime mmụọ anyị dị mkpa, o kwesịkwara ịgụnye ikpe ekpere na ịtụgharị uche n’ụzọ chiri anya.—8/15, peeji nke 23-26.

N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji ewere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 dị ka ọnụ ọgụgụ nkịtị?

Mgbe a gwasịrị Jọn onyeozi banyere 144,000, ọ hụrụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ.” (Mkpughe 7:4, 9) Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ narị puku na iri puku anọ na anọ bụ ihe atụ, ọdịiche dị n’etiti òtù abụọ ahụ agaghịzi apụta ìhè. Jizọs kwuru banyere ndị ga-eso ya chịa dị ka “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32)—9/1, peeji nke 30.

N’ihi gịnị ka onye Izrel pụrụ iji renye onye ala ọzọ anụ nwụrụ anwụ a na-egbupụghị ọbara?

Onye ala ọzọ ma ọ bụ onye ọbịa nke na-aghọghị onye na-eso ụzọ ndị Juu anọghị n’okpuru Iwu ahụ. Ya mere, onye Izrel pụrụ inye ma ọ bụ irenye ya anụ ndị dị otú ahụ. (Deuterọnọmi 14:21) Ma onye na-eso ụzọ ndị Juu nọ n’okpuru Iwu ahụ, ọ gaghịkwa eri anụ a na-egbupụghị ọbara nke anụmanụ dị otú ahụ. (Levitikọs 17:10)—9/15, peeji nke 26.

Gịnị bụ nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ iji mepụta ụdị ha, oleekwa otú ọ pụrụ isi metụta Ndị Kraịst?

Ọ bụ ihe ọmụmụ sayensị nke na-anwa iṅomi ihe ndị a hụrụ n’ihe ndị e kere eke. Dị ka ihe atụ, ụmụ Wright rụpụtara ụgbọelu ka ha nyochasịrị nnụnụ ndị buru ibu na-efe efe. N’ihi ya, nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ iji mepụta ụdị ha pụrụ ịkpali Onye Kraịst inye Onye Okike otuto.—10/1, peeji nke 9.

Ònye ka a kpọtụrụ aha na 2 Ndị Kọrint 12:2-4 na e bupụrụ gaa na paradaịs?

Amaokwu ndị a sochiri amaokwu ndị Pọl ji gbachitere ọbụbụ ọ bụ onyeozi. Ebe ọ bụ na Bible ekwughị banyere onye ọ bụla ọzọ nke nwere ahụmahụ dị otú ahụ, ebe ọ bụkwa Pọl gwara anyị banyere ya, o yiri ka ọ̀ bụ Pọl hụrụ ọhụụ a.—10/15, peeji nke 8.

Olee àgwà ụfọdụ nke Jizọs ndị mere ka o ruo eruo ịbụ Onye Ndu Chineke họọrọ?

Jizọs jigidere iguzosi ike n’ezi ihe zuru okè, bụrụ onye na-eme ihe n’eziokwu na onye àgwà ya ziri ezi. Ọ raara onwe ya nye Chineke kpamkpam. Jizọs nwere mmetụta miri emi maka ndị mmadụ, ọ dịkwa njikere ịrụ ọrụ.—11/1, peeji nke 6-7.

Ebee ka ndị mmụọ ọjọọ ga-anọ n’oge Narị Afọ Iri Ahụ?

Anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na a ga-atụba ha na Setan n’abis n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. (Mkpughe 20:1-3) Jenesis 3:15 buru amụma banyere ichifịa agwọ ahụ n’isi, bụ́ nke gụnyere ịtụba ya n’abis n’oge Narị Afọ Iri ahụ. Mkpụrụ ya gụnyere ndị ajọ mmụọ ozi, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ. Eziokwu bụ́ na ha egosipụtawo egwu ha na-atụ abis na-egosi na ha maara banyere njichi a na-abịanụ. (Luk 8:31)—11/15, peeji nke 30-31.

N’ihi gịnị ka mmadụ pụrụ iji kpachara anya banyere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ na-ezere ịṅụ ya ruo n’ókè nke igbuwe ya egbuwe?

Ihe àmà nke ịṅụbiga mmanya ókè adịghị apụtacha ìhè n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọbụna mgbe ha ṅụsịrị ọtụtụ iko mmanya. Otú ọ dị, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ iji nwayọọ nwayọọ rie mmadụ ahụ́, onye ahụ aghọọkwa “ohu nye oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) Jizọs dọrọ aka ná ntị ‘ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya ga-anyịgbu obi anyị.’ (Luk 21:34, 35) Ọ dịghị mkpa ka mmanya gbuwe mmadụ egbuwe tupu ya emee ka onye ahụ mewe anya ụra ma ọ bụ dịrị umengwụ—n’ụzọ nkịtị nakwa n’ụzọ ime mmụọ.—12/1, peeji nke 19-21.