Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Enyi Chineke ‘n’Agwaetiti nke Ndị Nwere Omume Enyi’

Ndị Enyi Chineke ‘n’Agwaetiti nke Ndị Nwere Omume Enyi’

Ndị Enyi Chineke ‘n’Agwaetiti nke Ndị Nwere Omume Enyi’

Na 1932, ụgbọ mmiri butere mkpụrụ ndị dị oké ọnụ ahịa na Tonga. Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ nyere Charles Vete akwụkwọ nta bụ́ “Where Are the Dead?” Charles kwetara na ya achọtawo eziokwu ahụ. Ka e mesịrị, isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova kwadoro ka Charles sụgharịa akwụkwọ nta ahụ gaa n’asụsụ ya. Mgbe ọ sụgharịsịrị ya, o nwetara 1,000 akwụkwọ nta ahụ ma malite ikesa ha. Ọ bụ otú ahụ ka mkpụrụ nke eziokwu banyere Alaeze Jehova si malite ịgbasa n’alaeze Tonga.

NA MAP Ebe Ndịda Pacific, ị pụrụ ịchọta Tonga kpọmkwem n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe akara ụwa ji agụ ụbọchị na Tropic of Capricorn zutere. Agwaetiti kasị ukwuu na ya, bụ́ Tongatapu, dị ihe dị ka puku kilomita abụọ site n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Auckland, New Zealand. E nwere otu narị agwaetiti na iri asaa na otu na Tonga, ọ bụkwa na 45 n’ime ha ka mmadụ bi. Onye Britain a ma ama na-eme nchọpụta nke narị afọ nke 18 bụ́ James Cook kpọrọ agwaetiti ndị a dịpụrụ adịpụ Agwaetiti nke Ndị Nwere Omume Enyi.

N’ịbụ nke ihe dị ka otu narị puku mmadụ na isii bi na ya, ihe mejupụtara Tonga bụ ìgwè agwaetiti atọ—ndị ndị bụ́ isi n’ime ha bụ Tongatapu, Ha’apai, na Vava’u. N’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova ise e nwere n’ógbè ahụ, atọ dị n’ìgwè agwaetiti nke Tongatapu bụ́ nke ndị mmadụ kasị biri na ya, otu dị na Ha’apai, nke ọzọ adịkwa na Vava’u. Iji nyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị enyi Chineke, Ndịàmà Jehova nwere ebe obibi ndị ozi ala ọzọ na ụlọ ọrụ nsụgharị na nso Nuku’alofa, bụ́ isi obodo ha.—Aịsaịa 41:8.

Malite n’afọ ndị 1930, a maara Charles Vete nke ọma dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na e meghị ya baptizim ruo 1964. Ndị ọzọ sonyeere ya n’ọrụ ịgba àmà, na 1966 kwa, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na-aba mmadụ 30. Na 1970, e hiwere ọgbakọ nwere ndị nkwusa Alaeze 20 na Nuku’alofa.

Kemgbe ahụ, a pụrụ ịhụ mmezu nke okwu onye amụma bụ́ Aịzaịa nke ọma n’agwaetiti Tonga: “Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto Ya n’agwaetiti nile.” (Aịsaịa 42:12) Ọrụ Alaeze ahụ anọgidewo na-aga nke ọma, na-enyere ọtụtụ ndị aka iso Jehova na-enwe mmekọrịta. Ná mgbakọ distrikti e nwere na Nuku’alofa na 2003, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ bụ narị mmadụ anọ na asaa, e meekwa mmadụ ise baptizim. Iji gosi na e nwere atụmanya maka uto, narị mmadụ isii na iri abụọ na otu bịara Ememe Ncheta na 2004.

Ibi Ndụ Dị Mfe

Otú ọ dị, a ka nwere mkpa pụtara ìhè nke ndị nkwusa Alaeze n’obodo ndị ọzọ na-abụghị isi obodo ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ dị puku mmadụ asatọ na narị ise bi n’agwaetiti 16 ndị mmadụ bi na ha nke ìgwè agwaetiti Ha’apai mkpa ịnụkwu banyere eziokwu Bible. Ihe ndị mejupụtara Ha’apai bụ karịsịa agwaetiti ndị dị ala, ndị osisi nkwụ jupụtara na ha, bụ́kwa ndị nwere ogologo ụsọ mmiri ndị nwere ájá ọcha. Oké osimiri ahụ na-egbukepụ nnọọ egbukepụ, ọtụtụ mgbe, a pụrụ ịhụ ihe dị mita 30 n’ime ya. Ọ bụ ahụmahụ magburu onwe ya igwugharị n’etiti nkume ndị mara mma dị n’okpuru mmiri na n’etiti ihe karịrị otu narị ụdị azụ e nwere ebe ahụ. Obodo ha na-adịkarị ntakịrị. Ọ bụ ezie na a rụrụ ụlọ ndị dị n’ebe ahụ n’ụzọ dị mfe, a rụrụ ha ịnagide ajọ ifufe nke ebe okpomọkụ.

A na-eji ụdị osisi ụkwa ụfọdụ na mango emere ndò, sikwa na ha enweta nri. Ha na-eji oge ka ukwuu n’ụbọchị achọ ihe ha ga-eri. E wezụga anụ ezì, ndị bi n’agwaetiti ahụ na-esi n’oké osimiri enweta ọtụtụ ihe oriri. Ubi ezinụlọ na-emepụta ihe oriri ndị dị ka ji nwa nnu na akwụkwọ nri. Oroma na-epuru onwe ya n’ọhịa; osisi akị Bekee na úkwù unere juru ebe nile. Ihe ọmụma banyere mkpá akwụkwọ, ụgbụgbọ osisi na mkpọrọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa na-esite n’otu ọgbọ gafere n’ọzọ.

N’ezie, ihe kasị mma Ha’apai nwere bụ ndị obodo ya nwere omume enyi, bụ́ ndị kwekọrọ n’ógbè ahụ dị jụụ. Ọ dịghị onye na-ebi ndụ okomoko ebe a. Ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom ha na-arụ ọrụ aka—na-akpa nkata na ute ma na-eji ụgbụgbọ osisi akpa ákwà. Ka ha na-arụ ọrụ ha, ndị inyom Tonga na-anọdụ ala, na-akọ akụkọ, na-abụ abụ ma na-achị ọchị n’okpuru osisi nwere ndò, mgbe mgbe ka ụmụaka ha na-egwuri egwu ma ọ bụ na-ehi ụra n’akụkụ ha. Mgbe mmiri talatara, ọ na-abụkarịkwa ndị inyom na-aga atụtụ akịrịkọ na ihe ndị ọzọ a na-eri eri si na mmiri, nakwa ahịhịa mmiri ndị e ji esi nri ndị dị ụtọ.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị ikom ha na-eji oge ha elekọta ubi, egbu azụ, atụ ihe ọtụtụ, arụ ụgbọ mmiri ma na-edozi ụgbụ. Ndị ikom, ndị inyom na ụmụntakịrị na-eji obere ụgbọ ndị e ji egbu azụ bụ́ ndị e kpuchiri elu ha ekpuchi eme njem site n’otu agwaetiti gaa n’ọzọ iji leta ndị ikwu ha, nara ọgwụgwọ ma zụrụ ihe ma ọ bụ ree ihe ndị ha rụpụtara.

Ọ Dịghị Ebe Ozi Ọma ahụ Na-apụghị Iru

Ọ bụ n’ebe dị otú a magburu onwe ya ka ndị ozi ala ọzọ abụọ na ndị ọsụ ụzọ abụọ bịara n’oge Ememe Ncheta nke afọ 2002. Tupu mgbe ahụ, a kpọtụworo ndị Ha’apai site n’oge ruo n’oge, ha enwetawokwa akwụkwọ ndị Ndịàmà Jehova bipụtara, ọbụna soro Ndịàmà mụọ Bible.

Ndị nkụzi Bible anọ ahụ si esi bịa nwere ebumnobi atọ: inyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ịmalite ọmụmụ Bible na ịkpọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ha mezuchara ebumnobi atọ ahụ. Mmadụ 97 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha ji ụgbọ mmiri ndị elu ha ghere oghe bịa n’agbanyeghị oké mmiri ozuzu na oké ifufe. N’ihi ihu igwe na-adịghị mma, ọtụtụ hibọrọ chi n’ebe a nọrọ mee Ememe Ncheta ahụ ma lazie n’echi ya.

Onye kwuru okwu Ememe Ncheta ahụ mekwara mgbalị dị ukwuu. “Ọ baghị uru ịgwawa gị otú o si sie ike ikwu okwu Ememe Ncheta abụọ n’asụsụ ọzọ n’otu uhuruchi,” ka onye ozi ala ọzọ nke kwuru okwu ahụ na-echeta. “Ị pụrụ ịghọta otú ụjọ si tụọ m. Lee ka ekpere si nyere m aka! Echetara m okwu na ahịrịokwu ndị m na-amaghị na m ma.”

N’ihi ndị ahụ na-ezisa ozi ọma ịzụlite mmasị ndị a chọtarala achọta n’agwaetiti Ha’apai, e mere di na nwunye abụọ bụ́ ndị ebe ahụ baptizim. Di nke otu n’ime ndị inyom ahụ malitere inwe mmasị n’akwụkwọ Ndịàmà mgbe a na-azụ ya ịghọ pastọ nke chọọchị dị n’ógbè ahụ.

Ọ bụ ezie na nwoke a na nwunye ya dara ogbenye, ha na-adị enye onyinye gbara ọkpụrụkpụ mgbe ọ bụla a kpọpụtara ha na chọọchị n’oge agbamọnya ego chọọchị kwa afọ. Otu Onyeàmà letaburu ebe ahụ gwara nwoke ahụ ka ọ sapeta ma gụọ 1 Timoti 5:8 na Bible ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” Ụkpụrụ Bible a metụrụ nwoke ahụ n’obi. Ọ ghọtara na site n’ịdị na-enye onyinye gabigara ókè chọọchị ahụ chọrọ ya n’aka, ọ dịghị egboro ezinụlọ ya mkpa ha ndị bụ́ isi. N’agbamọnya ego nke afọ na-eso ya, ọ bụ ezie na o ji ego ahụ n’akpa, ọ pụghị ichefu 1 Timoti 5:8. Mgbe a kpọpụtara ya, o ji obi ike gwa ụkọchukwu ha na mkpa ezinụlọ ya kwesịrị ibute ụzọ. N’ihi ya, ndị okenye chọọchị ahụ katọrọ ma mechuo di na nwunye ahụ ihu n’ihu ọha.

Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya sosịrị Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ha ghọrọ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Nwoke ahụ kwuru, sị: “Eziokwu Bible agbanweela ndụ m. Adịghịzi m emeso ezinụlọ m omume obi ọjọọ. Anaghịzi m aṅụ oké mmanya. Ndị obodo m pụrụ ịhụ mgbanwe eziokwu ahụ meworo ka m nwee ná ndụ m. Enwere m olileanya na ha ga-emesị hụ eziokwu ahụ n’anya dị ka m hụrụ ya.”

E Ji Ụgbọ Quest Mee Ihe n’Ịchọta Ndị Nwere Obi Eziokwu

Ọnwa ole na ole ka Ememe Ncheta 2002 gasịrị, ụgbọ mmiri ọzọ butere ndị dị oké ọnụ ahịa n’ìgwè agwaetiti Ha’apai ahụ dịpụrụ adịpụ. Ụgbọ Quest nke dị mita 18 n’ogologo si New Zealand gaa n’agwaetiti dị iche iche nke Tonga. Ndị o bu bụ Gary na Hetty na ada ha nwanyị bụ́ Katie. Ụmụnna nwoke na ndị nwanyị itoolu bụ́ ndị Tonga na ndị ozi ala ọzọ abụọ sonyeere ha ugboro abụọ. Ndịàmà Tonga ahụ nyere aka jiri nkà kwọọ ụgbọ ahụ, mgbe ụfọdụ, gafere ebe ndị ụgbọ na-agafetụbeghị, bụ́ ndị nwere nkume n’okpuru ha. Njem ndị a abụghị njem ntụrụndụ. Ndị ụgbọ ahụ bu gara ebe ahụ ịkụzi eziokwu Bible. Ha gazuru ebe buru ibu n’oké osimiri, na-eleta agwaetiti 14. E kwusatụbeghị ozi ọma Alaeze ahụ n’ụfọdụ n’ime agwaetiti ndị ahụ.

Olee otú ndị ahụ si meghachi omume? N’ozuzu, ndị ebe ahụ, bụ́ ndị e ji ile ọbịa mara, ji ma ọchịchọ ịmata ihe ma obi ụtọ nabata ndị nkwusa ahụ ji ụgbọ mmiri bịa. Ozugbo ndị agwaetiti ahụ ghọtara ihe mere ndị nkwusa ahụ ji bịa, ha gosipụtara ekele miri emi. Ọ bịara doo Ndịàmà ahụ si esi bịa anya na ndị agwaetiti ahụ ji Okwu Chineke kpọrọ ihe ma mara mkpa nke ime mmụọ ha.—Matiu 5:3.

Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-agba ndị ọbịa ahụ gburugburu ka ha nọ ọdụ n’úkwù osisi nke ebe okpomọkụ, na-ajụ ha ọtụtụ ajụjụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe chi jiri, nkwurịta okwu Bible na-agakwa n’ihu n’ụlọ ndị mmadụ. Ndị bi n’otu agwaetiti rịọrọ Ndịàmà ahụ na-ala ala, sị: “Unu alala! Ònye ga-aza anyị ajụjụ anyị ma unu laa?” Otu Onyeàmà kwuru, sị: “Ọ na-esi ike ịhapụ ọtụtụ ndị yiri atụrụ bụ́ ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ. A kụwo ọtụtụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ.” Mgbe ụgbọ Quest ahụ rutere otu agwaetiti, Ndịàmà ahụ hụrụ na onye ọ bụla yi ákwà mkpe. Nwunye ọfịsa obodo ahụ ka nwụpụrụ. Ọfịsa ahụ n’onwe ya kelere ụmụnna ahụ maka iwetara ha ozi nkasi obi sitere na Bible.

Ọ dịghị mfe ịbanye n’agwaetiti ụfọdụ. Hetty na-akọwa, sị: “Otu agwaetiti enweghị ebe dị mma ụgbọ ga-akwụsị, nanị ihe e nwere n’ụsọ oké osimiri ya bụ nkume ndị kpọliri ọnụ elu bụ́ ndị dịgasị ihe dị ka otu mita n’elu. Nanị ihe a pụrụ iji ruo ya bụ obere ụgbọ mmiri rọba. Anyị aghaghị ibu ụzọ tụpụrụ ndị nọ n’ụsọ mmiri, bụ́ ndị dị njikere inyere anyị aka, akpa anyị. Mgbe ahụzi, mgbe mmiri buliri obere ụgbọ mmiri rọba ahụ elu ruo n’ọnụ ọnụ nkume ndị ahụ, anyị aghaghị ịmapụ tupu ya ebudaghachi ya.”

Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nọ n’ụgbọ ahụ bụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri obi kara. Mgbe ọ kwọsịrị ụgbọ ruo izu abụọ, onyeisi ụgbọ ahụ dere banyere njem ha mere iji laghachi n’agwaetiti bụ́ isi nke Tongatapu, sị: “Anyị ka nwere njem ga-ewe awa 18 n’ụgbọ mmiri. Anyị apụghị ime ya otu ugboro n’ihi ndị ọrịa njem mmiri ji. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-ala ma ọ na-ewutekwa anyị nke ukwuu ịhapụ ọtụtụ ndị nụworo ozi Alaeze ahụ ugbu a. Anyị na-ahapụ ha n’aka Jehova, ka mmụọ nsọ ya na ndị mmụọ ozi ya na-enyere ha aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.”

Agwaetiti Ndị A Ka Ga-arụpụta Ihe na Ha

Ihe dị ka ọnwa isii ka ụgbọ Quest ahụ lasịrị, e zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ, bụ́ Stephen na Malaki, ịga mee nkwusa n’ìgwè agwaetiti nke Ha’apai. Ha sonyeere di na nwunye abụọ ahụ a ka mepụrụ baptizim n’ebe ahụ n’ịkụzi Bible. A na-enwe mkparịta ụka ndị na-ekpo ọkụ bụ́ ndị metụtara ozizi, ndị nkwusa ahụ jikwa Bible na-eme ihe nke ọma.

Na December 1, 2003, e hiwere otu ọgbakọ na Haʹapai, bụ́ ọgbakọ nke ise e nwere na Tonga. Ndị na-abịa nzukọ na-agụnye ọtụtụ ụmụaka. Ha amụtawo ige ntị nke ọma. Ha na-anọdụ nwayọọ ma na-achọ ịza ajụjụ n’ihe omume ndị ndị na-ege ntị na-ekere òkè na ha. Onye nlekọta sekit ha kwuru na “otú ha maruuru Akwukwọm nke Akukọ Bible na-egosi na ndị nne na nna ji ibu ọrụ ha nke ịkụnye eziokwu Bible n’ime ụmụ ha kpọrọ ihe.” O doro anya na a ka nwere ọtụtụ ndị enyi Jehova a pụrụ inweta n’agwaetiti ndị ahụ.

Ihe karịrị afọ 70 gara aga, mgbe Charles Vete sụgharịrị akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead? gaa n’asụsụ ya bụ́ Tongan, ọ maghị otú mkpụrụ Alaeze ahụ ga-agbanyeru mkpọrọgwụ n’obi ndị obodo ya. Site n’obere mmalite ahụ, Jehova anọgidewo na-agọzi mkpọsa na-amụbawanye amụbawanye nke ozi ọma ahụ n’akụkụ ahụ nke ụwa anyị. Taa, a pụrụ ikwu n’ezie na Tonga so n’agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ nke oké osimiri, bụ́ ndị na-echigharịkwuru Jehova, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Abụ Ọma 97:1; Aịsaịa 51:5) E nweziri ọtụtụ ndị enyi Jehova ‘n’Agwaetiti nke Ndị Nwere Omume Enyi.’

[Foto dị na peeji nke 8]

Charles Vete, 1983

[Foto dị na peeji nke 9]

Iji ụgbụgbọ osisi akpa ákwà

[Foto dị na peeji nke 10]

E ji ụgbọ “Quest” mee ihe iji gbasaa ozi ọma ahụ na Tonga

[Foto dị na peeji nke 11]

Ìgwè ndị nsụgharị, Nukuʹalofa

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Iji ụgbụgbọ osisi akpa ákwà: © Jack Fields/CORBIS; ihe osise dị n’azụ peeji nke 8 na nke 9, na ọ́kụ̀ azụ: © Fred J. Eckert