Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Devid, bụ́ nwoke dị ka obi Chineke si chọọ, ò mesoro ndị ọ dọtara n’agha ihe n’ụzọ obi ọjọọ, dị ka ụfọdụ na-ekwubi n’ihi ihe e dere na 2 Samuel 12:31 na 1 Ihe E Mere 20:3?
Ee e. Ihe Devid mere bụ nanị ime ka ndị Amọn ọ dọtara n’agha rụọ ọrụ mmanye. A ghọtahiere ihe Devid mere n’ihi otú ụfọdụ nsụgharị Bible si sụgharịa amaokwu ndị a.
N’ịkọwa otú e si mesoo ndị Amọn ihe, nsụgharị Bible ndị ahụ na-egosi Devid dị ka onye na-eme ihe ike nke obi tara mmiri. Dị ka ihe atụ, dị ka ọ dị na Bible Nsọ nke Union Version, 2 Samuel 12:31 na-agụ, sị: “O mekwara ka ndị nọ n’ime ya pụta, o tinye ha n’okpuru mma nkwọ, na n’okpuru ígwè na-ebi ihe, na n’okpuru anyụike ígwè, meekwa ka ha gabiga n’ihe e ji akpụ brik: otú a ka ọ na-emekwa obodo nile nke ụmụ Amọn.” Ihe ndekọ dị n’Ihe E Mere nke Mbụ 20:3 yikwara nke ahụ.
Otú ọ dị, dị ka ọkà mmụta Bible bụ́ Samuel Rolles Driver si kwuo, obi ịta mmiri “abụtụghị ihe anyị ji mara Devid.” N’ihi ya, otu nkọwa dị na The Anchor Bible na-ekwu, sị: “Ihe Devid nọ na-eme bụ ịhazi òtù ndị ọrụ ga-enyere ya aka iwekọrọ akụ̀ na ụba nke ógbè ahụ o meriri, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ ihe ndị eze nwere mmeri na-eme.” N’otu aka ahụ, Adam Clarke na-ekwu, sị: “Ya mere, ihe ọ pụtara bụ na O mere ndị ahụ ohu ma nye ha ọrụ ịkwọ osisi, ịrụ ígwè e ji akọ ala, ma ọ bụ igwupụta akụ̀ ndị dị n’ala, . . . nyekwa ha ọrụ ịwa osisi na ịkpụ brik. Ịkwọwa ndị mmadụ, iji anyụike akpọwa ha, iberisị ha eberisị, na ịwa ha awa, adịghị n’ihe odide ahụ, Devid emesoghịkwa ndị Amọn omume dị otú ahụ.”
N’igosipụta nghọta a ka zie ezie, nsụgharị dịgasị iche iche nke oge a mere ka o doo anya na e kwesịghị ibo Devid ebubo imeso ndị mmadụ omume obi ịta mmiri. * Rịba ama otú New English Translation (2003) si sụgharịa ya: “Ọ kpụpụtara ndị nọ n’ime ya ma mee ka ha jiri mma nkwọ, ígwè ndị ọnụ ha pịrị apị, na anyụike ndị e ji ígwè mee rụọ ọrụ ike, mee ka ha rụọ ọrụ n’ebe a na-akpụ brik. Nke a bụ ụkpụrụ ọ gbasoro n’ihe metụtara obodo nile nke ndị Amọn.” (2 Samuel 12:31) “Ọ kpọọrọ ndị bi n’obodo ahụ ma mee ka ha jiri mma nkwọ, ígwè ndị ọnụ ha pịrị apị, na anyụike rụọ ọrụ. Devid mere otú a n’obodo ndị Amọn nile.” (1 Ihe E Mere 20:3) Otú New World Translation si sụgharịa ya kwekọkwara ná nghọta ndị ọkà mmụta nwere ugbu a: “Ọ kpọpụtara ndị nọ na ya ka o wee tinye ha n’ebe a na-akwọ nkume nakwa n’ebe e ji ngwá ọrụ na-aghọ nkọ na anyụike arụ ọrụ, o mekwara ka ha na-arụ ọrụ ịkpụ brik.” (2 Samuel 12:31) “O wee kpọpụta ndị bi n’ime ya wee nye ha ọrụ ịwa nkume nakwa iji ngwá ọrụ na-aghọ nkọ ndị e ji ígwè mee na anyụike na-arụ ọrụ; ọ bụkwa otú ahụ ka Devid mere obodo niile nke ụmụ Amọn.”—1 Ihe E Mere 20:3.
Devid ejighị obi ọjọọ mekpọọ ndị Amọn ahụ e meriri emeri ọnụ ma ọ bụ gbuchapụ ha n’egosighị obi ebere. O ṅomighị mmeso obi ọjọọ na obi ịta mmiri nke ndị meriri n’agha n’oge ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ọ bụrụ na e tinye ma ọ bụ wepụ otu mkpụrụ okwu n’ihe odide Hibru ahụ, ọ pụrụ ikwu na “o [tinyere] ha n’ebe a na-eji mma nkwọ arụ ọrụ” ma ọ bụ na “ọ (kpọwara) ha iberibe iberibe.” Ụdị ihe e ji akpụ brik e kwuru okwu ya n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ga-adị nnọọ warara nke na mmadụ apụghị isi na ya gafee.