Ndị Kraịst—Jirinụ Ụdị Ndị Unu Bụ Na-akpa Nganga!
Ndị Kraịst—Jirinụ Ụdị Ndị Unu Bụ Na-akpa Nganga!
“Onye na-anya isi, ya jiri Jehova nyaa isi.”—1 NDỊ KỌRINT 1:31.
1. Olee àgwà ọtụtụ ndị mmadụ na-enwezi n’ebe okpukpe dị?
“ENWEGHỊ MMASỊ NA CHINEKE.” Otu onye na-akọ ihe ndị na-eme n’okpukpe jiri okwu ahụ kọwaa àgwà ọtụtụ mmadụ na-enwe n’ebe okpukpe ha dị. Ọ kọwara, sị: “Ihe ihe ka ọtụtụ na-agbaso n’okpukpe nke oge a abụtụghị okpukpe—ọ bụ àgwà a pụrụ ịkpọ n’ụzọ kasị daba adaba ‘enweghị mmasị na Chineke.’” N’imekwu ka okwu ya doo anya, ọ kọwara enweghị mmasị na Chineke dị ka “mmadụ enwechaghị mmasị n’ihe banyere okpukpe ya.” O kwuru na ọtụtụ mmadụ “kweere na Chineke . . . ; ọ bụ nanị na ha adịchaghị eche banyere ya.”
2. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na ndị mmadụ adịghịzi egosi mmasị n’ihe ime mmụọ? (b) Olee ihe ize ndụ enweghị mmasị na-eche ezi Ndị Kraịst n’ihu?
2 Enweghị mmasị a jupụtara ebe nile adịghị eju ndị na-amụ Bible anya. (Luk 18:8) Mgbe a bịakwara n’ihe banyere okpukpe n’ozuzu, a pụrụ ịtụ anya enweghị mmasị dị otú ahụ. Ọ dịla anya okpukpe ụgha duhiewere ihe a kpọrọ mmadụ ma na-akpatara ha nkụda mmụọ. (Mkpughe 17:15, 16) Otú ọ dị, mmụọ nke inwe obi abụọ na enweghị ịnụ ọkụ n’obi bụ́ nke jupụtara ebe nile bụụrụ ezi Ndị Kraịst ihe ize ndụ. Anyị agaghị anwa anwa nwee àgwà ọ gbasaghị m banyere okwukwe anyị ma bụrụ ndị ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka ozi anyị na-ejere Chineke na eziokwu Bible funahụrụ. Jizọs dọrọ aka ná ntị megide ịdị ṅara ṅara dị otú ahụ mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi na Leodisia ọdụ, sị: “Ị jụghị oyi, i kpoghịkwanụ ọkụ. Ọ dị m ka ya bụrụ na ị jụrụ oyi ma ọ bụkwanụ kpoo ọkụ. . . . Ị dị ṅara ṅara.”—Mkpughe 3:15-18.
Ịghọta Ụdị Ndị Anyị Bụ
3. Olee ụfọdụ ihe ndị e ji mara Ndị Kraịst bụ́ ndị ha pụrụ iji na-akpa nganga?
3 Iji lụsoo enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ ọgụ, ọ dị Ndị Kraịst mkpa ịghọta nke ọma ụdị ndị ha bụ, ha aghaghị iji ọnọdụ ha pụrụ iche na-akpa nganga ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. Dị ka ndị ohu Jehova na ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị pụrụ ịchọta nkọwa nke ụdị ndị anyị bụ n’ime Bible. Anyị bụ “ndị àmà” Jehova, “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” ka anyị ji ịdị uchu soro ndị ọzọ na-ekerịta “ozi ọma” ahụ. (Aịsaịa 43:10; 1 Ndị Kọrint 3:9; Matiu 24:14) Anyị bụ ndị ‘na-ahụrịta ibe anyị n’anya.’ (Jọn 13:34) Ezi Ndị Kraịst bụ ndị “siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Anyị bụ ndị ‘na-enwu dị ka ihe ndị na-enye ìhè n’ụwa.’ (Ndị Filipaị 2:15) Anyị na-agbalị ‘ịnọgide na-eme omume dị mma n’etiti mba nile.’—1 Pita 2:12; 2 Pita 3:11, 14.
4. Olee otú onye na-efe Jehova pụrụ isi chọpụta ihe ọ na-abụghị?
4 Ezi ndị na-efe Jehova ofufe makwaara ihe ha na-abụghị. “Ha abụghị akụkụ nke ụwa,” Jọn 17:16) Ha na-anọpụ iche n’ebe “ndị mba ọzọ” nọ, bụ́ ndị “nọ n’ọchịchịrị n’uche, bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ ahụ bụ́ nke Chineke.” (Ndị Efesọs 4:17, 18) N’ihi ya, ụmụazụ Jizọs ‘na-ajụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa ma na-ebi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.’—Taịtọs 2:12.
dị nnọọ ka Onye Ndú ha, bụ́ Jizọs Kraịst, na-abụghị akụkụ nke ụwa. (5. Gịnị ka ndụmọdụ nke ‘iji Jehova na-anya isi’ pụtara?
5 Ịghọta nke ọma ọnọdụ anyị dị ka Ndị Kraịst na mmekọrịta nke anyị na Eze Na-achị eluigwe na ala na-akwali anyị ‘iji Jehova na-anya isi.’ (1 Ndị Kọrint 1:31) Olee ụdị ịnya isi nke ahụ bụ? Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị na-anya isi n’ihi na Jehova bụ Chineke anyị. Anyị na-agbaso ndụmọdụ bụ́: “Onye na-anya isi, ya nyaa isi na nke a, na o nwere uche n’ebe M nọ, wee mara m, na Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa.” (Jeremaịa 9:24) Anyị ‘na-anya isi’ n’ihi ihe ùgwù nke ịmara Chineke na ịbụ ndị o ji eme ihe iji nyere ndị ọzọ aka.
Ihe Ịma Aka Anyị Nwere
6. Olee ihe mere o ji abụrụ ụfọdụ ihe ịma aka ịnọgide na-aghọta nke ọma ọnọdụ ha dị ka Ndị Kraịst?
6 N’ikwu eziokwu, ọ bụghị mgbe nile ka ọ na-adịrị anyị mfe ịghọta nke ọma ọnọdụ anyị pụrụ iche dị ka Ndị Kraịst. Otu nwa okorobịa nke a zụlitere dị ka Onye Kraịst chetara na ya adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ruo oge ụfọdụ, na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ, echere m na amaghị m ihe mere m ji bụrụ Onyeàmà Jehova. A kụziiri m eziokwu ahụ site na mgbe m bụ nwa ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ, m chere na okpukpe m bụ otu n’ime okpukpe ndị bụ́ isi a nakweere n’ebe nile.” Ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ ekwewo ka ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe ntụrụndụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na echiche ndị na-adịghị amasị Chineke bụ́ ndị a na-ahụ n’oge a kpebie ụdị ndị ha ga-abụ. (Ndị Efesọs 2:2, 3) Ndị Kraịst ụfọdụ pụrụ inwe obi abụọ mgbe ụfọdụ banyere onwe ha ma na-enyochagharị ụkpụrụ ha na ihe mgbaru ọsọ ha.
7. Olee ụdị nnyocha onwe onye ndị ohu Chineke kwesịrị ịdị na-eme?
7 Ọ̀ dị njọ ịdị na-enyocha onwe anyị ruo n’ókè ụfọdụ? Ee e. Ị pụrụ icheta na Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ịnọgide na-enyocha onwe ha, na-asị: “Nọgidenụ na-anwale ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, nọgidenụ na-anwapụta ihe unu onwe unu bụ.” (2 Ndị Kọrint 13:5) N’ebe a, onyeozi ahụ nọ na-agba ume ka anyị na-etinye ezi mgbalị n’ịchọpụta adịghị ike ime mmụọ ndị anyị pụrụ inwewo ka anyị wee mee ihe ndị dị mkpa iji merie ha. N’ịnwale ma ọ̀ nọ n’okwukwe, Onye Kraịst aghaghị ikpebi ma okwu na omume ya hà na-ekwekọ n’ihe ọ na-ekwu na ya bụ. Anyị agatụghị achọ ka ‘ụgbọ anyị kpuo n’ihe banyere okwukwe anyị’!—1 Timoti 1:19.
Anyị Onwe Anyị Kwa Na-enwe Ihe Ịma Aka
8, 9. (a) Olee otú Mozis si gosipụta obi abụọ o nwere banyere onwe ya? (b) Gịnị ka Jehova mere banyere ịla azụ Mozis? (ch) Olee mmetụta mmesi obi ike nke Jehova nwere n’ahụ́ gị?
8 Ndị Kraịst bụ́ ndị na-enwe obi abụọ banyere onwe ha mgbe ụfọdụ hà kwesịrị iche na ha adaala? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, ha pụrụ inweta nkasi obi n’ịmara na mmetụta ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke n’oge gara aga nwere ha. Were Mozis dị ka ihe atụ, bụ́ onye gosipụtara okwukwe, iguzosi ike n’ihe, na nraranye pụrụ iche. Mgbe e kenyere ya ọrụ yiri nnọọ ka ọ̀ karịrị ya akarị, Mozis jụrụ, sị: “Ònye ka m bụ?” (Ọpụpụ 3:11) O yiri ka azịza o bu n’obi bụ, ‘Ọ dịghị onye m bụ!’ ma ọ bụ ‘Erughị m eru!’ Ihe ụfọdụ banyere nzụlite Mozis pụrụ imewo ka o chee na ya erughị eru: Mba ya bụ ndị ohu. Ndị Izrel ajụla ya. Ọ bụghịkwa ọkà okwu. (Ọpụpụ 1:13, 14; 2:11-14; 4:10) Ọ bụ onye na-azụ atụrụ, bụ́ ọrụ ndị Ijipt na-asọ oyi. (Jenesis 46:34) Ka a sịkwa ihe mere o ji chee na ya erughị eru ịtọhapụ ndị Chineke nọ n’ohu!
9 Jehova mesiri Mozis obi ike site n’ikwe ya nkwa abụọ siri ike, sị: “Mụ na gị ga-anọ; nke a bụkwaara gị ihe ịrịba ama na Mụ onwe m ezigawo gị: mgbe ị ga-emeworị ka ndị m si n’Ijipt pụta, unu ga-efe Chineke n’elu ugwu a.” (Ọpụpụ 3:12) Chineke nọ na-agwa ohu ya obi na-esichaghị ike na Ya ga-anọnyere ya mgbe nile. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova nọ na-egosi na ya ga-anapụtarịrị ndị ya. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Chineke ekwewo nkwa ndị yiri ndị ahụ inyere ndị ya aka. Dị ka ihe atụ, site n’ọnụ Mozis, ọ gwara mba Izrel ka ha nọ na-ejikere ịba n’Ala Nkwa ahụ, sị: “Dịnụ ike, nweekwanụ ume, . . . Jehova, bụ́ Chineke gị, ya onwe ya bụ onye gị na ya na-eje; Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị.” (Deuterọnọmi 31:6) Jehova mesikwara Jọshụa obi ike, sị: “Ọ dịghị nwoke ọ bụla ga-eguzo onwe ya n’ihu gị ụbọchị nile nke ndụ gị: . . . M ga-anọnyere gị: M gaghị aha gị aka, M gaghị ahapụkwa gị.” (Joshua 1:5) Ọ na-ekwekwa Ndị Kraịst nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Inwe nkwado siri ike dị otú ahụ kwesịrị ime ka anyị na-anya isi na anyị bụ Ndị Kraịst!
10, 11. Olee otú e si nyere onye Livaị bụ́ Esaf aka inwe echiche ziri ezi banyere uru ozi ọ na-ejere Jehova bara?
10 Ihe dị ka narị afọ ise ka Mozis nwụsịrị, otu onye Livaị kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Esaf dere n’ezoghị ọnụ banyere obi abụọ o nwere n’uru dị n’ịgbaso ụzọ ziri ezi. Ka ọ na-adọga ijere Chineke ozi n’agbanyeghị ule na ọnwụnwa, Esaf hụrụ na ụfọdụ ndị na-akwa Chineke emo na-enwe ike ma na-enwe ihe ịga nke ọma karị. Olee otú nke a si metụta Esaf? “Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwa ntịị ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha,” ka o kwetara. “Nzọụkwụ m fọdụrụ nke nta ka ha gbụchapụ. N’ihi na ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ.” Ọ malitere inwe obi abụọ banyere uru dị n’ịbụ onye na-efe Jehova. “Ọ bụ nanị n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, n’efu ka m kwọworo ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ,” ka Esaf chere. ‘Abụkwa m onye a na-eti ihe ogologo ụbọchị nile.’—Abụ Ọma 73:2, 3, 13, 14.
11 Gịnị ka Esaf mere banyere echiche ndị a nọ na-enye ya nsogbu n’obi? Ò mere ka à ga-asị na ya enweghị echiche ndị ahụ? Ee e. Ọ kọọrọ ha Chineke n’ekpere, dị ka anyị na-ahụ n’Abụ Ọma nke 73. Ọ bụ mgbe Esaf gara n’ebe nsọ nke ụlọ nsọ ka echiche ya gbanwere. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, ọ ghọtara na ụzọ ndụ nke nsọpụrụ Chineke ka bụ ụzọ kasị mma. N’ịbụ onye e nyeere aka ijirighachi ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ọ ghọtara na Jehova kpọrọ ihe ọjọọ asị nakwa na ndị ajọ omume ga-enweta ntaramahụhụ mgbe oge ya ruru. (Abụ Ọma 73:17-19) Ka ọ gbanwesịrị echiche ya, Esaf ghọtakwuru ihe ùgwù o nwere dị ka ohu Jehova. Ọ gwara Chineke, sị: “Mụ onwe m nọ n’aka Gị mgbe nile: I jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ Gị na-edu m, e mesịa Ị ga-ejikwa nsọpụrụ nara m.” (Abụ Ọma 73:) Esaf maliteghachiri iji Chineke ya akpa nganga.— 23, 24Abụ Ọma 34:2.
Ha Ghọtara Ụdị Ndị Ha Bụ nke Ọma
12, 13. Nye ihe atụ nke ndị a kpọtụrụ aha na Bible bụ́ ndị jiri mmekọrịta ha na Chineke kpaa nganga.
12 Otu ụzọ isi ghọtakwuo ọnọdụ anyị dị ka Ndị Kraịst bụ inyocha na iṅomi okwukwe nke ndị ji iguzosi ike n’ihe fee Chineke, bụ́ ndị ji nnọọ mmekọrịta ha na Chineke kpaa nganga n’agbanyeghị ihe isi ike. Tụlee ihe banyere Josef, bụ́ nwa Jekọb. Mgbe ọ ka dị obere, e jiri aghụghọ ree ya ịbụ ohu ma kpọga ya Ijipt, bụ́ ebe dị ọtụtụ narị kilomita site n’ebe nna ya na-atụ egwu Chineke nọ na ebe na-eyitụghị ezinụlọ ya bụ́ ebe e nwere ịhụnanya na nkwado. Ka ọ nọ n’Ijipt, Josef enweghị mmadụ ọ bụla ọ ga-agakwuru maka ndụmọdụ kwekọrọ n’uche Chineke, o chekwara ọnọdụ ndị siri ike ihu bụ́ ndị lere omume ọma ya na ndabere ọ dabeere n’ebe Chineke nọ ule. Otú ọ dị, o tinyere mgbalị pụtara ìhè iji nọgide na-aghọta ọnọdụ ya dị ka ohu Chineke, ọ nọgidekwara na-eme ihe ọ maara na o ziri ezi. O ji ịbụ onye na-efe Jehova ọbụna n’ebe siri ike kpaa nganga, ihere emeghịkwa ya ikwupụta mmetụta ya.—Jenesis 39:7-10.
13 Narị afọ asatọ ka e mesịrị, otu nwata nwanyị Izrel a dọọrọ n’agha bụ́ onye ghọọrọ ọchịagha Siria bụ́ Neeman ohu echefughị na ya bụ onye na-efe Jehova. Mgbe ohere ya dapụtara, ọ gbara àmà n’atụghị egwu banyere Jehova mgbe o mere ka a mata Ịlaịsha dị ka onye amụma nke ezi Chineke ahụ. (2 Ndị Eze 5:1-19) Ọtụtụ afọ ka nke ahụ gasịrị, Eze Josaịa ka na-eto eto, n’agbanyeghị na ọ na-etolite n’ebe rụrụ arụ, mere mgbanwe buru ibu n’ihe metụtara okpukpe, rụzie ụlọ nsọ Chineke ma mee ka mba ahụ laghachikwute Jehova. O ji okwukwe na ofufe ya kpaa nganga. (2 Ihe E Mere, isi 34, 35) Ọ dịtụghị mgbe Daniel na ndị Hibru ibe ya atọ nọ na Babilọn chefuru na ha bụ ndị ohu Jehova, ọbụna mgbe a na-arụgide ha ma na-ele ha ule, ha nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’ụzọ doro anya, ha ji ịbụ ndị ohu Jehova kpaa nganga.—Daniel 1:8-20.
Jiri Ụdị Onye Ị Bụ Na-akpa Nganga
14, 15. Gịnị ka iji Ndị Kraịst anyị bụ anya isi gụnyere?
14 Ndị ohu Chineke ndị a nwere ihe ịga nke ọma n’ihi na ha jiri nguzo ha n’ihu Chineke kpaa nganga n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Gịnị banyere anyị taa? Gịnị ka iji Ndị Kraịst anyị bụ anya isi na-agụnye?
15 N’ụzọ bụ́ isi, nke a na-agụnye inwe ekele dị ukwuu n’ihi ịbụ otu n’ime ndị a kpọkwasịrị aha Jehova, ndị na-enweta ngọzi na nnwapụta ya. Chineke enweghị obi abụọ ọ bụla banyere ndị bụ́ ndị nke ya. Pọl onyeozi, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge e nwere nnọọ mgbagwoju anya n’ihe banyere okpukpe dere, sị: “Jehova maara ndị bụ ndị ya.” (2 Timoti 2:19; Ọnụ Ọgụgụ 16:5) Jehova na-eji “ndị bụ ndị ya” akpa nganga. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m].” (Zekaraịa 2:8) O doro anya na Jehova hụrụ anyị n’anya. N’aka nke ọzọ, mmekọrịta nke anyị na ya kwesịrị ịdabere n’ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe ọ nọ. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya, onye a bụ onye Ọ maara.”—1 Ndị Kọrint 8:3.
16, 17. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst, ma nwata ma okenye, pụrụ iji jiri ihe nketa ime mmụọ ya na-akpa nganga?
16 Ndị na-eto eto a zụlitere dị ka Ndịàmà Jehova kwesịrị inyocha ma ihe e ji mara ha dị ka Ndị Kraịst ọ̀ na-apụtakwu ìhè n’ihi mmekọrịta nke ha na Chineke. Ha apụghị ịdabere nanị n’okwukwe nke ndị mụrụ ha. Banyere ohu Chineke nke ọ bụla, Pọl dere, sị: “N’ebe nna ya ukwu nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada.” N’ihi ya, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:4, 12) O doro anya na iji obi abụọ na-agbaso omenala ezinụlọ nke ijere Chineke ozi apụghị inyere mmadụ aka ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya nke na-adịte aka.
17 N’akụkọ ihe mere eme nile, e nwewo ọtụtụ ndị àmà Jehova. Ọ malitere site na nwoke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebel—ihe dị ka narị afọ iri isii gara aga—ruo ‘n’oké ìgwè’ nke Ndịàmà nke oge a, ọ ga-erukwa n’ọtụtụ ìgwè nke ndị na-efe Jehova bụ́ ndị ga-adị ndụ agwụghị agwụ n’ọdịnihu. (Mkpughe 7:9; Ndị Hibru 11:4) Ọ bụ anyị bụ ndị dị ndụ taa n’ime ọtụtụ ndị a feworo Jehova eri ọtụtụ ọgbọ. Lee ihe nketa ime mmụọ bara ụba anyị nwere!
18. Olee otú ụkpụrụ anyị si eme ka anyị dị iche n’ebe ụwa dị?
18 Ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst na-agụnyekwa ihe ndị anyị ji akpọrọ ihe, àgwà, ụkpụrụ, na omume ndị na-egosi na anyị bụ Ndị Kraịst. Ọ bụ ya bụ “Ụzọ Ahụ,” nanị ụzọ nke ga-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ na ụzọ isi mee ihe na-amasị Chineke. (Ọrụ 9:2; Ndị Efesọs 4:22-24) Ndị Kraịst ‘na-anwapụta ihe nile’ ma ‘na-ejisi aka ike n’ihe dị mma’! (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Anyị ghọtara nke ọma ọdịiche dị n’etiti Iso Ụzọ Kraịst na ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Jehova mere ka ọdịiche dị n’etiti ezi ofufe na ofufe ụgha doo anya. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị, o kwuru, sị: “Unu ga-alaghachikwa hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.”—Malakaị 3:18.
19. Gịnị ka ezi Ndị Kraịst na-agaghị aghọ?
19 Ebe ọ bụ na iji Jehova anya isi dị oké mkpa n’ụwa a nke nọ ná mgbagwoju anya, gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-eji Chineke anyị akpa nganga n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma na-ejigidesi ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst ike? Aro ndị na-enye aka dị n’isiokwu na-esonụ. Ka ị na-atụle ha, ị pụrụ ijide nke a n’aka: Ọ dịghị mgbe ezi Ndị Kraịst ga-abụ ndị ‘na-enweghị mmasị na Chineke.’
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi ‘jiri Jehova na-anya isi’?
• Gịnị ka ị mụtaworo site n’ihe atụ Mozis na nke Esaf?
• Olee ndị a kpọtụrụ aha na Bible bụ́ ndị jiri ozi ha jeere Chineke kpaa nganga?
• Gịnị ka iji Ndị Kraịst anyị bụ anya isi gụnyere?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 14]
Ruo oge ụfọdụ, Mozis nwere obi abụọ banyere onwe ya
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova n’oge ochie jiri ofufe ha na-efe Chineke kpaa nganga