Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye Kraịst ò kwesịrị inye onye ọrụ gọọmenti ego mmiri oyi ma ọ bụ onyinye n’ihi ozi ndị ọ na-eje, ka à ga-ele nke ahụ anya dị ka inye ihe iri ngo?

N’ebe ọ bụla ha bi, Ndị Kraịst na-agbalị igosipụta ezi amamihe mgbe ha na-eme ihe banyere ọnọdụ ndị e nwere n’ebe ahụ, na-echeta na ihe a na-anakwere na ihe iwu kwadoro n’ala ụfọdụ pụrụ ịbụ ihe a na-adịtụghịdị anakwere na ihe megidere iwu n’ala ọzọ. (Ilu 2:6-9) N’eziokwu, Onye Kraịst kwesịrị iburu n’uche mgbe nile na onye ọ bụla chọrọ ịbụ “ọbịa n’ụlọikwuu [Jehova]” aghaghị izere inye ihe iri ngo.—Abụ Ọma 15:1, 5; Ilu 17:23.

Gịnị bụ inye ihe iri ngo? Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, “inye ihe iri ngo pụtara inye onye na-arụrụ ọha na eze ọrụ ihe bara uru . . . bụ́ onye n’aka nke ya na-eme ihe megidere ọrụ ya ma ọ bụ ihe iwu na-akwadoghị iji menyere onye ahụ nyere ya ihe.” Ya mere, n’agbanyeghị ebe mmadụ bi, inye ọkàikpe ma ọ bụ onye uwe ojii ego ma ọ bụ onyinye iji mee ka ha kpee ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ inye onye bịara ime nnyocha ego iji mee ka o leghara ihe na-adịghị mma ma ọ bụ iwu a dara anya bụ inye ihe iri ngo. Mmadụ inye onyinye ka e wee menyere ya, dị ka idenye aha ya tupu nke ndị bu ya ụzọ ma ọ bụ iji gafere ndị ọzọ n’ahịrị bụkwa inye ihe iri ngo. Omume dị otú ahụ na-egosipụtakwa enweghị ịhụnanya.—Matiu 7:12; 22:39.

Ma inye, dị ka ihe atụ, onye na-arụrụ ọha na eze ọrụ onyinye ma ọ bụ ego mmiri oyi ka o wee jeere gị ozi iwu kwadoro ma ọ bụ iji zere mmeso na-adịghị mma ọ̀ bụ inye ihe iri ngo? Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ndị ọrụ gọọmenti pụrụ ịdị na-ala azụ idebanye aha ụmụaka n’ụlọ akwụkwọ, inye mmadụ àkwà n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụ isu stamp n’akwụkwọ ikike ịkwaga mba ọzọ ọ gwụla ma è nyere ha ego mmiri oyi. Ma ọ bụ ha pụrụ ịdị na-egbu oge n’ilebara akwụkwọ ndị mmadụ dejupụtara iji gbanwee akwụkwọ ikike ha anya.

Inye ego mmiri oyi na otú ndị mmadụ si ele ya anya dịgasị iche site n’otu mba ruo n’ọzọ. N’ebe ndị a na-akwụkarị ụgwọ dị otú ahụ ma ọ bụ n’ebe a na-atụ anya ya, ụfọdụ Ndị Kraịst pụrụ iche na ebe ọ na-adịghị iwu o megidere, na ha adịghị emebi ụkpụrụ Bible mgbe ha nyere onye ọrụ gọọmenti ego mmiri oyi iji rụọ ọrụ ya. N’ala ụfọdụ, ndị mmadụ pụrụ ọbụna ile ịkwụ ụgwọ dị otú ahụ anya dị ka onyinye iji tụkwasị ihe n’ego dị ala a na-akwụ ndị ọrụ ọha na eze. Buru n’uche na e nwere ihe dị iche n’inye onyinye maka ọrụ iwu kwadoro na inye ihe iri ngo iji nweta ihu ọma n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

N’aka nke ọzọ, mgbe ha na-arịọ maka ihe ndị iwu kwadoro, ụfọdụ Ndịàmà Jehova ajụwo inye ndị na-eme nnyocha, ndị na-ahụ maka mbupụ na mbubata ngwá ahịa, ma ọ bụ ndị ọzọ ego mmiri oyi, ọbụnadị n’ebe inye onyinye dị otú ahụ bụ ihe a na-emekarị. N’ihi na a maara Ndịàmà n’ebe ha bi maka nguzo a kwekọrọ n’akọ na uche ha nakwa maka ime ihe n’eziokwu, mgbe ụfọdụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-emeso ha ihe otú a ga-esi mesoo ndị ọzọ nanị mgbe ndị ahụ kwụrụ ụgwọ.—Ilu 10:9; Matiu 5:16.

Ná nchịkọta, onye nke ọ bụla na-ejere Jehova ozi aghaghị ikpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-enye ego mmiri oyi iji mee ka e jeere ya ozi iwu kwadoro ma ọ bụ iji zere mmeso ọjọọ. Nke kasị mkpa, o kwesịrị ime ihe na-agaghị enye akọ na uche ya nsogbu, nke na-agaghị ewetara aha Jehova nkọcha, na nke na-agaghị ewetara ndị ọzọ ihe mkpọbi ụkwụ.—Matiu 6:9; 1 Ndị Kọrint 10:31-33; 2 Ndị Kọrint 6:3; 1 Timoti 1:5.