Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Ihe Mere Eme nke Bible Olee Otú O ziruru Ezi?

Akụkọ Ihe Mere Eme nke Bible Olee Otú O ziruru Ezi?

Akụkọ Ihe Mere Eme nke Bible Olee Otú O ziruru Ezi?

N’AKWỤKWỌ ha bụ́ Battles of the Bible, Chaim Herzog, onye bụ́bu president nke mba Izrel, na Mordechai Gichon, bụ́ prọfesọ nke nkà mmụta ihe ochie na Mahadum Tel Aviv bụ́ onye larala ezumike nká, kwuru ihe na-esonụ:

“A pụghị ikwu na atụmatụ ndị e ji buo agha ndị e dekọrọ na Bible . . . bụ ndị e chepụtara echepụta. Dị ka ihe atụ, nanị iji agha Gidiọn busoro ndị Midian na ndị ha na ha gbakọrọ aka, dị ka e dekọrọ ya ná Ndị Ikpe, 6-8, tụnyere ihe ndị mere n’Agha Trojan, bụ́ nke Homer kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Iliad ezuola iji gosipụta nke a. A pụrụ ikwu na a lụrụ Agha Trojan n’ụsọ oké osimiri ọ bụla mmadụ pụrụ ịga na ya ma ọ bụ sị na a nọ n’obodo ọ bụla e wusiri ike dị nso lụọ ya . . . Ihe ndekọ Bible banyere agha Gidiọn adịghị otú ahụ. A pụghị nnọọ ikwu na a nọ ebe ọzọ lụọ agha ahụ n’ihi ọdịdị dịgasị iche nke ebe ndị a nọ lụọ ya na ihe ndị ahụ na-eburịta agha mere—agha nke a lụrụ ruo ihe dị ka kilomita iri isii . . . N’ihi ya, anyị pụrụ ikwu na ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime karịa ịnakwere otú Bible kwuru e si lụọ agha ahụ dị ka eziokwu.”

Ị pụrụ ịmụ banyere agha Gidiọn site n’iji map dị na peeji nke 18 na 19 nke broshuọ nwere map ndị e ji akọwa ihe bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ.’ * Akụkọ ahụ malitere mgbe ‘ndị Midian nile na ndị Amalek na ụmụ Ihu Anyanwụ chịkọtara onwe ha, gabiga, maa ụlọikwuu ha na ndagwurugwu Jezril.’ Gidiọn kpọkuru ebo dị iche iche nọ ha nso maka enyemaka. Agha ahụ malitere n’olulu mmiri Herọd ruo n’ugwu More, mgbe ahụ rutezie Ndagwurugwu Jọdan. Mgbe ọ chụsịịrị ndị iro ahụ gafere Osimiri Jọdan, Gidiọn meriri ha.—Ndị Ikpe 6:33–8:12.

Map ahụ dị na ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ na-egosi ebe dị iche iche bụ́ isi a kpọtụrụ aha na otú ha dị. Map ọzọ (peeji nke 15) na-egosi ókèala nke ebo dị iche iche nke Izrel. Map abụọ ahụ pụrụ inyere gị aka ịghọta na ihe ndị Bible kwuru ziri ezi.

Nke a bụ ihe atụ nke ihe Prọfesọ Yohanan Aharoni nwụrụ anwụ kwuru: “N’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible, ọdịdị mbara ala na akụkọ ihe mere na-aga nnọọ ụkwụ na ụkwụ nke na a pụghị ịghọta otu n’ezie n’atụleghị ibe ya.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Map dị n’azụ: Ọ dabeere na map ndị Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel ji ikike mbipụtaghachi ha