Okwukwe Gị Ọ̀ Na-akwali Gị Ime Ihe?
Okwukwe Gị Ọ̀ Na-akwali Gị Ime Ihe?
ONYEISI ndị agha ahụ kwetara na Jizọs nwere ike ịgwọ ọrịa ahụ́ mkpọnwụ nke ohu ya. Ma onyeisi ndị agha ahụ akpọghị Jizọs òkù ịbịa n’ụlọ ya n’ihi na o chere na ya erughị eru ma ọ bụ n’ihi na ọ bụ onye Jentaịl. Kama nke ahụ, onyeisi ahụ gwara ụfọdụ ndị okenye nke ndị Juu ka ha gakwuru Jizọs ma gwa ya, sị: “Nna anyị ukwu, erughị m eru ka ị bata n’ụlọ m, kama nanị kwuo ya, nwoke na-ejere m ozi ga-abụkwa onye a gwọrọ.” Mgbe Jizọs hụrụ na onyeisi ndị agha ahụ kweere na ya pụrụ ịgwọ ọrịa ọbụna site n’ebe dị anya, ọ gwara ìgwè mmadụ so ya n’azụ, sị: “Ana m agwa unu eziokwu, Ahụbeghị m onye nwere okwukwe dị ukwuu otú a n’Izrel.”—Matiu 8:5-10; Luk 7:1-10.
Ahụmahụ a pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya n’otu eziokwu bụ́ isi banyere okwukwe. Ezi okwukwe abụghị nanị ikwere ihe; a na-eji ọrụ esochi ya. Jems onye so dee Bible kọwara, sị: “Okwukwe, ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, nwụrụ anwụ n’onwe ya.” (Jems 2:17) Eziokwu a na-apụtakwu ìhè ọbụna karị mgbe anyị tụlere ihe atụ nke ihe pụrụ nnọọ ime mgbe okwukwe na-adịghịzi arụ ọrụ.
Ọpụpụ 19:3-6) Ee, ịdị nsọ nke mba Izrel dabeere ná nrubeisi.
Na 1513 T.O.A., ọgbụgba ndụ Iwu ahụ jikọtara Jehova Chineke na mba Izrel. Dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ahụ, Mozis gwara ụmụ Izrel okwu Chineke, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu [ga-abụkwa] mba dị nsọ.” (Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, ndị Juu malitere iwere ịmụ Iwu ahụ dị ka ihe dị oké mkpa karịa itinye ụkpụrụ ya n’ọrụ. N’akwụkwọ ya bụ́ The Life and Times of Jesus the Messiah, Alfred Edersheim dere, sị: “Ọ dịla anya ndị [rabaị]—ndị ‘ukwu nke ụwa’ kpebiri ya, na ịmụ ihe dị mkpa karịa itinye ya n’ọrụ.”
N’eziokwu, e nyere ụmụ Izrel oge ochie iwu iji ịdị uchu mụọ ihe ndị Chineke na-achọ. Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ma, ọ̀ dị mgbe Jehova bu n’obi na a ga-ewere ịmụ Iwu ahụ dị ka ihe dị mkpa karịa ime ihe kwekọrọ na ya ma ọ bụ ihe o kwuru? Ka anyị hụ.
Oké Ọmụmụ Ihe
Iwere ịmụ Iwu ahụ dị ka ihe dị oké mkpa pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya n’anya ụmụ Izrel ebe ọ bụ na otu ozizi ọdịbendị nke ndị Juu na-ekwu na Chineke n’onwe ya na-eji awa atọ amụ Iwu ahụ kwa ụbọchị. Ị pụrụ ịhụ ihe mere ndị Juu ụfọdụ nwere ike iji na-eche, sị, ‘Ya bụrụ na Chineke na-amụ Iwu ahụ mgbe nile, ọ̀ bụ na ihe ndị o kere eke n’ụwa ekwesịghị itinye oge ha nile n’ime otu ihe ahụ?’
Ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., oké mmasị ndị rabaị nwere n’ịtụrisị na ịkọwa Matiu 23:2-4) Ndị ndú okpukpe ahụ ji ụmụ irighiri iwu na ụkpụrụ bogbuo ndị nkịtị, ma ha onwe ha ji ihu abụọ chọta ihe ndị ha ga-eji zere idebe otu iwu ndị ahụ. Ọzọkwa, ndị ikom ahụ bụ́ ndị lekwasịrị anya nanị n’oké ọmụmụ nke iwu ahụ “na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.”— Matiu 23:16-24.
Iwu ahụ agwagbuola echiche ha kpamkpam. Jizọs kwuru, sị: “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii . . . na-ekwu ma ha adịghị eme. Ha na-ekekọta ibu dị arọ ma dọkwasị ha n’ubu ndị mmadụ, ma ha onwe ha adịghị achọ iji mkpịsị aka ha enutụ ha.” (Lee ihe na-ekwekọghị ekwekọ ọ bụ na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-emebi otu Iwu ahụ ha na-azọrọ na ha na-edebe, site n’ịchọ ime ka ezi omume nke ha pụta ìhè! Ọtụtụ narị afọ ha ji rụọ ụka banyere okwu na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ dị n’Iwu ahụ emeghị ka ha bịarukwuo Chineke nso. Ihe siri na ya pụta yiri ihie ụzọ ahụ siri n’ihe Pọl onyeozi kpọrọ “okwu nzuzu,” “ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha” na “ihe ọmụma” n’ụzọ ụgha, pụta. (1 Timoti 6:20, 21) Otú ọ dị, nnukwu nsogbu ọzọ bụ mmetụta nke nnyocha ndị na-adịghị agwụ agwụ ha na-eme na-enwe n’ahụ́ ha. Ha enweghị ụdị okwukwe ahụ nwere ike ịkwali ha ime ihe ziri ezi.
Uche Na-aghọ Nkọ, Obi Na-enweghị Okwukwe
Lee ka echiche ndị ndú okpukpe ndị Juu si dị iche na nke Chineke! Obere oge tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis gwara ha, sị: “Tụkwasị obi unu n’okwu nile nke mụ onwe m na-agbara unu àmà taa; nke unu ga-enye ụmụ unu n’iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.” (Deuterọnọmi 32:46) N’ụzọ doro anya, ndị Chineke agaghị abụ nanị ndị ji ịdị uchu na-amụ Iwu ahụ, kama ndị na-edebe ya.
Otú ọ dị, ugboro ugboro, mba Izrel ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova. Kama ịrụ ọrụ ndị ziri ezi, ụmụ Izrel “ekweghịkwa Ya, [ha] egeghịkwa ntị n’olu Ya.” (Deuterọnọmi 9:23; Ndị Ikpe 2:15, 16; 2 Ihe E Mere 24:18, 19; Jeremaịa 25:4-7) N’ikpeazụ, ndị Juu mere omume kasị njọ nke na-egosi ekwesịghị ntụkwasị obi site n’ịjụ Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. (Jọn 19:14-16) N’ihi ya, Jehova Chineke jụrụ Izrel ma chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ.—Ọrụ 13:46.
N’ezie, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya ka anyị ghara ịdaba n’otu ọnyà ahụ—na-eche na anyị nwere ike iji uche na-aghọ nkọ na obi na-enweghị okwukwe fee Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọmụmụ Bible anyị ekwesịghị ịbụ nanị iji nweta ihe ọmụma. Ezi ihe ọmụma aghaghị iru n’obi anyị iji nwee mmetụta dị mma ná ndụ anyị. Ọ̀ bara uru ịmụ otú e si akụ mkpụrụ ma ghara ịkụ mkpụrụ ọ bụla? N’eziokwu, anyị pụrụ inweta ihe ọmụma ụfọdụ banyere otú e si akụ mkpụrụ, ma anyị agaghị aghọrọ mkpụrụ ọ bụla! N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị na-amụ banyere ihe ndị Chineke chọrọ n’aka ha site n’ịmụ Bible aghaghị ikwe ka mkpụrụ nke eziokwu ahụ ruo n’obi ha, ka mkpụrụ ndị ahụ wee topụta ma kwalie ha ime ihe.—Matiu 13:3-9, 19-23.
“Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Ahụ”
Pọl onyeozi kwuru na “okwukwe na-esochi ihe a na-anụ.” (Ndị Rom 10:17) Ọganihu a na-esochi nnọọ onwe ya site n’ịnụ Okwu Chineke ruo n’igosipụta okwukwe n’Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, na-eme ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ee, a chọrọ ihe karịrị nanị ikwu, sị, ‘Ekweere m na Chineke, kwerekwa na Kraịst.’
Jizọs gbara ụmụazụ ya ume inwe ụdị okwukwe ahụ nke ga-akwali ha ime ihe: “A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 15:8) Ka e mesịrị, onye otu nne ji ya na Jizọs, bụ́ Jems, dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghịkwa ndị na-anụ nanị ọnụnụ.” (Jems 1:22) Ma, olee otú anyị pụrụ isi mara ihe anyị ga-eme? Site n’okwu na ihe nlereanya, Jizọs gosiri ihe ọ dị mkpa ka anyị na-eme iji mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rụsiri ọrụ ike iji kwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na iji mee ka aha Nna ya nke eluigwe dị ebube. (Jọn 17:4-8) N’ụzọ dị aṅaa? Ọtụtụ mmadụ pụrụ icheta ọrụ ebube Jizọs nke ịgwọ ndị ọrịa na ndị ngwụrọ. Ma Oziọma Matiu mere ka ụzọ ahụ bụ́ isi doo anya: “Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ.” N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, Jizọs emeghị ka ozi ya bụrụ nanị izi ndị enyi ole na ole, ma ọ bụ ndị agbata obi, ozi mberede. O mere mgbalị siri ike, na-eji ohere ọ bụla o nwere eleta ndị mmadụ na “Galili dum.”—Matiu 4:23, 24; 9:35.
Jizọs nyekwara ụmụazụ ya ntụziaka ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. N’ezie, o setịpụụrụ ha ihe nlereanya zuru okè ha ga-agbaso. (1 Pita 2:21) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
N’eziokwu, ikere òkè n’ọrụ nkwusa na-eweta nnọọ ihe ịma aka. Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Lee! Ana m ezipụ unu dị ka ụmụ atụrụ n’etiti nkịta ọhịa.” (Luk 10:3) Mgbe anyị zutere mmegide, ọchịchọ ebumpụta ụwa anyị bụ ịsụla azụ iji zere mwute ma ọ bụ nchegbu na-enweghị isi. Ọ bụ ihe mere n’abalị ahụ e jidere Jizọs. Ndịozi ya gbalagara n’ihi ụjọ. Ka e mesịrị n’abalị ahụ, Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ.—Matiu 26:56, 69-75.
Ọzọkwa, ọ pụrụ iju gị anya ịmata na ọbụna Pọl onyeozi kwuru na ya onwe ya gbara mgba iji kwusaa ozi ọma ahụ. O degaara ọgbakọ dị na Tesalonaịka akwụkwọ, sị: “[Anyị nwere] nkwuwa okwu site na Chineke anyị iji oké ịgba mgba gwa unu ozi ọma Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:1, 2.
Pọl na ndịozi ibe ya nwere ike imeri ụjọ ọ bụla ha nwere nke ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke, ị pụkwara imeri ya. N’ụzọ dị aṅaa? Nzọụkwụ kasị mkpa iwere bụ ịdabere na Jehova. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike na Jehova, okwukwe anyị ga-akwali anyị ime ihe, anyị ga-enwekwa ike ime uche ya—Ọrụ 4:17-20; 5:18, 27-29.
Ụgwọ Ọrụ Dịịrị Ọrụ Unu
Jehova maara nke ọma mgbalị anyị na-eme ijere ya ozi. Dị ka ihe atụ, ọ maara mgbe anyị na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe ike gwụrụ anyị. Ọ mara mgbe ụjọ na-atụ anyị na mgbe obi na-esighị anyị ike. Mgbe nsogbu ego na-anyịgbu anyị ma ọ bụ mgbe ọnọdụ ahụ́ ike ma ọ bụ ọnọdụ mmetụta uche anyị yiri ka hà adịghị otú anyị tụrụ anya ya, Jehova na-anọgide na-echebara ọnọdụ anyị echiche.—2 Ihe E Mere 16:9; 1 Pita 3:12.
Lee obi ụtọ Jehova na-aghaghị inwe ma ọ bụrụ na okwukwe anyị akwalie anyị ime ihe n’agbanyeghị ezughị okè anyị na ihe isi ike ndị anyị na-enwe! Mmetụta dị nro Jehova nwere n’ahụ́ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi abụghị mmetụta nkịtị—ọ na-egosipụta ya site ná nkwa ya. Site n’ike mmụọ nsọ Chineke, Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.”— Ndị Hibru 6:10.
Ị pụrụ ịtụkwasị obi n’otú Bible siri kọwaa Jehova dị ka “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume,” nakwa dị ka “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Deuterọnọmi 32:4; Ndị Hibru 11:6) Dị ka ihe atụ, otu nwanyị bi na California, U.S.A., na-echeta, sị: “Papa m jere ozi dị ka onye ozi oge nile ruo afọ iri tupu ya enwee ezinụlọ nke ya. Ọ na-atọ m ụtọ mgbe ọ na-akọrọ m otú Jehova siri kwagide ya n’ozi ya. Ọtụtụ mgbe, ọ na-eji ego ikpeazụ o nwere azụ mmanụ ụgbọala iji nwee ike ịga ozi ọma. Mgbe ọ lọtara ozi, ọ na-ahụkarị nri ọ na-atụghị anya ya n’ọnụ ụzọ ya.”
Tụkwasị ná nkwado anụ ahụ́, “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile” na-enye anyị nkwado n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 1:3) Otu Onyeàmà nke nagiderela ọtụtụ ule n’ime afọ ndị gaferelanụ na-ekwu, sị: “Ọ na-enye afọ ojuju ịdabere n’ebe Jehova nọ. Ọ na-eme ka ị tụkwasị Jehova obi ma hụ ka ọ na-enyere gị aka.” I nwere ike iji obi umeala gakwuru “Onye na-anụ ekpere,” na-enwe obi ike na ọ ga-elebara nchegbu ndị ị na-enwe anya.—Abụ Ọma 65:2.
Ngọzi na ụgwọ ọrụ nke ndị ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ na-enweta dị ọtụtụ. (Matiu 9:37, 38) Ikere òkè n’ikwusa ozi ọma emeela ka ọtụtụ ndị nwee ezi ahụ́ ike, ọ pụkwara imere gị otu ihe ahụ. Ma, nke kasị mkpa bụ na ịgbara ndị ọzọ àmà na-enyere anyị aka ime ka ezi mmekọrịta nke anyị na Chineke sikwuo ike.—Jems 2:23.
Nọgide Na-eme Ihe Ọma
Ọ ga-abụ ihie ụzọ otu n’ime ndị ohu Chineke ikwubi na Jehova ga-ewe iwe ma ọ bụrụ na ọrịa ma ọ bụ nká egbochie ya ime ihe nile ọ ga-achọ ime n’ozi. Otú ahụ kwa ka ọ dị banyere ndị ahụ́ na-esighị ike, ndị nwere ibu ọrụ ezinụlọ ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ.
Cheta na mgbe Pọl onyeozi chere na ọrịa ma ọ bụ ihe mgbochi na-adọla ya azụ, “ugboro atọ ka [ọ] rịọsiri Onyenwe anyị arịrịọ ike ka ihe a wee si n’ebe [ọ] nọ pụọ.” Kama ịgwọ Pọl ọrịa ya ka o wee nwee ike ịrụpụtakwu ihe n’ozi Jehova, Chineke kwuru, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:7-10) N’ihi ya, jide n’aka na n’agbanyeghị ihe isi ike ị na-edi, Nna gị nke eluigwe na-eji ihe ọ bụla i nwere ike ime iji kwalite ihe ndị metụtara ozi ya akpọrọ ihe.—Ndị Hibru 13:15, 16.
Onye Okike anyị na-ahụ n’anya adịghị atụ anyị anya n’aka ime ihe anyị na-agaghị emeli. Nanị ihe ọ na-achọ n’aka anyị bụ inwe ụdị okwukwe nke pụrụ ịkwali anyị ime ihe.
[Foto dị na peeji nke 26]
Nanị ịmụ Iwu ahụ ò zuru?
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ọ dị mkpa iji ọrụ sochie okwukwe anyị