Jehova Na-echebe Ndị Na-ele Anya Ya
Jehova Na-echebe Ndị Na-ele Anya Ya
“Ka ebere Gị na eziokwu Gị na-echezi m mgbe nile.”—Abụ Ọma 40:11.
1. Gịnị ka Eze Devid rịọrọ Jehova, oleekwa otú e si emezu ihe ahụ ọ rịọrọ ugbu a?
EZE DEVID nke Izrel oge ochie ‘lesiri anya Jehova ike,’ a kpalikwara ya ikwu na Jehova “tọọrọ [ya] ntị Ya n’ala, nụ ntiku [ya].” (Abụ Ọma 40:1) Ugboro ugboro, o jiri anya ya hụ otú Jehova si chebe ndị hụrụ Ya n’anya. Ya mere, Devid pụrụ ịrịọ ka Jehova na-echebe ya mgbe nile. (Abụ Ọma 40:11) N’ịbụ onye a gụnyere n’etiti ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị e kwere nkwa “mbilite n’ọnwụ ka mma,” Devid nọ ugbu a ná ncheta Jehova dị ka onye ga-enweta nkwụghachi ụgwọ ahụ. (Ndị Hibru 11:32-35) O si otú a nwee mmesi obi ike kasị mma na ọ ga-adịghachi ndụ n’ọdịnihu. E debara aha ya ‘n’akwụkwọ ncheta’ Jehova.—Malakaị 3:16.
2. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si enyere anyị aka ịghọta ihe mmadụ ịbụ onye Jehova chebere pụtara?
2 Ọ bụ ezie na ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi a kpọtụrụ aha ná Ndị Hibru isi 11 dịrị ndụ tupu Jizọs Kraịst ebie ndụ n’elu ala, ka o sina dị, ha biri ndụ kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziri mgbe o kwuru, sị: “Onye hụrụ mkpụrụ obi ya n’anya na-ebibi ya, ma onye kpọrọ mkpụrụ obi ya asị n’ụwa a ga-echebe ya maka ndụ ebighị ebi.” (Jọn 12:25) N’ihi ya, mmadụ ịbụ onye Jehova chebere apụtaghị nnọọ na onye ahụ ga-enwere onwe ya pụọ ná nhụjuanya na mkpagbu. Ma, ọ pụtara na a ga-echebe mmadụ n’ụzọ ime mmụọ ka o wee nwee ike ịnọgide na-enwe nguzo dị mma n’ihu Chineke.
3. Olee ihe àmà anyị nwere nke na-egosi na Jehova chebere Kraịst Jizọs, gịnịkwa si na ya pụta?
3 E ji obi ọjọọ kpagbuo ma kwutọọ Jizọs n’onwe ya, ndị iro ya mesịkwara mee ka ọ nwụọ nnọọ ọnwụ ihere na nke ihe mgbu. Ma, nke a emegideghị nkwa Chineke ichebe Mezaịa ahụ. (Aịsaịa 42:1-6) Mbilite n’ọnwụ Jizọs n’ụbọchị nke atọ ka ọ nwụsịrị ọnwụ ihere na-egosi na Jehova nụrụ arịrịọ ya maka enyemaka—dị nnọọ ka Jehova nụrụ nke Devid. N’ịza arịrịọ ahụ, Jehova nyere Jizọs ume iguzosi ike n’ezi ihe. (Matiu 26:39) N’ịbụ onye e si otú a chebe, Jizọs nwetara anwụghị anwụ n’eluigwe, ọtụtụ nde mmadụ bụ́kwa ndị gosipụtara okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ esorola ná ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi.
4. Mmesi obi ike dị aṅaa ka e nyere Ndị Kraịst e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ?
Jems 1:17) Ụmụnna Jizọs e tere mmanụ ka fọdụrụ n’ụwa, bụ́ ndị na-adịchakwaghị ọtụtụ, pụrụ ịtụkwasị obi ná nkwa Jehova, nke bụ́: “Ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi na nke a na-emerụghị emerụ na nke na-adịghị emebi emebi [ka] e debere . . . n’eluigwe maka unu, bụ́ ndị ike nke Chineke na-echebe site n’okwukwe maka nzọpụta nke a kwadebeworo ikpughe n’oge ikpeazụ.” (1 Pita 1:4, 5) “Atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, pụkwara ịtụkwasị obi na Chineke nakwa ná nkwa ahụ o kwere site n’ọnụ ọbụ abụ ahụ, nke bụ́: “Hụnụ Jehova n’anya, ndị ebere Ya nile: ọ bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ka Jehova na-echezi.”—Jọn 10:16; Abụ Ọma 31:23.
4 Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova dị nnọọ njikere, nweekwa ike ichebe ndị ohu ya ugbu a dị ka o mere n’oge Devid na Jizọs. (Ndị E Chebere n’Ụzọ Ime Mmụọ
5, 6. (a) Olee otú e sirila chebe ndị Chineke n’oge a? (b) Olee mmekọrịta dị n’etiti ndị e tere mmanụ na Jehova, oleekwa maka ndị nwere olileanya elu ala?
5 N’oge a, Jehova emeela ndokwa ichebe ndị ya n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị echebe ha pụọ ná mkpagbu ma ọ bụ ihe isi ike na ọdachi nke ndụ, o jirila iguzosi ike n’ihe nye ha nkwado na agbamume dị ha mkpa iji chebe mmekọrịta chiri anya nke ha na ya. Mmekọrịta a dabeere n’okwukwe ha nwere n’ihe mgbapụta ahụ Chineke ji ịhụnanya nye. E jirila mmụọ Chineke tee ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi mmanụ ịghọ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa n’eluigwe. A gụọla ha ná ndị ezi omume dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke, okwu ndị a metụtakwara ha: “Ọ gbapụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị ma wega anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya, bụ́ onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta na-atọhapụ anyị, bụ́ mgbaghara nke mmehie anyị.”—Ndị Kọlọsi 1:13, 14.
6 A na-emesi ọtụtụ nde Ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi obi ike na ha onwe ha kwa pụrụ irite uru site n’ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere. Anyị na-agụ, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi nakwa ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45) Ndị Kraịst ahụ na-atụ anya inweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” mgbe oge ya ruru. (Ndị Rom 8:21) Ka ọ dịgodị, ha ji ọbụbụenyi ha na Chineke kpọrọ ihe ma jiri obi ha nile na-agbalịsi ike ime ka mmekọrịta ahụ sikwuo ike.
7. Olee ụzọ Jehova si echebe ọdịmma ime mmụọ nke ndị ya taa?
7 Otu ụzọ Jehova si echebe ọdịmma ime mmụọ nke ndị ya bụ site n’ime ndokwa ka ha nọgide na-enweta ọzụzụ. Nke a na-eme ka o kwe ha omume inweta ihe ọmụma na-eziwanye ezi nke eziokwu. Jehova na-enyekwa nduzi na-aga n’ihu n’ihu site n’Okwu ya, nzukọ Matiu 24:45.
ya na mmụọ nsọ ya. N’ihi ịnara nduzi nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi,” ndị Chineke n’ụwa nile dị ka otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ. Òtù ohu ahụ na-ahụ maka mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ndị ohu Jehova, na ọbụna nke anụ ahụ́ ha mgbe ọ dị mkpa—n’agbanyeghị mba ha si ma ọ bụ ihe bụ́ ọnọdụ ha n’obodo.—8. Olee obi ike Jehova nwere n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nọ, mmesi obi ike dịkwa aṅaa ka ọ na-enye ha?
8 Dị ka Jehova na-echebeghị Jizọs n’ụzọ nkịtị pụọ n’aka ndị iro ya, Ọ dịghị echebe Ndị Kraịst n’ụzọ dị otú ahụ taa. Ma nke a adịghị apụta na obi adịghị Chineke mma n’ebe ha nọ. Ọ bụtụghị ihe ọ pụtara! Kama nke ahụ, ọ na-egosipụta obi ike o nwere na ha ga-adịnyere ya n’oké ihe iseokwu ahụ metụtara eluigwe na ala. (Job 1:8-12; Ilu 27:11) Jehova agatụghị ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya, “n’ihi na Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya; ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha.”—Abụ Ọma 37:28.
Ndị E Ji Ebere na Eziokwu Chebe
9, 10. (a) Olee otú eziokwu Jehova si echebe ndị ya? (b) Olee otú Bible si egosi na Jehova na-echebe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe site n’ebere ya?
9 N’ekpere ya e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 40, Devid rịọrọ ka ebere na eziokwu Jehova chebe ya. Eziokwu Jehova na ịhụnanya ya maka ezi omume chọrọ ka o kwupụta ihe ụkpụrụ ya bụ n’ụzọ doro anya. Ruo n’ókè dị ukwuu, a na-echebe ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a pụọ n’obi erughị ala, ụjọ na nsogbu nke ndị na-adịghị ebi ndụ kwekọrọ na ha na-enwe. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ichebe onwe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya pụọ n’ọtụtụ nsogbu ndị na-akpata obi mgbawa ma ọ bụrụ na anyị ezere ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè, inwe mmekọahụ aghara aghara na ibi ndụ ime ihe ike. Ọbụna ndị na-akpapụ n’ụzọ eziokwu nke Jehova—dị ka Devid mere mgbe ụfọdụ—nwere obi ike na Chineke ka bụkwa “ebe nzuzo” nye ndị mmehie chegharịrịnụ. Ndị dị otú ahụ pụrụ iji ọṅụ tie mkpu, sị: “Ị ga-echezi m ka m pụọ n’ahụhụ.” (Abụ Ọma 32:7) Lee ngosipụta nke ebere Chineke nke ahụ bụ!
10 Ihe atụ ọzọ nke ebere Chineke bụ na ọ na-adọ ndị ohu ya aka ná ntị ka ha nọgide na-anọpụ iche site n’ụwa a, bụ́ nke ọ ga-ebibi n’oge na-adịghị anya. Anyị na-agụ, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa.” Site n’ịnakwere ịdọ aka ná ntị a na ime ihe kwekọrọ na ya, anyị pụrụ ichebe ndụ anyị n’ụzọ nkịtị ruo mgbe nile ebighị ebi, n’ihi na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọzọkwa, ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:15-17.
Ndị E Ji Ikike Iche Echiche, Nghọta na Amamihe Chebe
11, 12. Kọwaa otú ikike iche echiche, nghọta na amamihe si echebe anyị.
11 E nyere nwa Devid bụ́ Solomọn ike mmụọ nsọ idegara ndị nwere olileanya inweta ihu ọma Chineke, sị: “Izuzu [ma ọ bụ “ikike iche echiche,” NW] ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.” Ọ gbakwara ume, sị: “Nweta amamihe . . . ahapụla ya, ọ ga-edebekwa gị; hụ ya n’anya, ọ ga-echebekwa gị.”—Ilu 2:11; 4:5, 6.
12 Anyị na-eji ikike iche echiche anyị eme ihe ma ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara site n’Okwu Chineke. Ime otú ahụ na-eme ka anyị nwetakwuo nghọta ka anyị wee nwee ike ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Nke a dị oké mkpa ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara—eleghị anya site n’ahụmahụ onwe onye—na nsogbu na-ebilite mgbe ndị mmadụ ma ụma bute ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ụzọ, ma ọ bụ mee otú ahụ n’amaghị ama. Ụwa Setan na-eche anyị akụ̀ na ụba, ịbụ ndị a ma ama na inwe ikike n’ihu, ebe Jehova na-agba anyị ume ịchụso ihe ime mmụọ bụ́ ndị ka mkpa. Ịghara iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe karịa nke anụ ahụ́ pụrụ itisa ezinụlọ, imebi ọbụbụenyi na ime ka mmadụ kwụsị ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Nke a pụrụ nnọọ ime ka mmadụ daba n’ọnọdụ ọjọọ ahụ Jizọs kwuru banyere ya mgbe ọ sịrị: “Olee uru ọ baara mmadụ irite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?” (Mak 8:36) Ihe amamihe na-achọ ka anyị mee bụ ịnakwere ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:33.
Ihe Ize Ndụ nke Ịghọ Onye Na-eche Nanị Banyere Onwe Ya
13, 14. Gịnị ka mmadụ iche nanị banyere onwe ya pụtara, oleekwa ihe mere o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịghọ onye dị otú ahụ?
13 Àgwà nke mmadụ inwe mmasị n’onwe ya bụ ihe ụmụ mmadụ bu pụta ụwa. Otú ọ dị, mgbe ọchịchọ na mmasị onwe onye ghọrọ ihe kasị mkpa ná ndụ, nsogbu na-adị. N’ihi ya, iji chebe ọbụbụenyi anyị na Jehova, ọ na-agwa anyị ka anyị zere ịdị na-eche nanị banyere onwe anyị. Nke a pụtara mmadụ “ịdị na-eche nnọọ nanị banyere ọchịchọ, mkpa ma ọ bụ ihe ndị na-amasị ya.” Ọ̀ bụ na nke a adịghị akọwa kpọmkwem ihe ọtụtụ mmadụ taa na-eme? N’ụzọ dị ịrịba ama, Bible na-ebu amụma na “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe 2 Timoti 3:1, 2.
Setan, “ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya,” ma ọ bụ ndị nwere mmasị nanị n’ebe onwe ha nọ.—14 Ndị Kraịst ghọtara na amamihe dị n’irube isi n’iwu Bible bụ́ mmadụ inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, na-ahụ ha n’anya dị ka onwe ya. (Luk 10:27; Ndị Filipaị 2:4) Ụmụ mmadụ n’ozuzu pụrụ ile nke a anya dị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ọ dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, mmekọrịta ezinụlọ obi ụtọ na ọbụbụenyi na-enye afọ ojuju. N’ihi ya, ezi onye na-ejere Jehova ozi agaghị anwa anwa kwe ka mmasị ebumpụta ụwa nke mmadụ nwere n’onwe ya chịkwaa ndụ ya nke na ọ ga-ahapụ ịchụso ihe ndị ka mkpa. Nke kasị mkpa n’ime ihe ndị a ka mkpa bụ ihe ndị metụtara Jehova, bụ́ Chineke anyị na-efe.
15, 16. (a) Na gịnị ka àgwà nke mmadụ iche nanị banyere onwe ya pụrụ iduga, dị ka ihe atụ ole ndị gosiri? (b) Gịnị n’ezie ka mmadụ na-eme mgbe ọ na-adị ngwa n’ikpe ndị ọzọ ikpe?
15 Mmadụ iche nanị banyere onwe ya pụrụ ime ka ọ ghọọ onye ezi omume n’anya onwe ya, bụ́kwa nke pụrụ ime ka onye ahụ ghara ịdị na-eche banyere ndị ọzọ ma dị mpako. Bible na-ekwu hoo haa, sị: “I nweghị ihe ngọpụ, gị mmadụ, onye ọ sọrọ gị bụrụ, ma ọ bụrụ na ị na-ekpe mmadụ ikpe; n’ihi na n’ihe ahụ nke ị na-ekpe onye ọzọ ikpe, ị na-ama onwe gị ikpe, ebe ọ bụ na gị onye na-ekpe mmadụ ikpe na-eme otu ihe ahụ.” (Ndị Rom 2:1; 14:4, 10) Ndị ndú okpukpe nke oge Jizọs kwenyesiri nnọọ ike na ha bụ ndị ezi omume nke na ha chere na ha ruru eru ịkatọ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Site n’ime otú ahụ, ha mere onwe ha ndị ikpe. Ebe ọ bụ na ha enweghị ike ịhụ mmejọ ha, ha wetaara onwe ha amamikpe n’ezie.
16 Judas, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs nke raara ya nye, ghọrọ onye na-ekpe ndị ọzọ ikpe. N’otu oge na Betani, mgbe Meri nwanne Lazarọs tere Jizọs mmanụ na-esi ísì ụtọ, Judas megidere ya n’ụzọ siri ike. O kwupụtara iwe ya site n’ịrụ ụka, sị: “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ụtọ narị mkpụrụ ego dinarịọs atọ ma nye ya ndị ogbenye?” Ma ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Otú ọ dị, o kwuru nke a, ọ bụghị n’ihi na ọ na-echegbu onwe ya maka ndị ogbenye, kama n’ihi na ọ bụ onye ohi, na-ejidekwa igbe ego, ọ na-adịkwa ewepụ ego a na-etinye na ya.” (Jọn 12:1-6) Ya adịla mgbe anyị ga-adị ka Judas ma ọ bụ ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị na-adị ngwa ikpe ndị ọzọ ikpe ma si otú a na-ama onwe ha ikpe.
17. Nye ihe atụ nke ihe ize ndụ dị na mmadụ ịbụ onye na-anya isi ma ọ bụ ịghọ onye onwe ya juru afọ gabiga ókè.
17 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ ghọrọ ndị nganga na ndị na-anya isi, ọ bụ ezie na ha abụghị ndị ohi dị ka Judas. Jems dere banyere ha, sị: “Unu na-akpa nganga n’okwu ịnya isi unu.” Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ụdị ịkpa nganga ahụ nile bụ ihe ọjọọ.” (Jems 4:16) Iji ihe anyị rụzuru ma ọ bụ ihe ùgwù ije ozi anyị nwere n’ozi Jehova etu ọnụ agaghị abara anyị uru. (Ilu 14:16) Anyị na-echeta ihe mere Pita onyeozi, bụ́ onye turu ọnụ mgbe onwe ya juru ya afọ gabiga ókè, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ nile asụọ ngọngọ n’ihi gị, m gaghị asụ ngọngọ ma ọlị! . . . Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị ma ọlị.” N’ikwu eziokwu, ọ dịghị ihe anyị nwere anyị kwesịrị iji tuo ọnụ. Ihe nile anyị nwere bụ nanị n’ihi obiọma sitere n’ịhụnanya Jehova. Icheta nke a ga-eme ka anyị ghara ịbụ ndị na-anya isi.—Matiu 26:33-35, 69-75.
18. Olee otú Jehova si ele mpako anya?
Ilu 8:13; 16:18) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji wee iwe n’ihi “oké obi eze Asiria, [nakwa n’ihi] mpako ya”! (Aịsaịa 10:12) Ọ zara ajụjụ n’ihu Jehova. N’oge na-adịghị anya, ụwa Setan na ndị ndú ya dị mpako ma dị mkpa n’anya onwe ha, ma ndị nke a na-ahụ anya ma ndị nke a na-adịghị ahụ anya, ga-azakwa ajụjụ. Ka anyị ghara iṅomi àgwà ikwesi olu ike nke ndị iro Jehova!
18 A gwara anyị, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” N’ihi gịnị? Jehova na-aza, sị: “Mpako, na nganga . . . ka m kpọworo asị.” (19. Na gịnị ka ndị Chineke na-akpa nganga ma dị umeala n’obi n’otu mgbe ahụ?
19 Ezi Ndị Kraịst nwere ezi ihe mere ha ga-eji akpa nganga na ha bụ ndị ohu Jehova. (Jeremaịa 9:24) N’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere ezi ihe mere ha ga-eji nọgide na-adị umeala n’obi. N’ihi gịnị? N’ihi na “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ya mere, iji chebe ọnọdụ anyị dị ka ndị ohu Jehova, anyị aghaghị inwe àgwà yiri nke Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru na “Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie,” ma gbakwụnyezie, sị: “Ná ndị a abụ m onye mbụ.”—1 Timoti 1:15.
20. Olee otú Jehova si echebe ndị ya ugbu a, oleekwa otú ọ ga-esi chebe ha n’ọdịnihu?
20 Ebe ndị Jehova na-eji obi ụtọ edebe ihe ndị na-amasị ha n’azụ iji bute ihe ndị na-amasị Chineke ụzọ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-anọgide na-echebe ha n’ụzọ ime mmụọ. Anyị pụkwara ijide n’aka na mgbe oké mkpagbu ahụ tiwapụrụ, Jehova ga-echebe ndị ya, ọ bụghị nanị n’ụzọ ime mmụọ, kamakwa n’ụzọ anụ ahụ́. Mgbe ha bara n’ụwa ọhụrụ Chineke, ha ga-eti mkpu, sị: “Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.”—Aịsaịa 25:9.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú e si chebe Eze Devid na Jizọs Kraịst?
• Olee otú e si echebe ndị Jehova nke taa?
• Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere ịdị na-ebuli onwe anyị elu gabiga ókè?
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-akpa nganga ma dị umeala n’obi n’otu mgbe ahụ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Olee otú Jehova si chebe Devid na Jizọs?
[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]
Olee otú e si echebe ndị Chineke taa n’ụzọ ime mmụọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Ọ bụ ezie na anyị ji ozi anyị na-ejere Jehova akpa nganga, anyị aghaghị ịnọgide na-adị umeala n’obi mgbe nile