Enwere M Obi Ụtọ Maka Òkè M Keere ná Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ
Akụkọ Ndụ
Enwere M Obi Ụtọ Maka Òkè M Keere ná Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ
DỊ KA ANNA MATHEAKIS SI KỌỌ
Ụgbọ mmiri ahụ nọ na-agba ọkụ. Ọ bụrụ na nnukwu ụgbọ mmiri ahụ dị otu narị mita na iri asaa na otu emie, ọ ga-agbagbu m n’ime mmiri. Ejiri m anya ọnwụ gwuruo ebe dị nchebe ka mụ na ajọ ebili mmiri na-alụ. Nanị ụzọ m ga-esi nọgide na-ese n’elu mmiri bụ ijidesi aka ike na jaket nchebe otu nwanyị yi. Ekpegaara m Chineke ekpere inye m ume na obi ike. Ọ bụ nanị ihe m pụrụ ime.
Ọ BỤ n’afọ 1971, anọkwa m na-alaghachi Ịtali bụ́ ebe nke atọ m jere ozi ala ọzọ. Ọ fọrọ ntakịrị ka ihe nile m nwere funahụ m n’ụgbọ ahụ kpurunụ. Ma, ihe ndị kasị mkpa efunahụghị m—ndụ m, ịhụnanya òtù ụmụnna Ndị Kraịst, na ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi. Ozi ahụ akpọgawo m kọntinent atọ, ụgbọ ahụ kpurunụ bụkwa otu n’ime ọtụtụ ihe ndị dị ịrịba mere ná ndụ m.
A mụrụ m na 1922. Ezinụlọ anyị biri na Rām Allāh, nke dị kilomita 16 site n’akụkụ ebe ugwu Jeruselem. Ndị mụrụ m si agwaetiti Krit, ma, a zụlitere papa m na Nazaret. Abụ m nwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị abụọ papa m na mama m mụrụ. Ọnwụ nwanne m nwoke nke abụọ, bụ́ onye Osimiri Jọdan riri mgbe ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya mere mkpapụ, gbawara ezinụlọ anyị obi. Mgbe ọdachi a gasịrị, mama m jụrụ ibi na Rām Allāh, anyị kwagakwara Atens, Gris, mgbe m dị afọ atọ.
Eziokwu Bible Erute Ezinụlọ Anyị
Obere oge ka anyị rutesịrị Gris, diọkpara anyị, bụ́ Nikos, bụ́ onye dị afọ 22 mgbe ahụ, zutere Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà
Jehova n’oge ahụ. Inweta ihe ọmụma Bible mere ka o nwee ọṅụ dị ukwuu ma na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Ndị Kraịst. Nke a kpasuru papa m iwe, ọ chụpụkwara Nikos n’ụlọ. Otú ọ dị, mgbe ọ bụla papa m gawara Palestaịn, mụ na mama m na nwanne m nwanyị na-eso Nikos aga nzukọ Ndị Kraịst. M ka na-echeta nke ọma otú mama m si eji obi ụtọ ekwu banyere ihe ndị ọ nụrụ ná nzukọ ndị ahụ. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, ọrịa cancer jituru ya ma gbuo ya mgbe ọ dị afọ 42. N’oge ahụ siri ike, nwanne m nwanyị, bụ́ Ariadne, ji ịhụnanya lekọta ezinụlọ anyị. N’agbanyeghị na ọ ka bụ nwata, ọ nọọrọ m dị ka nne ruo ọtụtụ afọ.Papa m na-akpọkarị m aga Chọọchị Ọtọdọks mgbe ọ nọ n’Atens, mgbe ọ nwụkwara, anọgidere m na-aga chọọchị ahụ, ọ bụ ezie na adịghị m agachi ya anya. Ebe ọ bụ na ahụghị m ihe ọ bụla na-egosi na ndị chọọchị ahụ na-asọpụrụ Chineke, emesịrị m kwụsị ịga ya.
Mgbe papa m nwụsịrị, enwetara m ọrụ na ministri okwu ego dị n’aka. Otú ọ dị, nwanne m nwoke jiri ndụ ya rụọ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, jiri ọtụtụ afọ jee ozi na Gris. Na 1934, ọ kwagara Saịprọs. N’oge ahụ, e nweghị Ndịàmà Jehova e mere baptizim n’agwaetiti ahụ, ya mere, o nwere ihe ùgwù nke iji ọrụ nkwusa ahụ gaa n’ihu n’ebe ahụ. Mgbe ọ lụsịrị nwanyị, nwunye ya, bụ́ Galatia, jekwara ozi dị ka onye ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ. * Nikos na-ezitere anyị akwụkwọ na magazin ndị dabeere na Bible mgbe mgbe, ma ọ dịtụghị mgbe anyị sapere ha. Ọ nọgidere na Saịprọs ruo mgbe ọ nwụrụ.
Ime Eziokwu Bible Ka Ọ Bụrụ nke M
Na 1940, George Douras, bụ́ Onyeàmà na-anụ ọkụ n’obi bi n’Atens, onye bụ́kwa enyi Nikos, letara anyị ma kpọọ anyị òkù isonyere otu obere ìgwè na-amụ Bible n’ụlọ ya. Anyị ji obi ụtọ nabata ọkpụkpọ òkù ahụ. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ndị anyị na-amụta. Inweta ihe ọmụma Bible dugara mụ na nwanne m nwanyị ịrara ndụ anyị nye Jehova. E mere Ariadne baptizim na 1942, e meekwa m na 1943.
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, Nikos gwara anyị ka anyị kwafeta Saịprọs, ya mere na 1945, anyị kwagara Nicosia. N’adịghị ka Gris, o nweghị ihe na-egbochi ọrụ nkwusa na Saịprọs. Ọ bụghị nanị n’ozi ụlọ n’ụlọ ka anyị keere òkè, kamakwa n’ịgba àmà okporo ámá.
Afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, Ariadne laghachiri Gris. N’ebe ahụ, ọ hụrụ onye ga-alụ ya, onye na-efekwa Jehova, n’ihi ya, ọ nọgidere n’Atens. N’oge na-adịghị anya, di nwanne m nwanyị na nwanne m nwanyị gbara m ume ịlaghachi Gris ma malite ozi oge nile n’isi obodo Gris. Ebe m nọworo na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịsụ ụzọ, alaghachiri m Atens, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu.
E Megheere M Ọnụ Ụzọ Na-eduga n’Ohere Ndị Ọhụrụ
Na November 1, 1947, amalitere m ịsụ ụzọ, na-eji otu narị awa na iri ise ekwusa ozi ọma kwa ọnwa. Ókèala ọgbakọ anyị buru nnọọ ibu, aghaghịkwa m ịga ogologo ije. N’agbanyeghị nke ahụ, enwetara m ọtụtụ ngọzi. Ndị uwe ojii na-ejichikarị Onyeàmà ọ bụla ha hụrụ na-eme nkwusa ma ọ bụ na-aga nzukọ Ndị Kraịst, n’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, ha jidere m.
E boro m ebubo nke ịtọghata mmadụ, nke bụ́ oké ịda iwu n’oge ahụ. A mara m ikpe ịnọ
ọnwa abụọ n’Ụlọ Mkpọrọ Averof Maka Ndị Inyom nke dị n’Atens. E nwere nwanyị ọzọ bụ́ Onyeàmà nọ ebe ahụ tupu m rute, anyị abụọ kpakọrịtakwara dị ka Ndị Kraịst, nke ahụ nyere anyị obi ụtọ ma wulie anyị elu n’agbanyeghị na e ji anyị eji. Mgbe a tọhapụrụ m, eji m obi ụtọ gaa n’ihu n’ịsụ ụzọ. Ọtụtụ n’ime ndị m mụụrụ Bible ka bụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, nke ahụ na-enyekwa m ọṅụ dị ukwuu.Na 1949, a kpọrọ m òkù ịga klas nke 16 nke Watchtower Bible School of Gilead na United States, bụ́ ebe a na-azụ ndị ozi oge nile maka ozi ala ọzọ. Mụ na ndị ikwu m nwere obi ụtọ. Emere m atụmatụ ịga mgbakọ mba nile na New York City n’oge okpomọkụ nke 1950, ma sizie ebe ahụ gaa Gilead.
Mgbe m bịarutere United States, enwere m ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ ọnwa ole na ole dị ka onye na-elekọta ụlọ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na New York City. Gburugburu ebe ahụ dị nnọọ ọcha, na-enye obi ụtọ ma na-ewuli elu, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nwere ihu ọchị gbakwara m gburugburu. Ana m eji obi ụtọ mgbe nile echeta ọnwa isii m nọrọ ebe ahụ. Oge ruziri ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ ebe ọnwa ise nke ọmụmụ ihe na ntụziaka kpụ ọkụ n’ọnụ gabigara ngwa ngwa. Anyị bụ́ ụmụ akwụkwọ bịara ghọta otú ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ si dị oké ọnụ ahịa ma baa uru, nke ahụ mụbakwara ọṅụ anyị na ọchịchọ anyị nwere iso ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma nke eziokwu ahụ na-enye ndụ.
Ebe Mbụ E Kenyere M Ozi Ala Ọzọ
N’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, a na-ekwe ka anyị họrọ onye ga-abụ onye ibe anyị tupu e kenye anyị ebe anyị ga-aga ozi ala ọzọ. Ruth Hemmig (onye bụ́zi Bosshard), nwanna nwanyị nwere àgwà magburu onwe ya, bụ onye ibe m. Mụ na Ruth nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe e kenyere anyị ọrụ n’Istanbul, Turkey—obodo dị n’agbata Eshia na Europe! Anyị maara na iwu akwadobeghị ọrụ nkwusa ná mba ahụ, ma anyị enweghị obi abụọ na Jehova ga-akwado anyị.
Istanbul bụ obodo na-ekwo ekwo nke mara mma. N’ebe ahụ, anyị hụrụ ụlọ ahịa ndị na-ekwo ekwo, ọtụtụ ụzọ isi nri ndị magburu onwe ha n’ụwa, ebe ngosi ihe mgbe ochie ndị na-adọrọ mmasị, ógbè ndị mara mma, na ụlọ ndị mara mma ndị dị n’ọnụ mmiri. Nke kasị mkpa bụ na anyị chọtara ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị chọrọ ịmụ banyere Chineke. Ndị bụ́ isi mejupụtara obere ìgwè Ndịàmà e nwere n’Istanbul bụ ndị Armenia, ndị Gris na ndị Juu. Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ndị si mba ndị ọzọ, ọ bakwara uru ịmụta asụsụ dịgasị iche iche, gụnyere Turkish. Anyị nwere nnọọ obi ụtọ izute ndị si mba dịgasị iche iche bụ́ ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ. Ọtụtụ n’ime ndị a ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.
N’ụzọ dị mwute, Ruth enwetaghachilighị ikike ibi ná mba ahụ, ọ hapụkwara mba ahụ. Ọ nọgidere na-eje ozi oge nile na Switzerland. Ka afọ nile a gasịrị, mkpakọrịta na-enye obi ụtọ na nke na-ewuli elu mụ na ya nwere ka na-agụ m agụụ.
Ịkwaga n’Akụkụ Ọzọ nke Ụwa
Na 1963, enwetaghachilighị m ikike ibi na Turkey. O siiri m ike ịhapụ Ndị Kraịst ibe m bụ́ ndị m hụworo ka ha na-enwe ọganihu ime mmụọ ka ha na-agbalị imeri ọtụtụ ihe isi ike. Iji mee m obi ụtọ, ndị ikwu m ji obiọma kwụọrọ m ụgwọ ịga New York City ka m wee nwee ike ịga mgbakọ n’ebe
ahụ. E kenyebeghị m ebe ọzọ m ga-eje ozi mgbe ahụ.Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, e kenyere m ịga Lima, Peru. Mụ na nwanna nwanyị na-eto eto bụ́ onye ga-abụ onye ibe m si New York gawa ebe ọhụrụ e kenyere m ọrụ ozugbo. Amụtara m asụsụ Spanish ma biri n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ nke dị n’elu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ nnọọ ihe obi ụtọ ime nkwusa n’ebe ahụ ma mata ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị obodo ahụ.
Ebe Ọzọ E Kenyere M Ọrụ, Asụsụ Ọzọ
Ka oge na-aga, ndị ikwu m bi na Gris kawara nká, ọnọdụ ahụ́ ike ha kawakwara njọ. Ọ dịtụghị mgbe ha gbara m ume ịhapụ ozi oge nile ma lọta iji bie ihe a sị na ọ bụ ndụ dị otú o kwesịrị iji nwee ike inyere ha aka. Otú ọ dị, ka m chesịrị echiche ma kpee ekpere banyere ya ọtụtụ ugboro, aghọtara m na ọ ga-akara m mma ije ozi n’ebe m ga-anọ ndị ezinụlọ m nso. Ụmụnna ọ dị n’aka ji ịhụnanya kweta ma kenye m ọrụ n’Ịtali, ndị ikwu m kwekwara nkwa ịkwụ ego ọ ga-ewe m iji kwafeta Ịtali. Ọ dabakwara na e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị na-ezisa ozi ọma n’Ịtali.
Ọzọkwa, aghaghị m ịmụ asụsụ ọhụrụ—Italian. Ebe e kenyere m ọrụ bụ n’obodo Foggia. Ka e mesịrị, e zigara m Naples, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ókèala e kenyere m bụ Posilipo, otu n’ime ebe ndị kasị maa mma na Naples. Ebe ahụ buru nnọọ ibu, ọ bụkwa nanị otu onye nkwusa Alaeze bi na ya. Ọrụ ahụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu, Jehova nyekwaara m aka ịmalite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ka oge na-aga, e hiwere ọgbakọ nke nwere ọtụtụ ndị nkwusa n’ebe ahụ.
Otu nwanyị na ụmụ ya anọ so n’ụmụ amaala mbụ m mụụrụ Bible. Ya na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ ka bụ Ndịàmà Jehova. A mụkwaara m otu di na nwunye bụ́ ndị nwere otu obere nwata nwanyị ihe. Ezinụlọ ahụ dum nwere ọganihu n’eziokwu ahụ ma gosipụta nraranye ha site na baptizim ime mmiri. Ugbu a, nwa ha nwanyị alụwo otu ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, ha abụọ jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi. Ka m na-amụrụ otu ezinụlọ buru ibu Bible, ike Okwu Chineke kpara masịrị m. Mgbe anyị gụrụ ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na Chineke adịghị akwado iji ihe oyiyi efe ya ofufe, nne nwe ụlọ ahụ ekwedịghị ka a mụchaa ihe a na-amụ. Ozugbo ahụ, ọ tụfusịrị ihe oyiyi nile dị n’ụlọ ya!
Ihe Ize Ndụ n’Osimiri
Ana m ejikarị ụgbọ mmiri eme njem mgbe ọ bụla m si Ịtali na-aga Gris. Njem ụgbọ mmiri ndị ahụ na-emekarị m nnọọ obi ụtọ. Ma otu n’ime njem ndị ahụ, nke m mere n’oge okpomọkụ 1971, pụrụ iche. Eji m ụgbọ mmiri a na-akpọ Heleanna na-alaghachi Ịtali. N’isi ụtụtụ nke August 28, ọkụ malitere ịgba n’ebe a na-esi nri n’ụgbọ ahụ. Ọkụ ahụ gbasara, ụjọ jidekwara ndị njem nile. Ụmụ nwanyị nọ na-atụbọ, ụmụaka ana-ebe ákwá, ụmụ nwoke ana-eme mkpesa ma na-aba mbá. Ndị mmadụ gbagara n’ụgbọ nchebe ndị dị n’akụkụ abụọ nke ụgbọ ahụ. Otú ọ dị, e nweghị jaket nchebe zuru ezu, ihe na-ebuda ụgbọ nchebe n’oké osimiri anaghị arụ ọrụ nke ọma. Enwetaghị m jaket nchebe, ma ire ọkụ ahụ nọ na-ala elu, ya mere, nanị ihe ezi uche dị na ya ime bụ ịmaba n’ime oké osimiri.
Ozugbo m mabara n’ime mmiri, ahụrụ m otu nwanyị yi jaket nchebe ka ọ na-ese n’elu mmiri n’akụkụ m. O yiri ka ọ maghị otú e si egwu mmiri, ya mere, ejidere m ya n’aka ma dọpụta ya n’ebe ahụ ụgbọ mmiri ahụ na-agba ọkụ dị. Oké osimiri ahụ nọ na-amalikwu elu, mgbalị m nọkwa na-eme iji nọgide na-ese n’elu mmiri mekwara ka ike gwụchaa m. O yiri ka olileanya adịghị, ma anọgidere m na-arịọ Jehova maka obi ike, nke a mekwara ka m nweta ume. Echetara m nnọọ mgbe ụgbọ mmiri Pọl onyeozi nọ na ya kpuru.—Ka m jisiri nwanyị ahụ aka ike, mụ na ebili mmiri lụrụ ruo awa anọ, m na-egwu mmiri mgbe m nwere ike ime otú ahụ ma na-akpọku Jehova maka enyemaka. N’ikpeazụ, ahụrụ m ka otu obere ụgbọ mmiri na-abịa. A gụpụtara m, ma nwanyị ahụ anwụọlarị. Mgbe anyị rutere obodo Bari, Ịtali, a kpọgara m ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe e lekọtara m. Anọrọ m abalị ole na ole n’ụlọ ọgwụ, ọtụtụ Ndịàmà letakwara m, jiri obiọma nye m ihe nile dị m mkpa. Ịhụnanya Ndị Kraịst ha gosiri kpaliri ndị ọzọ nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ. *
Mgbe m gbakechara, e kenyere m ọrụ na Rom. A gwara m ka m na-arụ ógbè azụmahịa dị n’etiti obodo ahụ, bụ́ nke m mere ruo afọ ise site n’enyemaka Jehova. Ruo ihe dị ka afọ 20, ejere m ozi n’Ịtali, abịakwara m nwee mmasị n’ebe ndị Ịtali nọ.
Ịlaghachi Ebe M Si Malite
Ka oge na-aga, ọnọdụ ahụ́ ike Ariadne na di ya kara njọ. Achọpụtara m na ọ bụrụ na mụ ebidebe ha, m ga-enwe ike ịkwụghachitụ ha ụgwọ ihe nile ha ji ịhụnanya meere m. N’ezie, ịhapụ Ịtali bụ ihe na-agbawa obi. Otú ọ dị, ụmụnna ọ dị n’aka nyere m ikike ime otú ahụ, kemgbe oge okpomọkụ 1985 kwa, anọwo m na-asụ ụzọ n’Atens, bụ́ ebe m nọ malite ozi oge nile na 1947.
Emere m nkwusa n’ókèala e kenyere ọgbakọ m, ajụkwara m ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ ma m̀ pụrụ ịdị na-emekwa nkwusa n’ógbè azụmahịa dị n’etiti obodo ahụ. Mụ na otu onye ọsụ ụzọ ibe m mere nke a ruo afọ atọ. Anyị gbaara ndị a na-adịghị ahụkebe n’ụlọ àmà n’ụzọ zuru ezu.
Otú ọ dị, ka oge na-aga, ọchịchọ m nwere ije ozi nọgidere na-esiwanye ike ma ume m na-adalata adalata. Ugbu a, di nwanne m nwanyị anwụọla. Ariadne, bụ́ onye nọwooro m dị ka nne, anaghịzi ahụ ụzọ. Ahụ́ siri m ike n’afọ ndị m jere ozi oge nile. Ma, n’oge na-adịchabeghị anya, esi m n’elu steepụ e ji nkume mabụl rụọ daa, agbajikwara m aka nri m. Mgbe nke ahụ gasịrị, adara m ada ma gbajie úkwù. A wara m ahụ́, edinakwara m n’àkwà ruo ogologo oge. Apụghịzi m ịgagharị agagharị n’onwe m. Ana m ejizi mkpara aga, anaghịkwa m apụ èzí ma mmadụ esoghị m. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m eme ike m nile, enwekwara m olileanya na ahụ́ ike m ga-aka mma. Ikere òkè n’ọrụ nkụzi Bible, ọbụna n’ụzọ a kpaara ókè, ka bụ isi ihe na-enye m obi ụtọ na afọ ojuju.
Mgbe m chetara afọ ndị ahụ na-enye obi ụtọ m jiri jee ozi oge nile, m na-ekele nnọọ Jehova. Ya na akụkụ elu ala nke nzukọ ya anọgidewo na-enye m ezi nduzi na enyemaka dị m nnọọ mkpa, si otú ahụ na-enyere m aka iji ike m na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu ka m jiworo ndụ m jeere ya ozi. Ọchịchọ si n’ala ala obi m bụ ka Jehova wusie m ike ịnọgide n’ozi ya. Enwere m obi ụtọ n’obere òkè m keere n’ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ bụ́ nke ọ na-eduzi.—Malakaị 3:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Lee peeji nke 73-89 nke 1995 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 34 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Teta! (Bekee) February 8, 1972, peeji nke 12-16.
[Foto dị na peeji nke 9]
Mụ na nwanne m nwanyị, bụ́ Ariadne, na di ya, bụ́ Michalis, ka m na-achọ ịga Gilead
[Foto dị na peeji nke 10]
E kenyere mụ na Ruth Hemmig ịga Istanbul, Turkey
[Foto dị na peeji nke 11]
N’Ịtali, mmalite afọ ndị 1970
[Foto dị na peeji nke 12]
Mụ na nwanne m nwanyị, bụ́ Ariadne, taa