Ezi Ozizi nke Na-atọ Chineke Ụtọ
Ezi Ozizi nke Na-atọ Chineke Ụtọ
KA NDỊ bi n’ụwa wee mata ozizi nke bụ́ eziokwu na nke na-atọ Chineke ụtọ, Chineke aghaghị ime ka ndị mmadụ mata echiche ya. Ọ ghaghịkwa ime ka mmadụ nile mata ya. Oleezi otú ọzọ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi mata ụdị ozizi, ofufe na akparamàgwà Chineke na-achọ? Chineke ò nyewo ụdị ihe ọmụma ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, n’ụzọ dị aṅaa?
Ọ̀ dị mmadụ ọ bụla na-adị ndụ ruo nanị iri afọ ole na ole nke Chineke pụrụ iji na-agwa ụmụ mmadụ okwu ma nwee ike iwere ozi ahụ gakwuru ihe nile a kpọrọ mmadụ ? Ọ dịghị. Ma a pụrụ iji ihe e dere ede nke na-adịgide adịgide mee otú ahụ. N’ihi ya, ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị ime ka ihe ndị Chineke kpughere dịrị n’ụdị akwụkwọ? Bible bụ otu n’ime akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie nke na-ekwu na ya sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Otu onye so dee Bible kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Ka anyị lerukwuo Bible anya ma hụ ma ọ̀ bụ ebe e si enweta ezi ozizi.
Ọ̀ Nọọla Afọ Ole?
A bịa n’akwụkwọ okpukpe ndị bụ́ isi, Bible so ná ndị kasị ochie. E dere akụkụ ndị mbụ ya ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. E dechara akwụkwọ a n’afọ 98 O.A. * Ọ bụ ezie na ihe dị ka ndị ikom 40 ji ihe dị ka otu puku afọ na narị isii dee ya, ihe odide Bible kwekọrịtara. Nke a bụ n’ihi na Onye chepụtara ya n’ezie bụ Chineke.
Bible bụ akwụkwọ a kasị kesaa na nke a kasị sụgharịa n’akụkọ ihe mere eme nile. Kwa afọ, a na-ekesa ihe dị ka nde 60 nke Bible zuru ezu ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. A sụgharịwo Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ gaa na puku asụsụ na olu mba abụọ na narị atọ. Ihe karịrị pasent 90 nke mmadụ nile bi n’ụwa
pụrụ inweta Bible, ma ọ dịghị ihe ọzọ, akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ nke ha. Akwụkwọ a emeriela ihe mgbochi dị n’etiti mba na mba na nkewa dị n’etiti agbụrụ na ebo dị iche iche.Olee Otú E Si Hazie Ya?
Ọ bụrụ na i nwere Bible, gịnị ma ị sapee ya ma hụ otú e si hazie ya? * Buru ụzọ sapee peeji ebe e depụtara ihe ndị dị n’ime ya. Ọtụtụ Bible nwere ná mmalite ya peeji ebe e depụtara aha akwụkwọ Bible nke ọ bụla na nọmba peeji ebe a pụrụ ịchọta ya. Ị ga-ahụ na Bible bụ n’ezie nchịkọta nke akwụkwọ nta dị iche iche, nke ọ bụla nwere aha nke ya. Aha akwụkwọ nke mbụ bụ Jenesis ebe nke ikpeazụ bụ Mkpughe, ma ọ bụ Apọkalips. A chịkọtara akwụkwọ ndị ahụ gaa ná nkebi abụọ. A na-akpọ akwụkwọ 39 mbụ ya Akwụkwọ Nsọ Hibru, ebe ọ bụ na e dere ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’asụsụ Hibru. E dere akwụkwọ 27 ikpeazụ ya n’asụsụ Grik, ọ bụkwa ha mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Grik. Ụfọdụ na-akpọ nkebi abụọ a Agba Ochie na Agba Ọhụrụ.
Akwụkwọ ndị dị na Bible nwere isiakwụkwọ na amaokwu iji mee ka ọ dị mfe ịchọta ihe dị na ha. Mgbe e zoro aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ na magazin a, nọmba mbụ na-eso akwụkwọ Bible ahụ na-egosi isiakwụkwọ nke akwụkwọ Bible ahụ e zoro aka na ya, ebe nọmba nke abụọ na-egosi amaokwu ya. Dị ka ihe atụ, “2 Timoti 3:16” pụtara akwụkwọ Timoti nke Abụọ, isi 3, amaokwu 16. Lee ma ị pụrụ ịchọta amaokwu ahụ na Bible.
Í kwenyeghị na ụzọ kasị mma isi mara Bible nke ọma bụ ịgụchi ya anya? Ụfọdụ ahụwo ya dị ka ihe na-enye aka ibu ụzọ gụọ Akwụkwọ Nsọ Grik, malite n’akwụkwọ Matiu. Ọ bụrụ na ị gụọ site n’isiakwụkwọ atọ ruo ise kwa ụbọchị, ị pụrụ ịgụcha Bible n’otu afọ. Ma, olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na ihe ị na-agụ na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ezie?
Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?
Akwụkwọ e dere n’ike mmụọ nsọ Chineke maka mmadụ nile ó kwesịghị inwe ndụmọdụ na-anọgide na-adị irè banyere otú e si ebi ndụ? Bible na-egosi na o nwere ndụmọdụ ga-egbo mkpa nke ọgbọ ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ụkpụrụ ndị dị na ya dịkwa irè taa dị nnọọ ka ha dị mgbe e dere ha. A pụrụ ịhụ nke a n’ụzọ dị mfe n’okwu a ma ama Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Hiwere Iso Ụzọ Kraịst, kwuru. E dekọrọ ya na Matiu isi 5 ruo isi 7. Okwu a, nke a maara dị ka Ozizi Elu Ugwu, na-egosi anyị ọ bụghị nanị otú e si enweta ezi obi ụtọ kamakwa otú e si edozi esemokwu, otú e si ekpe ekpere, otú a ga-esi na-ele ihe onwunwe anya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’okwu a, na n’akụkụ ya ndị ọzọ, Bible gwara anyị hoo haa ihe anyị ga-eme na ihe anyị ga-ezere iji mee Chineke obi ụtọ na iji mee ka ọnọdụ anyị ka mma ná ndụ.
Ihe ọzọ mere ị pụrụ iji tụkwasị Bible obi bụ na mgbe a bịara n’okwu banyere sayensị, ihe akwụkwọ mgbe ochie a na-ekwu na-ezi ezi. Dị ka ihe atụ, mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kweere na ụwa dị mbadamba, Bible kwuru banyere “gburugburu [ma ọ bụ, okirikiri] ụwa.” (Aịsaịa 40:22) Ihe karịkwara puku afọ atọ tupu ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Sir Isaac Newton akọwaa na ike ndọda jigidere mbara ụwa n’ebe ihe na-adịghị, Bible kwuru n’ụdị uri na ‘ụwa na-ekokwasịkwa n’ihe na-abụghị ihe.’ (Job 26:7) Tụleekwa nkọwa a e ji uri kọwaa nrugharị mmiri, bụ́ nke e dekọrọ ihe dị ka puku afọ atọ gara aga: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.” (Eklisiastis 1:7) Ee, ọ bụ Onye Kere eluigwe na ụwa chepụtara Bible.
Nkwekọ akụkọ Bible kwekọrọ n’akụkọ ihe mere eme na-egosi na o sitere n’ike mmụọ Luk 3:1 zoro aka “n’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd abụrụkwa onye na-achị ógbè Galili.”
nsọ Chineke. Akụkọ ndị dị na Bible abụghị akụkọ ifo nkịtị. A kọrọ kpọmkwem oge ha mere, ndị ha metụtara na ebe ndị ha nọrọ mee. Dị ka ihe atụ, n’ihi na ihe ọ na-akọ mere eme n’ezie,Ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge ochie na-akọ nanị banyere ihe ịga nke ọma na àgwà ọma nke ndị ọchịchị, ndị dere Bible kwuru eziokwu, ọbụna kọọ mmejọ nke ha n’ezoghị ọnụ. Dị ka ihe atụ, Eze Devid nke Izrel kwupụtara, sị: “Emehiewo m nke ukwuu n’ihe m meworo: . . . emewo m ihe nzuzu nke ukwuu.” E dekọrọ okwu ahụ n’ezoghị ọnụ n’ime Bible. (2 Samuel 24:10) Onye so dee Bible bụ́ Mozis jikwa aka ya dee banyere mgbe ọ na-adabereghị n’ebe ezi Chineke ahụ nọ.—Ọnụ Ọgụgụ 20:12.
Bible nwekwara ihe ọzọ na-egosi na o sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Nke ahụ bụ amụma ya ndị mezurulanụ—ihe ndị e dere tupu ha emee. Ụfọdụ n’ime ha bụ amụma ndị e buru banyere Jizọs Kraịst. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs, Akwụkwọ Nsọ Hibru buru amụma n’ụzọ ziri ezi na a ga-amụ Onye a E Kwere ná Nkwa “na Betlehem nke Judia.”—Matiu 2:1-6; Maịka 5:2.
Tụlee ihe atụ ọzọ. Na 2 Timoti 3:1-5, Bible na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.” Nke a ọ́ bụghị àgwà ụmụ mmadụ n’ozuzu nwere taa? E dekọrọ okwu ndị a n’afọ 65 O.A., ihe karịrị otu puku afọ na narị itoolu gara aga!
Gịnị Ka Bible Na-akụziri Anyị?
Ka ị na-agụ Bible, ị ga-ahụ na o nwere amamihe ka elu. Ọ na-aza ajụjụ ndị dị ka ndị a na-esonụ n’ụzọ na-eju afọ: Ònye bụ Chineke? Ekwensu ọ̀ dị adị? Ònye bụ Jizọs Kraịst? Gịnị mere nhụjuanya ji dịrị? Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Azịza ndị ọzọ ga-enye gị ga-adịgasị nnọọ iche dị ka okpukpe na omenala ha si dịgasịa iche. Ma Bible na-agwa anyị eziokwu banyere isiokwu ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ. Ọzọkwa, nduzi Bible na-enye n’ihe metụtara omume na àgwà anyị n’ebe ndị ọzọ na ikike ndị ka elu nọ enweghị atụ. *
Gịnị ka Bible na-ekpughe banyere nzube Chineke maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ? Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Bible ebuwokwa amụma na agha, ime mpụ, ime ihe ike, na mmebi iwu ga-akwụsị n’isi nso. Ọrịa, nká, na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs ga-aghọ ihe dị adị. Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ! Leekwa ka ihe a nile si egosi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ!
Gịnị Ka Ị Ga-eme?
Bible bụ onyinye dị ịtụnanya sitere n’aka Onye Okike. Olee otú i kwesịrị isi jiri akwụkwọ a na-eme ihe? Otu onye Hindu kwetara * Otu prọfesọ nke mahadum dị na United States bịara ghọta mkpa ọ dị ịgụ akwụkwọ a a kasị kesaa n’ụwa tupu ya ekwuo ihe bụ́ uche ya banyere ya.
na ka ihe Chineke kpughere nwee ike ịbara ihe nile a kpọrọ mmadụ uru, ọ ghaghị ịbụ nke e dere n’oge ụwa malitere imepe anya. Mgbe ọ ghọtara na akụkụ ụfọdụ nke Bible emewo ochie karịa ihe ka ọtụtụ n’ihe odide ochie nke ndị Hindu, bụ́ Veda, o kpebiri ịgụ Bible na inyocha ihe ndị dị n’ime ya.Ịgụ Bible na itinye ihe ndị ọ na-akụzi n’ọrụ ga-ewetara gị ngọzi dị ukwuu. Bible na-ekwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ . . . N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” * (Abụ Ọma 1:1-3) Ịmụ Bible na ime ihe kwekọrọ n’ihe ọ na-ekwu ga-ewetara gị obi ụtọ n’ihi na nke ahụ ga-egbo mkpa ime mmụọ gị. (Matiu 5:3) Bible ga-egosi gị ụzọ ị ga-esi bie ndụ na-arụpụta ihe na otú ị ga-esi nagide nsogbu dị iche iche n’ụzọ gara nke ọma. Ee, “n’idebe [iwu Chineke ndị e dere n’ime Bible] ka ọkpụkpụ ọrụ hiri nne na-apụta.” (Abụ Ọma 19:11) Ọzọkwa, inwe obi ike ná nkwa ndị Chineke kwere ga-ewetara gị ngọzi dị iche iche ugbu a ma mee ka i nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu.
Bible na-agba anyị ume, sị: “Dịkwa ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, zụlitenụ agụụ maka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dịịrị okwu ahụ.” (1 Pita 2:2) Nwa a mụrụ ọhụrụ na-adabere ná nri na-edozi ahụ́, ọ na-ahụkwa na e gboro mkpa ahụ. N’otu aka ahụ, anyị na-adabere nnọọ n’ihe ọmụma sitere n’aka Chineke. N’ihi ya, ‘zụlite agụụ,’ ma ọ bụ ọchịchọ siri ike, maka Okwu ya. Bible bụ akwụkwọ nke ezi ozizi nke sitere n’aka Chineke. Mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịmụ ya mgbe nile. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka inweta ihe kasị mma n’ọmụmụ ihe gị. Anyị ji ịhụnanya na-agba gị ume ịkpọtụrụ ha. Ma ọ bụkwanụ gị edetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 O.A. na-anọchi anya “Oge Anyị,” nke a na-akpọkarị A.D., maka Anno Domini, nke pụtara “n’ime afọ Onyenwe anyị.” T.O.A. pụtara “Tupu Oge Anyị.”
^ par. 8 Ọ bụrụ na i nweghị Bible nke aka gị, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inye gị otu.
^ par. 19 A tụlere isiokwu ndị a n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 23 E kweere na a rọrọ ukwe ndị mbụ nke Veda ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ atọ gara aga, e deghịkwa ha ede. N’akwụkwọ ya bụ́ A History of India, P. K. Saratkumar na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị na narị afọ nke iri na anọ A.D. ka e dere Veda n’akwụkwọ.”
^ par. 24 Jehova bụ aha Chineke nke Bible. N’ime ọtụtụ nsụgharị Bible, a pụrụ ịchọta ya n’Abụ Ọma 83:18.
[Foto dị na peeji nke 7]
‘Zụlite agụụ’ maka Okwu Chineke. Na-amụchi Bible anya
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 5]
Foto NASA