Ndị Kraịst Na-egbukepụ Ebube Jehova
Ndị Kraịst Na-egbukepụ Ebube Jehova
“Obi ụtọ na-adịrị anya unu n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, nakwa ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe.”—MATIU 13:16.
1. Olee ajụjụ na-agbata anyị n’uche banyere otú ndị Izrel si mesoo Mozis n’Ugwu Saịnaị?
ỤMỤ Izrel bụ́ ndị gbakọrọ n’Ugwu Saịnaị nwere ezi ihe mere ha ga-eji bịaruo Jehova nso. E kwuwerị, o ji aka dị ike napụta ha n’Ijipt. O gboro mkpa ha, na-enye ha nri na mmiri n’ọzara. O mekwara ka ha merie ndị agha Amalek bịara ibuso ha agha. (Ọpụpụ 14:26-31; 16:2-17:13) Ka ha mara ụlọikwuu ha n’ihu Ugwu Saịnaị, égbè eluigwe na àmụ̀mà mere ka ha tụọ ụjọ ruo n’ókè na ha mara jijiji. Ka e mesịrị, ha hụrụ Mozis ka o si n’Ugwu Saịnaị rịdata, ihu ya ana-egbukepụkwa ebube Jehova. Ma kama ime ihe n’ụzọ na-egosi na o juru ha anya, nakwa na ha maara onye nke ahụ si n’aka, ha gbalagara. “Ha wee tụọ egwu ịbịaru [Mozis] nso.” (Ọpụpụ 19:10-19; 34:30) Gịnị mere ụjọ ji tụọ ha ịhụ mgbukepụ nke ebube Jehova, bụ́ onye mewooro ha ọtụtụ ihe?
2. Gịnị pụrụ imewo ka ụmụ Izrel tụọ ụjọ mgbe ha hụrụ ebube Chineke nke Mozis gbukepụrụ?
2 O yiri ka ihe kasị mee ka ụmụ Izrel tụọ ụjọ n’oge a bụ ihe mere tupu mgbe ahụ. Mgbe ha ma ụma nupụrụ Jehova isi site n’ịkpụ nwa ehi ọlaedo, ọ dọrọ ha aka ná ntị. (Ọpụpụ 32:4, 35) Hà mụtara ihe site n’ịdọ aka ná ntị Jehova ma gosipụta ekele maka ya? Ee e, ihe ka ọtụtụ n’ime ha amụtaghị ihe. Ka ọnwụ ya na-eru nso, Mozis chetaara ụmụ Izrel oge ha kpụrụ nwa ehi ọlaedo nakwa oge ndị ọzọ ha nupụrụ isi. Ọ gwara ndị ahụ, sị: “Unu wee nupụ isi n’okwu ọnụ Jehova, bụ́ Chineke unu, unu ekweghịkwa Ya, unu egeghịkwa ntị n’olu Ya. Ndị na-enupụ isi ka unu bụ n’ebe Jehova nọ site n’ụbọchị m maara unu.”—Deuterọnọmi 9:15-24.
3. Gịnị ka Mozis mere n’ihe banyere ikpudo ihe n’ihu ya?
3 Tụlee otú Mozis si meghachi omume n’ụjọ ụmụ Izrel tụrụ. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Mozis wee gwabie ha okwu, kpudo ihe mkpudo n’ihu ya. Ma mgbe ọ bụla Mozis bara n’ime [ụlọikwuu] n’ihu Jehova ịkpanyere Ya ụka, o wezụga ihe mkpudo ahụ ruo mgbe ọ pụtara: o wee pụta, gwa ụmụ Izrel ihe nke e nyere ya n’iwu; ụmụ Izrel wee hụ ihu Mozis, na akpụkpọ ihu Mozis na-enwupụta ìhè: Mozis wee kpughachi ihe mkpudo ahụ n’ihu ya, ruo mgbe ọ bara n’ime ịkpanyere [Jehova] ụka.” (Ọpụpụ 34:33-35) Gịnị mere Mozis ji kpudo ihe n’ihu ya mgbe ụfọdụ? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? Azịza nke ajụjụ ndị a pụrụ inyere anyị aka ịtụ mmekọrịta anyị na Jehova n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.
Ohere Ndị A Tụfuru
4. Gịnị ka Pọl onyeozi kọwara banyere ihe Mozis kpu n’ihu?
4 Pọl onyeozi kọwara na ihe mere Mozis ji kpudo ihe n’ihu metụtara ọnọdụ uche na obi ụmụ Izrel n’onwe ha. Pọl dere, sị: “Ụmụ Izrel enweghị ike ilegide anya n’ihu Mozis n’ihi ebube nke ihu ya . . . Ma e mere ka ike iche echiche ha nyụọ nkọ.” (2 Ndị Kọrint 3:7, 14) Lee ọnọdụ jọgburu onwe ya nke ahụ bụ! Ụmụ Izrel bụ ndị Jehova họọrọ, ọ chọkwara ka ha bịaruo ya nso. (Ọpụpụ 19:4-6) N’agbanyeghị nke ahụ, ha enweghị ike ilegide mgbukepụ nke ebube Chineke anya. Kama iji obi na uche ha sọpụrụ Jehova n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ, n’ụzọ ụfọdụ, ha gbakụtara ya azụ.
5, 6. (a) Olee otú ndị Juu nke narị afọ mbụ si yie ụmụ Izrel nke oge Mozis? (b) Olee ihe dị iche n’etiti ndị gere Jizọs ntị na ndị na-egeghị ya ntị?
5 E nwere ihe ya na nke a yiri na narị afọ mbụ O.A. Ka ọ na-erule n’oge a tọghatara Pọl n’Iso Ụzọ Kraịst, e jirila ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke Jizọs Kraịst, bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu bụ onye ogbugbo ya, dochie anya ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Jizọs gbukepụrụ ebube Jehova n’ụzọ zuru okè ma n’okwu ma n’omume. Pọl dere banyere Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite, sị: “Ọ bụ onyinyo nke ebube [Chineke] na ihe nnọchiteanya nke onye ọ bụ kpọmkwem.” (Ndị Hibru 1:3) Lee ohere magburu onwe ya ndị Juu ahụ nwere! Ha pụrụ ịnụ okwu nke ndụ ebighị ebi site n’ọnụ Ọkpara Chineke n’onwe ya! N’ụzọ dị mwute, ihe ka ọtụtụ ná ndị Jizọs kwusaara ozi ọma egeghị ntị. Banyere ha, Jizọs hotara amụma Jehova buru site n’ọnụ Aịzaịa, sị: “N’ihi na obi ndị a adịkwaghị anabata ihe, ha ejiriwokwa ntị ha nụ ihe ma ha azaghachighị ihe ọ bụla, ha emechiwokwa anya ha; ka ha wee ghara inwe mgbe ha ga-eji anya ha hụ ụzọ ma jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta ihe ọ pụtara wee chigharịa, m wee gwọọ ha.”—Matiu 13:15; Aịsaịa 6:9, 10.
6 E nwere ọdịiche pụtara nnọọ ìhè n’etiti ndị Juu na ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị Jizọs kwuru banyere ha, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya unu n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, nakwa ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe.” (Matiu 13:16) Ọ na-agụsi ezi Ndị Kraịst agụụ ike ịmara Jehova na ijere ya ozi. Ha na-enwe obi ụtọ ime uche ya, dị ka e kpughere n’ime Bible. N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-egbukepụ ebube Jehova n’ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ha, ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-emekwa otu ihe ahụ.—2 Ndị Kọrint 3:6, 18.
Ihe Mere E Ji Kpuchie Ozi Ọma ahụ Ákwà
7. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ajụ ozi ọma ahụ?
7 Dị ka anyị hụworo, ma n’oge Jizọs ma n’oge Mozis, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ Izrel jụrụ ohere ahụ pụrụ iche e nyere ha. Ọ dịkwa otú ahụ n’oge anyị. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-ajụ ozi ọma anyị na-ekwusara ha. Nke a adịghị eju anyị anya. Pọl dere, sị: “Ma, ọ bụrụ na ozi ọma nke anyị na-akpọsa bụ nke e kpuchiri ákwà n’ezie, e kpuchiri ya ákwà n’etiti ndị na-ala n’iyi, n’etiti ndị chi nke usoro ihe a meworo ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Tụkwasị ná mgbalị Setan na-eme iji kpuchie ozi ọma ahụ, ọtụtụ ndị na-ekpuchi ihu ha n’ihi na ha achọghị ịhụ ụzọ.
8. N’ụzọ dị aṅaa ka amaghị Chineke sirila kpuo ọtụtụ ndị ìsì, oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị nke a metụtara?
8 Amaghị Chineke na-eme ka anya ihe atụ nke ọtụtụ ndị kpuo ìsì. Bible na-ekwu na mba dị iche iche “nọ n’ọchịchịrị n’uche, bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ ahụ bụ́ nke Chineke, n’ihi amaghị ihe nke dị n’ime ha.” (Ndị Efesọs 4:18) Tupu ya aghọọ Onye Kraịst, amaghị Chineke mere ka Pọl, bụ́ onye maara Iwu ahụ nke ọma, kpuo ìsì nke na ọ kpagburu ọgbakọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:9) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova mere ka ọ mata eziokwu ahụ. Pọl na-akọwa, sị: “Ihe mere e ji meere m ebere bụ na site na mụ, dị ka onye kasị pụta ìhè, Kraịst Jizọs ga-enwe ike igosipụta ogologo ntachi obi ya nile ịbụ ihe atụ nye ndị gaje ime ka okwukwe ha dabere na ya maka ndụ ebighị ebi.” (1 Timoti 1:16) Dị ka Pọl, ọtụtụ ndị na-emegidebu eziokwu Chineke na-ejere Ya ozi ugbu a. Nke a bụ ezi ihe mere anyị ga-eji nọgide na-agbara ọbụna ndị na-emegide anyị àmà. N’otu oge ahụ, ịmụchi Okwu Chineke anya na ịghọta ya na-enyere anyị aka ịghara ịkpa àgwà dị ka ndị na-amaghị ihe bụ́ nke ga-eme ka Jehova wesa anyị iwe.
9, 10. (a) Olee otú ndị Juu narị afọ mbụ si gosi na ha adịghị njikere ịmụta ihe, nakwa na ha achọghị ịgbanwe echiche ha? (b) È nwere ihe yiri ya na Krisendọm taa? Kọwaa.
9 Ọtụtụ ndị adịghị ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na ha adịghị njikere ịmụta ihe, ha achọghịkwa ịgbanwe echiche ha. Ọtụtụ ndị Juu jụrụ Jizọs na ozizi ya n’ihi na ha jigidesiri Iwu Mozis ike. Otú ọ dị, e nwere ndị na-adịghị ka ha. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, “oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe ahụ.” (Ọrụ 6:7) Ka o sina dị, Pọl dere banyere ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu, sị: “Ruokwa taa, mgbe ọ bụla a na-agụ akwụkwọ Mozis, ákwà mkpuchi na-adịkwasị n’obi ha.” (2 Ndị Kọrint 3:15) O yiri ka Pọl ọ̀ maara ihe Jizọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na unu chere na site na ya unu ga-enwe ndụ ebighị ebi; ọ bụkwa ihe ndị a na-agba àmà banyere m.” (Jọn 5:39) Akwụkwọ Nsọ ha jiworo nlezianya na-enyocha kwesịrị inyere ha aka ịghọta na Jizọs bụ Mezaịa ahụ. Otú ọ dị, ndị Juu nwere echiche nke ha, ọbụna Ọkpara Chineke nke na-arụ ọrụ ebube emelighị ka ha gbanwee echiche ha.
10 Otú ahụkwa ka ọ dị ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm taa. Dị ka ndị Juu nke narị afọ mbụ, “ha nwere ịnụ ọkụ n’obi maka Chineke; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-amụ Bible, ma ha achọghị ikwere ihe ọ na-ekwu. Ha adịghị ekweta na Jehova na-akụziri ndị ya ihe site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bụ́ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara. (Matiu 24:45) Otú ọ dị, anyị ghọtara na Jehova na-akụziri ndị ya ihe nakwa na kemgbe ụwa, a na-aghọta eziokwu Chineke nke nta nke nta. (Ilu 4:18) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova zie anyị ihe, anyị ga-amata uche na nzube ya.
11. Olee otú mmadụ ikwere nanị n’ihe ọ chọrọ ikwere siworo kere òkè n’ikpuchi eziokwu ahụ?
11 Ndị ọzọ kpuru ìsì n’ihi na ha na-ekwere nanị ihe ha chọrọ ikwere. E buru amụma na ụfọdụ ga-akwa ndị Chineke na ozi ha na-ezisa banyere ọnụnọ Jizọs emo. Pita onyeozi dere, sị: “Dị ka ọchịchọ ha si dị, ha na-echezọ eziokwu a” bụ́ na Chineke wetara iju mmiri n’ụwa nke oge Noa. (2 Pita 3:3-6) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-ekweta ozugbo na Jehova na-eme ebere, dị obiọma, ma na-agbaghara mmehie; ma, ha na-eme ka à ga-asị na ha amaghị eziokwu ahụ bụ́ na ọ naghị agụ ndị ikpe mara dị ka ndị ikpe na-amaghị ma ọ bụkwanụ ha ajụ ikwere na ọ bụ otú Chineke si eme. (Ọpụpụ 34:6, 7) Ezi Ndị Kraịst na-agbalị ịghọta ihe Bible na-akụzi n’ezie.
12. Olee otú ọdịnala siworo mee ka ọtụtụ ndị kpuo ìsì?
12 Ọdịnala na-eme ka ọtụtụ ndị na-aga chọọchị kpuo ìsì. Jizọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.” (Matiu 15:6) Ndị Juu ji ịnụ ọkụ n’obi weghachi ezi ofufe mgbe ha si Babilọn lọta, n’agbanyeghị nke ahụ, ndị nchụàjà n’onwe ha ghọrọ ndị mpako na ndị ezi omume n’anya onwe ha. Ememe okpukpe ghọziri ihe e ji emezu iwu, nke na-adịghịzi egosipụta ezi nsọpụrụ Chineke. (Malakaị 1:6-8) Ka ọ na-erule n’oge Jizọs, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii agbakwụnyela ọtụtụ ọdịnala a na-apụghị ịgụta ọnụ n’Iwu Mozis. Jizọs mere ka a mata na ha bụ ndị ihu abụọ n’ihi na ha adịghịzi aghọta ụkpụrụ ezi omume ndị Iwu ahụ dabeere na ha. (Matiu 23:23, 24) Ezi Ndị Kraịst aghaghị ilezi anya ịghara ikwe ka ọdịnala okpukpe ndị ụmụ mmadụ wepụtara dọpụ uche ha n’ezi ofufe.
“Ọ Na-ahụ Onye ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya”
13. Olee ụzọ abụọ Mozis si hụperetụ ebube Chineke?
13 Mozis rịọrọ ka ọ hụ ebube Chineke, ọ hụkwara mgbukepụ nke ebube Jehova mgbe ọ gafesịrị. Mgbe ọ bara n’ụlọikwuu, o kpughị ákwà. Mozis bụ nwoke nwere okwukwe siri ike nke chọrọ ime uche Chineke. Ọ Ndị Hibru 11:27; Ọpụpụ 34:5-7) O gosipụtakwara ebube Chineke ọ bụghị nanị site n’ìhè ahụ nwupụtara n’ihu ya ruo oge ụfọdụ kamakwa site ná mgbalị o mere iji nyere ụmụ Izrel aka ịmata Jehova na ijere Ya ozi.
bụ ezie na e kwere ka ọ hụperetụ ebube Jehova n’ọhụụ, a pụrụ ikwu na o burula ụzọ jiri anya nke okwukwe hụ Chineke. Bible na-ekwu na Mozis “nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.” (14. Olee otú Jizọs si hụ ebube Chineke, oleekwa ihe tọrọ ya ụtọ?
14 N’eluigwe, Jizọs hụrụ ebube Chineke ruo ogologo oge a na-apụghị ịgụta ọnụ, ọbụna tupu e kee eluigwe na ala. (Ilu 8:22, 30) N’oge ahụ nile, ha ghọrọ ezigbo ndị enyi hụrụ onwe ha n’anya nke ukwuu. Jehova Chineke gosipụtara na ọ hụrụ onye a e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke n’anya nke ukwuu. Jizọs mesịrị gosipụtakwa na ọ hụrụ Chineke ya bụ́ Onye nyere ya ndụ n’anya nke ukwuu. (Jọn 14:31; 17:24) Ha nwere ịhụnanya zuru ezu n’etiti onwe ha dị ka Nna na Ọkpara. Dị nnọọ ka Mozis, ọ tọrọ Jizọs ụtọ igbukepụ ebube Jehova n’ihe ndị ọ kụziri.
15. Olee otú Ndị Kraịst si eche banyere ebube Chineke?
15 Dị ka Mozis na Jizọs, Ndịàmà Chineke nọ n’ụwa n’oge a na-adị njikere iche banyere ebube Jehova. Ha ajụghị ozi ọma ahụ dị ebube. Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe e chigharịkwuuru Jehova [ime uche ya], a na-ewepụ ákwà mkpuchi ahụ.” (2 Ndị Kọrint 3:16) Anyị na-amụ Akwụkwọ Nsọ n’ihi na anyị chọrọ ime uche Chineke. Anyị na-enwe mmasị n’ebube nke ihu Ọkpara Jehova na Eze ahụ e tere mmanụ, bụ́ Jizọs Kraịst, na-egbukepụ, anyị na-eṅomikwa ihe nlereanya ya. Dị ka Mozis na Jizọs, e nyewo anyị ozi anyị ga-eje, ịkụziri ndị ọzọ banyere Chineke ahụ dị ebube anyị na-efe.
16. N’ihi gịnị ka o ji bụụrụ anyị ngọzi ịma eziokwu ahụ?
16 Jizọs kpere ekpere, sị: “Nna, . . . ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.” (Matiu 11:25) Jehova na-ekwe ka ndị nwere ezi obi na ndị dị umeala n’obi ghọta nzube ya na àgwà ya. (1 Ndị Kọrint 1:26-28) Anyị abatawo n’okpuru nlekọta ya, ọ na-akụzikwara anyị ịbara onwe anyị uru—inweta ihe kasị mma ná ndụ. Ka anyị jiri ohere ọ bụla anyị nwere na-abịaru Jehova nso, na-eji ọtụtụ ndokwa ndị o mere iji mee ka anyị mara ya nke ọma na-eme ihe.
17. Olee otú anyị si amata àgwà Jehova n’ụzọ zuru ezu karị?
17 Pọl degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Anyị na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo n’ihu a na-ekpuchighị ákwà, a na-agbanwekwa anyị nile gaa n’otu onyinyo ahụ site n’ebube ruo n’ebube.” (2 Ndị Kọrint 3:18) Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, ka anyị na-amatakwu Jehova—àgwà ya ndị e kpughere na Bible—otú ahụ ka anyị na-adịkwu ka ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ekele na-atụghari uche ná ndụ, ozi na ozizi Jizọs Kraịst, anyị ga na-egosipụtakwu àgwà Jehova n’ụzọ zuru ezu. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara na anyị na-eto Chineke anyị, bụ́ onye anyị na-achọ igbukepụ ebube ya!
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị mere ụjọ ji tụọ ụmụ Izrel ilegide ebube Chineke nke Mozis gbukepụrụ anya?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si ‘kpuchie ozi ọma ahụ ákwà’ na narị afọ mbụ? n’oge anyị?
• Olee otú anyị si egbukepụ ebube Chineke?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 19]
Ụmụ Izrel apụghị ilegide ihu Mozis anya
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
Dị ka Pọl, ọtụtụ n’ime ndị na-emegidebu eziokwu Chineke na-ejere Ya ozi ugbu a
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ọ na-atọ ndị ohu Jehova ụtọ igbukepụ ebube Chineke