Anyị Ga Na-ejegharị n’Aha Jehova Bụ́ Chineke Anyị
Anyị Ga Na-ejegharị n’Aha Jehova Bụ́ Chineke Anyị
“Anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—MAỊKA 4:5.
1. Ụdị omume dị aṅaa ka ndị mmadụ nọ na-eme n’ụbọchị Noa, oleekwa otú Noa si dị iche?
NWOKE mbụ e kwuru na Bible na ya na Chineke yikọrọ jegharịa bụ Ịnọk. Onye nke abụọ bụ Noa. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị sị: “Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:9) Ka ọ na-erule n’oge Noa, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha esiwo n’ezi ofufe dapụ. Ndị mere ka ọnọdụ ahụ ka njọ bụ ndị mmụọ ozi na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ ndị sooro ndị inyom nwee mmekọahụ, bụ́ nke a na-ekeghị ha inwe. Nke ahụ mekwara ka ha mụta ụmụ ndị a kpọrọ ndị Nefilim, “ndị dike,” ma ọ bụ “ndị a maara aha ha,” nke oge ahụ. Ka a sịkwa ihe mere ụwa ji jupụta n’ime ihe ike! (Jenesis 6:2, 4, 11) N’agbanyeghị nke ahụ, Noa enweghị ntụpọ, ọ bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Mgbe Chineke nyere ya iwu ka o wuo ụgbọ iji chebe ndụ, Noa rubere nnọọ isi “wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22) N’ezie, Noa na Chineke yikọrọ jegharịa.
2, 3. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Noa setịpụụrụ anyị taa?
2 Pọl gụnyere Noa ná ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi ọ kpọtụrụ aha mgbe o dere, sị: “Site n’okwukwe, Noa, mgbe e nyesịrị ya ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya; sitekwa n’okwukwe a, ọ mara ụwa ikpe, o wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke dị dị ka okwukwe si dị.” (Ndị Hibru 11:7) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ahụ bụ! N’inwe obi ike na okwu Jehova ga-emezu, Noa tinyere oge, ume, na ihe onwunwe ya iji mezuo ihe Chineke gwara ya mee. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị taa na-ajụ ohere ndị megheere ha inweta ihe onwunwe n’ụwa a ma na-etinye oge, ume, na ihe onwunwe ha n’irube isi n’iwu Jehova. Okwukwe ha kwesịrị ịrịba ama, ọ ga-arụpụtakwara ha na ndị ọzọ nzọpụta.—Luk 16:9; 1 Timoti 4:16.
3 Ọ ghaghị isiworo Noa na ndị ezinụlọ ya ike igosipụta okwukwe dị ka o siiri Ịnọk, bụ́ nna nna ochie Noa, onye a tụlere ihe banyere ya n’isiokwu bu ụzọ. N’ụbọchị Noa, dị ka ọ dị n’ụbọchị Ịnọk, ndị na-efe ezi ofufe dị ole na ole—ọ bụ nanị mmadụ asatọ kwesịrị ntụkwasị obi ma lanarị Iju Mmiri ahụ. Noa kwusara ezi omume n’ụwa nke jupụtara n’ime ihe ike na omume rụrụ arụ. Tụkwasị na nke ahụ, ya na ezinụlọ ya nọ na-ewu akatamkpo ụgbọ iji kwadebe maka iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ nke na-abịanụ n’agbanyeghị na ọ dịbeghị onye n’ime ha nke hụworo iju mmiri dị otú ahụ mbụ. Ha aghaghị ịdịwo ka ndị iberibe n’anya ndị na-ahụ ha.
4. Olee ihe dị njọ nke ndị oge Noa mere bụ́ nke Jizọs mere ka ọ pụta ìhè?
4 N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbe Jizọs zoro aka n’ụbọchị Noa, o kwughị okwu banyere ime ihe ike, okpukpe ụgha, ma ọ bụ omume rụrụ arụ—ọ bụ ezie na ihe ndị a dị oké njọ. Ihe ọjọọ Jizọs kwuru na ndị oge ahụ mere bụ na ha jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị e nyere. O kwuru Matiu 24:38, 39.
na ha nọ “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ.” Iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ịlụ di ma ọ bụ nwunye, na inye n’ọlụlụ di—ọ̀ dị ihe dị njọ n’ihe ndị a? Ha nọ nnọọ na-ebi ndụ “dị otú o kwesịrị”! Ma iju mmiri na-abịa, Noa nọkwa na-ekwusa ezi omume. Okwu ya na omume ya kwesịrị ịbụrụ ha ihe ịdọ aka ná ntị. Ma, “ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.”—5. Àgwà dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka Noa na ezinụlọ ya nwee?
5 Ọ bụrụ na anyị eleghachi anya azụ gaa n’oge ahụ, anyị ga-ahụ amamihe dị n’ụzọ ndụ Noa gbasoro. Otú ọ dị, ọ chọrọ obi ike iji dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụbọchị ndị bu Iju Mmiri ahụ ụzọ. Ọ chọrọ Noa na ezinụlọ ya inwe nkwenye siri ike iji wuo akatamkpo ụgbọ mmiri ahụ ma tinyejuo anụmanụ dị iche iche na-anọchi anya ụmụ anụmanụ dum n’ime ya. È nwere mgbe ọ gụtụrụ ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi agụụ ịghara ịgbapụ iche, kama ka ha soro ibe ha bie ndụ “dị otú o kwesịrị”? Ọ bụrụgodị na ọ dị mgbe echiche dị otú ahụ batara ha n’obi, o meghị ka ha kwụsị ịnọgide na-eme ezi ihe. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị—ogologo oge karịrị oge onye ọ bụla n’ime anyị tachiworo obi n’usoro ihe a—okwukwe Noa zọpụtara ya gabiga Iju Mmiri ahụ. Otú ọ dị, Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị nile na-ebi ndụ “dị otú o kwesịrị” ma ghara ịma ihe oge ha nọ n’ime ya pụtara.
Ime Ihe Ike Ejupụtala Ọzọ n’Etiti Ihe A Kpọrọ Mmadụ
6. Ọnọdụ dị aṅaa ka a nọgidere na-enwe mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?
6 Mgbe mmiri nke Iju Mmiri ahụ tara, ihe a kpọrọ mmadụ malitere ụwa n’isi. Otú ọ dị, ụmụ mmadụ ka bụ ndị na-ezughị okè, “nchepụta nke obi mmadụ” nọgidekwara ‘na-adị njọ site na nwata.’ (Jenesis 8:21) E wezụga nke ahụ, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ọjọọ apụghị inwoghara ahụ́ mmadụ ọzọ, ha ka na-akpa nnọọ ike. Ngwa ngwa, ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke gosipụtara na ya “dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” dịkwa nnọọ ka ọ dị taa, ndị na-efe Chineke lụrụ ọgụ megide “nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.”—1 Jọn 5:19; Ndị Efesọs 6:11, 12.
7. Olee otú ime ihe ike si mụbaa n’ụwa mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?
7 Ma ọ dịghị ihe ọzọ, malite n’oge Nimrọd, ime ihe ike bịara jupụtaghachi n’ụwa mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. N’ihi mmụba nke ọha mmadụ na ọganihu ndị a na-enwe na nkà na ụzụ, ime ihe ike ahụ bịara na-aka njọ. N’oge mbụ, ihe e nwere bụ mma agha, ube, ụta na àkụ́, na ụgbọ ịnyịnya. N’oge ndị na-adịbeghị nnọọ anya, e mepụtara égbè ndị ukwu na ndị nta nakwa ngwá agha ndị ọzọ, mesịakwa mepụta ndị ka ha bụrụ ọkpọka na narị afọ nke iri abụọ. N’Agha Ụwa Mbụ, a kpụpụtara ngwá agha ọhụrụ ndị na-emenye egwu karị, ndị dị ka ụgbọelu, ụgbọ agha na-agba n’ala, ụgbọ agha okpuru mmiri, na ikuku gas na-egbu egbu. N’agha ahụ, ngwá agha ndị a tara isi ọtụtụ nde mmadụ. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ịtụnanya? Ee e.
8. Olee otú Mkpughe 6:1-4 siworo mezuo?
8 N’afọ 1914, e chiri Jizọs echichi dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, “ụbọchị Onyenwe anyị” malitekwara. (Mkpughe 1:10) N’ọhụụ e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe, a hụrụ Jizọs dị ka Eze nke na-agba ịnyịnya ọcha ma na-enwe mmeri. Ndị ọzọ na-agba ịnyịnya sochiri ya, nke ọ bụla n’ime ha na-anọchi anya ihe otiti dị iche iche ga-adakwasị ihe a kpọrọ mmadụ. Otu n’ime ha na-agba ịnyịnya nke na-acha ọkụ ọkụ, e nyekwara ya ikike “iwepụ udo n’ụwa ka ha wee gburịta ibe ha; e nyekwara ya oké mma agha.” (Mkpughe 6:1-4) Ịnyịnya a na onye na-anọkwasị ya na-ese onyinyo agha, oké mma agha ahụ na-anọchikwa anya otú agha a na-alụ n’oge a na ngwá agha ya si ebibi ihe. Ngwá agha ndị e nwere taa gụnyere ngwá agha nuklia, nke otu n’ime ya nwere ike ibibi ọtụtụ iri puku mmadụ; ụgbọ elu rọket, bụ́ ndị a pụrụ ịnọ ọtụtụ puku kilomita jiri ha tụọ bọmbụ; nakwa gas na nje ndị na-akpata ọrịa bụ́ ndị a pụrụ iji lụọ agha ọgwụrụ mba.
Anyị Na-aṅa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Jehova
9. Olee otú ụwa taa si yie ụwa nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ?
9 N’ụbọchị Noa, Jehova bibiri ụmụ mmadụ n’ihi ihe ike gabigara ókè nke ndị ajọ mmadụ na-eme, bụ́ nke ndị Nefilim mere ka ọ ka njọ. Gịnị banyere oge a? Ime ihe ike ò belatawo n’ụwa karịa otú ọ dị n’ụbọchị Noa? Ọ dịghị ma ọlị. Tụkwasị na nke ahụ, dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, ndị mmadụ nọ na-eme ihe dịịrị ha, na-agbalị ibi ndụ “dị otú o kwesịrị,” na-ajụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị a na-akpọsa. (Luk 17:26, 27) Ọ̀ dị ihe ọ bụla mere a ga-eji nwee obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-ebibi ụmụ mmadụ ọzọ? Ee e.
10. (a) Olee ịdọ aka ná ntị nke e kwughachiri ugboro ugboro n’amụma Bible? (b) Olee nanị ihe amamihe dị na ya ime taa?
10 Ọtụtụ narị afọ tupu Iju Mmiri ahụ, Ịnọk buru amụma banyere mbibi nke na-aghaghị ịbịa n’oge ya. (Jud 14, 15) Jizọs kwukwara okwu banyere “oké mkpagbu” nke na-abịanụ. (Matiu 24:21) Ndị amụma ndị ọzọ dọkwara aka ná ntị banyere oge oké mkpagbu ahụ. (Ezikiel 38:18-23; Daniel 12:1; Joel 2:31, 32) N’akwụkwọ Mkpughe kwa, anyị na-agụ nkọwa doro anya banyere mbibi ikpeazụ ahụ. (Mkpughe 19:11-21) Anyị nile n’otu n’otu na-eṅomi Noa, anyị na-arụsikwa ọrụ ike dị ka ndị na-ekwusa ezi omume. Anyị na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova ma jiri ịhụnanya na-enyere ndị agbata obi anyị aka ime otu ihe ahụ. N’ihi ya, dị ka Noa, anyị so Chineke na-eje ije. N’ezie, ọ dị oké mkpa ka onye ọ bụla chọrọ ịdị ndụ nọgide soro Chineke na-eje ije. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ ebe anyị na-enwe nrụgide kwa ụbọchị? Ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe siri ike na nzube Chineke ga-emezu.—Ndị Hibru 11:6.
Nọgide Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara
11. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị si eṅomi Ndị Kraịst narị afọ mbụ?
11 Na narị afọ mbụ, e kwuru banyere ụmụnna Ọrụ 9:2) Ndụ ha dum hiwere isi n’okwukwe ha nwere n’ebe Jehova na Jizọs Kraịst nọ. Ha jere ije n’ụzọ Onyenwe ha jere ije na ya. Taa, Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-emekwa otú ahụ.
ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, dị ka ndị òtù nke “Ụzọ Ahụ.” (12. Gịnị mere mgbe Jizọs nyesịrị ìgwè mmadụ ihe oriri n’ụzọ ọrụ ebube?
12 A na-ahụ mkpa okwukwe dị n’otu ihe mere n’oge Jizọs jere ozi. N’otu oge, Jizọs nyere ìgwè mmadụ dị ihe dị ka puku ndị ikom ise ihe oriri n’ụzọ ọrụ ebube. Nke ahụ tụrụ ha n’anya ma mee ka ha nwee obi ụtọ. Otú ọ dị, rịba ama ihe mezirinụ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ndị ahụ hụrụ ihe ịrịba ama ndị o mere, ha malitere ịsị: ‘Onye a bụ n’ezie onye amụma ahụ nke gaje ịbịa n’ụwa.’ Ya mere, ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jichie ya iji chie ya eze, ọ laghachiri ọzọ n’ugwu ahụ nanị ya.” (Jọn 6:10-15) Ọ gawara ebe ọzọ n’abalị ahụ. O yiri ka ọjụjụ Jizọs jụrụ ịbụ eze ha ò wutere ọtụtụ ndị. E kwuwerị, o gosiwo na ya nwere amamihe ruo n’ókè nke ịbụ eze nakwa na ya nwere ike nke igbo mkpa anụ ahụ́ nke ndị mmadụ. Ma, oge Jehova chọrọ ka ọ chịwa dị ka Eze erubeghị. E wezụga nke ahụ, Alaeze Jizọs gaje ịbụ nke eluigwe, ọ bụghị nke ụwa.
13, 14. Echiche dị aṅaa ka ọtụtụ ndị nwere, oleekwa otú e si nwalee okwukwe ha?
13 Otú o sina dị, ìgwè mmadụ ahụ chọgharịrị nnọọ Jizọs ma chọta ya, dị ka Jọn kwuru, “n’ofe oké osimiri ahụ.” N’ihi gịnị ka ha ji chọgharịwa ya mgbe ọ jụsịrị ka e mee ya eze? Ọtụtụ ndị gosipụtara na ha na-eche echiche dị ka ndị anụ ahụ́ na-achị, na-ekwusi okwu ike banyere ihe anụ ahụ́ Jehova nyere n’ọzara n’oge Mozis. Ihe ha bu n’uche bụ na Jizọs kwesịrị ịnọgide na-egbo mkpa anụ ahụ́ ha. Ebe Jizọs ghọtara ihe ndị na-ezighị ezi ha bu n’obi, ọ malitere ịkụziri ha eziokwu ime mmụọ ndị pụrụ ime ka ha gbanwee echiche ha. (Jọn 6:17, 24, 25, 30, 31, 35-40) Ihe ụfọdụ ndị mere bụ ịtamu ntamu megide ya, karịsịa mgbe o nyere ihe atụ a, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ọ gwụla ma ùnu riri anụ ahụ́ nke Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu. Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 6:53, 54.
14 Ọtụtụ mgbe, ihe atụ ndị Jizọs nyere kpaliri ndị mmadụ igosipụta ma hà chọrọ n’ezie iso Chineke na-eje ije. Ihe atụ a mekwara otú ahụ. Ọ kpasuru ha iwe. Anyị na-agụ, sị: “Ya mere ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị: ‘Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ igere ya?’” Jizọs gara n’ihu ịkọwa na ha kwesịrị ịgbalị ịghọta ihe okwu ya pụtara n’ụzọ ime mmụọ. O kwuru, sị: “Ọ bụ mmụọ bụ nke na-enye ndụ; anụ ahụ́ abaghị uru ọ bụla ma ọlị. Okwu ndị m gwaworo unu bụ mmụọ, bụrụkwa ndụ.” N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị egeghị ntị, ihe ndekọ ahụ na-asị: “N’ihi nke a ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ndị ha hapụrụ ahapụ, kwụsịkwa iso ya na-ejegharị.”—Jọn 6:60, 63, 66.
15. Echiche dị aṅaa ziri ezi ka ụfọdụ n’ime ụmụazụ Jizọs nwere?
15 Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile na-eso ụzọ Jizọs meghachiri omume n’ụzọ dị otú ahụ. N’ikwu nke bụ́ eziokwu, ndị a na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị nọgidesiri ike n’akụkụ ya, aghọtachaghị ihe o kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere na-enwe nnọọ obi ike n’ebe ọ nọ. Pita, bụ́ otu n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ, ndị nọgidesiri ike, Jọn 6:68) Lee àgwà na ihe nlereanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!
kwupụtara echiche nke ndị ahụ nile na-ahapụghị Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (16. Olee otú a pụrụ isi lee anyị ule, ma echiche dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka anyị kwesịrị inwe?
16 Taa, a pụrụ ile anyị ule n’otu ụzọ ahụ e si lee ụmụazụ Jizọs ule. Anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ na nkwa Jehova adịghị emezu ngwa ngwa otú anyị chọrọ. Anyị pụrụ iche na otú e si akọwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible na-esi ike nghọta. Àgwà nke Ndị Kraịst ibe anyị pụrụ ime ka anyị nwee nkụda mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ziri ezi ịkwụsị iso Chineke na-eje ije maka ihe ndị a ma ọ bụ ihe ndị yiri ha? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị hapụrụ ya, gosipụtara na ha na-eche echiche dị ka ndị anụ ahụ́ na-achị. Anyị aghaghị izere ime otu ihe ahụ.
“Anyị Abụghị Ụdị Ndị Na-asụla Azụ”
17. Olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka iji nọgide soro Chineke na-eje ije?
17 Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) N’ime Bible, Jehova na-agwa anyị n’ụzọ doro anya, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:21) Irube isi n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka ‘ịnọrọsi ike na nche banyere otú anyị si na-eje ije.’ (Ndị Efesọs 5:15) Ịmụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe anyị na-amụ na-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ (3 Jọn 3) N’ezie, dị ka Jizọs kwuru, “mmụọ bụ nke na-enye ndụ; anụ ahụ́ abaghị uru ọ bụla ma ọlị.” Nanị nduzi a pụrụ ịdabere na ya maka nzọụkwụ anyị bụ nduzi ime mmụọ, bụ́ nke na-abịa site n’Okwu Jehova, mmụọ ya, na nzukọ ya.
18. (a) Olee ihe amamihe na-adịghị na ya nke ụfọdụ ndị na-eme? (b) Okwukwe dịkwa aṅaa ka anyị na-azụlite?
18 Taa, ndị na-ewe iwe n’ihi iche echiche dị ka ndị anụ ahụ́ na-achị ma ọ bụ n’ihi enwetaghị ihe ha tụrụ anya ha, na-amalitekarị ịchụrụ ihe nke ụwa a ruo ebe ọ gwụrụ. N’ịbụ ndị na-adịghịzi echeta na ụbọchị Jehova dị nso, ha adịghị ahụ mkpa ọ dị ‘ịnọrọ na nche,’ ha na-ahọrọkwa ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị bụ maka ọdịmma onwe onye nanị kama ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ. (Matiu 24:42) Ije ije n’ụzọ dị otú ahụ bụ ihe amamihe na-adịtụghị na ya. Rịba ama ihe Pọl onyeozi kwuru, sị: “Anyị abụghị ụdị ndị na-asụla azụ gaa ná mbibi, kama ụdị ndị na-enwe okwukwe gaa n’ichebe mkpụrụ obi ndụ.” (Ndị Hibru 10:39) Ma, dị ka Ịnọk na Noa, anyị bi n’oge ọgba aghara ma nwee ihe ùgwù nke iso Chineke na-eje ije. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme otú ahụ, anyị ga-enwe atụmanya e ji n’aka na nzube Jehova ga-emezu, na a ga-ekpochapụ ajọ omume, nakwa na ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-abịa. Lee atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!
19. Olee otú Maịka si kọwaa ụzọ ndụ nke ndị na-efe ezi ofufe na-agbaso?
19 Maịka onye amụma, bụ́ onye e nyere ike mmụọ nsọ, kwuru na mba nile nke ụwa ‘ga-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya.’ Mgbe ahụ, o kwuziri banyere onwe ya na ndị ọzọ ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova, sị: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Ọ bụrụ na mkpebi gị dị ka nke Maịka, akwụsịla ịnọ Jehova nso n’agbanyeghị otú oge a na-agbaru n’aghara. (Jems 4:8) Ka ọ bụrụ ọchịchọ sitere n’ala ala obi nke onye ọ bụla n’ime anyị iso Jehova bụ́ Chineke anyị na-eje ije ugbu a, ruokwa mgbe ebighị ebi!
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee otú oge a si yie oge Noa?
• Ụzọ ndụ dị aṅaa ka Noa na ezinụlọ ya gbasoro, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie okwukwe ha?
• Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi ka ụfọdụ n’ime ụmụazụ Jizọs nwere?
• Gịnị ka ezi Ndị Kraịst kpebisiri ike ime?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, ndị mmadụ taa na-emikpu onwe ha n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị
[Foto dị na peeji nke 21]
Dị ka ndị nkwusa Alaeze, “anyị abụghị ụdị ndị na-asụla azụ”