Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara Ndị A
Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara Ndị A
“Ịnọk na Chineke wee yikọọ na-ejegharị: ọ nọghịkwa: n’ihi na Chineke kuuru ya laa.”—JENESIS 5:24.
1. Olee ụfọdụ ihe ndị na-eme n’oge anyị bụ́ ndị mere ka ọ bụrụ oge dị oké egwu?
OGE ọgba aghara! Nke ahụ bụ nnọọ okwu kwesịrị ekwesị iji kọwaa afọ ndị gafeworonụ kemgbe e guzobere Alaeze Mezaịa na 1914, bụ́ afọ ndị jupụtara ná nsogbu na ime ihe ike. Kemgbe afọ ndị ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ nọ “n’ụbọchị ikpeazụ.” Ọdachi ndị dị ka ụnwụ nri, ọrịa, ala ọma jijiji, na agha anọwo na-akpa ha aka ọjọọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. (2 Timoti 3:1; Mkpughe 6:1-8) Ha na-emetụtakwa ndị na-efe Jehova. Ruo n’okè ụfọdụ, anyị nile aghaghị ịnagide ihe isi ike na ọnọdụ nke amaghị ihe echi ga-abụ bụ́ ndị a na-enwe n’oge a. Nsogbu ego, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mpụ, na ọrịa so n’ihe ndị na-eme ka ndụ sie nnọọ ike.
2. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ndị ohu Jehova cheworo ihu?
2 Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ ndị ohu Jehova anọwo na-edi ọtụtụ mkpagbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ ka Setan nọgidere na-ebu agha megide ndị “na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (Mkpughe 12:17) Ọ bụ ezie na ọ bụghị anyị nile nwetaworo mkpagbu kpọmkwem, ezi Ndị Kraịst nile aghaghị ịlụ ọgụ megide Setan bụ́ Ekwensu na mmụọ ọ na-akwalite n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Efesọs 2:2; 6:12) Anyị aghaghị ịnọ na nche iji zere ịbụ ndị mmụọ ahụ metụtara, ebe ọ bụ na anyị na-ahụ ya n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ebe ọ bụla ọzọ anyị na ndị na-enweghị mmasị n’ofufe dị ọcha na-emekọ ihe.
Soro Chineke Na-eje Ije, Ọ Bụghị Ndị Mba Ọzọ
3, 4. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndị Kraịst si dị iche n’ụwa?
3 Laa azụ na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst lụsikwara ọgụ ike megide mmụọ nke ụwa a, nke ahụ mekwara ka ha dị nnọọ iche n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst nọ. Pọl kọwara Ndị Efesọs 4:17-19.
ọdịiche ahụ mgbe o dere, sị: “Ya mere, nke a ka m na-ekwu ma na-agba àmà ya n’ime Onyenwe anyị, ka unu gharakwa ịnọgide na-eje ije dị nnọọ ka ndị mba ọzọ na-ejekwa n’abaghị uru nke uche ha, ka ha nọ n’ọchịchịrị n’uche, bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ ahụ bụ́ nke Chineke, n’ihi amaghị ihe nke dị n’ime ha, n’ihi enweghị mmetụta nke obi ha. Ebe ha na-enwekwaghị mmetụta ime omume ọma, ha nyefere onwe ha n’omume rụrụ arụ iji ụdị anyaukwu ọ bụla na-arụpụta adịghị ọcha.”—4 Lee ka okwu ndị ahụ si nnọọ kọwaa oké ọchịchịrị ime mmụọ gbachiri ụwa a na omume rụrụ arụ nke jupụtara na ya—ma n’ụbọchị Pọl ma n’ụbọchị anyị! Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst taa adịghị ‘eje ije dị ka ndị mba ọzọ na-eje.’ Kama nke ahụ, ha nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke iso Chineke na-eje ije. N’eziokwu, ụfọdụ pụrụ iche ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị dị ala, na-eso Jehova eje ije. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ha pụrụ ime otú ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova na-atụ anya ka ha mee otú ahụ. Na narị afọ nke asatọ Tupu Oge Anyị, Maịka onye amụma dekọrọ okwu ndị na-esonụ sitere n’ike mmụọ nsọ: ‘Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?’—Maịka 6:8.
Olee Otú A Pụrụ Isi Soro Chineke Na-eje Ije, Ọ̀ Bụkwa n’Ihi Gịnị?
5. Olee otú mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi soro Chineke na-eje ije?
5 Olee otú anyị pụrụ isi soro Chineke a na-adịghị ahụ anya, bụ́ onye kachasị ihe nile ike, na-eje ije? O doro anya na ọ bụghị dị ka anyị si eso mmadụ ibe anyị eje ije. Na Bible, okwu bụ́ “ije ije” pụrụ ịpụta ‘ịgbaso ụzọ ụfọdụ nke ime ihe.’ * N’iburu nke a n’uche, anyị na-aghọta na onye so Chineke na-eje ije na-agbaso ụzọ ndụ nke Chineke setịpụrụ, bụ́ nke na-atọ ya ụtọ. Ịgbaso ụzọ ndụ dị otú ahụ na-eme ka anyị dị iche n’ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị gbara anyị gburugburu nọ. Ma, ọ bụ nanị ya bụ ụzọ kwesịrị ekwesị Onye Kraịst ga-ahọrọ ịgbaso. N’ihi gịnị? E nwere ọtụtụ ihe mere o ji dị otú ahụ.
6, 7. N’ihi gịnị ka iso Chineke na-eje ije ji bụrụ ihe kasị mma ime?
6 Nke mbụ, ọ bụ n’ihi na Jehova bụ Onye Okike anyị, Isi Iyi nke ndụ anyị, na Onye Na-enye anyị ihe nile dị anyị mkpa iji dịgide ndụ. (Mkpughe 4:11) N’ihi ya, ọ bụ nanị ya nwere ikike ịgwa anyị otú anyị ga-esi na-eje ije. Tụkwasị na nke ahụ, iso Chineke na-eje ije bụ ụzọ ndụ kasị aba uru. Jehova emewo ndokwa maka ịgbaghara ndị so ya na-eje ije mmehie ha ma mee ka ha nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-enyekwa ndụmọdụ amamihe dị na ya bụ́ nke na-enyere ndị so ya na-eje ije aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ha ugbu a n’agbanyeghị na ha ezughị okè, birikwa n’ụwa nke na-atọgbọ n’aka Setan. (Jọn 3:16; 2 Timoti 3:15, 16; 1 Jọn 1:8; 2:25; 5:19) Ihe ọzọ mere anyị ga-eji soro Chineke na-eje ije bụ n’ihi na iji obi anyị dum na-eme otú ahụ ga-eme ka e nwee udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ.—Ndị Kọlọsi 3:15, 16.
7 Ihe ikpeazụ, bụ́kwa nke kasị mkpa, bụ na mgbe anyị so Chineke na-eje ije, anyị na-egosi ebe anyị kwụ ná nnukwu ihe iseokwu ahụ e welitere laa azụ n’ogige Iden—ihe iseokwu banyere ọbụbụeze. (Jenesis 3:1-6) Anyị na-egosipụta site n’ụzọ ndụ anyị na anyị kwụ chịm n’akụkụ Jehova, anyị na-akpọsakwa n’atụghị egwu na ọ bụ nanị ya ka o ruuru ịbụ Eze. (Abụ Ọma 83:18) N’ụzọ dị otú a, anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere anyị bụ́ ka e doo aha Chineke nsọ, ka e meekwa uche ya. (Matiu 6:9, 10) N’ezie, ndị họọrọ iso Chineke na-eje ije maara ihe! Obi kwesịrị isi ha ike na ha nọ n’ezi ụzọ, ebe ọ bụ ‘nanị Jehova maara ihe.’ Ọ dịghị ehie ụzọ ma ọlị.—Ndị Rom 16:27.
8. Olee otú oge Ịnọk na oge Noa si yie oge anyị?
8 Ma, olee otú ọ pụrụ isi kwe omume ibi ndụ
kwesịrị Ndị Kraịst n’ụwa nke na-agba aghara otú a, bụ́kwa ebe ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị ijere Jehova ozi? Anyị na-ahụ azịza ya mgbe anyị tụlere ihe banyere ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, bụ́ ndị nọgidesiri ike na-eme ezi ihe mgbe ihe siri nnọọ ike. Abụọ n’ime ha bụ Ịnọk na Noa. Ha abụọ biri ndụ n’oge yiri nnọọ oge anyị. Mmebi iwu juru ebe nile. N’oge Noa, ime ihe ike na omume rụrụ arụ jupụtara ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, Ịnọk na Noa guzogidere mmụọ nke ụwa nke oge ha ma soro Jehova jee ije. Gịnị nyeere ha aka ime otú ahụ? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị ga-atụle banyere Ịnọk n’isiokwu a. Anyị ga-atụlezi banyere Noa n’isiokwu na-eso.Ịnọk na Chineke Yikọrọ Jegharịa n’Oge Ọgba Aghara
9. Gịnị ka anyị maara banyere Ịnọk?
9 Ịnọk bụ onye mbụ e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na ya na Chineke yikọrọ jegharịa. Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Ịnọk na Chineke wee yikọọ na-ejegharị, mgbe ọ mụsịrị Metusela.” (Jenesis 5:22) Mgbe o kwusịrị afọ ole Ịnọk gbara—bụ́ nke dị ogologo ma e jiri ya tụnyere nke anyị, ma dị mkpụmkpụ ma e jiri ya tụnyere nke ndị oge ahụ—ihe ndekọ ahụ kwuziri, sị: “Ịnọk na Chineke wee yikọọ na-ejegharị: ọ nọghịkwa: n’ihi na Chineke kuuru ya laa.” (Jenesis 5:24) N’ụzọ doro anya, Jehova si n’ala ndị dị ndụ wega Ịnọk n’ụra ọnwụ ka ndị iro ya ghara ịkpara ya aka. (Ndị Hibru 11:5, 13) E wezụga amaokwu ndị ahụ dị mkpirikpi, e nwere ebe ole na ole ọzọ e kwuru banyere Ịnọk na Bible. Otú o sina dị, site n’ihe ndị anyị maara banyere oge ahụ na ihe àmà ndị ọzọ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwuo na oge Ịnọk bụ oge ọgba aghara.
10, 11. (a) Olee otú mmebi iwu si gbasaa mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi? (b) Ozi amụma dị aṅaa ka Ịnọk kwusara, oleekwa otú ihe o kwuru si metụta ndị mmadụ?
10 Dị ka ihe atụ, tụlee otú mmebi iwu si gbasaa ngwa ngwa n’etiti agbụrụ mmadụ mgbe Adam mehiesịrị. Bible na-agwa anyị na nwa mbụ nke Adam, bụ́ Ken, ghọrọ ogbu mmadụ mbụ mgbe o gburu nwanne ya bụ́ Ebel. (Jenesis 4:8-10) Mgbe Ebel nwụsịrị ọnwụ ike, a mụụrụ Adam na Iv nwa ọzọ, ha kpọkwara ya Set. Anyị na-agụ banyere ya, sị: “Set kwa, ya onwe ya ka a mụkwara nwa nwoke nye; ọ kpọọ aha ya Inọsh: mgbe ahụ ka a malitere ịkpọku aha Jehova.” (Jenesis 4:25, 26) N’ụzọ dị mwute, mmalite ahụ “a malitere ịkpọku aha Jehova” bụ n’ụzọ nkwulu. * Ọtụtụ afọ ka a mụsịrị Inọsh, otu onye sitere n’eriri Ken nke aha ya bụ Lemek rọọrọ ndị nwunye ya abụọ abụ, na-ekwu na ya gburu otu nwa okorobịa nke merụrụ ya ahụ́. Ọ dọkwara aka ná ntị, sị: “A sị na ọ bụ okpukpu asaa ka a ga-abọ Ken ọ́bọ̀, a ga-abọkwa Lemek [okpukpu iri asaa na asaa].”—Jenesis 4:10, 19, 23, 24.
11 Ihe a anyị tụlere na-egosi na ajọ omume nke Setan kpalitere n’ogige Iden dugara ngwa ngwa ná mgbasa nke mmebi iwu n’etiti ụmụ Adam. Ọ bụ n’ụwa dị otú ahụ ka Ịnọk bụrụ onye amụma Jehova, bụ́ onye okwu ya dị ike nke sitere n’ike mmụọ nsọ ka dị irè ọbụna taa. Jud kọrọ na Ịnọk buru amụma, sị: “Lee! Jehova bịara ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ihe e kpere n’ikpe megide ha nile, na ịma ndị nile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume nile ha nke asọpụrụghị Chineke bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, na banyere ihe nile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Okwu ndị a ga-enwe mmezu ikpeazụ ha n’Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na ọbụna n’ụbọchị Ịnọk, e nwere ọtụtụ “ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke,” bụ́ ndị amụma Ịnọk buru kpasuru iwe. Lee ka o si bụrụ ihe na-egosipụta ịhụnanya na Jehova kpọpụrụ onye amụma ahụ ka a ghara ịkpara ya aka!
Gịnị Mere Ka Ịnọk Kpebisie Ike Iso Chineke Jegharịa?
12. Gịnị mere ka Ịnọk dị iche n’etiti ndị ya na ha bikọrọ ndụ?
12 Laa azụ n’ogige Iden, Adam na Iv gere Setan ntị, Adam nupụkwaara Jehova isi. (Jenesis 3:1-6) Nwa ha bụ́ Ebel gbasoro ụzọ ndụ dị iche, ya na Jehova dịkwara ná mma. (Jenesis 4:3, 4) N’ụzọ dị mwute, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ Adam adịghị ka Ebel. Otú ọ dị, Ịnọk, bụ́ onye a mụrụ ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, mere dị ka Ebel mere. Olee otú Ịnọk si dị iche n’etiti ọtụtụ ụmụ ndị ọzọ nke Adam? Pọl onyeozi zara ajụjụ ahụ mgbe o dere, sị: “Site n’okwukwe, e wegara Ịnọk ebe ọzọ ka o wee ghara ịhụ ọnwụ, ọ dịghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke ewegawo ya ebe ọzọ; n’ihi na tupu e wega ya ebe ọzọ a gbara àmà banyere ya na o mewo ihe dị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 11:5) Ịnọk so ‘n’oké ìgwè ndị àmà [dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst],’ bụ́ ndị gosipụtara ihe nlereanya magburu onwe ya nke inwe okwukwe. (Ndị Hibru 12:1) Ọ bụ okwukwe nyeere Ịnọk aka ịtachi obi ma nọgide na-akpa ezi àgwà ruo narị afọ atọ—ihe karịrị okpukpu atọ nke afọ ole ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-adịru ndụ taa!
13. Ụdị okwukwe dị aṅaa ka Ịnọk nwere?
13 Pọl kọwara okwukwe Ịnọk na nke ndị àmà ndị ọzọ mgbe o dere, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ee, okwukwe bụ iji ihe a na-atụ anya ya n’aka bụ́ nke dabeere ná mmesi obi ike e nwere na ihe a na-atụ anya ya ga-emezu. Ọ bụ atụmanya siri nnọọ ike ruo n’ókè nke na ọ na-emetụta ndụ anyị. Okwukwe dị otú ahụ nyeere Ịnọk aka iso Chineke jee ije n’agbanyeghị na ụwa ọ nọ n’ime ya emeghị otú ahụ.
14. N’ezi ihe ọmụma dị aṅaa ka ọ pụrụ ịbụ na okwukwe Ịnọk dabeere?
14 Ọ bụ ezi ihe ọmụma na-eme ka mmadụ nwee ezi okwukwe. Olee ihe ọmụma nke Ịnọk nwere? (Ndị Rom 10:14, 17; 1 Timoti 2:4) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ maara ihe ndị mere n’Iden. Ikekwe, ọ nụkwara otú ndụ dị n’ogige Iden—bụ́ ogige ka dị adị n’oge ahụ ma eleghị anya, ọ bụ ezie na e gbochiri ụmụ mmadụ ịbanye n’ime ya. (Jenesis 3:23, 24) Ọ makwaara nzube Chineke bụ́ na ụmụ Adam ga-ejupụta ụwa ma mee ụwa dum ka ọ dị ka Paradaịs mbụ ahụ. (Jenesis 1:28) Tụkwasị na nke ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ịnọk nwere mmasị ná nkwa Jehova kwere ime ka e nwee Mkpụrụ nke ga-echipịa isi Setan ma kpochapụ ajọ ihe nile nke nduhie Setan kpatara. (Jenesis 3:15) N’ezie, amụma sitere n’ike mmụọ nsọ nke Ịnọk n’onwe ya buru, bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Jud, bụ banyere mbibi nke mkpụrụ Setan. Ebe ọ bụ na Ịnọk nwere okwukwe, anyị maara na o fere Jehova ofufe dị ka “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) N’ihi ya, ọ bụ ezie na Ịnọk enweghị ihe ọmụma nile anyị nwere, o nwere nke zuru ime ka o nwee okwukwe siri ike. N’ihi okwukwe dị otú ahụ, ọ nọgidesiri ike na-eme ezi ihe n’oge ọgba aghara.
Ṅomie Ihe Nlereanya Ịnọk
15, 16. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ụzọ ndụ Ịnọk?
15 Ebe ọ bụ na, dị ka Ịnọk, anyị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ n’oge ọgba aghara nke dị taa, anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya Ịnọk. Ọ dị anyị mkpa inweta na ịnọgide na-enwe ezi ihe ọmụma banyere Jehova na nzube ya. Ma, ọ dị ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa. Ọ dị mkpa ka anyị kwe ka ezi ihe ọmụma ahụ na-eduzi ụzọ ndụ anyị. (Abụ Ọma 119:101; 2 Pita 1:19) Ọ dị mkpa ka echiche Chineke na-eduzi anyị. Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-agbalịsi ike mgbe nile iche echiche na ime omume n’ụzọ na-atọ ya ụtọ.
16 Anyị enweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere onye ọ bụla ọzọ nke jeere Jehova ozi n’oge Ịnọk, ma o doro anya na ma ọ́ bụghị na ọ bụ nanị ya, ya abụrụ na o so na mmadụ ole na ole jeere Jehova ozi n’oge ahụ. Anyị onwe anyị, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi taa, dịkwa ole na ole n’ụwa, ma nke ahụ adịghị eme ka anyị nwee nkụda mmụọ. Jehova ga-akwado anyị onye ọ sọkwara ya ya megidewe anyị. (Ndị Rom 8:31) Ịnọk ji obi ike dọọ aka ná ntị banyere mbibi nke ga-abịakwasị ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Anyị onwe anyị jikwa obi ike na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” n’agbanyeghị ịkwa emo, mmegide, na mkpagbu. (Matiu 24:14) Ịnọk adịghị ogologo ndụ dị ka ndị ọgbọ ya. Otú ọ dị, olileanya ya abụghị n’ụwa nke oge ahụ. O lekwasịrị anya n’ihe ka mma. (Ndị Hibru 11:10, 35) Anyị onwe anyị kwa na-elekwasị anya ná mmezu nke nzube Jehova. N’ihi ya, anyị adịghị eji ụwa a eme ihe n’újú. (1 Ndị Kọrint 7:31) Kama ime otú ahụ, anyị na-eji ume na ihe onwunwe anyị eme ihe karịsịa n’ozi Jehova.
17. Olee ihe ọmụma anyị nwere bụ́ nke Ịnọk na-enweghị, n’ihi ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
17 Ịnọk nwere okwukwe na Mkpụrụ ahụ nke Chineke kwere ná nkwa ga-apụta mgbe oge Jehova ruru. O ruwo puku afọ abụọ ugbu a kemgbe Mkpụrụ ahụ—Jizọs Kraịst—pụtara, nye ihe mgbapụta, ma megheere anyị, nakwa ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie dị ka Ịnọk, ohere inweta ndụ ebighị ebi. Mkpụrụ ahụ, bụ́ onye e chiworo echichi ugbu a dị ka Eze nke Alaeze Chineke, si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa a, anyị na-ahụkwa nhụjuanya nke a kpataworo n’ebe nile. (Mkpughe 12:12) Ee, anyị nwere ihe ọmụma karịrị nke Ịnọk nwere. N’ihi ya, ka anyị nwee okwukwe siri ike dị ka o nwere. Ka okwukwe anyị nwere na nkwa Chineke ga-emezu na-achịkwa ihe nile anyị na-eme. Dị ka Ịnọk mere, ka anyị soro Chineke na-eje ije n’agbanyeghị na anyị bi n’oge ọgba aghara.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Lee Mpịakọta nke Mbụ nke Insight on the Scriptures, peeji nke 220, paragraf nke 6, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 10 Tupu ụbọchị Inọsh, Jehova anọwo na-agwa Adam okwu. Ebel chụụrụ Jehova àjà nke Ọ nakweere. Ọbụna Chineke gwara Ken okwu tupu iwe ekworo eduga Ken n’igbu ọchụ. N’ihi ya, mmalite a “a malitere ịkpọku aha Jehova” ga-abụrịrị n’ụzọ ọhụrụ, ọ bụghị n’ife ya ezi ofufe.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Gịnị ka iso Chineke na-eje ije pụtara?
• N’ihi gịnị ka iso Chineke na-eje ije ji bụrụ ihe kasị mma mmadụ ga-eme?
• Gịnị nyeere Ịnọk aka iso Chineke jee ije n’agbanyeghị na o biri ndụ n’oge ọgba aghara?
• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Ịnọk?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Site n’okwukwe, ‘Ịnọk na Chineke yikọrọ jegharịa’
[Foto dị na peeji nke 17]
Anyị kwenyesiri ike na nkwa Jehova ga-emezu
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 13]
Nwanyị, n’isi isi aka nri: foto FAO/B. Imevbore; ụlọ na-ada ada: San Hong R-C Picture Company