Uru Ọ̀ Dị n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe?
Uru Ọ̀ Dị n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe?
“I KWESỊRỊ ịgbanwe ọrụ,” ka Okoro gwara enyi ya. * “Ụgwọ ụlọ ọrụ ahụ ị na-arụrụ ọrụ na-akwụ gị ebughị ibu. Ọ bụrụ na ị rụwa ọrụ ebe ọzọ, a ga-akwụ gị ụgwọ buru ibu karị.”
“Ihe i kwuru ga-abụkwa eziokwu,” ka Chima zaghachiri. “Ma arụọlara m ha ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Ha enyewokwara m aka n’oge gara aga, achọkwara m ịnọgidesi ike n’akụkụ ha.”
“Ịnọgidesi ike n’ihe bụ àgwà magburu onwe ya,” ka Okoro kwuru. “Ma, ịnọgidesi ike n’ihe na-efu gị ego!”
Ihe Okoro kwuru bụ eziokwu. Ọtụtụ mgbe, mmadụ ịnọgidesi ike n’akụkụ onye ọzọ pụrụ ifu ya ego. Ọ chọkwara oge, ume, na mmadụ inye onwe ya kpamkpam. Uru a na-erite site n’ịnọgidesi ike n’ihe ọ̀ na-eru mgbalị a na-etinye maka ya?
Ka E Si Eto Ya Abụghị Ka E Si Eme Ya
N’otu nnyocha nke otu ụlọ ọrụ mere na Germany, pasent iri itoolu na isii nke ndị zara ihe a jụrụ ha lere ikwesị ntụkwasị obi anya dị ka àgwà dị mma. Nnyocha nke abụọ nke ụlọ ọrụ ahụ mere n’etiti ndị dị afọ 18 ruo afọ 24 gosiri na mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla zara ihe a jụrụ ha weere ikwesị ntụkwasị obi dị ka “ebe a nọ,” ya bụ́, ha lere ya anya dị ka ihe dị mma.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-eto ịnọgidesi ike n’ihe, ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi, egwú na-adagharị ma a bịa n’ime ya eme. * Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ mba ndị dị na Europe, ndị di na nwunye ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ adịchaghị anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha. Ọtụtụ mgbe, ndị enyi adịghị anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha. Ndị ọrụ na ndị were ha n’ọrụ adịchaghị anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha dị ka ọ na-adịbu, otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị na-ere ahịa na ndị ahịa ha nọ. N’ihi gịnị?
Mgbe ụfọdụ, ndụ gbalụ gbalụ adịchaghị ekwe ka e nwee oge ma ọ bụ ume ga-eme ka mmadụ wepụta onwe ya iji nọgidesie ike n’akụkụ onye ọzọ. Ndị ndị ha tụkwasịrị obi mewara obi nwere ike hà agaghịzi achọ ịtụkwasị onye ọ bụla obi. Ndị ọzọ pụrụ ịhọrọ ndụ nke e mete onye a enyi taa echi a chọrọ onye ọzọ, bụ́ nke na-adịghị achọ ịnọgidesi ike n’akụkụ onye ọ bụla.
Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, ịnọgidesi ike n’ihe bụ àgwà ọma nke otú e si eto ya na-abụghị otú e si eme ya. N’ihi ya, ajụjụ abụrụ: Uru ọ̀ dị n’ịnọgidesi ike n’ihe? Ya bụrụ otú ahụ, ole ndị ka anyị kwesịrị ịnọgidesi ike n’akụkụ ha, ọ̀ bụkwa n’ụzọ ndị dị aṅaa? Olee uru ndị dị n’ịnọgidesi ike n’ihe?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a nakwa n’isiokwu na-esonụ.
^ par. 8 Ọ bụ ezie na a dịghị ejikarị “ịnọgidesi ike n’ihe” na “ikwesị ntụkwasị obi” eme ihe n’ebe ha pụtara otu ihe, e jicha ha abụọ mee ihe n’ebe ụfọdụ n’isiokwu ndị a iji zoo aka n’otu ihe.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ịnọgidesi ike n’ihe bụ àgwà ọma nke otú e si eto ya na-abụghị otú e si eme ya