Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iso Ụzọ Kraịst Agbasaa n’Etiti Ndị Juu Narị Afọ Mbụ

Iso Ụzọ Kraịst Agbasaa n’Etiti Ndị Juu Narị Afọ Mbụ

Iso Ụzọ Kraịst Agbasaa n’Etiti Ndị Juu Narị Afọ Mbụ

E NWERE otu nzukọ dị mkpa na Jeruselem n’ihe dị ka afọ 49 O.A. “Ndị yiri ka ha bụ ogidi” nke ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ—Jọn, Pita, na onye otu nne ji ya na Jizọs bụ́ Jems—nọ ná nzukọ ahụ. Mmadụ abụọ ọzọ a kpọrọ aha ha so gaa nzukọ ahụ bụ Pọl onyeozi na onye ibe ya bụ́ Banabas. Ihe a tụlere ná nzukọ ahụ bụ otú a ga-esi kee ókèala ahụ buru nnọọ ibu maka ọrụ nkwusa ahụ. Pọl kọwara, sị: “[Ha] nyere mụ na Banabas aka nri nke ikerịta ihe, ka anyị wee gakwuru ndị mba ọzọ, ma ka ha gakwuru ndị e biri úgwù.”—Ndị Galeshia 2:1, 9. *

Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta nkwekọrịta a? È kere ókèala ndị a ga-ekwusa ozi ọma na ha ụzọ abụọ, nwee ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’otu akụkụ ma nwee ndị Jentaịl n’akụkụ nke ọzọ? Ka è kere ókèala ndị ahụ dabere n’ebe ha dị? Iji mata ihe nwere ike ịbụ azịza ya, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe ụfọdụ banyere ndị Juu bi ná mba ndị ọzọ.

Ndị Juu Narị Afọ Mbụ

Ndị Juu ole bi ná mba ọzọ na narị afọ mbụ? O yiri ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta hà kwenyeere ihe a akwụkwọ bụ́ Atlas of the Jewish World kwuru: “O siri ike ịmata ole ha dị kpọmkwem, ma e meela atụmatụ yiri ka ò ziri ezi nke na-ekwu na obere oge tupu afọ 70, e nwere nde ndị Juu abụọ na ọkara na Judia na ihe karịrị nnọọ nde anọ n’ebe ndị ọzọ ndị Rom na-achị. . . . O yiri ka ndị Juu hà mejupụtara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị nile bi n’ógbè alaeze ukwu ahụ, n’ebe ndị ọnụ ọgụgụ ha kasịkwa ukwuu, n’obodo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha pụrụ imejupụtawo otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na ha ma ọ bụ karịa.”

Ebe ndị bụ́ isi ndị Juu bi bụ Siria, Eshia Maịnọ, Babilọn, na Ijipt, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ha nwekwara obere ógbè dị iche iche na Europe. Ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst oge ochie a ma ama bibu ná mba ọzọ, ụfọdụ n’ime ha bụ Banabas onye Saịprọs, Priska na Akwịla ndị Pọntọs na Rom, Apọlọs onye Aleksandria, na Pọl onye Tasọs.—Ọrụ 4:36; 18:2, 24; 22:3.

E nwere ọtụtụ ihe ndị jikọrọ ndị Juu bi ná mba ọzọ na obodo ha. Otu n’ime ha bụ ụtụ isi a na-eziga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kwa afọ, bụ́ otu ụzọ ha si ekere òkè n’ihe a na-eme n’ụlọ nsọ na n’ofufe. Mgbe ọ na-ekwu banyere nke a, ọkà mmụta bụ́ John Barclay kwuru, sị: “E nwere ihe àmà zuru ezu na-egosi na ógbè ndị Juu dịgasị ná mba ndị ọzọ na-eji nlezianya anakọta ego a na onyinye ndị ọzọ ndị ọgaranya na-enye iji kpọnyere ya aka.”

Njikọ ọzọ ha nwere bụ ọtụtụ iri puku ndị na-aga ememe na Jeruselem kwa afọ. Ihe e dekọrọ n’Ọrụ 2:9-11 banyere Pentikọst 33 O.A. na-egosi nke a. Ndị Juu gara ememe ahụ na Jeruselem si Patia, Midia, Ilam, Mesopotemia, Kapadoshia, Pọntọs, Eshia, Frijia, Pamfilia, Ijipt, Libia, Rom, Krit, na Arebia.

Ndị isi ụlọ nsọ dị na Jeruselem na-edegara ndị Juu bi ná mba ndị ọzọ akwụkwọ ozi. A maara na Gameliel, bụ́ onye nkụzi iwu nke e kwuru maka ya n’Ọrụ 5:34, zigara akwụkwọ ozi na Babilọn na n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Mgbe Pọl onyeozi rutere Rom dị ka onye mkpọrọ n’ihe dị ka afọ 59 O.A., “ndị ikom welitere isi n’etiti ndị Juu” gwara ya na ha “[anataghị] akwụkwọ ozi banyere [ya] site na Judia, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ụmụnna ndị bịaworonụ nke kọrọ akụkọ ma ọ bụ kwuo ihe ọ bụla dị njọ banyere [ya].” Nke a na-egosi na a na-esi na Jeruselem eziga akwụkwọ ozi na akụkọ na Rom mgbe nile.—Ọrụ 28:17, 21.

Bible ndị Juu bi ná mba ọzọ na-agụ bụ nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ́ nke a maara dị ka Septuagint. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-ekwu, sị: “E nwere ike ikwubi na a nabatara ma na-agụ akwụkwọ bụ́ LXX [Septuagint] dị ka Bible ma ọ bụ ‘akwụkwọ nsọ’ ndị Juu n’ebe nile ndị Juu bi.” Ndị Kraịst oge mbụ jikwa nnọọ nsụgharị Bible ahụ mee ihe mgbe ha na-ezi ihe.

Ndị so n’òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst na Jeruselem maara banyere ọnọdụ ndị a. Ozi ọma ahụ eruolarị ndị Juu bi na Siria na ebe ndị ọzọ ntị, gụnyere ndị bi na Damaskọs na Antiọk. (Ọrụ 9:19, 20; 11:19; 15:23, 41; Ndị Galeshia 1:21) Ihe àmà na-egosi na ndị bịara nzukọ ahụ e nwere na 49 O.A. nọ na-eme atụmatụ maka ọrụ a ga-arụ n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee ebe ndị Bible kwuru otú ozi ọma ahụ si gbasaa n’etiti ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu.

Ihe Jikọrọ Njem Ndị Pọl Mere na Ndị Juu Bi ná Mba Ọzọ

Ọrụ mbụ e nyere Pọl onyeozi bụ “iburu aha [Jizọs Kraịst] gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.” * (Ọrụ 9:15) Mgbe nzukọ ahụ e nwere na Jeruselem gasịrị, Pọl nọgidere na-ezi ndị Juu bi ná mba ọzọ ozi ọma ebe ọ bụla ọ gara. (Lee igbe dị na peeji nke 14.) Nke a na-egosi na o mesịrị bụrụ na e kwekọrịtara ike ókèala ndị ahụ dabere n’ebe ha dị. Pọl na Banabas ji ozi ala ọzọ ha gaa n’ebe ọdịda anyanwụ, ndị ọzọ jekwara ozi ná mba ndị Juu na ná nnukwu ógbè ndị Juu dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Mgbe Pọl na ndị òtù ya malitere njem ozi ala ọzọ ha nke abụọ n’Antiọk nke dị na Siria, a gwara ha gaa n’ebe ọdịda anyanwụ site n’Eshia Maịnọ ruo Troas. Ha si ebe ahụ gafere Masedonia n’ihi na ha kpebiri na “Chineke akpọwo [ha] ịkpọsara [ndị Masedonia] ozi ọma.” Ka oge na-aga, e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst n’ógbè ndị ọzọ nke Europe, gụnyere Atens na Kọrint.—Ọrụ 15:40, 41; 16:6-10; 17:1-18:18.

N’ihe dị ka n’afọ 56 O.A., ná ngwụsị nke njem ozi ala ọzọ ya nke atọ, Pọl mere atụmatụ ịgakwu ọbụna n’ime ime ebe ọdịda anyanwụ ma gbasawanye ókèala ahụ e kenyere ya ná nzukọ ahụ e nwere na Jeruselem. O dere, sị: “Enwere m ọchịchọ siri ike ịkpọsakwara unu ozi ọma n’ebe ahụ na Rom,” deekwa sị, “M ga-esi na nke unu gaa Spen.” (Ndị Rom 1:15; 15:24, 28) Ma gịnị banyere ógbè ndị Juu buru ibu bụ́ ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?

Ógbè Ndị Juu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa

Na narị afọ mbụ O.A., ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ndị Juu bi n’Ijipt, karịsịa n’isi obodo ya bụ́ Aleksandria. Ebe a azụmahịa na ọdịnala hiwere isi nwere ọnụ ọgụgụ ndị Juu ruru ọtụtụ narị puku, e nwekwara ụlọ nzukọ ndị Juu n’akụkụ nile nke obodo ahụ. Philo, bụ́ onye Juu bi n’Aleksandria, kwuru na n’Ijipt nile, e nwere otu nde ndị Juu n’oge ahụ ma ọ dịkarịa ala. Ọnụ ọgụgụ buru ibu ebirikwala na Libia bụ́ obodo dị nso n’ebe ahụ, n’obodo Saịrini, nakwa gburugburu ya.

Ụfọdụ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst si n’ebe ndị a. Anyị na-agụ banyere “Apọlọs, . . . nwa afọ Aleksandria,” “ụfọdụ ndị ikom Saịprọs na Saịrini,” na “Lushiọs onye Saịrini,” bụ́ onye kwadoro ọgbakọ dị n’Antiọk nke Siria. (Ọrụ 2:10; 11:19, 20; 13:1; 18:24) E wezụga ndị a, ọ dịghị ihe ọzọ Bible kwuru banyere ọrụ Ndị Kraịst nke oge mbụ n’Ijipt na gburugburu ya ma ọ́ bụghị banyere ozi ọma Filip Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma ziri ọnaozi Etiopia.—Ọrụ 8:26-39.

Babilọn, nakwa Patia, Midia, na Ilam, bụ ebe ọzọ bụ́ isi ndị Juu bi. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na “e nwere ndị Juu n’ógbè ọ bụla dị gburugburu oké osimiri Taịgris na Yufretis, site n’Armenia ruo n’ọwara oké osimiri Peshia, nakwa n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ ruo Oké Osimiri Kaspian, na n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Midia.” Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ahụ ruru narị puku asatọ ma ọ bụ karịa. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Josephus na-agwa anyị na ọtụtụ iri puku ndị Juu bi na Babilọn gara Jeruselem maka ememe ndị a na-eme kwa afọ.

È mere ụfọdụ ndị Juu si Babilọn gaa Jeruselem baptizim na Pentikọst 33 O.A.? Anyị amaghị, ma ndị so nụ ihe Pita onyeozi kwuru n’ụbọchị ahụ si Mesopotemia bịa. (Ọrụ 2:9) Anyị maara na Pita onyeozi nọrọ na Babịlọn n’ihe dị ka afọ 62-64 O.A. Ọ nọ ebe ahụ dee akwụkwọ ozi mbụ ya, nakwa ma eleghị anya nke abụọ ya. (1 Pita 5:13) O doro anya na e weere Babilọn na ọtụtụ ndị Juu bi na ya dị ka otu akụkụ nke ókèala e kenyere Pita, Jọn na Jems ná nzukọ ahụ e kwuru banyere ya n’akwụkwọ ozi e degaara ndị Galeshia.

Ọgbakọ Jeruselem na Ndị Juu Bi ná Mba Ọzọ

Jems, bụ́ onye gakwara nzukọ ahụ ebe a nọrọ kwuo banyere ókèala ndị ahụ, jere ozi dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ Jeruselem. (Ọrụ 12:12, 17; 15:13; Ndị Galeshia 1:18, 19) Ọ hụrụ ihe mere na Pentikọst 33 O.A. bụ́ mgbe ọtụtụ puku ndị Juu bi ná mba ọzọ, bụ́ ndị bịara ememe ahụ, nakweere ozi ọma ahụ, e meekwa ha baptizim.—Ọrụ 1:14; 2:1, 41.

N’oge ahụ nakwa mgbe oge ahụ gasịrị, ọtụtụ iri puku ndị Juu bịara ememe ndị a na-eme kwa afọ. Obodo ahụ bịara jupụta na mmadụ nke na ndị bịara abịa gara nọrọ n’obodo ndị gbara Jeruselem gburugburu, ụfọdụ amaakwa ụlọikwuu nke ha. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-akọwa na e wezụga ịbịa hụ ndị enyi ha, ndị ahụ bịara ememe ahụ na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ iji fee ofufe, chụọ àjà ma mụọ Torah.

Obi abụọ adịghị ya na Jems na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ Jeruselem ji ohere ahụ gbaara ndị Juu si mba ndị ọzọ bịa àmà. Ikekwe, ndịozi ahụ ji nnọọ akọ mee nke ahụ n’oge “mkpagbu dị ukwuu bilitere megide ọgbakọ ahụ dị na Jeruselem” n’ihi ọnwụ Stivin. (Ọrụ 8:1) Ihe ndekọ ahụ na-egosi na tupu nke a emee, nakwa mgbe o mesịrị, ịnụ ọkụ n’obi Ndị Kraịst a ji kwusaa ozi ọma mere ka a nọgide na-enwe mmụba.—Ọrụ 5:42; 8:4; 9:31.

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta?

N’ezie, Ndị Kraịst oge mbụ mere ezi mgbalị iji zie ndị Juu ozi ọma n’agbanyeghị ebe ha bi. N’otu oge ahụ, Pọl na ndị ọzọ ziri ndị Jentaịl bi na Europe ozi ọma. Ha rubere isi n’iwu Jizọs nyere ụmụazụ ya mgbe ọ na-ala, nke bụ́ ka ha mee “ndị nke mba nile” ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20.

Site n’ihe nlereanya ha, anyị pụrụ ịmụta mkpa ọ dị ime nkwusa n’ụzọ a haziri ahazi iji nweta nkwado nke mmụọ Jehova. Anyị pụkwara ịhụ uru dị n’iji ozi ọma ahụ gakwuru ndị na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù, karịsịa n’ókèala ebe e nwere Ndịàmà Jehova ole na ole. Ókèala ụfọdụ e kenyere ọgbakọ gị ọ̀ na-amịpụta mkpụrụ karịa ebe ndị ọzọ? Ọ pụrụ ịba uru ịrụ ebe ndị ahụ mgbe mgbe karị. È nwere ihe omume ọha na eze ndị a na-eme n’ógbè unu bụ́ ndị ga-achọ ka e tinye mgbalị pụrụ iche iji gbaa àmà n’oge a na-anọghị n’ozi na n’okporo ámá?

Ọ ga-abara anyị uru inweta akụkọ zuru ezu banyere ihe ụfọdụ ndị mere n’oge gara aga nakwa ebe ndị ha mere kama nanị ịgụ ihe ndị e dere na Bible banyere Ndị Kraịst oge mbụ. Otu ngwá ọrụ pụrụ ime ka anyị ghọtakwuo ihe ndị a bụ broshuọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ nke nwere ọtụtụ map na ihe osise.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ọ dị ka è nwere nzukọ a n’oge òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ kwurịtara banyere ibi úgwù, ma ọ bụ ya abụrụ na e kwurịtara ihe abụọ ahụ n’otu nzukọ ahụ.—Ọrụ 15:6-29.

^ par. 13 Isiokwu a na-elekwasị anya n’àmà Pọl gbaara ndị Juu, ọ bụghị n’ọrụ ya dị ka “onyeozi nye ndị mba ọzọ.”—Ndị Rom 11:13.

[Chaatị dị na peeji nke 14]

NCHEGBU PỌL ONYEOZI NWERE MAKA NDỊ JUU BI NÁ MBA ỌZỌ

TUPU NZUKỌ AHỤ E NWERE NA JERUSELEM NA 49 O.A.

Ọrụ 9:19, 20 Damaskọs — ‘n’ụlọ nzukọ, ọ malitere ime nkwusa’

Ọrụ 9:29 Jeruselem — “ya na ndị Juu na-asụ Grik

na-ekwurịtakwa okwu”

Ọrụ 13:5 Salamis, Saịprọs — ‘na-ekwusa okwu Chineke n’ụlọ

nzukọ ndị Juu’

Ọrụ 13:14 Antiọk dị na Pisidia — “ha banyere n’ụlọ nzukọ”

Ọrụ 14:1 Aịkoniọm — ‘ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu’

MGBE NZUKỌ AHỤ E NWERE NA JERUSELEM NA 49 O.A. GASỊRỊ

Ọrụ 16:14 Filipaị — “Lidia, . . . onye na-efe Chineke”

Ọrụ 17:1 Tesalonaịka — “ụlọ nzukọ ndị Juu”

Ọrụ 17:10 Biria — ‘ụlọ nzukọ ndị Juu’

Ọrụ 17:17 Atens — “iso ndị Juu . . . na-atụgharị uche

n’ụlọ nzukọ”

Ọrụ 18:4 Kọrint — “na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ”

Ọrụ 18:19 Efesọs — “ya onwe ya banyere n’ụlọ nzukọ wee

soro ndị Juu nwee mkparịta ụka”

Ọrụ 19:8 Efesọs — “ọ banyere n’ụlọ nzukọ, o kwuru okwu

n’atụghị egwu ruo ọnwa atọ”

Ọrụ 28:17 Rom — ọ “kpọkọtara ndị ikom welitere isi

n’etiti ndị Juu”

[Map dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ndị nụrụ ozi ọma ahụ na Pentikọst 33 O.A. si ọtụtụ ebe bịa

ILIRIKỌM

ỊTALI

Rom

MASEDONIA

GRIS

Atens

KRIT

Saịrini

LIBIA

BITINIA

GALESHIA

ESHIA

FRIJIA

PAMFILIA

SAỊPRỌS

IJIPT

ETIOPIA

PỌNTỌS

KAPADOSHIA

SILAỊSHIA

MESOPOTEMIA

SIRIA

SAMERIA

Jeruselem

JUDIA

MIDIA

Babilọn

ILAM

AREBIA

PATIA

[Mmiri]

Oké Osimiri Mediterenian

Oké Osimiri Ojii

Oké Osimiri Uhie

Ọwara Oké Osimiri Peshia