Jehova Agaghị Ahapụ Gị Ma Ọlị
Jehova Agaghị Ahapụ Gị Ma Ọlị
A NỌ na-emegide Ndị Kraịst nọ na Judia n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ha aghaghịkwa ịlụ ọgụ megide ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ́ ihe e ji mara ndị bi ha gburugburu. Iji gbaa ha ume, Pọl onyeozi hotara ihe Jehova gwara ụmụ Izrel mgbe ha na-aba n’Ala Nkwa ahụ. Pọl dere, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5; Deuterọnọmi 31:6) Obi abụọ adịghị ya na nkwa a wusiri ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ ike.
Otu nkwa ahụ kwesịrị iwusi anyị ike ịnagide nchegbu ndị anyị na-enwe n’ihi ibi ‘n’oge ndị pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma mee ihe kwesịrị ekwesị, ọ ga-akwagide anyị ọbụna n’oge ndị kasị sie ike. Iji hụ otú Jehova pụrụ isi mezuo nkwa a, ka anyị tụlee ihe atụ nke mmadụ ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ na mberede.
Iche Mgbanwe A Na-atụghị Anya Ya Ihu
Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-enweghị ọrụ na-amụba amụba n’ụwa nile. Dị ka otu magazin ndị Poland si kwuo, e weere enweghị ọrụ dị ka “otu n’ime nsogbu ego ndị kasị sie ike ọha na eze nwere.” Nke a metụtakwara mba ndị mepere emepe. Dị ka ihe atụ, ọbụna n’etiti mba ndị so n’Òtù Na-ahụ Maka Nzụkọrịta Ahịa na Mmepe, ka ọ na-erule afọ 2004, ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ “agafeela nde 32, dị elu karịa ka ọ dị n’oge Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba nke afọ ndị 1930.” Na Poland, Ụlọ Ọrụ Etiti Na-ahụ Maka Mgbakọ Ọnụ Ọgụgụ depụtara aha nde mmadụ atọ na-enweghị ọrụ na December 2003, nke “bụ́ pasent 18 nke ndị nkịtị torurula ogo ịrụ ọrụ.” Otu akwụkwọ kwuru na n’afọ 2002, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị Africa bi na South Africa enweghị ọrụ!
Ọtụtụ ndị nọ n’egwu n’ihi na a pụrụ ịchụ ha n’ọrụ ma ọ bụ e mechie ụlọ ọrụ ha na mberede, nke a gụnyekwara ndị ohu Jehova. “Mgbe na ihe ndapụta” na-adabara onye ọ bụla. (Eklisiastis 9:11) Anyị onwe anyị pụrụ ịdị na-ekwughachi ihe a ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara.” (Abụ Ọma 25:17) Ị̀ ga-anagideli ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ? Ọ pụrụ ịkpatara gị nchegbu, ọ pụkwara imetụta ọnọdụ ime mmụọ gị na ego ole ị na-akpata. Ya bụrụ na a chụrụ gị n’ọrụ, ị̀ ga-enwetaghachili onwe gị?
Ịnagide Uche Mgbasasị
Janusz Wietrzyński bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ na-akọwa na “ọ na-aka ewute ụmụ nwoke ma a chụọ ha n’ọrụ” ebe ọ bụ na a na-ele ha anya kemgbe ụwa dị ka ndị na-akpa afọ ezinụlọ. O kwuru na ọ pụrụ ime ka nwoke “na-enwe mmetụta dịgasị iche iche,” ma iwe ma ike ọgwụgwụ. Nwoke a chụrụ n’ọrụ nke nwere ụmụ nwere ike ịmalite ile onwe ya anya dị ka onye na-abaghịzi uru ma malite “isesa ezinụlọ ya okwu.”
Adam, bụ́ Onye Kraịst nwere ụmụ abụọ, na-ekwu otú ọ dị ya mgbe a chụrụ ya n’ọrụ: “Obere ihe na-ewe m iwe; ọ dịghị ihe na-anaghị agbakasị m ahụ́. Ọbụna mgbe m na-ehi ụra, nrọ m nile na-abụ banyere ọrụ na otú m ga-esi kpata ihe ụmụ m na nwunye m, bụ́ onye a chụkwara n’ọrụ na mberede, ga-eri.” Mgbe a chụrụ Ryszard na Mariola, bụ́ di na nwunye nwere otu nwa, n’ọrụ, ha ka ji ụgwọ nnukwu ego ha gbazitere n’ụlọ akụ̀. Nwunye ya na-akọ, sị: “Obi m na-ama m ikpe mgbe nile, akọ na uche m ana-agwa m na anyị agaraghị agbaziri ego ahụ. Anọgidere m na-eche na o si m n’aka.” Mgbe anyị chere ọnọdụ ndị dị otú ahụ ihu, anyị pụrụ iwe iwe, inwe nchegbu ma ọ bụ inwe obi ilu ozugbo, obi pụkwara ịda anyị mbà. Oleezi otú anyị pụrụ isi chịkwaa mmetụta ndị na-adịghị mma anyị pụrụ inwe?
Bible na-enye ndụmọdụ dị irè banyere otú mmadụ pụrụ isi nọgide na-enwe olileanya. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ikpegara Jehova ekpere ga-enye anyị “udo nke Chineke,” obi dị jụụ bụ́ nke na-esite n’okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ. Nwunye Adam, bụ́ Irena, kwuru, sị: “N’ekpere anyị, anyị gwara Jehova ọnọdụ anyị na otú anyị ga-esi mekwuo ka ndụ anyị dị mfe. Di m, bụ́ onye obere ihe na-akpataburu nchegbu, malitere iche na anyị ga-enweta ihe ngwọta nye nsogbu anyị.”
Ọ bụrụ na a chụrụ gị n’ọrụ na mberede, i nwere ohere nke itinye ndụmọdụ Jizọs Kraịst n’ọrụ, bụ́ nke o nyere n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. . . . Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:25, 33) Ryszard na Mariola tinyere ndụmọdụ a n’ọrụ ka ha na-anagide mmetụta ndị ha na-enwe. Mariola na-echeta, sị: “Di m na-akasi m obi mgbe nile ma na-ekwusi ya ike na Jehova agaghị agbahapụ anyị.” Di ya na-agbakwụnye, sị: “Site n’ikpegara Jehova ekpere mgbe nile, anyị abịakwuola Chineke nso, sikwa otú a na-anọkwu onwe anyị nso, nke ahụ enyekwala anyị nkasi obi dị anyị mkpa.”
Mmụọ nsọ Chineke ga-enyekwara anyị aka ịnagide nsogbu. Njide onwe onye, bụ́ nke mmụọ ahụ pụrụ ịmịpụta n’ime anyị, pụrụ inyere anyị aka ịchịkwa onwe anyị na Ndị Galeshia 5:22, 23) O nwere ike ọ gaghị adị mfe, ma ọ ga-ekwe omume n’ihi na Jizọs kwere nkwa na “Nna [anyị] nke nọ n’eluigwe [ga-enye] ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị.”—Luk 11:13; 1 Jọn 5:14, 15.
mmetụta ndị anyị na-enwe. (Elegharala Mkpa Ime Mmụọ Gị Anya
Na mbụ, ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ na mberede pụrụ ichegbu ọbụna Onye Kraịst nwere nnọọ echiche ziri ezi, ma anyị ekwesịghị ileghara mkpa ime mmụọ anyị anya. Were Mozis dị afọ 40 dị ka ihe atụ, bụ́ onye ndụ ya gbanwere kpamkpam mgbe a chụpụrụ ya n’ọnọdụ ya n’obí eze, ya aghọọkwa onye ọzụzụ atụrụ, bụ́ ọrụ ndị Ijipt ledara anya. (Jenesis 46:34) Mozis aghaghị ime mgbanwe iji bie ndụ kwekọrọ n’ọnọdụ ọhụrụ ya. Ruo afọ 40 sochirinụ, o kwere ka Jehova kpụzie ya ma kwadebe ya maka ọrụ ọhụrụ ndị ọ ga-arụ n’ọdịnihu. (Ọpụpụ 2:11-22; Ọrụ 7:29, 30; Ndị Hibru 11:24-26) N’agbanyeghị na ihe siiri Mozis ike, o lekwasịrị anya n’ihe ime mmụọ, dịrị njikere ịnara ọzụzụ Jehova na-enye ya. Ka anyị gharatụ ileghara ihe ime mmụọ anya ‘ihi ihe isi ike!
Ọ bụ ezie na mmadụ ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ na mberede pụrụ ịdị na-akpasasị uche, ọ bụ oge mara mma iji wusie mmekọrịta anyị na Jehova Chineke na ndị ya ike. Adam, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, chere otú ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe a chụrụ mụ na nwunye m n’ọrụ, ịhapụ nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ibelata òkè anyị na-ekere n’ọrụ nkwusa abatatụghị anyị n’obi. Otú ahụ anyị si lee ihe anya mere ka anyị ghara ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe ga-eme echi.” Ryszard chekwara otú ahụ: “E wezụga nzukọ na ozi anyị, ọ dịghị otú Ndị Filipaị 2:4.
anyị gaara esi nwetaghachi onwe anyị; nchegbu gaara nnọọ erikpuwo anyị. Iso ndị ọzọ ekwurịta ihe ime mmụọ wuliri anyị elu, n’ihi na ọ na-eme ka anyị chefuo mkpa nke anyị ma chewe banyere nke ha.”—Ee, kama ịnọ na-echegbu onwe gị banyere ọrụ, gbalịa itinye oge ahụ i nwetakwuru n’ihe ime mmụọ, na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, na-ekere òkè n’ihe omume ọgbakọ, ma ọ bụ na-agbasawanye ozi gị. Kama ịnọ nkịtị, ị ga-enwe “ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị”—bụ́ nke ga-ewetara gị na ndị nile ji ezi obi nabata ozi Alaeze ahụ ị na-ekwusa ọṅụ.—1 Ndị Kọrint 15:58.
Ịkpa Afọ Ezinụlọ Gị
Otú ọ dị, nri ime mmụọ agaghị eme ka afọ ju onye agụụ ji. Anyị kwesịrị iburu ụkpụrụ na-esonụ n’obi: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Adam kwetara, sị: “N’agbanyeghị na ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ na-egbo mkpa anụ ahụ́ anyị ngwa ngwa, dị ka Ndị Kraịst, ọ bụ ibu ọrụ anyị ịgbalị ịchọta ọrụ.” Anyị pụrụ ịtụ anya na Jehova na ndị ya ga-akwado anyị, ma anyị ekwesịghị ichefu na ọ dị anyị mkpa ibute ụzọ n’ịchọ ọrụ.
Gịnị ka anyị ga-eme? Adam na-akọwa, sị: “Afanyela aka n’ụkwụ na-eche ka Chineke rụọrọ gị ọrụ ebube. . . . Mgbe ị na-achọ ọrụ, alala azụ ịkọwa onwe gị dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ndị isi ọrụ na-ejikarị nke ahụ akpọrọ ihe.” Ryszard na-enye ndụmọdụ a: “Jụọ onye ọ bụla ị maara ma è nwere ndị na-achọ ndị ha ga-ewe n’ọrụ, nọgide na-akpọtụrụ ụlọ ọrụ na-achọtara mmadụ ọrụ, na-agụ ịma ọkwa banyere ebe a chọrọ ndị ọrụ n’akwụkwọ akụkọ, ndị dị ka: ‘A chọrọ nwanyị ga na-elekọta onye ahụ́ na-adịghị’; ma ọ bụ, ‘Ọrụ nwa oge: Onye ga na-atụtụ mkpụrụ osisi.’ Nọgide na-achọ! Ahọbigala ọrụ ókè, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-apụta na ị ga-arụ ọrụ dị ala ma ọ bụ nke na-abụghị obi gị.”
Ee, “Jehova bụ onye inyeaka [gị].” Ọ “gaghị ahapụ gị ma ọlị, [ọ] gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5, 6) I kwesịghị ịdị na-echegbubiga onwe gị ókè. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) ‘Ịkpọre ụzọ anyị ruo Jehova ahụ́’ pụtara anyị ịdabere na ya na ime uche ya, ọbụna mgbe ihe yiri ka ò na-esiri anyị ike.
Adam na Irena jisiri ike kwadoo ezinụlọ ha site n’ịsa windo na ịza steepụ, ma ghara ịdị na-emefusị ego mgbe ha na-azụ ihe. Ha nọkwa na-aga ahụ ụlọ ọrụ na-achọtara ndị mmadụ ọrụ. Irena na-ekwu, sị: “Anyị na-enweta nnọọ enyemaka mgbe ọ dị anyị mkpa.” Di ya na-agbakwụnye, sị: “Anyị achọpụtala na ihe ndị anyị kpere n’ekpere ekwekọchaghị n’uche Chineke. Nke a akụziworo anyị ịdabere n’amamihe ya na ịghara ime ihe anyị chere. Ọ ka mma iji ndidi chere ihe ngwọta Chineke ga-eweta.”—Jems 1:4.
Ryszard na Mariola rụrụ ọrụ nwa oge dị iche iche, ma n’otu mgbe ahụ gbaa àmà n’ókèala ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu. Ryszard kwuru, sị: “Anyị nwetara ọrụ ndị dị anyị mkpa mgbe ọ na-adịghị ihe fọọrọ anyị iri. Anyị jụrụ ọrụ ndị a na-akwụ ezigbo ụgwọ na ha bụ́ ndị ga-emetụta ibu ọrụ ime mmụọ anyị. Anyị họọrọ ichere Jehova.” Ha kweere na ọ bụ Jehova mere ka ha chọta ụlọ dị ọnụ ala, meekwa ka Ryszard mesịa chọta ọrụ.
Ọ pụrụ iwute mmadụ nke ukwuu ma a chụọ ya n’ọrụ, ma gịnị ma i lee ya anya dị ka ohere iji jiri anya gị hụ na Jehova agaghị ahapụ gị? Jehova ga-elekọta gị. (1 Pita 5:6, 7) O kwela nkwa site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka.” (Aịsaịa 41:10) Ekwela ka ihe ndị a na-atụghị anya ha, gụnyere ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ, kụda gị mmụọ. Mee ihe nile i nwere ike ime, ma hapụziere Jehova ndị ọzọ. Chere Jehova, “derekwa duu” mgbe ị na-eme otú ahụ. (Abụ Ákwá 3:26) Ị ga-enweta ngọzi dị ukwuu.—Jeremaịa 17:7.
[Foto dị na peeji nke 9]
Tinye oge ahụ n’ihe ime mmụọ
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Mụta ịghara ịdị na-emefusị ego, ahọbigakwala ọrụ ókè mgbe ị na-achọ ọrụ