Nkà nke Iji Ịhụnanya Ege Ntị
Nkà nke Iji Ịhụnanya Ege Ntị
“I MEELA maka ige m ntị.” Ọ̀ dịla onye gwara gị otú ahụ na nso nso a? Onye ahụ kelere gị ezigbo ekele! Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe mmasị n’ebe onye na-ege ntị nke ọma nọ. Site n’ige ntị nke ọma, anyị pụrụ ime ka ndị dara mbà n’obi ma ọ bụ ndị nsogbu na-anyịgbu nwee ume ọhụrụ. Ige ntị nke ọma ọ́ dịghịkwa eme ka ọnụnọ anyị na ndị ọzọ tọọ anyị ụtọ? N’ọgbakọ Ndị Kraịst, iji ịhụnanya ege ntị bụ otu ụzọ dị mkpa e si ‘echebara ndị ọzọ echiche iji kpalie ha inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—Ndị Hibru 10:24.
Otú ọ dị, ọtụtụ ndị adịghị ege ntị nke ọma. Ha na-achọ inye ndụmọdụ, ịkọ banyere onwe ha, ma ọ bụ ikwu echiche ha kama ige ntị n’ihe ndị ọzọ nwere ikwu. N’ezie, ige ntị bụ nkà. Olee otú anyị pụrụ isi mụta iji ịhụnanya ege ntị?
Ihe Dị Mkpa Iji Bụrụ Onye Ji Ịhụnanya Ege Ntị
Jehova bụ ‘onye ozizi anyị.’ (Aịsaịa 30:20) Ọ pụrụ ịkụziri anyị ọtụtụ ihe banyere ige ntị. Tụlee otú Jehova si nyere Ịlaịja onye amụma aka. N’ihi ụjọ maka egwu Eze Nwanyị Jezibel yiri ya, Ịlaịja gbagara n’ịkpa ma sị na ọ kaara ya mma ịnwụ. Mmụọ ozi Chineke gwara ya okwu n’ebe ahụ. Ka onye amụma ahụ na-ekwu ihe bụ́ ụjọ ya, Jehova gere ya ntị ma gosipụtazie ike Ya dị ukwuu. Gịnị si na ya pụta? Ịlaịja kwụsịrị ịtụ ụjọ ma laghachi n’ọrụ ya. (1 Ndị Eze 19:2-15) Gịnị mere Jehova ji ewepụta oge ige ntị n’ihe ndị na-echegbu ndị ohu ya? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eche banyere ha. (1 Pita 5:7) Nke a bụ ihe dị mkpa iji bụrụ onye na-ege ntị nke ọma: Na-eche banyere ndị ọzọ ma gosi na i nwere ezi mmasị n’ebe ha nọ.
Mgbe otu nwoke bi na Bolivia mere mmehie dị oké njọ, o nwere obi ụtọ na otu onye kwere ekwe ibe ya chebaara ya nnọọ echiche n’ụzọ dị otú ahụ. Nwoke ahụ kọwara, sị: “Oge ahụ so n’oge ndị m kasị nwee nkụda mmụọ ná ndụ m. Ma eleghị anya, agaara m nnọọ akwụsị ife Jehova ma a sị na otu nwanna nwoke ewepụtaghị oge iji gee m ntị. O kwughị ọtụtụ okwu, ma ịmara na o nwere mmasị n’ebe m nọ ruo n’ókè nke ige m ntị wusiri m ike. Ihe dị m mkpa abụghị ka ọ gwa m ihe m ga-eme; amaara m ihe m kwesịrị ime. Nanị ihe dị m mkpa bụ ịma na ọ dị onye chọrọ ịma otú obi dị m. Ntị ahụ o gere m mere ka nkụda mmụọ ghara irikpu m.”
Jizọs Kraịst bụ ezigbo Onye Nlereanya n’ihe banyere nkà nke iji ịhụnanya ege ntị. Obere oge ka Jizọs nwụsịrị, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya si Jeruselem na-aga otu obodo nta dị kilomita 11 site na Jeruselem. O doro anya na ha nwere nkụda mmụọ. N’ihi ya, Jizọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ sonyeere ha na njem ahụ. Ọ jụrụ ha ajụjụ ndị o ji nlezianya hazie iji mata ihe dị ha n’obi, ndị ahụ na-eso ụzọ ya zakwara ajụjụ ndị ahụ. Ha gwara ya olileanya ndị ha nweburu na otú ha si nwee nkụda mmụọ na mgbagwoju anya ugbu a. Jizọs chebaara ha echiche, otú o si jiri ịhụnanya gee Luk 24:13-27.
ha ntị kwadebekwara mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ige ya ntị. Jizọs ‘kọwaziiri ha ihe ndị metụtara ya onwe ya n’ime Akwụkwọ Nsọ dum.’—Ibu ụzọ gee ndị ọzọ ntị bụ ụzọ magburu onwe ya isi kpalie ha ige anyị ntị. Otu nwanyị onye Bolivia kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na nne na nna di m malitere ikwu okwu megide otú m si azụ ụmụ m. Ihe ndị ha kwuru were m iwe, ma ejighị m n’aka na m ma ọrụ dịịrị m dị ka nne. N’oge a, otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ m. Ọ gwara m banyere nkwa ndị Chineke kwere. Otú ọ dị, ihe mere ka m mara na ọ chọrọ ige m ntị bụ otú o si ajụ m ihe m chere. Akpọbatara m ya n’ime ụlọ, n’oge na-adịghịkwa anya, amalitere m ịkọrọ ya nsogbu m. O ji ndidi gee m ntị. Ọ jụrụ m ihe bụ́ ebumnuche m n’ebe ụmụ m nọ na ihe di m chere banyere ya. Obi ruru m ala ịhụ onye dị njikere ịghọta m. Mgbe ọ malitere igosi m ihe Bible na-ekwu banyere ndụ ezinụlọ, ama m na ọ bụ onye ọnọdụ m na-emetụ n’obi ka mụ na ya na-akọrị.”
Bible na-ekwu, sị: ‘Ịhụnanya adịghị achọ ọdịmma nke ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Ya mere, iji ịhụnanya ege ntị na-achọ ka anyị wezụga ọdịmma nke onwe anyị n’ụsọ. Nke a pụrụ ịchọ anyị n’aka ịgbanyụ telivishọn, ịgbọtọ akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ ịgbanyụ ekwe ntị anyị mgbe ndị ọzọ na-akọrọ anyị ihe dị mkpa. Iji ịhụnanya ege ntị pụtara inwe ezigbo mmasị n’echiche onye nke ọzọ. Ọ na-achọ anyị n’aka izere ịmalite ikwu banyere onwe anyị site n’ikwu ihe dị ka, “Nke ahụ na-echetara m ihe mere m otu mgbe.” Ọ bụ ezie na ikwu ihe dị otú ahụ ná mkparịta ụka enyi na enyi adịghị ihe o mere, anyị kwesịrị iwezụga ọdịmma anyị n’ụsọ mgbe mmadụ na-akọrọ anyị ihe na-enye ya nsogbu n’obi. E nwekwara ụzọ ọzọ a pụrụ isi gosi ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ.
Gee Ntị Iji Mata Ihe Dị Mmadụ n’Obi
Ndị enyi Job nụrụ ma ọ dịkarịa ala okwu iri o kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, Job tipụrụ, sị: “Ọ ga adị m nnọọ mma ma a sị na enwere m onye ga-ege m ntị!” (Job 31:35) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ntị ha gere ya akasighị ya obi. Ha echeghị banyere Job ka ọ fọdụ ịchọ ịghọta otú obi dị ya. N’ezie, ha egosighị mmasị n’ebe ọ nọ dị ka ndị ji ọmịiko ege mmadụ ntị. Ma Pita onyeozi na-adụ ọdụ, sị: “Unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi.” (1 Pita 3:8) Olee otú anyị pụrụ isi gosi mmasị n’ebe onye ọzọ nọ? Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ bụ ichebara mmetụta onye nke ọzọ echiche na ịgbalị ịghọta ya. Ikwu okwu ọmịiko ndị dị ka “ụdị ihe ahụ na-ewe iwe” ma ọ bụ “ọ ga-adị gị nnọọ ka à ghọtahiere gị” bụ otu ụzọ isi gosipụta na anyị na-eche banyere ọnọdụ onye ahụ. Ihe ọzọ anyị pụrụ ime bụ ikwughachi ihe onye ahụ kwuru n’okwu nke aka anyị, si otú ahụ gosi na anyị ghọtara ihe o kwuru. Iji ịhụnanya ege ntị pụtara ige ntị n’ihe onye ahụ na-ekwu nakwa n’ihe ndị na-apụtachaghị ìhè okwu ya na-egosi banyere ihe dị ya n’obi.
Robert * bụ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova nke nwere ahụmahụ. Ọ na-akọ, sị: “Ọ dị mgbe ike ozi m gwụrụ m. N’ihi ya, arịọrọ m ka mụ na onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwurịta okwu. O gere m nnọọ ntị ma gbalịa ịghọta mmetụta m. O yidịrị ka ọ̀ ghọtara na m na-atụ ụjọ na ọ ga akatọ m maka otú m si lee ọnọdụ m anya. Nwanna ahụ mesiri m obi ike na ya ghọtara mmetụta ndị m na-enwe, n’ihi na ya onwe ya enwetụla mmetụta ndị yiri ha. N’ezie nke ahụ nyeere m aka ịnọgide n’ozi m.”
Ànyị nwere ike ige mmadụ ntị ma ghara ikwere ihe o kwuru? Ànyị nwere ike ịgwa mmadụ na obi dị anyị ụtọ na ọ gwara anyị ihe dị ya n’obi? Ee. Gịnị ma ọ bụrụ na obere nwa gị nwoke alụọ ọgụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ nwa gị nwanyị dị afọ iri na ụma alọta ma gwa gị na o nwere nwoke ya na ya na-akpa? Ọ́ kaghị mma nne ma ọ bụ nna ige ntị ma gbalịa ịghọta ihe onye ahụ na-eto eto na-eche tupu ya akọwawara ya ihe bụ́ àgwà ọma na ihe bụ́ àgwà ọjọọ?
Ilu 20:5 na-ekwu, sị: “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” Ọ bụrụ na onye maara ihe na onye nwere ahụmahụ achọghị inyewe ndụmọdụ n’okwu a na-akpọghị ya na ya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jiri nkà mee ka o nye anyị ndụmọdụ. Iji ịhụnanya ege ntị yiri nke ahụ. Nghọta dị mkpa iji mee ka mmadụ kwuo ihe dị ya n’obi. Ịjụ ajụjụ na-enye aka, ma anyị ga-akpachapụ anya ka anyị ghara ịjụwa onye ahụ ihe ndị ọ na-achọghị ịgwa mmadụ. Ọ pụrụ ịdị mma ịtụrụ onye ahụ na-ekwu okwu aro ka ọ malite site n’ikwu ihe ndị ga-adịrị ya mfe okwukwu. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịkara nwanyị chọrọ ikwu banyere nsogbu ya na di ya na-enwe mfe ịmalite site n’ịkọ otú ya na di ya si mata onwe ha ma lụọ. Ọ pụrụ ịkara onye na-adịghị ejekwa ozi Ndị Kraịst mfe ịmalite site n’ịkọ otú o si mụta eziokwu ahụ.
Iji Ịhụnanya Ege Ntị Bụ Ihe Ịma Aka
Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ige mmadụ ntị mgbe ọ na-ewesa anyị iwe, n’ihi na ọchịchọ ebumpụta ụwa anyị bụ ịgọpụwara onwe anyị. Olee otú anyị pụrụ isi merie ihe ịma aka ahụ? Ilu 15:1 na-ekwu, sị: “Ọzịza okwu dị nro, na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” Iji obiọma gwa onye ahụ ka ọ gwa anyị ihe dị ya n’obi na iji ndidi gee ya ntị ka ọ na-ekwu ihe na-ewe ya iwe bụ otu ụzọ isi nye azịza dị nro.
Oké arụmụka na-abụkarị mmadụ abụọ ikwughachi ihe ndị ha kwurula ekwu. Nke ọ bụla n’ime ha na-eche na onye nke ọzọ anaghị ege ya ntị. Lee ka ọ ga-esi ka mma ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha ga-akwụsị ma gee nnọọ ntị! N’ezie, ọ dị anyị mkpa ijide onwe anyị ma jiri amamihe na ịhụnanya mee ihe mgbe anyị na-ekwu uche anyị. Bible na-agwa anyị, sị: “Onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.”—Ilu 10:19.
Ọ dịghị onye bu ikike nke iji ịhụnanya ege ntị pụta ụwa. Otú o sina dị, ọ bụ nkà a puru ịmụta amụta site n’itinye mgbalị na mmadụ inye onwe ya ọzụzụ. N’ezie, ọ bụ nkà e kwesịrị inweta enweta. Ige ntị nke ọma mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu bụ ụzọ isi gosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ na-emekwa ka anyị nwekwuo obi ụtọ. N’ihi ya, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ịzụlite nkà nke iji ịhụnanya ege ntị!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 A gbanwere aha ahụ agbanwe.
[Foto dị na peeji nke 11]
Mgbe anyị na-ege ntị, anyị aghaghị iwezụga ọdịmma anyị n’ụsọ
[Foto dị na peeji nke 12]
Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ige mmadụ ntị mgbe iwe ji ya