Soro Chineke Na-eje Ije, Ma Ghọrọ Ezi Mkpụrụ
Soro Chineke Na-eje Ije, Ma Ghọrọ Ezi Mkpụrụ
“Ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụkwa oké ifufe ka ha ga-ewe dị ka ihe ubi.”—HOSEA 8:7.
1. Olee otú anyị pụrụ isi soro Jehova na-eje ije?
IME njem gabiga ógbè dị ize ndụ agaghị esicha ike ma ọ bụrụ na onye nduzi ụzọ doro anya ga-eduzi njem ahụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya iso onye nduzi dị otú ahụ na-aga kama itinye isi n’ógbè ahụ nanị gị. N’ụzọ ụfọdụ, nke ahụ bụ ihe atụ nke ọnọdụ anyị nọ na ya. A pụrụ ịsị na Jehova ekwela nkwa iduru anyị gafee ọzara sara mbara nke ajọ ụwa a. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị iso ya na-eje ije kama ịnwa iduzi nzọụkwụ anyị. Olee otú anyị pụrụ isi soro Chineke na-eje ije? Ọ bụ site n’ịgbaso nduzi ọ na-enye n’Okwu ya.
2. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu a?
2 Isiokwu bu ụzọ tụlere ihe nkiri ihe atụ nke dị na Hosea isi 1 ruo 5. Dị ka anyị hụworo, ihe nkiri ahụ nwere ihe mmụta bara uru bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka iso Chineke na-eje ije. Ka anyị tụlezie isi ihe ụfọdụ dị n’isi 6 ruo 9. Ọ ga-abara anyị uru ibu ụzọ tụlee ihe ndị dị n’isiakwụkwọ anọ a n’ụzọ dị mkpirikpi.
Ntụle Dị Mkpirikpi
3. Kọọ ihe dị na Hosea isi 6 ruo 9 ná mkpirikpi.
3 Ndị bụ́ isi Jehova zigara Hosea ije buoro amụma bụ alaeze ebo iri nke Izrel nke dị n’ebe ugwu. Mba ahụ, nke a makwaara dị ka Ifrem, bụ́ aha ebo ya bụ́ isi, agbakụtawo Chineke azụ. Hosea isi 6 ruo 9 na-egosi na ndị ahụ eguzosighị ike n’ihe n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ Jehova ma na-eme ajọ omume. (Hosea 6:7) Kama ịlaghachikwute Jehova, ha tụkwasịrị obi ná njikọ aka nke ha na mba dị iche iche. Ebe ọ bụ na ha nọgidere na-agha mkpụrụ ọjọọ, ha ga-aghọrọ mkpụrụ ọjọọ. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ha n’oge na-adịghị anya. Ma amụma Hosea nwekwara ozi ọma na-enye obi ụtọ. E mesikwara ndị ahụ obi ike na ha pụrụ ịlaghachikwute Jehova, nakwa na ọ ga-emere ha ebere ma ọ bụrụ na ha egosipụta nchegharị sitere n’obi.
4. Olee ihe mmụta anọ bara uru anyị ga-atụle n’amụma Hosea?
4 Anyị pụrụ inwetakwu nduzi ga-enyere anyị aka iso Chineke na-eje ije n’isiakwụkwọ anọ ndị a nke amụma Hosea. Ka anyị tụlee ihe mmụta anọ bara uru: (1) E ji omume egosipụta ezi nchegharị, ọ bụghị nanị okwu ọnụ; (2) nanị àjà adịghị atọ Chineke ụtọ; (3) ọ na-ewute Jehova mgbe ndị na-efe ya ofufe gbakụtara ya azụ; na (4) iji ghọrọ ezi mkpụrụ, anyị ga-agharịrị ezi mkpụrụ.
Otú E Si Egosipụta Ezi Nchegharị
5. Kwuo akụkụ kasị mkpa nke ihe e kwuru na Hosea 6:1-3.
5 Amụma Hosea na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere nchegharị na ebere. Na Hosea 6:1-3, anyị na-agụ, sị: “Bịanụ, ka anyị laghachikwute Jehova: n’ihi na Ya onwe ya adọkawo, Ọ ga-agwọkwa anyị; O tigbuwo, Ọ ga-ekechikwa anyị. Ọ ga-eme ka anyị dịghachi ndụ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị: n’ụbọchị nke atọ ka Ọ ga-eme ka anyị bilie, anyị ewee dị ndụ n’ihu Ya. Ka anyị marakwa, ka anyị gbasoo ịmara Jehova; dị ka chi ọbụbọ, otú a ka ọpụpụ Ya guzosiworo ike: Ọ ga-abịakwutekwa anyị dị ka oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri ozuzo ikpeazụ nke na-ezosa ala.”
6-8. Gịnị dị njọ ná nchegharị Izrel gosiri?
Hosea 6:4) Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ ihe àmà na-egosi na ndị Chineke nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ụzọ ime mmụọ! Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ebere, ma ọ bụ ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe, adịghịzi—dị ka igwe ojii ụtụtụ nke na-apụ n’anya ngwa ngwa anwụ wara. Ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na ndị ahụ mere ka à ga-asị na ha nwere nchegharị, Jehova ahụghị ihe mere ọ ga-eji meere ha ebere. N’ihi gịnị?
6 Ònye kwuru okwu ndị dị n’amaokwu ndị a? Ụfọdụ sịrị na ọ bụ ndị Izrel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi kwuru ha, nakwa na ndị nnupụisi ahụ nọ na-eme ka a sị na ha nwere nchegharị ma jiri ebere Chineke na-emere ihe ngọpụ iji na-arụ ala. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Hosea onye amụma kwuru okwu ndị ahụ, na-arịọ ndị ahụ ka ha laghachikwute Jehova. Onye ọ sọrọ ya bụrụ ya kwuru okwu ndị ahụ, ajụjụ dị mkpa bụ, Ndị alaeze ebo iri nke Izrel n’ozuzu ha hà laghachikwutere Jehova, ma gosipụta ezi nchegharị? Azịza ya bụ ee e. Site n’ọnụ Hosea, Jehova kwuru, sị: “Gịnị ka M ga-eme gị, Ifrem? gịnị ka M ga-eme gị, Juda? n’ihi na ebere unu dị ka igwe ojii ụtụtụ, na dị ka igirigi nke na-ala n’isi ụtụtụ.” (7 Nchegharị Izrel chegharịrị esighị ha n’obi n’ezie. Hosea 7:14 na-ekwu ihe mere Jehova ji wesa ndị Ya iwe, sị: “Ha ejighịkwa obi ha tikuo m, kama ha na-akwasi ákwá ike n’elu ihe ndina ha.” Amaokwu nke 16 na-agbakwụnye, sị: “Ha na-alaghachi, ma ọ bụghị Onye nọ n’elu ka ha na-alaghachikwute”—ya bụ, “ha alaghachighị n’ụdị ofufe dị elu.” Ndị ahụ adịghị njikere ịlaghachi n’ofufe dị elu nke Jehova site n’ime mgbanwe ndị dị mkpa iji mezie mmekọrịta ha na ya. N’ezie, ha achọghị iso Chineke jee ije!
8 E nwere ihe ọzọ dị njọ ná nchegharị Izrel gosipụtara. Ndị ahụ ka nọ na-eme mmehie—n’ezie, ụdị mmehie dịgasị iche iche, gụnyere igwu wayo, igbu ọchụ, izu ohi, ikpere arụsị, na iji nzuzu soro mba ndị ọzọ na-ejikọ aka. Na Hosea 7:4, e ji ndị ahụ tụnyere “ite ọkụ,” ma ọ bụ ovun nke onye na-eme achịcha, eleghị anya n’ihi na ihe ọjọọ na-agụsi ha agụụ ike. N’ihi ajọ ọnọdụ ime mmụọ dị otú ahụ ha nọ na ya, hà kwesịrị imere ebere? Ọ dịghị ma ọlị! Hosea gwara ndị nnupụisi ahụ na Jehova “ga-echeta ajọ omume ha” ma “leta mmehie nile ha.” (Hosea 9:9) A gaghị emere ha ebere!
9. Gịnị ka ihe ndị Hosea kwuru na-akụziri anyị banyere nchegharị na ebere?
9 Ka anyị na-agụ ihe ndị dị na Hosea, gịnị ka anyị na-amụta banyere nchegharị na ebere? Ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-akụziri anyị na iji bụrụ ndị Jehova ga-emere
ebere, anyị aghaghị igosipụta nchegharị sitere n’obi. Olee otú e si egosipụta nchegharị dị otú ahụ? A naghị eji anya mmiri nkịtị ma ọ bụ okwu ọnụ efu aghọgbu Jehova. E ji omume egosipụta ezi nchegharị. Ka e wee meere onye ajọ omume ebere, ọ ghaghị ịhapụ mmehie ya kpamkpam ma mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke ofufe Jehova e buliri elu.Nanị Àjà Adịghị Atọ Jehova Ụtọ
10, 11. Dị ka e gosiri n’ihe metụtara Izrel, gịnị mere na nanị àjà adịghị atọ Jehova ụtọ?
10 Ugbu a, ka anyị tụlee ihe mmụta nke abụọ pụrụ inyere anyị aka iso Jehova na-eje ije. Ọ bụ nke a: Nanị àjà adịghị atọ Chineke ụtọ. Hosea 6:6 na-ekwu, sị: “Ebere atọwo m [Jehova] ụtọ, ọ bụghị àjà; [ihe] ọmụma Chineke atọwokwa m ụtọ karịa àjà nsure ọkụ nile.” Rịba ama na ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ebere, ma ọ bụ ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe—àgwà nke na-esite n’obi—na inwe ihe ọmụma banyere Ya. Ma ị pụrụ iche, sị: ‘Gịnị mere amaokwu ahụ ji sị na “àjà” na “àjà nsure ọkụ” adịghị atọ Jehova ụtọ?’ Ọ̀ bụ na a chọghị ihe ndị ahụ n’okpuru Iwu Mozis?
11 A chọrọ àjà na àjà nsure ọkụ n’okpuru Iwu ahụ, ma ndị ha na Hosea dịkọrọ ndụ nwere nnukwu nsogbu. Ihe àmà na-egosi na e nwere ndị Izrel chụrụ àjà ndị ahụ ka a sịkwa na ha na-efe Jehova. Ma n’otu oge ahụ, ha nọ na-eme mmehie. Site ná mmehie ha, ha gosiri na ha enweghị ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe. Ha gosikwara na ha ajụla ihe ọmụma Chineke, n’ihi na ha adịghị ebi ndụ kwekọrọ na ya. Ọ bụrụ na ọnọdụ obi ndị ahụ na ụzọ ndụ ha ezighị ezi, olee uru àjà ha bara? Àjà ha na-asọ Jehova Chineke oyi.
12. Olee ịdọ aka ná ntị Hosea 6:6 na-enye ndị bi n’ụwa taa?
12 Ihe Hosea kwuru na-adọ ọtụtụ ndị na-aga chọọchị taa aka ná nti. Ha na-achụrụ Chineke àjà site n’ikere òkè n’ihe omume okpukpe. Ma, ofufe ha adịghị emetụtacha àgwà ha na-akpa kwa ụbọchị, ma ọ bụrụdị na ọ na-emetụta ya ma ọlị. Ndị dị otú ahụ hà na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na obi ha adịghị akpali ha ịnara ezi ihe ọmụma banyere Ya ma na-etinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ site n’izere mmehie? Ka onye ọ bụla ghara iche na nanị ọrụ okpukpe na-atọ Chineke ụtọ. Jehova adịghị enwe mmasị n’ahụ́ ndị na-achọ iji ofufe mmezu iwu enweta ihu ọma ya kama ịdị na-ebi ndụ kwekọrọ n’Okwu ya.—2 Timoti 3:5.
13. Olee ụdị àjà anyị na-achụ, ma gịnị ka anyị kwesịrị icheta na ọ bụ ya na-eme ka àjà anyị baa uru?
13 Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị na-eburu n’obi na nanị àjà adịghị atọ Chineke ụtọ. Ọ bụ eziokwu na anyị adịghị achụrụ Jehova àjà ụmụ anụmanụ. Otú o sina dị, anyị ‘na-achụrụ Chineke àjà otuto, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.’ (Ndị Hibru 13:15) Ọ dị oké mkpa na anyị ga-ezere ịdị ka ụmụ Izrel nke oge Hosea, na-eche na anyị pụrụ ikpuchi ajọ omume anyị site n’ịchụrụ Chineke àjà. Tụlee otu ihe atụ nke otu onye ntorobịa nwere mmekọahụ rụrụ arụ na nzuzo. O mesịrị kweta, sị: “Amụbara m ozi ubi m, na-eche na nke a ga-ekpuchi mmehie m n’ụzọ ụfọdụ.” Nke ahụ yiri ihe ndị Izrel ahụ na-enupụ isi nwara ime. Otú ọ dị, Jehova na-anara àjà otuto anyị nke ọma nanị ma ọ bụrụ na e jiri ezi obi na àgwà nsọpụrụ Chineke sochie ya.
Ọ Na-ewute Jehova Mgbe Ndị Na-efe Ya Ofufe Gbakụtara Ya Azụ
14. Olee ihe amụma Hosea na-ekpughe banyere ụdị mmetụta Chineke na-enwe?
14 Ihe nke atọ anyị na-amụta na Hosea isi 6 ruo 9 bụ otú ọ na-adị Jehova mgbe ndị na-efe ya ofufe gbakụtara ya azụ. Chineke na-enwe ma mmetụta ndị dị nro ma ndị siri ike. Ọ na-enwe mmetụta ndị dị nro dị ka ọṅụ na ọmịiko mgbe e nwere ndị si ná mmehie ha chegharịa. Otú ọ dị, mgbe ndị ya na-enweghị nchegharị, ọ na-enye ha ntaramahụhụ kwesịịrị ha. Ebe ọ bụ na Chineke na-eche nnọọ banyere anyị, ọ na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị ji ikwesị ntụkwasị obi soro ya na-eje ije. Abụ Ọma 149:4 na-ekwu, sị: “Ihe ndị Ya na-atọ Jehova ụtọ.” Ma, olee otú ọ na-adị Chineke mgbe ndị ohu ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi?
15. Dị ka Hosea 6:7 si kwuo, olee ihe ụfọdụ ndị Izrel nọ na-eme?
15 N’izo aka n’ebe ụmụ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ, Jehova na-ekwu, sị: “Ndị ahụ agabigawo pụọ n’ọgbụgba ndụ m, dị ka Adam: n’ebe ahụ ka ha ghọgbuworo m.” (Hosea 6:7) Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ ‘ịghọgbu’ pụtakwara ‘ekwesịghị ntụkwasị obi.’ Na Malakaị 2:10-16, e ji otu okwu Hibru ahụ kọwaa àgwà eguzosighị ike n’ihe nke ndị Izrel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye ha. Banyere ojiji e ji okwu a mee ihe na Hosea 6:7, otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu na ọ bụ “okwu ihe atụ banyere alụmdi na nwunye iji gosi àgwà mmadụ na-enwe ná mmekọrịta ahụ . . . Ọnọdụ ahụ bụ nke metụtara onwe onye bụ́ ebe e mebiri ịhụnanya.”
16, 17. (a) Gịnị ka Izrel mere banyere ọgbụgba ndụ ya na Chineke? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi banyere omume anyị?
16 Jehova weere Izrel dị ka nwunye ihe atụ ya n’ihi ọgbụgba ndụ ya na mba ahụ gbara. Ya mere, mgbe ndị ya mebiri ihe ndị ha kwekọrịtara na ha n’ọgbụgba ndụ ahụ, ọ dị ka à ga-asị na ha na-akwa iko. Chineke dị ka di na-ekwesị ntụkwasị obi, ma ndị ya gbakụtara ya azụ!
17 Olee maka anyị? Ma ànyị so Chineke eje 1 Jọn 4:16) Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ ọjọọ, anyị pụrụ ime ka Jehova nwee mwute, nke ahụ ga-akpasukwa ya nnọọ iwe. Anyị iburu nke a n’uche pụrụ ịbụ ihe nchebe siri ike nke ga-egbochi anyị ịdaba n’ọnwụnwa.
ije ma ọ bụ na anyị esoghị ya na-emetụta ya. Anyị kwesịrị icheta na “Chineke bụ ịhụnanya,” nakwa na omume anyị na-emetụta ya. (Otú Anyị Pụrụ Isi Ghọrọ Ezi Mkpụrụ
18, 19. Olee ụkpụrụ anyị na-ahụ na Hosea 8:7, oleekwa otú ụkpụrụ a si mezuo n’ahụ́ ụmụ Izrel?
18 Ka anyị tụlee ihe mmụta nke anọ dị n’amụma Hosea—otú anyị pụrụ isi ghọrọ ezi mkpụrụ. Banyere ụmụ Izrel na ihe nzuzu na ihe efu nke ekwesịghị ntụkwasị obi ha, Hosea na-ede, sị: “Ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụkwa oké ifufe ka ha ga-ewe dị ka ihe ubi.” (Hosea 8:7) N’ebe a, anyị na-ahụ otu ụkpụrụ anyị kwesịrị iburu n’uche: E nwere njikọ chiri anya dị n’etiti ihe anyị na-eme ugbu a na ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu. Olee otú ụkpụrụ a si mezuo n’isi ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi?
19 Site n’ime mmehie, ndị Izrel ahụ nọ na-agha mkpụrụ ọjọọ. Hà ga-anọgideli na-eme otú ahụ n’enwetaghị ntaramahụhụ? Ha agaghị agbanahụli ikpe ọmụma. Hosea 8:13 na-ekwu, sị: “Ọ [Jehova] ga-echeta ajọ omume ha, leta mmehie nile ha.” Na Hosea 9:17 kwa, anyị na-agụ, sị: “Chineke m ga-ajụ ha, n’ihi na ha egeghị Ya ntị: ha ga-abụkwa ndị na-awagharị n’etiti mba nile.” Jehova ga-ajụ ụmụ Izrel ajụjụ banyere mmehie ha. Ebe ọ bụ na ha ghara mkpụrụ ọjọọ, ha ga-aghọrọ mkpụrụ ọjọọ. E mezuru ikpe Chineke megide ha na 740 T.O.A. mgbe ndị Asiria kwaturu alaeze ebo iri nke Izrel ma dọrọ ndị bi na ya n’agha.
20. Gịnị ka ihe mere ụmụ Izrel na-akụziri anyị?
20 Ihe mere ndị Izrel ahụ na-akụziri anyị otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: Anyị ga-aghọrọ mkpụrụ anyị ghara. Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Ekwela ka e duhie gị: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Ọ bụrụ na anyị aghaa mkpụrụ ọjọọ, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ndị na-ebi ndụ rụrụ arụ ga-aghọrọ ajọ mkpụrụ. Onye mmehie nke na-enweghị nchegharị ga-ata ahụhụ ya.
21. Olee otú anyị pụrụ isi ghọrọ ezi mkpụrụ?
21 Oleezi otú anyị pụrụ isi ghọrọ ezi mkpụrụ? A pụrụ iji ihe atụ dị mfe zaa ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo achọọ ịghọrọ ọka wit, ọ̀ ga-agha ọka bali? Mbanụ! Ọ ghaghị ịgha mkpụrụ ọ ga-achọ ịghọrọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị achọọ ịghọrọ ezi mkpụrụ, anyị aghaghị ịgha ezi mkpụrụ. Ị̀ chọrọ ịnọgide na-aghọrọ ezi mkpụrụ—ndụ na-eju afọ ugbu a na atụmanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke? Ya bụrụ otú ahụ, ị ghaghị ịnọgide na-agha ezi mkpụrụ site n’iso Chineke na-eje ije ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya.
22. Olee ihe ndị anyị mụtaworo na Hosea isi 6 ruo 9?
22 Na Hosea isi 6 ruo 9, anyị amụtala ihe anọ ndị pụrụ inyere anyị aka iso Chineke na-eje ije: (1) E ji omume egosipụta ezi nchegharị; (2) nanị àjà adịghị atọ Chineke ụtọ; (3) ọ na-ewute Jehova mgbe ndị na-efe ya ofufe gbakụtara ya azụ; na (4) iji ghọrọ ezi mkpụrụ, anyị ga-agharịrị ezi mkpụrụ. Olee otú isiakwụkwọ ise ikpeazụ nke akwụkwọ Bible a pụrụ isi nyere anyị aka iso Chineke na-eje ije?
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee otú e si egosipụta ezi nchegharị?
• Gịnị mere na nanị àjà adịghị atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ?
• Olee otú ọ na-adị Chineke mgbe ndị na-efe ya gbakụtara ya azụ?
• Olee mkpụrụ anyị ga-agha ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọrọ ezi mkpụrụ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
Dị ka igwe ojii ụtụtụ, ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe nke Izrel nweburu pụrụ n’anya ngwa ngwa
[Foto dị na peeji nke 23]
Ọchịchọ ọjọọ nke Izrel dị ọkụ dị ka ite ọkụ
[Foto dị na peeji nke 24]
Gịnị mere Jehova ji jụ àjà ndị ya?
[Foto dị na peeji nke 25]
Iji ghọrọ ezi mkpụrụ, anyị ga-agharịrị ezi mkpụrụ