Ha Mere Ka Obi Ndị Mụrụ Ha Ṅụrịa
Ha Mere Ka Obi Ndị Mụrụ Ha Ṅụrịa
“NWA m, ọ bụrụ na obi gị maara ihe, obi m ga-aṅụrị, ọbụna nke m.” (Ilu 23:15) N’ezie, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-aṅụrị ọṅụ mgbe ụmụ ha nwetara amamihe Chineke. Na Saturday, September 10, 2005, puku mmadụ isii na narị mmadụ asatọ na iri ise na itoolu bụ́ ndị si mba dị iche iche, bịara ememe ngụsị akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri na itoolu nke Watchtower Bible School of Gilead. Mmadụ nile nwere nnọọ ọṅụ, karịsịa ndị nne na nna nke mmadụ iri ise na isii ahụ na-agụsị akwụkwọ.
David Walker, bụ́ onye nọteworo aka n’ezinụlọ Betel dị na United States, ji ekpere sitere n’obi meghee ihe omume ahụ. Mgbe ahụ, onyeisi oche nke usoro ihe omume ahụ, bụ́ David Splane, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, malitere ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ site n’ịgwa ndị nne na nna nke ndị a na-agụsị akwụkwọ, sị: “Unu kwesịrị ka a jaa unu mma nke ukwuu. Àgwà ndị unu kụnyere n’ime ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị emeela ka ha dị njikere ịbanye n’ozi ala ọzọ.” Ndị nne na nna nke ndị a na-agụsị akwụkwọ pụrụ ịdị na-echegbu onwe ha n’ihi na a pụrụ iziga ụmụ ha n’ala ndị dị anya. Otú ọ dị, Nwanna Splane mesiri ha obi ike, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ụmụ unu. Jehova pụrụ nnọọ ilekọta ha karịa ka unu pụrụ ime.” O kwuziri, sị: “Cheedịnụ echiche banyere ihe ọma ndị ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị ga na-emere ndị mmadụ. Ndị na-ata ahụhụ ga-enweta ezigbo nkasi obi nke mbụ ya ná ndụ ha.”
Otú Mmadụ Ga-esi Nọgide Na-ewetara Ndị Ọzọ Ọṅụ
Onyeisi oche kpọpụtara ọkà okwu anọ. Onye nke mbụ bụ́ Ralph Walls onye so na Kọmitii Alaka United States, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Mụrụ Anya.” O mesiri ike na ikpu ìsì ime mmụọ dị nnọọ njọ karịa ikpu ìsì nkịtị. Ọgbakọ dị na Leodisia na narị afọ mbụ bịara kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ. E kwere Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ nkwa na a ga-enyere ha aka, ma ọ kasị mma izere ikpu ìsì dị otú ahụ site n’ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 3:14-18) Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Mụrụnụ anya, na-elekwanụ ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ anya dị ka Jehova si ele ha.” Ndị a na-agụsị akwụkwọ ekwesịghị ịdị na-echegbubiga onwe ha ókè ma ọ bụrụ na e nwere nsogbu n’ọgbakọ. Onyenwe anyị Jizọs Kraịst maara banyere ihe nile dị otú ahụ. Ọ ga-ahụ na e lebaara ha anya n’oge kwesịrị ekwesị.
Ọzọ, Samuel Herd onye so n’Òtù Na-achị Isi zara ajụjụ bụ́ “Ị̀ Dị Njikere?” Dị nnọọ ka onye ije na-ewere uwe ndị dị ya mkpa, ndị a na-agụsị akwụkwọ aghaghị ịdị na-eyikwasị àgwà ndị e ji mara ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ mgbe nile. Ha aghaghị inwe ụdị ọmịiko Jizọs nwere. Mgbe otu onye ekpenta gwara ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha,” Jizọs sịrị ya: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” (Mak 1:40-42) Ọkà okwu ahụ kwuziri, sị: “Ọ bụrụ n’ezie na unu chọrọ inyere ndị mmadụ aka, unu ga-achọtarịrị ụzọ unu ga-esi mee otú ahụ.” Ndị Filipaị 2:3 na-agwa Ndị Kraịst ka ha ‘na-ewere na ndị ọzọ ka ha.’ Nwanna Herd kwuru, sị: “Ịdị obi umeala dị mkpa karịa inwe ihe ọmụma. Ndị unu ga-ezute n’ozi na ụmụnna unu ndị nwoke na ndị nwanyị ga-erite uru site n’ihe ọmụma unu ma ọ bụrụ nanị na unu dị umeala n’obi.” O mechiri site n’ikwu na ọ bụrụ na ndị a na-agụsị akwụkwọ anọgide na-eyikwasị onwe ha ịhụnanya Ndị Kraịst, na ha ga-adị njikere ịga ebe e kenyere ha ọrụ, na-ejide n’aka na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma.—Ndị Kọlọsi 3:14.
Mark Noumair, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi Gilead, jiri isiokwu bụ́, “Ị̀ Ga-anọgide Na-enwe Ya?” mee ka ndị na-ege ntị malite ịjụ onwe ha ihe “Ya” pụtara. “Ya” na-ezo aka n’ekele anyị nwere maka ịdị mma Jehova. Abụ Ọma 103:2 na-ekwu, sị: “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m, echezọkwala mmeso ọma Ya Ọ na-emeso gị.” Ụmụ Izrel egosipụtaghị ekele maka mana nke mere ka ha dị ndụ, ha kpọrọ ya ‘achịcha dị mfe.’ (Ọnụ Ọgụgụ 21:5) Ka oge na-aga, mana ahụ nọgidere na-abara ha uru, ha enweghịkwa ekele maka ya. Onye nkụzi ha ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu echefuo ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ ma ghara iji ozi o dunyere unu kpọrọ ihe, nke ahụ ga-emetụta otú unu si ele ọrụ Jehova nyere unu anya.” Abụ Ọma 103:4 na-ekwu na Jehova “na-ekpube gị okpueze, bụ́ ebere.” Ndị a na-agụsị akwụkwọ ga-ahụ ebere Jehova n’ọgbakọ ọhụrụ ha.
Onye nkụzi ọzọ nke Gilead, bụ́ Lawrence Bowen, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ọ̀ Ga-eru Gị Ahụ́?” O kwuru na ndị so na klas nke otu narị na iri na itoolu nke Gilead azụwo onwe ha nke ọma ịbụ ndị ozi ala ọzọ na-eme nke ọma. Ma ugbu a, ọ dị ha mkpa ịrapara Jehova n’ahụ́ ma na-arụ ọrụ o kenyere ha. Ná Mkpughe 14:1-4, a kọwara otu narị puku na iri puku anọ na anọ dị ka “ndị nọgidere na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.” Ndị nile so n’ìgwè ahụ na-arapara Jehova na Ọkpara ya n’ahụ́ n’agbanyeghị ule ọ bụla bịaara ha, ha na-erukwa ihe mgbaru ọsọ ha. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ihe ọ sọkwara ya mee, anyị onwe anyị kwa ga-arapara Jehova n’ahụ́ ma na-arụ ọrụ o kenyere anyị.” Site n’ime otú ahụ, ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ga-ahụ na ngọzi Jehova ‘ga-eru ha ahụ́.’—Deuterọnọmi 28:2.
Ịmịpụta Mkpụrụ n’Ozi Ha
N’oge ha nọ na-agụ akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ ahụ keere òkè n’ozi ubi ná ngwụsị izu nile. Ka Wallace Liverance, bụ́ onye na-edebanye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, so ha kwurịta okwu n’ihe omume ahụ, ọ bịara pụta ìhè na ha enwewo ihe ịga nke ọma. Ha ziri ozi ọma ọ dịkarịa ala n’asụsụ iri ma malite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Otu di na nwunye so na klas ahụ malitere ịmụrụ otu nwoke bụ́ onye China Bible. Mgbe ha letara ya nke ugboro abụọ, ha jụrụ ya otú obi dị ya n’ihi ịmara Jehova. O mepere Bible ya ma gwa ha ka ha gụọ Jọn 17:3. Ọ dị ya ka ọ nọ n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ.
Anthony Morris onye so n’Òtù Na-achị Isi gbaziri ụmụnna atọ so na Kọmitii Alaka nke Côte d’Ivoire, Dominican Republic na Ecuador ajụjụ ọnụ. Ụmụnna a mesiri ndị a na-agụsị akwụkwọ obi ike na ndị Kọmitii Alaka na-atụ anya ọbịbịa ha nakwa na ha ga-enyere ha aka ime ka ebe e kenyere ha ọrụ mara ha ahụ́.
Ọzọ, Leonard Pearson bụ́ onye òtù ezinụlọ Betel dị na United States sooro ndị Kọmitii Alaka si Democratic Republic of Congo, Papua New Guinea, na Uganda kwurịta okwu. Ụmụnna a gbara ndị a na-agụsị akwụkwọ ume ka ha na-ejechi ozi ọma anya. Otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ, ndị jiworo ihe karịrị afọ 21 jee ozi na Congo enyerela mmadụ iri isii aka ịrara onwe ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim. Di na nwunye ahụ na-eduziri mmadụ 30 Bible ugbu a, mmadụ 22 n’ime ndị ha na-amụrụ ihe na-abịa nzukọ ọgbakọ. Ugbu a a na-eweta ezigbo ihe n’ubi n’ụzọ ime mmụọ bụ oge magburu onwe ya iji jee ozi dị ka onye ozi ala ọzọ.
Ịgba Àmà n’Ụzọ Na-egosi na Anyị Maara na Oge Agwụwala
Gerrit Lösch onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu ikpeazụ. Isiokwu ya bụ “Ikwu Banyere Chineke na Ịgba Àmà Banyere Jizọs n’Ụbọchị Onyenwe Anyị.” Okwu Grik ndị e si na ha sụgharịta okwu ndị bụ́ “onye àmà,” “ndi àmà” na ‘ịgba àmà’ pụtara ugboro iri na itoolu n’akwụkwọ Mkpughe. Ya mere, Jehova mere ka ọrụ o nyere ndị ya doo anya. Olee mgbe anyị ga-agba àmà dị otú ahụ? Ọ bụ “n’ụbọchị Mkpughe 1:9, 10) Ụbọchị ahụ malitere na 1914, o ruru n’ụbọchị anyị, ọ ga-erukwa n’ọdịnihu. Dị ka Mkpughe 14:6, 7 si kwuo, ndị mmụọ ozi na-akwado ọrụ nke ikwu banyere Chineke. Mkpughe 22:17 na-egosi na ọ bụ ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ ka e kenyere iduzi ọrụ nke ịgbara Jizọs àmà. Ma anyị nile aghaghị iji ihe ùgwù ahụ mee ihe ugbu a. N’amaokwu nke 20, e kwuru na Jizọs sịrị: “Ana m abịa ọsọ ọsọ.” Nwanna Lösch gbara ndị nile bịaranụ ume, sị: “Gaanụ kpọọ ndị mmadụ, sịnụ ha bịa ‘nara mmiri nke ndụ n’efu.’ Jizọs na-abịa ọsọ ọsọ. Ùnu dị njikere?”
Onyenwe anyị.” (Fred Rusk, bụ́ onye kụziworo ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead ruo afọ iri na otu, jiri ekpere gosipụta ekele e nwere maka Jehova, bụ́ nke metụrụ ndị nile bịaranụ n’obi, mechie ihe omume ahụ. Ọ bụ ụzọ kasị mma isi weta ụbọchị a na-enye oké ọṅụ ná njedebe.
[Igbe dị na peeji nke 13]
IHE BANYERE KLAS AHỤ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10
Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 25
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56
Nkezi afọ ndụ ha: 32.5
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.4
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.1
[Foto dị na peeji nke 15]
Klas nke Otu Narị na Iri na Itoolu Na-agụsị Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Helgesen, S.; Daugaard, H.; Pierluissi, A.; Joseph, I.; Racanelli, C. (2) Byrge, T.; Butler, D.; Freedlun, J.; Nuñez, K.; Pavageau, C.; Doumen, T. (3) Camacho, O.; Lindqvist, L.; Broomer, A.; Wessels, E.; Burton, J.; Woodhouse, O.; Doumen, A. (4) Tirion, A.; Connally, L.; Fournier, C.; Gil, A.; Johnsson, K.; Hamilton, L. (5) Byrd, D.; Scribner, I.; Camacho, B.; Laschinski, H.; Hallahan, M.; Libuda, O. (6) Joseph, A.; Lindqvist, M.; Helgesen, C.; Nuñez, D.; Scribner, S.; Fournier, J. (7) Pierluissi, F.; Pavageau, T.; Broomer, C.; Racanelli, P.; Butler, T.; Woodhouse, M.; Libuda, J. (8) Laschinski, M.; Freedlun, S.; Burton, I.; Tirion, M.; Byrd, M.; Byrge, J. (9) Wessels, T.; Hallahan, D.; Connally, S.; Gil, D.; Daugaard, P.; Hamilton, S.; Johnsson, T.