Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Anụmanụ Na-eto Jehova

Ụmụ Anụmanụ Na-eto Jehova

Ụmụ Anụmanụ Na-eto Jehova

EBUBE Jehova pụtara ìhè n’ebe ụmụ anụmanụ nọ. Chineke na-elekọta ụmụ anụmanụ nke ọma, dịkwa ka o si elekọta ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 145:16) Lee ka ọ ga-esi bụrụ nnọọ ihie ụzọ ikwujọ Onye kere anyị na ha! Ọ bụ ezie na nwoke ahụ bụ́ Job bụ onye ezi omume, ọ gụrụ “onwe ya n’onye ezi omume karịa Chineke.” N’ihi ya, Job nwere ọtụtụ ihe o kwesịrị ịmụta!—Job 32:2; 33:8-12; 34:5.

Ihe atụ e ji ụmụ anụmanụ meere Job mere ka ọ mara na ụmụ mmadụ kwesịrị nnọọ ịnabata ụzọ Chineke. Nke ahụ ga-edo nnọọ anya mgbe anyị tụlere ihe ndị Jehova gwara ohu ya bụ́ Job!

Enyemaka Ụmụ Mmadụ Adịghị Ha Mkpa

Job azalighi ajụjụ ndị Chineke jụrụ ya banyere ụmụ anụmanụ. (Job 38:39-41) O doro anya na ọ dịghị mmadụ nke na-enyere Jehova aka n’ịzụ ọdụm na ugoloọma. Ọ bụ ezie na ugoloọma na-efegharị na-achọ nri, ọ bụ Chineke na-azụ ya n’ezie.—Luk 12:24.

Job amaghị ihe ọ ga-aza mgbe Chineke jụrụ ya banyere ụmụ anụmanụ ndị bi n’ọhịa. (Job 39:1-8) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ichebe ewu ọhịa na nne ele. Ịbịarudị ewu ọhịa nso adịghị mfe! (Abụ Ọma 104:18) Ọ bụ amamihe ebumpụta ụwa Chineke kenyere nne ele mere o ji abanye n’ebe zoro ezo n’ọhịa mgbe ọ na-achọ ịmụ nwa. Ọ na-elekọta ụmụ ọhụrụ ya nke ọma, ma mgbe ‘ahụ́ mara ha mma,’ ha ‘na-apụ, ha adịghị alaghachi.’ Ha na-elekọtawazi onwe ha.

Ịnyịnya ibu ọhịa nweere onwe ya, ọzara bụkwa ụlọ ya. Job apụghị iji ịnyịnya ibu ọhịa buo ibu. Ọ na-achọ “akwụkwọ ndụ ọ bụla,” na-achọgharị ahịhịa ọ ga-ata n’ugwu. Anụ ọhịa a agaghị ahapụ ọhịa bịa biri n’ụlọ iji na-enweta ihe oriri n’ụzọ dị mfe. “Ọ dịghị anụ mbigbọ nke onye na-achị mmadụ n’ihe ike,” n’ihi na ịnyịnya ibu ọhịa na-agbalaga ozugbo mmadụ batara n’ebe o bi.

Chineke kwuziri banyere atụ́. (Job 39:9-12) Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ onye England nke aha ya bụ Austen Layard dere banyere ya, sị: “Site n’otú e sirila gosi atụ́ n’ọtụtụ ihe a tụrụ atụ, o yiri ka è lere ya anya dị ka anụ fọrọ nke nta ka ọ dị ebube n’anya dị ka ọdụm ma bụrụ nke ndị dike na-achụ nta ya dị ka ọdụm. A na-ahụkarị ka ya na eze na-alụ ọgụ, ndị dike na-ejikwa ma ịnyịnya ma ụkwụ achụ ya.” (Nineveh and Its Remains, 1849, Mpịakọta nke 2, peeji nke 326) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị onye amamihe jiworo ya buo ibu.—Abụ Ọma 22:21.

Anụ Ufe Na-eto Jehova

Chineke jụziri Job banyere anụ ufe. (Job 39:13-18) Ụgbala na-eji nku ya dị ike efego nnọọ elu. (Jeremaịa 8:7) N’agbanyeghị na enyi nnụnụ na-efegharị nkụ ya efegharị, ọ pụghị ife efe. N’adịghị ka ụgbala, enyi nnụnụ adịghị eyi àkwá ya n’ime akwụ́ a kpara n’elu osisi. (Abụ Ọma 104:17) Ọ na-egwu ala n’ájá ma yinye àkwá ya ebe ahụ. Ma nnụnụ a adịghị eleghara àkwá ndị ahụ anya. Ọ na-eji ájá ekpuchi àkwá ndị ahụ n’ebe nwere ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ kwesịrị ekwesị, nke oké na nke nne na-anọkwa nso na-elekọta ha.

Ọ pụrụ iyi ka enyi nnụnụ ọ̀ ‘na-echezọ amamihe’ mgbe ọ chọpụtara na ya nọ n’ihe ize ndụ site n’aka anụ na-eri ibe ya ma mee ka à ga-asị na ọ na-achọ ịgbalaga. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ An Encyclopedia of Bible Animals na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe o ji emegharị onye iro anya: [enyi nnụnụ] na-eme ka anụmanụ ma ọ bụ mmadụ ọ bụla yiri egwu iri àkwá ya hụ ya, fee nku ya iji dọta uche mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ahụ, ma si otú ahụ dupụ ha n’ebe àkwá ndị ahụ dị.”

Olee otú o si bụrụ na enyi nnụnụ “na-achị ịnyịnya, na-achịkwa onye ọ na-ebu, ọchị”? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Enyi nnụnụ apụghị ife efe, ma e ji ịgba oké ọsọ mara ya. Otu nzọụkwụ ya pụrụ iru amaụkwụ 15 (ihe ji nke nta gafee mita anọ na ọkara) ka ọ na-agba ihe dị ka maịl 40 (kilomita 64) n’otu awa.”

Chineke Na-enye Ịnyịnya Ike

Chineke jụziri Job banyere ịnyịnya. (Job 39:19-25) N’oge ochie, ndị dike ji ịnyịnya lụọ agha, ịnyịnya na-adọkpụkwa ụgbọ ịnyịnya nke na-ebu onye na-akwọ ụgbọ ahụ na ma eleghị anya ndị agha abụọ. Ịnyịnya e ji alụ agha na-eti oké mkpu ma na-azọkasị ala n’ihi otú agha si atọ ya ụtọ. Ụjọ anaghị atụ ya, ọ dịghịkwa agba ọsọ n’ihi mma agha. Mgbe ọ nụrụ ụda opì ike, ịnyịnya e ji alụ agha na-eme ka à ga-asị na ọ na-asị, “Ehee!” Ọ na-awụrụ ọsọ gawa, “na-eloda ala.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ịnyịnya e ji alụ agha na-erubere onye na-agba ya isi.

N’ịkọwa ya n’ụzọ kwekọrọ na nke a, ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Layard dere, sị: “Ọ bụ ezie na ịnyịnya ndị Arab dị nwayọọ ka nwa atụrụ, bụrụkwa nke a na-eji nanị eriri eduzi, mgbe ọ nụrụ mkpu agha nke ndị agbụrụ ahụ ma hụ otú onye na-agba ya si dị njikere ịtụpụ ube ya, anya ya na-achawa ọkụ ọkụ, imi ya nke na-acha ọbara ọbara na-eghere nnọọ oghe, olu ya na-arọji, ọdụ ya na ajị ya na-eguzoro ọtọ ma gbasaa.”—Akwụkwọ bụ́ Discoveries Among the Ruins of Nineveh and Babylon, 1853, peeji nke 330.

Chee Banyere Egbe na Ugo

Jehova jụwaziri Job banyere ụdị anụ ufe ndị ọzọ. (Job 39:26-30) Egbe ‘na-efego n’elu, gbasaakwa nkù ya n’ikuku.’ Mgbe ọ na-ekwu banyere otu ụdị egbe a na-akpọ agụnkwọ dị ka nnụnụ fekarisịrị n’ufe, akwụkwọ bụ́ The Guinness Book of Records kwuru na ọ “na-efe oké ọsọ mgbe o si n’ebe dị nnọọ elu na-efedata ka ọ na-egwu egwu ma ọ bụ mgbe ọ chọrọ inwude ihe n’elu.” A hụtụla nnụnụ a ka ọ kpọgidere isi n’ala na-efedata n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị narị kilomita atọ na iri anọ na itoolu n’otu awa!

Ugo eferuola ebe karịrị otu narị kilomita na iri atọ n’otu awa. Job ji ndụ mmadụ nke na-agafe ngwa ngwa tụnyere ọsọ ugo nke na-achọ ihe ọ ga-eri. (Job 9:25, 26) Chineke na-enye anyị ume iji na-aga n’ihu, dị ka à ga-asị na ugo nke na-efego nnọọ elu bụ́ nke na-eyi ihe ike na-adịghị agwụ bu anyị na nku ya. (Aịsaịa 40:31) Mgbe ugo na-efe n’elu, ọ na-eso ikuku ọkụ nke na-ala elu iji nyere ya aka. Nnụnụ a na-agba ikuku ọkụ ahụ na-ala elu gburugburu, bụ́ nke na-eburu ya na-aga elu elu. Mgbe ugo ahụ ruru n’ebe dịtụ elu, ọ na-esonyere ikuku ọkụ ọzọ na-ala elu, ọ pụkwara ịnọ n’elu ruo ọtụtụ awa n’efechaghị nku ya efe.

Ugo ‘na-eme akwụ ya ka ọ dị elu’ ebe ihe ọ bụla na-apụghị iru, iji chebe ụmụ ya pụọ n’ihe ize ndụ. Ugo na-eme nke a n’ihi amamihe ebumpụta ụwa Jehova nyere ya. N’ihi ụdị anya Chineke nyere ugo, “anya ya abụọ na-esi n’ebe dị anya legide [ihe].” Ikike o nwere ịgbanwe ebe o legidere anya ngwa ngwa na-eme ka ugo nwee ike ịnọgide na-ahụ anụ ma ọ bụ ozu ọ na-aga iri mgbe o si n’ebe dị nnọọ anya na-efedata. Ugo pụrụ iri ozu anụmanụ nwụrụ anwụ, n’ihi ya, “ebe ndị e gburu egbu dị, n’ebe ahụ ka ọ nọ.” Nnụnụ a na-ejide ụmụ anụmanụ ndị dị obere ma bugara ha ụmụ ya.

Jehova Adọọ Job Aka ná Ntị

Tupu Chineke ajụọ Job ajụjụ ndị ọzọ banyere ụmụ anụmanụ, ọ dọrọ Job aka ná ntị. Olee ihe Job mere? O wedara onwe ya ala ma jiri obi ya nile nabatakwuo ndụmọdụ.—Job 40:1-14.

Anyị na-amụta ihe dị nnọọ mkpa site n’ihe anyị tụlerela n’ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke ahụmahụ Job: Ọ dịghị mmadụ nwere ihe mere ọ ga-eji katọọ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Anyị kwesịrị ịdị na-ekwu okwu ma na-eme omume n’ụzọ ga-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. Ọzọkwa, ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa karịsịa bụ ido aha nsọ Jehova nsọ na igosi na o ruuru ya ịbụ eze.

Òtòbò Na-eto Chineke

Chineke maliteghachiri ikwu banyere ụmụ anụmanụ ma jụọ Job banyere Òtòbò, bụ́ nke a maara dị ka enyi mmiri. (Job 40:15-24) Enyi mmiri nke tozuru etozu pụrụ ịdị malite na mita anọ ruo ise n’ogologo, ma nwee ike ịdị puku kilogram atọ na narị isii n’arọ. ‘Ike Òtòbò dị n’úkwù ya’—n’ebe azụ ya. Afọ ya siri ike na-enyere Òtòbò bụ́ anụ ụkwụ ya na-etoghị ogologo aka ka ọ na-akpụ afọ ya n’elu okwute ndị dị n’ala mmiri. N’ezie ọ dịghị mgbe a ga-eji mmadụ tụnyere Òtòbò, nke buru oké ibu, nwee ọnụ buru ibu, na agbà siri ike.

Òtòbò na-apụta n’elu ala iji ‘taa ahịhịa.’ Ọ na-afọ nke nta ka ọ tachaa ahịhịa nile dị n’ugwu! Ọ na-ata ahịhịa ruru kilogram 90 ruo otu narị kilogram na iri asatọ kwa ụbọchị. Mgbe Òtòbò rijuru afọ, ọ na-edina n’okpuru osisi lotus ma ọ bụ na ndò osisi willow. Ọ bụrụ na osimiri o bi n’ime ya etojuo, enyi mmiri nwere ike iwepụta isi ya n’elu mmiri ma gwufere ebe ahụ mmiri tojuru etoju. N’ihi otú ọnụ Òtòbò si buo ibu na otú ezé ya si sie ike, Job agaghị akatali obi ịga tinye nkò n’imi ya.

Agụ Iyi Na-ewetara Chineke Otuto

Job nụziri banyere Agụ Iyi. (Job 41:1-34) Okwu Hibru e si na ya nweta okwu ahụ bụ́ agụ iyi na-enye echiche nke “anụ ahụ́ ya fụkọrọ afụkọ.” Job ọ̀ pụrụ iji Agụ Iyi mere ihe ụmụaka na-eji egwuri egwu? Mbanụ! Izute anụ a akpatawo ọdachi ugboro ugboro. N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ emetụ Agụ Iyi aka, mgbali ọ ga-eme iji zọrọ onwe ya yiri ka ọ̀ ga-adị ukwuu nke na ọ gaghị anwa anwa mee ya ọzọ!

Ka anwụ na-awapụta, agụ Iyi na-ewelite isi ya n’elu mmiri, anya ya na-egbukekwa “dị ka mbubere anya nke chi ọbụbọ.” Akpịrịkpa Agụ Iyi kpachichara akpachi, ọkpụkpụ ndị dị n’ahụ́ ya sikwara ike nke na mgbọ agaghị epu ya ahụ́ ma ya fọdụ mma agha na ube. Akpịrịkpa kpuchiri afọ agụ iyi, bụ́ nke na-aghọ nkọ ka mma, na-aka akara yiri nke “ihe isucha ọka” n’elu apịtị dị n’ụsọ mmiri. Iwe ya n’ime mmiri na-eme ka mmiri gbaa ụfụfụ dị ka mmanụ otite na-esi ísì ụtọ. N’ihi otú ọ ha na ngwá agha ya—bụ́ ọnụ ya nke na-eyi egwu na ọdụ ya nke siri ike—Agụ Iyi adịghị atụ egwu ihe ọ bụla.

Job Echegharịa

Job kwetara na ‘ya kwuru ihe nke ya na-adịghị aghọta, ihe dịkarịrị ya ebube.’ (Job 42:1-3) Ọ nabatara mgbazi Chineke nyere ya, jụ onwe ya ma chegharịa. A baara ndị enyi ya mba, ma gọzie ya onwe ya n’ụba.—Job 42:4-17.

Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ịdị na-echeta ahụmahụ Job! Ọ dịghị otú anyị ga-esi zalie ajụjụ nile ahụ Chineke jụrụ ya. Otú ọ dị, anyị pụrụ ma kwesị ikele Jehova maka ọtụtụ ihe ndị dị iche iche dị ebube o kere bụ́ ndị na-eto ya.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ewu ọhịa

[Foto dị na peeji nke 13]

Ugoloọma

[Foto dị na peeji nke 13]

Nne ọdụm

[Foto dị na peeji nke 14]

Ịnyịnya ibu ọhịa

[Foto dị na peeji nke 14]

Enyi nnụnụ na-esi n’ebe àkwá ya nọ pụọ, ma ọ dịghị agbahapụ ha

[Foto dị na peeji nke 14]

Àkwá enyi nnụnụ

[Foto dị na peeji nke 14, 15]

Agụnkwọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Agụnkwọ: © Joe McDonald/Visuals Unlimited

[Foto dị na peeji nke 15]

Ịnyịnya ndị Arab

[Foto dị na peeji nke 15]

Ugo na-acha edo edo

[Foto dị na peeji nke 16]

A maara Òtòbò dị ka enyi mmiri

[Foto dị na peeji nke 16]

Agụ iyi bụ anụ siri ike