Ihe Odide Oge Ochie nke Gosipụtara Akwụkwọ Bible Ndị E ji Ike Mmụọ Nsọ Dee
Ihe Odide Oge Ochie nke Gosipụtara Akwụkwọ Bible Ndị E ji Ike Mmụọ Nsọ Dee
“O YIRI ka è dere ahịrịokwu ya ọ bụla kpọmkwem iji dọta mmasị nke ndị chọrọ ịma banyere Ndị Kraịst oge mbụ.” Nke ahụ bụ otú e si kọwaa otu ihe odide oge ochie. Ị̀ maara ihe odide nke ọ bụ?
O nwere ike ịbụ na ị nụtụla banyere ya ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị nụtụbeghị banyere ya—a na-akpọ ya Ihe Odide Muratori. Ma ị̀ nụtụla banyere ya ma ọ bụ na ị nụtụbeghị, ị pụrụ ịdị na-ajụ, sị, ‘Gịnị mere Ihe Odide Muratori ji pụọ iche?’ Ọ bụ ihe ndepụta kasị ochie nke akwụkwọ ndị dị na Bible, ma ọ bụ ihe ndepụta a pụrụ ịtụkwasị obi nke akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Ọ pụrụ ịbụ na o sighịrị gị ike ịma akwụkwọ ndị dị na Bible. Ma, ọ̀ ga-eju gị anya ịnụ na e nwere mgbe ụfọdụ ndị na-ejighị n’aka akwụkwọ ndị e kwesịrị ịgụnye n’akwụkwọ ndị dị na Bible? Ihe Odide Muratori, ma ọ bụ ihe ndepụta nke akwụkwọ ndị dị na Bible, depụtara akwụkwọ ndị e weere na e dere ha site n’ike mmụọ nsọ. Ị maara na ọ dị nnọọ mkpa ịma kpọmkwem akwụkwọ ndị so na Bible. N’ihi ya, gịnị ka ihe odide ahụ gosiri banyere akwụkwọ ndị dị ugbu a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe banyere ihe odide ahụ.
Otú E Si Chọta Ya
Ihe Odide Muratori dị n’otu nchịkọta nke ihe odide oge ochie e dere n’akpụkpọ anụ nke dị ibe 76, bụ́ nke a na-akpọ codex. Ibe ya nke ọ bụla dị sentimita 27 n’ogologo ma dị sentimita 17 n’obosara. Ọ bụ Ludovico Antonio Muratori (1672-1750), bụ́ onye Ịtali a ma ama nke na-akọ akụkọ ihe mere eme, chọtara ya n’Ọ́bá Akwụkwọ Ambrose, nke dị na Milan, Ịtali. N’afọ 1740, Muratori bipụtara ihe ahụ ọ chọtara, otú ahụ ka e si nweta aha ihe odide ahụ—Ihe Odide Muratori. O yiri ka à chịkọtara codex ahụ na narị afọ nke asatọ n’ebe obibi oge ochie nke ndị mọnk dị na Bobbio, nke dịdebere Piacenza, n’ebe ugwu Ịtali. E wefere ya n’Ọ́bá Akwụkwọ Ambrose ná mmalite narị afọ nke 17.
Ihe Odide Muratori nwere ahịrị 85, ọ dịkwa n’ibe nke 10 na nke 11 nke codex ahụ. E dere ya n’asụsụ Latin, ikekwe ọ bụ onye
ndepụtaghachi anya na-eruchaghị ala depụtaghachiri ya. Ma a chọpụtawo ụfọdụ n’ime ihe ndị o dehiere site n’iji ya tụnyere otu ihe odide ahụ nke dị n’ihe odide oge ochie anọ e dere na narị afọ nke 11 na nke 12.Olee Mgbe E Dere Ya?
Ma ị pụrụ ịdị na-eche mgbe mbụ e dere ihe ndị ahụ dị n’Ihe Odide Muratori. O yiri ka è dere nke mbụ ya na Grik ọtụtụ narị afọ tupu e dee nke ahụ a chọtara, bụ́ nke a sụgharịrị site na Grik gaa na Latin. Ọ dị otu ihe ga-enyere anyị aka ịmata mgbe e dere nke mbụ ya. Ihe Odide ahụ kpọtụrụ otu akwụkwọ na-adịghị na Bible, bụ́ Shepherd, aha ma kwuo na otu nwoke aha ya bụ Hermas dere ya “n’oge na-adịbeghị nnọọ anya, n’oge anyị, n’obodo Rom.” Ndị ọkà mmụta kwuru na Hermas dere akwụkwọ ikpeazụ ya bụ́ Shepherd n’agbata afọ 140 na 155 O.A. N’ihi ya, ị ga-ahụ ihe mere e ji kwuo na ọ bụ n’agbata afọ 170 na 200 O.A. ka e dere ihe odide Grik mbụ ahụ a sụgharịrị gaa n’asụsụ Latin, bụ́ nke a kpọrọ Ihe Odide Muratori.
Ebe ọ bụ na ihe odide ahụ kpọrọ Rom aha n’ụzọ pụtara ìhè nakwa n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, ọ pụrụ ịbụ na a nọ n’obodo ahụ dee ya. Ma a na-arụ ụka banyere onye dere ya. A kpọtụchaala Clement nke Aleksandria, Melito nke Sadis, na Polycrates nke Efesọs aha dị ka ndị ọ pụrụ ịbụ ha dere ya. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta na-ekwu na onye dere ya bụ Hippolytus, bụ́ onye dere ọtụtụ akwụkwọ na Grik, nke bikwara na Rom n’oge ọ pụrụ ịbụ na e dere Ihe Odide Muratori. Ọ bụ ezie na i nwere ike iche na nke ahụ agbasachaghị gị, ma eleghị anya, ị chọrọ ịmatakwu ihe dị n’ime ya bụ́ nke mere o ji baa nnọọ uru.
Ihe Dị n’Ime Ya
Ihe odide ahụ abụghị nanị ndepụta nke akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. O kwukwara banyere akwụkwọ ndị ahụ na ndị dere ha. Ọ bụrụ na ị gụọ ihe odide ahụ, ị ga-ahụ na ahịrị ndị mbụ ya adịkwaghị, o yikwara ka ọ̀ kwụsịrị n’ụzọ. O bu ụzọ kwuo banyere Oziọma Luk, o kwukwara na onye dere akwụkwọ Bible a bụ dibịa. (Ndị Kọlọsi 4:14) O kwuru na akwụkwọ Luk bụ Oziọma nke atọ, n’ihi ya, ị pụrụ ịhụ na o nwere ike ịbụ na akụkụ mbụ ya ahụ dọkapụrụla adọkapụ kwuru banyere Oziọma Matiu na Mak. Ọ bụrụ na i kwubie otú ahụ, echiche gị ga-ekwekọ n’ihe dị n’Ihe Odide Muratori ahụ, bụ́ nke kwuru na Oziọma nke anọ bụ Jọn.
Ihe Odide ahụ kwuru na Luk deere “Tiofilọs onye ukwu” akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Luk 1:3; Ọrụ 1:1) O depụtaziri akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi degaara ndị Kọrint (abụọ), nke o degaara ndị Efesọs, nke o degaara ndị Filipaị, nke o degaara ndị Kọlọsi, nke o degaara ndị Galeshia, ndị o degaara ndị Tesalonaịka (abụọ), nke o degaara ndị Rom, nke o degaara Faịlimọn, nke o degaara Taịtọs, na ndị o degaara Timoti (abụọ). O kwukwara na akwụkwọ ozi Jud na akwụkwọ ozi abụọ Jọn dere sitechara n’ike mmụọ nsọ. O burula ụzọ kwuo ihe banyere akwụkwọ ozi mbụ Jọn onyeozi dere mgbe ọ na-ekwu banyere Oziọma anọ ahụ. Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe, bụ akwụkwọ nke ikpeazụ o depụtara n’akwụkwọ ndị e lere anya na e dere ha n’ike mmụọ nsọ.
(Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na Ihe Odide ahụ kwuru banyere Apọkalips Pita ma kwuo na ụfọdụ chere na Ndị Kraịst ekwesịghị ịgụ ya. Onye dere ya dọrọ aka ná ntị na akwụkwọ ndị na-esiteghị n’ike mmụọ nsọ adịla n’oge ya. Ihe Odide Muratori kọwara na e kwesịghị ịnabata akwụkwọ ndị a, “n’ihi na o kwesịghị ekwesị ịgwakọta ihe na-elu ilu na mmanụ aṅụ.” Ihe odide ahụ kwukwara banyere ihe odide ndị ọzọ a na-agaghị agụnye n’akwụkwọ ndị dị nsọ. Nke ahụ bụ n’ihi na e dere ha mgbe oge ndịozi gaferela, bụ́ mgbe e dere Shepherd nke Hermas, ma ọ bụ ya abụrụ n’ihi na e dere ha iji kwado ozizi nduhie.
Ma eleghị anya, ị chọpụtala site n’ihe ndị e kwurula na e kwughị banyere akwụkwọ ozi e degaara ndị Hibru, akwụkwọ ozi abụọ Pita dere, na akwụkwọ Jems n’ihe ndepụta a kwuru banyere akwụkwọ ndị kwesịrị ịdị na Bible. Otú ọ dị, mgbe Dr. Geoffrey Mark Hahneman na-ekwu banyere nkà nke onye depụtaghachiri ihe odide ahụ, o kwuru na o “ziri ezi ikwu na o nwere ike ịbụ na Ihe Odide ahụ depụtara akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ ndị dọkapụrụ adọkapụ, nakwa na akwụkwọ Jems na Ndị Hibru (na 1 Pita) pụrụ iso na ha.”—Akwụkwọ bụ́ The Muratorian Fragment and the Development of the Canon.
Ya mere, Ihe Odide Muratori na-akwado na na narị afọ nke abụọ O.A., e werelarị ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ndị dị ugbu a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dị ka akwụkwọ ndị so na Bible. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ga-ekpebi akwụkwọ ndị so na Bible abụghị na a kpọtụrụ ha aha n’otu ihe odide oge ochie. Ihe na-egosi na e ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ ndị dị na Bible bụ ihe ndị dị na ha. Ha nile na-egosi na ọ bụ Jehova Chineke chepụtara ha, ha nile kwekọrịtakwara nnọọ. Nkwekọrịta nke akwụkwọ 66 mejupụtara Bible na-egosi na ha nwere otu olu, ọ na-egosikwa na ha zuru ezu. N’ihi ya, ọ ga-abara gị uru ịnabata ha dị ka ihe ha bụ n’eziokwu, Okwu eziokwu Jehova e ji ike mmụọ nsọ dee, nke e chebekwara ruo n’oge anyị.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13; 2 Timoti 3:16, 17.
[Foto dị na peeji nke 13]
Ludovico Antonio Muratori
[Foto dị na peeji nke 14]
Ọ́bá Akwụkwọ Ambrose
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe Odide Muratori
[Ebe E Si Nweta Foto]
Diritti Biblioteca Ambrosiana. Vietata la riproduzione. Aut. No. F 157 / 05
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 13]
Ihe Odide: Diritti Biblioteca Ambrosiana. Vietata la riproduzione. Aut. No. F 157 / 05; Muratori, nke dabeere n’ihe e sere ese: © 2005 Brown Brothers