Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Telivishọn Ọ̀ Na-elekọta Ụmụaka n’Ezie?

Telivishọn Ọ̀ Na-elekọta Ụmụaka n’Ezie?

Telivishọn Ọ̀ Na-elekọta Ụmụaka n’Ezie?

MGBE ỤFỌDỤ, ikwe ka ụmụ gị na-ele ihe na-atọ ha ọchị na telivishọn ka ị na-arụ ọrụ ndị dịịrị gị pụrụ iyi ihe dị nnọọ mma. Ma olee otú nke a pụrụ isi metụta ụmụ gị?

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ, sị: “Ihe ndị na-akpali akpali a na-egosi na telivishọn pụrụ imetụta ọbụna obere ụmụaka.” N’ihe ọmụmụ e mere n’oge na-adịbeghị anya, e gosiri ụmụaka dị otu afọ ebe onye na-eme ihe ngosi na telivishọn lere otu ihe ụmụaka ji egwuri egwu anya n’ụzọ dị iche iche. Akwụkwọ Times ahụ kwukwara, sị: “Mgbe onye ahụ na-eme ihe nkiri na TV tụrụ ihe ahụ ụmụaka ji egwuri egwu ụjọ, ụmụaka ahụ kwụsịrị iji ihe ahụ egwuri egwu, ụjọ jidekwara ọtụtụ n’ime ha, ha agbarụọ ihu, wee iwe ma ọ bụ bee ákwá. Mgbe onye ahụ na-eme ihe nkiri ji obi ụtọ were ihe ahụ ụmụaka ji egwuri egwu, ọtụtụ n’ime ụmụaka ahụ chọwara iji ihe ahụ egwuri egwu.”

O doro anya na telivishọn pụrụ imetụta obere ụmụaka. Gịnị banyere mmetụta na-adịte aka ọ na-enwe n’ahụ́ ụmụaka? Dr. Naoki Kataoka, bụ́ prọfesọ na-ahụ maka ọrịa ụmụaka na Mahadum Ọgwụ na Ahụ́ Ike Kawasaki dị na Kurashiki, Japan, ahụwo ọtụtụ ụmụaka ndị na-anọ nnọọ nwayọọ, ha anaghịkwa achịkarị ọchị. Ụmụaka nile ahụ bụ ndị leworo TV ma ọ bụ vidio ruo ogologo oge. Otu obere nwata nwoke dị afọ abụọ anaghị ekwusaliri ndị ọzọ okwu, ọ dịghịkwa ama ihe ọ ga-ekwu. Ọ nọwo na-ele vidio site n’ụtụtụ ruo anyasị kemgbe ọ dị otu afọ. Ọ bụ nanị mgbe nne ya malitere ime ihe dọkịta gwara ya, bụ́ igbochi nwatakịrị ahụ ile vidio ma malite iso ya na-emekọrịta ihe site n’igwusara ya egwu ka nwatakịrị ahụ bịara jiri nwayọọ nwayọọ kwuwe nnọọ okwu. Ee, ndị nne na nna aghaghị iso ụmụ ha na-ekwurịta okwu.

Jehova Chineke, bụ́ Onye mere ndokwa ezinụlọ, kwusiri okwu ike banyere uru ọ bara inwe ụdị nkwurịta okwu kasị mma. Ọ gwara ndị ya ogologo oge gara aga, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi [ụmụ gị okwu Chineke], ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:7) Ọ bụ ndị nne na nna, ọ bụghị telivishọn, pụrụ ịkụziri ụmụaka ihe n’ụzọ kasị mma, site n’okwu na ihe nlereanya, “dị ka ụzọ” ha si dị.—Ilu 22:6.