Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma

NDỊ bara ọgaranya nwere ike ikwu, sị: ‘Ụmụ anyị ndị ikom dị ka ihe a kụrụ n’ala, ndị a na-eme ka ha buo ibu mgbe ha dị na nwata; ụmụ anyị ndị inyom dị ka ogidi nkuku ụlọ a tụworo akịka dị ka ihe atụ̀ nke ụlọ ukwu; ọba anyị ejuwo, . . . ìgwè ewu na atụrụ nile anyị na-amụpụta puku kwuru puku.’ Ndị aka ji akụ̀ nwekwara ike ikwu, sị: ‘Ndị ihe na-agara nke ọma ma ọ bụ ndị obi ụtọ ka ndị ahụ bụ, nke dị otú a.’ Ma, n’aka nke ọzọ, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: ‘Ndị ihe na-agara nke ọma ma ọ bụ ndị obi ụtọ ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.’ (Abụ Ọma 144:12-15) A naghị agbagha nke ahụ agbagha. Jehova bụ Chineke obi ụtọ, obi ụtọ bụkwa ihe e ji mara ndị na-ejere ya ozi. (1 Timoti 1:11) E mere ka eziokwu a pụta ìhè ná nkebi nke ikpeazụ nke abụ ọma ndị ahụ e ji ike mmụọ nso dee, nke ihe mejupụtara ya bụ Abụ Ọma nke 107 ruo 150.

Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma mekwara ka àgwà Jehova ndị magburu onwe ha pụta ìhè, tinyere obiọma ya, ikwesị ntụkwasị obi ya, na ịdị mma ya. Ka anyị na-amatakwu ụdị onye Chineke bụ, ka anyị na-ahụkwu ya n’anya ma na-atụ egwu ya. Nke a na-emekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ozi dị ná Nkebi nke Ise nke Akwụkwọ Abụ Ọma dị nnọọ okè ọnụ ahịa!—Ndị Hibru 4:12.

INWE OBI ỤTỌ N’IHI EBERE JEHOVA

(Abụ Ọma 107:1119:176)

Ndị Juu ahụ si Babilọn na-alọta, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha gaa bụrụ, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere Ya, na oké ọrụ Ya nile nke ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ!” (Abụ Ọma 107:8, 15, 21, 31) Ka Devid na-eto Chineke, ọ bụrụ, sị: “Eziokwu Gị dịkwa ukwuu ruo mbara igwe.” (Abụ Ọma 108:4) N’abụ sochiri ya, Devid kpere ekpere, sị: “Nyere m aka, Jehova, Chineke m; zọpụta m dị ka ebere gị si dị.” (Abụ Ọma 109:18, 19, 26) Abụ Ọma nke 110 bụ amụma e buru banyere ọchịchị Mezaịa ahụ. Abụ Ọma nke 111:10 kwuru, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” Dị ka abụ ọma nke sochirinụ si kwuo, “onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova.”—Abụ Ọma 112:1.

A na-akpọ Abụ Ọma nke 113 ruo nke 118 Abụ Ọma Halel. Ihe e ji kpọọ ha aha a bụ n’ihi na e ji okwu ahụ bụ́ “Haleluja,” ma ọ bụ “Toonụ Jaa,” mee ihe na ha ugboro ugboro. Dị ka Mishnah, nke bụ́ akwụkwọ e dere na narị afọ nke atọ, bụ́kwa nke kọrọ banyere omenala ndị oge mbụ si kwuo, a na-abụ abụ ndị a n’Ememe Ngabiga nakwa n’ememe atọ ndị Juu na-eme n’afọ ọ bụla. Abụ Ọma nke 119, bụ́ abụ ọma kacha ogologo nakwa isiakwụkwọ Bible kacha ogologo, gosiri mkpa okwu Jehova o mere ka anyị mara, dị.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

109:23—Gịnị ka Devid bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Dị ka onyinyo mgbe ọ na-esetịpụ onwe ya site n’ọdịda anyanwụ, otú a ka m laworo”? Devid ji abụ a na-ekwu na ọ dị ya ka ọnwụ ya ọ dịla nnọọ nso.—Abụ Ọma 102:11.

110:1, 2—Gịnị ka “Onyenwe [Devid],” bụ́ Jizọs Kraịst, mere ka ọ nọdụrụ ala n’aka nri Chineke? Mgbe Jizọs bilitechara n’ọnwụ, ọ rịgooro n’eluigwe ma nọdụ n’aka nri Chineke chere ruo 1914 iji malite ịchị dị ka eze. N’oge ahụ, Jizọs chịrị ụmụazụ ya e tere mmanụ, duzie ha n’ọrụ nkwusa ha nakwa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, ma kwadebekwa ha maka iso ya chịa n’Alaeze ya.—Matiu 24:14; 28:18-20; Luk 22:28-30.

110:4—Na gịnị ka Jehova ‘ṅụworo iyi ọ na-agaghị echegharị uche ya’? Ịṅụ iyi a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ọgbụgba ndụ Jehova na Jizọs Kraịst gbara na Jizọs ga-abụ Eze na Onyeisi Nchụàjà.—Luk 22:29.

113:3—N’ụzọ dị aṅaa ka e si na-eto aha Jehova “site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya”? Nke a na-agụnye ihe karịrị otu ìgwè ndị na-eto Chineke kwa ụbọchị. Ìhè anyanwụ na-amụke n’ụwa nile malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ. N’otu aka ahụ, e kwesịrị ka a na-eto Jehova n’ụwa nile. Nke a agaghị ekwe omume ma ọ bụrụ na e jikọtaghị aka na-eme ya. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ito Chineke na ikerechi òkè anya n’ọrụ ikwusa banyere Alaeze ahụ.

116:15—Olee otú ‘ọnwụ ndị ebere Jehova dịruru oké ọnụ ahịa n’anya ya’? Ndị ohu Jehova dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’anya ya nke na ọ gaghị ekwe ka e gbuo ha n’ozuzu. Ọ bụrụ na Jehova ekwe ka nke ahụ mee, ọ ga-adị ka ndị iro ya hà ka ya ike. Ọ bụrụkwa na Jehova ekwe ka ndị iro ya gbuchapụ ndị ohu ya, ọ dịghịzi onye ga-afọdụ n’ụwa iji malite ụwa ọhụrụ ahụ.

119:71—Olee otú mmadụ ịbụ onye e wedara n’ala ga-esi baara onye ahụ uru? Ihe isi ike pụrụ ịkụziri anyị ịdị na-atụkwasịkwu Jehova obi, ịdị na-ekpechịkwu ekpere anya, nakwa ịdịkwu uchu n’ịmụ Bible na itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ. Ọzọkwa, otú anyị si emeghachi omume mgbe e wedara anyị n’ala ma ọ bụ mgbe anyị na-ata ahụhụ pụrụ ime ka anyị hụ ebe ndị ụfọdụ anyị na-adịghị eme nke ọma ma mee ihe banyere ha. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ahụhụ nụchaa anyị, anyị agaghị ekwe ka o mee anyị ka anyị nwee obi ilu.

119:96—Gịnị ka ‘nsọtụ dịịrị izu okè nile’ pụtara? Ihe ọbụ abụ ahụ na-ekwu bụ izu okè n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya. Ọ ga-abụ na ihe o bu n’uche bụ na mmadụ aghọtachaghị ihe izu okè gụnyere. Ma, iwu Chineke ruru ihe a chọrọ. Ndụmọdụ ndị dị na ya metụtara akụkụ nile nke ndụ.

119:164—Gịnị ka ito Chineke “ugboro asaa n’ụbọchị” pụtara? A na-ejikarị nọmba ahụ bụ́ asaa egosi na ihe zuru ezu. N’ihi ya, ihe ọbụ abụ ahụ na-ekwu bụ na e kwesịrị inye Jehova otuto nile.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

107:27-31. Amamihe ụwa ‘ga-ala n’iyi’ mgbe agha Amagedọn ga-etiwapụ. (Mkpughe 16:14, 16) Ọ gaghị echebe onye ọ bụla ka a ghara ibibi ya. Ọ bụ nanị ndị tụkwasịrị Jehova obi ga-adị ndụ iji wee “kelee Jehova ekele banyere ebere Ya.”

109:30, 31; 110:5. Ọta onye agha na-eji n’aka ekpe adịghị ekpuchi aka nri ya, bụ́ nke ọ na-eji ejide mma agha. N’ụzọ ihe atụ, Jehova nọ ndị ohu ya “n’aka nri,” iji lụọrọ ha agha. N’ụzọ dị otú a, ọ na-echebe ha ma na-enyere ha aka, nke a bụ nnọọ ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji ‘na-ekele ya nke ukwuu’!

113:4-9. Jehova dị nnọọ elu nke na ọ na-eme onwe ya ka ọ dị ala ọbụna iji ‘lekwasị eluigwe anya.’ N’agbanyeghị na ọ dị nnọọ elu, ọ na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị e wedara n’ala, ndị ogbenye, na nwanyị aga. Eze Onyenwe anyị Jehova dị obi umeala, ọ chọkwara ka ndị na-ejere ya ozi dị obi umeala.—Jems 4:6.

114:3-7. O kwesịrị nnọọ imetụ anyị n’ahụ́ mgbe anyị na-amụ banyere ọrụ ndị dị ike Jehova rụụrụ ndị ya n’Oké Osimiri Uhie, n’Osimiri Jọdan, na n’Ugwu Saịnaị. Ụmụ mmadụ, bụ́ ndị okwu ahụ bụ́ “ụwa” nọchiri anya ha, kwesịrị ịnọ n’ụjọ—nke a kọwara n’ụzọ ihe atụ dị ka ịnọ ‘n’oké ihe mgbu’—n’ihi Onyenwe anyị.

119:97-101. Isi n’Okwu Chineke nweta amamihe na nghọta na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi mmekọrịta anyị na Chineke.

119:105. Okwu Chineke bụ oriọna dịịrị ụkwụ anyị n’ụdị na ọ pụrụ inyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi hụ maka nsogbu ndị anyị na-enwe n’oge a. Ọ bụkwa ìhè dịịrị ụkwụ anyị n’ụzọ ihe atụ n’ihi na ọ na-agwa anyị ihe bụ́ nzube Chineke maka ọdịnihu.

INWE OBI ỤTỌ N’AGBANYEGHỊ AHỤHỤ

(Abụ Ọma 120:1145:21)

Olee otú anyị pụrụ isi die ọnọdụ ndị tara akpụ ma merie ihe isi ike? Abụ Ọma nke 120 ruo nke 134 zara ajụjụ a n’ụzọ doro anya. Anyị na-emeri ihe isi ike ma nọgide na-enwe ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị elegara Jehova anya maka enyemaka. Eleghị anya, a bụrụ abụ ọma ndị a bụ́ nke a na-akpọ Abụ Nrịgo, n’oge ụmụ Izrel na-aga Jeruselem iji mee ememe ndị ha na-eme n’afọ ọ bụla.

Abụ Ọma nke 135 na nke 136 kọwara Jehova dị ka Onye na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, nke a dị nnọọ iche n’arụsị bụ́ nke na-enweghị ike inyere ndị na-efe ya aka. E dere Abụ Ọma nke 136 n’ụdị a gụọ, e kwee. A na-ekwe akụkụ ikpeazụ nke amaokwu ọ bụla mgbe a gụsịrị akụkụ nke mbụ. Abụ ọma sochirinụ gosiri otú ndị Juu nọ na Babilọn si nọrọ nnọọ ná mwute n’ihi na ha chọrọ ịga fee Jehova na Zaịọn. Ọ bụ Devid bụrụ Abụ Ọma nke 138 ruo nke 145. Ọ chọrọ ‘iji obi ya nile kelee Jehova.’ N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “N’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 138:1; 139:14) N’abụ ọma ise ndị sochirinụ, Devid kpere ekpere ka e chebe ya pụọ n’aka ndị ajọ mmadụ, ka a dọọ ya aka ná ntị n’ezi omume, ka a napụta ya n’aka ndị mmegide, na ka a na-eduzi ya n’otú o si akpa àgwà. O mere ka a ghọta ihe mere ndị ohu Jehova ji enwe ọṅụ. (Abụ Ọma 144:15) Mgbe Devid tụlechara ịdị ukwuu Chineke na ịdị mma ya, o kwuru, sị: “Otuto Jehova ka ọnụ m ga-ekwu; ka anụ ahụ́ nile gọziekwa aha nsọ Ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 145:21.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

122:3—Olee otú Jeruselem si bụrụ obodo ‘e jikọtara n’otu’? Dị ka ọ na-adịkarị n’obodo ndị e nwere n’oge ochie, ụlọ ndị e wuru na Jeruselem dịdewere ibe ha. Ọ dị mfe ichebe obodo ahụ n’ihi na ụlọ ndị e wuru na ya dịkọtara ọnụ. Otú ụlọ ndị ahụ si nọkọta ọnụ mere ka ndị bi n’obodo ahụ dabere n’ebe ibe ha nọ maka enyemaka na nchebe. Nke a na-egosi otú ebo iri na abụọ nke Izrel si ejikọ aka ọnụ ejere Jehova ozi mgbe ha bịakọtara ọnụ ife Jehova ofufe.

123:2—Gịnị ka e ji ihe atụ ahụ e nyere banyere anya ndị ohu na-akọwa? Ndị odibo nwoke na ndị odibo nwanyị na-ele anya ihe abụọ n’aka nna ha ukwu ma ọ bụ nne ha ukwu: ịmata ihe nna ha ukwu ma ọ bụ ihe nne ha ukwu chọrọ na isi n’aka ya nweta nchebe na ihe ndị dị mkpa ná ndụ. N’otu aka ahụ, anyị na-elegara Jehova anya iji mata ihe bụ́ uche ya na iji nweta ihu ọma ya.

131:1-3—Olee otú Devid si ‘dozie mkpụrụ obi ya ma mee ka o dere duu dị ka nwata nke e mere ka ọ hapụ ara si dị n’ahụ́ nne ya’? Dị ka nwata a napụrụ ara si amụta inweta nkasi obi na afọ ojuju mgbe ọ dabere n’ahụ́ nne ya, otú a ka Devid si mụta ime ka mkpụrụ obi ya dere duu “dị ka nwata nke e mere ka ọ hapụ ara si dị n’ahụ́ nne ya.” Olee otú o si mee nke a? O mere nke a site n’ịghara ịdị mpako ma ọ bụkwanụ tụwa anya inweta ihe na-erughịrị ya ma ọ bụ nke aka ya na-agaghị eru. Kama Devid ịchọ ịbụ onye a ma ama, ọ ghọtara ebe ike ya ruru ma gosi obi umeala. Anyị kwesịrị iṅomi ya, karịsịa mgbe anyị na-agbalị iru eru maka ihe ùgwù n’ọgbakọ.

Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:

120:1, 2, 6, 7. Ikwutọ ndị ọzọ ma ọ bụ ịgwa ha okwu mkparị pụrụ ime ka obi ghara iru ha ala. Otu ụzọ anyị si egosi na anyị ‘bụ ndị udo’ bụ site n’ịkwa ire anyị nga.

120:3, 4. Ọ bụrụ na anyị na onye nwere “ire aghụghọ” emekọọ ihe, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na Jehova ga-edozi okwu nile mgbe oge ya ruru. Ndị nkwutọ ga-ahụsi anya n’aka “dike.” Jehova ga-ebibirịrị ha, bụ́ nke a kọwara dị ka “icheku ọkụ nke osisi broom.”

127:1, 2. Anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-eduzi anyị n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.

133:1-3. Ịdị n’otu dị n’etiti ndị Jehova na-eme ka ahụ́ ruo ha ala, ọ na-ewuli elu ma na-enye ume ọhụrụ. Anyị ekwesịghị imebi ịdị n’otu ahụ site n’ịdị na-enyochapụta ebe ndị ọzọ na-adịghị emezicha emezi, ịdị na-ese okwu ma ọ bụ ịdị na-eme mkpesa.

137:1, 5, 6. Obi ndị ohu Jehova ahụ a dọọrọ n’agha dị na Zaịọn, bụ́ nke nọchiri anya nzukọ Chineke n’oge ahụ. Gịnịkwanụ banyere anyị? Ànyị emeela ka obi anyị dịrị ná nzukọ Jehova ji na-eme ihe taa?

138:2. Jehova ‘na-eme ka okwu ọnụ ya dị ukwuu n’elu aha ya nile’ n’echiche bụ́ na otú ọ ga-esi emezu ihe nile o ji aha ya kwe ná nkwa ga-akarị nnọọ otú anyị tụrụ anya na ọ ga-esi emezu ha. N’eziokwu, ihe ndị magburu onwe ha na-eche anyị n’ọdịnihu.

139:1-6, 15, 16. Jehova maara ihe ndị anyị na-eme, ihe ndị anyị na-eche, nakwa ihe ndị anyị chọrọ ikwu ọbụna tupu anyị ekwuo ha. Ọ maara anyị malite mgbe a tụụrụ ime anyị tupu akụkụ ahụ́ nke ọ bụla apụta. Anyị apụghị ịkọwa otú Chineke si matachaa ihe nile banyere anyị. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova na-ahụ ọnwụnwa ndị anyị pụrụ ịdị na-enwe nakwa na ọ maara otú ha si emetụta anyị!

139:7-12. Ọ dịghị ebe anyị ga-anọ nke Chineke na-agaghị ahụ anyị iji gbaa anyị ume.

139:17, 18. Ànyị weere ihe ọmụma Jehova dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa? (Ilu 2:10) Ya bụrụ otú ahụ, mara na anyị achọtala ihe na-enye ọṅụ na-adịghị agwụ agwụ. Echiche Jehova “bara ụba karịa ájá.” A ga na-enwe ihe ndị anyị ga na-amụ banyere ya mgbe nile.

139:23, 24. Anyị kwesịrị ikwe ka Jehova nyochaa ihe ndị dị anyị n’obi iji hụ ma ọ̀ dị ‘ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu’ dị n’ime anyị—echiche na ọchịchọ na-ezighị ezi—nakwa ka o nyere anyị aka iwepụsị ha.

143:4-7. Olee otú anyị pụrụ isi die ihe isi ike ndị tara akpụ? Ọbụ abụ ahụ gwara anyị ihe ndị bụ́ isi ga-enyere anyị aka idi ha: Ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova na-emere anyị, ịnọ na-eme ihe ndị ọ sịrị anyị mee, na ịnọ na-arịọ ya n’ekpere ka o nyere anyị aka.

“Toonụ Jaa!”

Nkebi anọ ndị mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma jiri okwu ndị e ji eto Jehova mechie. (Abụ Ọma 41:13; 72:19, 20; 89:52; 106:48) E tokwara Jehova ná nkebi nke ikpeazụ a. Abụ Ọma 150:6 na-ekwu, sị: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa. Toonụ Jaa!” N’ezie, nke ahụ ga-emezu n’ụwa ọhụrụ Chineke.

Ka anyị na-atụ anya oge ahụ na-enye ọṅụ, anyị nwere nnọọ ezi ihe mere anyị ga-eji na-ekele ezi Chineke ahụ ma na-eto aha ya. Ọ̀ bụ na a dịghị akpali anyị iji obi anyị nile na-ekele Jehova mgbe anyị na-ahụ ụdị obi ụtọ anyị na-enwe n’ihi na anyị maara Jehova ma soro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọrụ ndị dị ike Jehova rụrụ dị ịtụnanya

[Foto dị na peeji nke 16]

Echiche Jehova “bara ụba karịa ájá”