Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ụtọ Ya Dị n’Iwu Jehova

Ihe Ụtọ Ya Dị n’Iwu Jehova

Ihe Ụtọ Ya Dị n’Iwu Jehova

ALBERT D. SCHROEDER, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jesịrị ozi elu ala ya na Wednesday, March 8, 2006. Ọ gbara afọ 94 ma jiri ihe karịrị afọ 73 jee ozi oge nile.

A mụrụ Nwanna Schroeder n’obodo Saginaw, nke dị na Michigan, U.S.A., n’afọ 1911. * Mgbe ọ bụ nwata, ọ mụtara ọtụtụ ihe banyere Bible n’aka nne nne ya, bụ́ onye mere ka o nwee mmasị ịgụ Okwu Jehova. Ọ gụrụ ihe banyere asụsụ Latin, German, na ọkụ eletrik na Mahadum Michigan. Ma, ka ọ na-aghọtakwu Akwụkwọ Nsọ, ọ kwụsịrị agụmakwụkwọ ya iji malite ọrụ nkwusa oge nile. N’afọ 1932, ọ ghọrọ otu n’ime ndị ezinụlọ Betel dị na Brooklyn, New York.

Mgbe Nwanna Schroeder dị afọ 26, na 1937, a họpụtara ya ilekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na Britain. Ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka ọrụ nkwusa kpaliri ọtụtụ ndị ebe ahụ ịbanye n’ozi oge nile. Otu nwa okorobịa ya na ya rụkọrọ ọrụ na Betel London bụ John E. Barr. Ha abụọ mesịrị rụkọọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ dị ka ndị so n’Òtù Na-achị Isi.

E chefughị ọrụ Nwanna Schroeder rụụrụ Ndịàmà Jehova n’afọ ndị ahụ ụwa nọ n’agha. N’August 1942, ndị ọchịchị Britain gbaara ya ụgbọ nwa mkpi. Mgbe ụgbọ ha jisichara ike gafee Oké Osimiri Atlantic n’oge agha ahụ, ọ lọghachiri na Brooklyn n’ọnwa September.

N’oge ahụ, ndị ohu Jehova anọrọlarị na-atụ anya na ọ ga-adị mkpa ịrụ ọrụ buru ibu mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. O juru Nwanna Schroeder anya ma mee ya obi ụtọ mgbe e nyere ya ọrụ ọzọ ọ ga-arụ—inye aka hazie ihe ndị a ga na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Ruo ọtụtụ afọ, ọ kụziri ihe ebe ahụ, nye aka na-azụ ndị ozi ala ọzọ. Ndị ọ kụziiri ihe na Gilead na ndị o mesịrị kụziere ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla ha chetara otú o si akụzi ihe. Ọ na-atọ ya ụtọ ịkụziri ụmụ akwụkwọ ya ịhụ iwu Chineke n’anya, ọ na-agwasikwa ha ike mkpa ọ dị ịmata Jehova.

N’afọ 1956, Nwanna Schroeder lụrụ Charlotte Bowin, n’afọ 1958 kwa, ha mụrụ nwa ha bụ́ Judah Ben. Nwanna Schroeder bụ ezi di na nna. N’afọ 1974, o sonyere n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ ebe amamihe ya bịara baa nnọọ uru. Ọ bụ nwoke nwere obiọma ma dị umeala n’obi, nke kasị mkpa bụ na ọ na-achọ ito aha ukwu Chineke. Obi siri anyị ike na Nwanna Schroeder enwetala ụgwọ ọrụ ya n’eluigwe dị ka Onye Kraịst e tere mmanụ nke ‘ihe ụtọ ya dị n’ezie n’iwu Jehova.’—Abụ Ọma 1:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 E bipụtara akụkọ ndụ Nwanna Schroeder n’Ụlọ Nche nke March 1, 1988.