Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Ekwe Mmadụ Megharịa Ahụ́?

Bible Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Ekwe Mmadụ Megharịa Ahụ́?

Bible Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Ekwe Mmadụ Megharịa Ahụ́?

OTU nwa okorobịa si Finland kwuru, sị: “Mgbe m dị obere, ọ dịghị onye kụziiri m ụkpụrụ ndị dị na Bible. Ọ dịghịdị onye na-akpọtụ Chineke aha.” A na-azụlite ọtụtụ ndị n’ụzọ dị otú ahụ taa. Ọtụtụ ndị, karịsịa ndị na-eto eto, na-ele Bible anya dị ka ihe mgbe ochie na ihe na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ụfọdụ ndị na-ele ndị na-achọ ịgbaso ihe Bible kwuru anya dị ka ndị na-ata ndụ ha ahụhụ, ndị e ji iwu dị iche iche kegide. Ọtụtụ ndị na-echekwa na ọ ka mma ịghara ịgụ Bible ma chọọ ntụziaka n’ebe ọzọ.

Ihe mere ndị mmadụ ji ele Bible anya otú ahụ bụ n’ihi mmegbu chọọchị Krisendọm nọworo na-emegbu ndị mmadụ eri ogologo oge. Dị ka ihe atụ, n’oge ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kpọrọ Oge Ụwa Nọ n’Ìsì, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na Chọọchị Katọlik dị na Europe na-achịkwa akụkụ nile nke ndụ ụmụ mmadụ. A na-emekpọ onye ọ bụla nwara anwa jụ ime ihe chọọchị ahụ kwuru ọnụ ma ọ bụkwanụ gbuo onye ahụ egbuo. Chọọchị Protestant ndị pupụtara ka e mesịrị ekweghịkwa ndị mmadụ megharịa ahụ́. Ihe na-agbata ọtụtụ ndị maara okpukpe Protestant n’uche ma a kpọtụ okpukpe ahụ aha bụ ụkpụrụ na iwu ndị na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́ jupụtara n’okpukpe ahụ na ntaramahụhụ a na-enye ndị dara iwu. N’ihi mmegbu chọọchị dị iche iche nọ na-emegbu ndị mmadụ, ndị mmadụ bịara chewe n’ụzọ hiere ụzọ na ozizi Bible adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́.

Na narị afọ ndị na-adịchabeghị anya, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ala ụfọdụ, chọọchị adịghịzi akpa ike ná ndụ ndị mmadụ. Ka ọtụtụ ndị hapụsịworo nkwenkwe dị iche iche nke chọọchị, ha bịara kwere na ndị mmadụ nweere onwe ha iji aka ha na-ekpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Gịnị siri na nke a pụta? Ahti Laitinen, bụ́ prọfesọ n’ihe ọmụmụ banyere otú e si akwụsị ime mpụ na otú e si ekpe ikpe n’ọhaneze, na-akọ, sị: “Ndị mmadụ adịghịzi erube isi n’iwu, ndị mmadụ amaghịzikwa ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Ọ dị nnọọ mwute ikwu na ọbụna ndị isi chọọchị esonyela ná ndị na-ele nke a anya otú ahụ. Otu bishọp a ma ama na chọọchị Lutheran kwuru, sị: “Adịghị m ekwetacha na ọ bụ nanị Bible ma ọ bụ ndị ndú okpukpe ka e kwesịrị ịgakwuru iji nweta azịza n’ihe ndị metụtara omume.”

È Kwesịrị Ịhapụ Ndị Mmadụ Ka Ha Merewe Otú Masịrị Ha?

Echiche nke mmadụ imere nnọọ otú ọ masịrị ya na-amasịkarị ndị na-eto eto. Ọtụtụ ndị adịghị enwe mmasị ka a na-ele ha anya dị ka ndị na-amaghị aka nri ha na aka ekpe ha ma ọ bụ ka a na-atụrụ ha ihe ha ga-eme. Otú ọ dị, è kwesịrị ịhapụ onye ọ bụla ka o merewe otú ọ masịrị ya? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee otu ihe atụ. Ka e were ya na e nwere otu obodo na-ekwo ekwo nke na-enweghị iwu na-achịkwa okporo ụzọ ya. Obodo ebe ọ na-adịghị mkpa ka mmadụ nweta akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, ọ dịghịkwa mkpa ka a nwalee mmadụ tupu ya amalite ịkwọ ụgbọala. Ndị mmadụ pụrụ ịkwọ ụgbọala otú masịrị ha, ọbụna mgbe ha ṅụrọchara anya, na-agba ọsọ otú o si masị ha, n’achọghị ịma banyere ihe mgbaàmà ndị na-agwa ha ka ha kwụsị, ọkụ ndị na-agwa ndị mmadụ mgbe ha ga-akwụsịtụ na mgbe ha ga-agawa, okporo ụzọ ebe ụgbọala nile ga na-eche ihu n’otu ebe, ma ọ bụ ebe e mere ka a na-akwụsịrị ndị ji ụkwụ agafe. Ezi ihe ọ̀ ga-esi na ya pụta ma a hapụ ndị mmadụ ka ha merewe otú masịrị ha n’ihe dị otú a? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ga-esi na ya pụta ga-abụ ọgba aghara na ọdachi. Ọ bụ ezie na iwu na-achịkwa okporo ụzọ mere ka ndị mmadụ ghara ime ihe otú masịrị ha, ma anyị ma na iwu ndị a na-echebe ma ndị ọkwọ ụgbọala ma ndị na-agafe agafe.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova na-ezi anyị otú anyị kwesịrị isi bie ndụ. Nke a na-abara anyị uru. Ọ bụrụ na o duzighị anyị, anyị ga na-eme ọtụtụ nnwale iji mụta ihe, ọ bụrụkwa na ọ bụ otú ahụ ka anyị si na-amụta ihe, anyị pụrụ imerụ onwe anyị na ndị ọzọ ahụ́. Ọnọdụ dị otú ahụ agaghị arụpụta ihe dị mma dịkwa nnọọ ka ịkwọ ụgbọala n’ebe a na-enweghị iwu na-achịkwa okporo ụzọ na-agaghị arụpụta ezigbo ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ụfọdụ dị anyị mkpa—ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ekwetakwa na nke ahụ bụ eziokwu.

“Ibu M Dịkwa Mfe”

Iwu na-achịkwa okporo ụzọ pụrụ ịdị ọtụtụ—n’ebe ụfọdụ, iwu ndị na-achịkwa nanị ebe a na-adọba ụgbọala karịrị akarị. N’ụzọ dị nnọọ iche na nke ahụ, iwu ndị dị na Bible adịghị ọtụtụ. Kama nke ahụ, ihe dị na Bible bụ ụkpụrụ ndị bụ́ isi, ụkpụrụ ndị a adịghịkwanụ arụ. Jizọs Kraịst kpọrọ ndị ya na ha dịkọrọ ndụ oku a na-enye obi ụtọ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28, 30) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ọgbakọ e nwere ná Kọrint, o dere, sị: “Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dịkwa, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.”—2 Ndị Kọrint 3:17.

Otú ọ dị, a kpaara nnwere onwe ahụ ókè. Jizọs mere ka ọ pụta ìhè na ihe Chineke chọrọ gụnyere iwu ụfọdụ ndị na-esighị ike o nyere. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya.” (Jọn 15:12) Cheedị echiche ihe ndụ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na mmadụ nile na-etinye iwu ahụ n’ọrụ! N’ihi ya, a kpaara nnwere onwe Ndị Kraịst ókè. Pita onyeozi dere, sị: “Dịnụ ka ndị nweere onwe ha, ma na-ejidekwanụ nnwere onwe unu, ọ bụghị dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu Chineke.”—1 Pita 2:16.

Ọ bụ ezie na amachibidoghị Ndị Kraịst ọtụtụ iwu, ha adịghị ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Nduzi nke dị ụmụ mmadụ mkpa bụ nduzi nke nanị Chineke pụrụ inye. Bible kwuru hoo haa, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị.” (Jeremaịa 10:23) Ọ bụrụ na anyị erube isi ná nduzi Chineke, ọ ga-abara anyị uru nke ukwuu.—Abụ Ọma 19:11.

Otu n’ime uru ọ na-aba bụ na ọ na-eweta obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite ghọrọ onye ohi na onye ụgha. Ọ na-akwakwa iko aghara aghara. Mgbe ọ mụtara ụkpụrụ ndị dị elu dị na Bible, o mere ka ndụ ya kwekọọ na ha. O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na agbanwechaghị m ndụ m ozugbo iji kwekọọ n’ụkpụrụ Bible, aghọtara m na ha bara uru. Ndụ m biburu enyeghị m obi ụtọ m na-enwe ugbu a. Ọ bụrụ na mmadụ na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, ọ ga-eme ka ndụ ya kpakọọ ọnụ. Nke ahụ ga-emekwa ka ọ mara ebe ndụ ya na-eche ihu, marakwa ihe bụ́ ezi ihe na nke bụ́ ihe ọjọọ.”

Ọtụtụ nde mmadụ enweela ahụmahụ ndị dị otú ahụ. Otu n’ime abamuru ndị nduzi dị na Bible baara ha bụ na o meela ka ha na ndị mmadụ ibe ha dị ná mma, mee ka ha na-arụsi ọrụ ike, mee ka ha hapụ omume ndị na-adịghị mma, meekwa ka ha na-ebikwu ndụ obi ụtọ. Markus, * bụ́ onye ọ dị mgbe o biri ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, nweekwa mgbe ọ na-emeghị otú ahụ, kwuru banyere ndụ ya, sị: “Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible emeela ka ndị mmadụ na-akwanyekwuru m ùgwù.” *

Gịnị Ka I Chere?

Bible ọ̀ na-egbochi mmadụ ime ihe ụfọdụ? Azịza ya bụ ee—nke a bụkwa maka abamuru anyị nile. Ma, Bible ọ̀ bụ ihe na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́? Azịza ya bụ ee e. Nanị ihe mmadụ imere nnọọ otú o si masị ya ga-arụpụtara ya bụ ihe isi ike. Ụkpụrụ Bible na-ekwe mmadụ megharịa ahụ́, ha na-emekwa ka anyị bie ezigbo ndụ na nke obi ụtọ. Markus kwuru, sị: “Ka oge na-aga, aghọtara m na amamihe dị n’itinye Okwu Chineke n’ọrụ. Ọ bụ ezie na otú m si ebi ndụ dị nnọọ iche n’otú ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ si ebi, ọ dịghị mgbe m chetụrụ n’echiche na ọ dị ihe na-efunahụ m.”

Mgbe i nwetawara ngọzi ndị na-abịa site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, ị ga-enwekwu ekele maka Okwu Chineke. Nke a ga-eme ka i nwetakwuo ngọzi—ị ga-abịa hụ Jehova Chineke, bụ́ onye ngọzi ahụ si n’aka ya, n’anya. “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 Jọn 5:3.

Jehova bụ ma Onye kere anyị ma Nna anyị nke eluigwe. Ọ maara ihe ga-akasị baara anyị uru. Kama inye anyị ọtụtụ iwu na-agaghị ekwe ka anyị megharịa ahụ́, ọ na-eji ịhụnanya eduzi anyị maka ọdịmma anyị. Jehova ji okwu a na-emetụ n’ahụ́ na-agba anyị ume: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 A gbanwere aha ahụ.

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ụdị ndụ Bible kwuru okwu ya, lee isi nke 12 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 9]

Jizọs kwuru na ihe ndị Chineke chọrọ anyị n’aka na-enye ume ọhụrụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ibi ndụ kwekọrọ ná nduzi Chineke na-eweta obi ụtọ na ùgwù onwe onye