Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Nyeere M Aka Imeri Ihe Ịma Aka Ndị Bịaara M

Jehova Nyeere M Aka Imeri Ihe Ịma Aka Ndị Bịaara M

Akụkọ Ndụ

Jehova Nyeere M Aka Imeri Ihe Ịma Aka Ndị Bịaara M

DỊ KA DALE IRWIN SI KỌỌ

“ASATỌ EZUOLA! ỤMỤ EJIMA ANỌ AMỤBAA NSOGBU E NWERE OKPUKPU ABỤỌ.” Nke a bụ isiokwu gbara n’otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’obodo anyị ka ọ na-akọ banyere ụmụ ejima anọ a tụkwasịịrị ezinụlọ anyị nke nweburu ụmụ nwanyị anọ. Mgbe m ka na-eto eto, ọ dịghị mgbe m bu n’uche ịlụ nwanyị ma ya fọdụkwa ịmụ ụmụ. Ma leenụ abụzi m nna ụmụ asatọ.

A MỤRỤ M na 1934 na Mareeba nke dị n’Australia. Anyị dị ụmụaka atọ, ọ bụ m bụ ọdụdụ nwa. Ezinụlọ anyị mechara kwaga Brisbane, bụ́ ebe mama m bụ onye nkụzi Sunday School na chọọchị Metọdist.

Ná mmalite afọ 1938, akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’obodo anyị kwuru na e nwere ike a gaghị ekwe ka Joseph F. Rutherford, bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, bata n’Australia. Mama m jụrụ otu Onyeàmà bịara n’ụlọ anyị ihe mere ndị ọchịchị ji si otú ahụ na-emeso ya ihe. Onyeàmà ahụ zara ya na Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya. Mama m nataziri akwụkwọ nta bụ́ Cure, bụ́ nke kọwara nnukwu ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha. * Ihe ndị mama m gụtara n’akwụkwọ nta ahụ masịrị ya, n’ihi ya, ọ kpọọrọ anyị gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na Sunday na-esonụ. Papa m jụwapụrụ isi na mbụ na anyị agaghị aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-edepụta ajụjụ ndị o nwere banyere ihe ndị dị na Bible ma nye ya mama m ka o nye ya otu nwanna nwoke. Nwanna nwoke ahụ na-edepụtazi azịza ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ ma nye ya mama m ka o nye papa m.

Papa m sooro anyị gaa ọmụmụ ihe n’otu ụbọchị Sunday, nzube ya bụ́ ịgwa Ndịàmà na ya enweghị mmasị na ha. Otú ọ dị, papa m gbanwere àgwà ya mgbe ya na onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke bịara ileta ọgbakọ n’izu ahụ kwurịtachara okwu, ọbụna o kwere ka a nọrọ n’ụlọ anyị na-enwe ọmụmụ ihe a na-enwe kwa izu bụ́ nke ndị nwere mmasị nọ n’ógbè na-abịa.

E mere papa m na mama m baptizim na September 1938. Mụ na ụmụnne m mekwara nke anyị na December 1941 ná mgbakọ e nwere na Hargreave Park, bụ́ nke dị na Sydney, New South Wales. Adị m afọ asaa mgbe ahụ. Mgbe e mechara m baptizim, ana m eso papa m na mama m agachi ozi ubi anya. N’oge ahụ, Ndịàmà na-eji ígwè phonograph ndị dị obere aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma na-akpọrọ ndị nwe ụlọ okwu ndị sitere na Bible e tinyere na teepu.

E nwere otu Onyeàmà m na-adịghị echefu echefu nke aha ya bụ Bert Horton. O nwere otu ụgbọala ka dị nnọọ ndụ—bụ́ nke a rụnyere otu nnukwu ígwè okwu n’elu ya. Mgbe m dị obere, ọ na-atọ m nnọọ ụtọ iso Bert aga ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị anọrọ n’elu ugwu na-akpọsa okwu ndị sitere na Bible, anyị na-ahụkarị ka ụgbọala ndị uwe ojii na-agbara abịa ebe anyị nọ. Bert na-agbanyụ ígwè okwu ya ngwa ngwa, ma kwọrọ ụgbọala ya gaa n’elu ugwu ọzọ dị ọtụtụ kilomita site na nke mbụ ahụ ma kpọnyekwa ígwè okwu ya. Amụtara m ọtụtụ ihe banyere mkpa ọ dị ịtụkwasị Jehova obi na inwe obi ike site n’aka Bert na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ nwere obi ike ma na-eguzosi ike n’ihe ka ya.—Matiu 10:16.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, nanị m na-esokarị aga ozi ọma ma m lọta akwụkwọ. N’otu oge, eziri m ezinụlọ Adshead ozi ọma. Ka oge na-aga, nwoke ahụ na nwunye ya, ụmụ ha asatọ, na ọtụtụ ụmụ ụmụ ha mụtara eziokwu ahụ. Ana m ekele nnọọ Jehova otú o si kwe ka obere nwa dị ka m kụziere ọmarịcha ezinụlọ a eziokwu Bible.—Matiu 21:16.

Ihe Ùgwù Ndị M Nwere Mgbe M Ka Na-eto Eto

Aghọrọ m onye ozi oge nile mgbe m dị afọ iri na asatọ, e kenyekwara m ije ozi na Maitland, bụ́ nke dị na New South Wales. Na 1956, a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Sydney, Australia. Ihe dị ka mmadụ asaa n’ime mmadụ iri abụọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ bụ ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya iso Kraịst chịa n’alaeze eluigwe ya. Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù iso ha na-arụkọ ọrụ.—Luk 12:32; Mkpughe 1:6; 5:10.

Agbanwere m echiche m nweburu na m agaghị alụ nwanyị mgbe m zutere Judy Helberg, bụ́ ọmarịcha nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ, onye alaka ụlọ ọrụ kpọrọ ka ọ bịa nyere m aka nwa oge ịrụ otu nnukwu ọrụ. Mụ na Judy bịara hụ onwe anyị n’anya nke ukwuu, anyị lụkwara mgbe afọ abụọ gasịrị. Anyị malitere ọrụ sekit mgbe anyị lụsịrị, bụ́ nke gụnyere ileta otu ọgbakọ n’izu ọ bụla iji na-agba ụmụnna ume.

Judy mụrụ ada anyị bụ́ Kim na 1960. Taa, ọ bụrụ na di na nwunye nọ n’ọrụ sekit amụọ nwa, ha na-akwụsị ọrụ nlekọta ha ma chọrọ otu ebe ha ga-aga biri. Ma n’ụzọ tụrụ anyị nnọọ n’anya, a gwara anyị ka anyị nọgide n’ọrụ sekit. Mgbe anyị kpesịrị ekpere ugboro ugboro banyere ya, anyị kwetara na anyị ga-aga. Ruokwa ihe karịrị ọnwa asaa ọzọ sochirinụ, Kim so anyị mee njem ruru puku kilomita iri na atọ. Anyị ji ụgbọala, ụgbọelu na ụgbọ okporo ígwè mee njem ndị ahụ, na-aga eleta ọgbakọ nile dị na Queensland na Northern Territory. Anyị enweghị ụgbọala nke anyị n’oge ahụ.

Anyị na-anọkarị n’ụlọ ụmụnna. A na-ejikarị ákwà mgbochi emechi ụzọ n’oge ahụ n’ihi okpomọkụ, kama iji ibo ụzọ. Nke a mekwuru ka obi ghara iru anyị ala n’abalị ma Kim bewe ákwá. Ka oge na-aga, ilekọta nwa ọhụrụ ma na-eje ozi anyị bịara siere anyị ike. N’ihi ya, anyị gara biri na Brisbane, amalitekwara m ọrụ ide saịn bọdụ iji nweta ego. Anyị mụrụ nwa anyị nwanyị nke abụọ, bụ́ Petina, afọ abụọ ka anyị mụsịrị Kim.

Idi Ọdachi

Na 1972, bụ́ mgbe ada anyị dị afọ iri na abụọ, nakwa mgbe nwanne ya nwanyị dị afọ iri, ka Judy nwụrụ n’ihi akpụ o nwere n’isi akwara ndị na-ekesa mmiri ọgwụ n’ahụ́. Ọnwụ ya siiri anyị ike odidi. Ka o sina dị, Jehova jiri Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na òtù ụmụnna kasie anyị obi n’oge ahụ Judy na-arịa ọrịa nakwa mgbe ọ nwụsịrị. Anyị nwetakwara agbamume site n’ihe e dere n’otu magazin Ụlọ Nche nke bịara ozugbo ọdachi ahụ dakwasịchara anyị. Magazin ahụ nwere isiokwu kwuru banyere ule ndị na-abịara ndị mmadụ n’otu n’otu, tinyere ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, o gosikwara ụzọ ule pụrụ isi nyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị yiri nke Chineke, bụ́ ndị dị ka ntachi obi, okwukwe na ịnọgidesi ike na-eme ezi ihe. *Jems 1:2-4.

Mụ na ụmụ m bịara na-akpachikwu anya mgbe Judy nwụsịrị. Ma n’eziokwu, ọ dịghịịrị m mfe ịrụ ọrụ dịịrị nna na nke dịịrị nne. Otú ọ dị, ezigbo ụmụ m abụọ mere ka ọrụ ahụ dịkwuoro m mfe.

Ịlụ Nwanyị Ọzọ na Inwe Ezinụlọ Buru Ibu

Alụrụ m nwanyị ọzọ ka oge na-aga. O nwere ọtụtụ ihe mụ na nwunye m nke ugbu a, bụ́ Mary, nwekọrọ ọnụ. Ọ bụ ụdị ọrịa ahụ gburu nwunye m gbukwara di ya. O nwekwara ụmụ nwanyị abụọ—Colleen na Jennifer. Petina ji ihe dị ka afọ atọ tọọ Colleen. Anyị nweziri ụmụ nwanyị anọ ugbu a bụ́ ndị dị afọ iri na anọ, afọ iri na abụọ, afọ itoolu, nakwa afọ asaa.

Mụ na Mary kpebiri na onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji aka ya na-adọ ụmụ nke ya aka ná ntị ruo mgbe ụmụ ndị ahụ ga-enwe ike ịnarawa ịdọ aka ná ntị site n’aka nne na nna nkuchi ha. Mụ na Mary nwere ihe abụọ dị mkpa anyị kpebiri ịdị na-eme ma a bịa n’ihe banyere mmekọrịta anyị dị ka di na nwunye. Nke mbụ bụ́ na ọ dịtụghị mgbe anyị ga-ese okwu n’ihu ụmụ anyị, nke abụọ bụ na anyị ga-etinye ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 4:26 n’ọrụ, nke bụ́ ịhụ na anyị doziri nghọtahie ọ bụla anyị nwere ọ bụrụgodị na ọ ga-ewe anyị ọtụtụ awa iji mee nke ahụ.

Onye ọ bụla mere nnọọ mgbanwe ngwa ngwa iji kwekọọ n’ọnọdụ anyị dị ka ezinụlọ ebe a lụgharịrị di na nwunye, ma anyị abụọ echefughị ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye anyị ozugbo. Dị ka ihe atụ abalị Monday ọ bụla na-aghọrọ Mary “abalị ákwá.” Mary na-etiwapụ ákwá n’ihi di ya nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ụmụ anyị ehie ụra ka anyị nwesịrị ọmụmụ ihe ezinụlọ.

Mary chọrọ ka anyị nwee nwa nke anyị. Ma ọ dị nnọọ mwute na ime mbụ anyị pụrụ apụ. Mgbe Mary dịịrị ime ọzọ, anyị amaghị na ihe dị ịtụ n’anya na-aga ime. Nnyocha e mere n’ụlọ ọgwụ gosiri na ọ dị ime ụmụ anọ kama ịbụ ime otu nwa. Nke ahụ enyeghị m ọnụ okwu mgbe m nụrụ ya. Leenụ m dị afọ iri anọ na asaa na-aga ịbụ nna nke ụmụ asatọ n’oge na-adịghị anya! A wara Mary afọ iji kupụta ụmụ ejima anọ ahụ na February 14 1982 ka ha nọsịrị ọnwa asatọ n’ime afọ. Onye bu ụzọ pụta bụ Clint, ọ gafetụrụ otu kilogram na ọkara n’ịdị arụ; onye nke abụọ bụ́ Cindy, ọ fọrọ obere ka o ruo kilogram abụọ n’arụ; Jeremy bụ onye nke atọ, ọ fọrọ obere ka o ruo otu kilogram na ọkara n’arụ; nke ikpeazụ bụ Danette, ọ gafetụrụ otu kilogram na ọkara n’arụ. Ọ dịghị nke yiri ibe ya.

Ozugbo ụmụ ahụ pụtachara, dọkịta Mary bịara nọdewe m.

Ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ na-echegbu onwe gị otú ị ga-esi lekọta ụmụ a?”

Agwara m ya, sị, “Ụdị ihe a abịatụberela m.”

Ihe ọzọ o kwuru juru m anya ma gbaakwa m ume.

O kwuru, sị, “Ndị ọgbakọ unu agaghị eleghara gị anya, ha ga-agbatara gị ọsọ enyemaka ozugbo ị chọrọ enyemaka ha.”

N’ihi ezigbo ọrụ ọkachamara a na-ahụ banyere ịmụ nwa na ndị ọrụ ya rụrụ, ụmụaka anọ ahụ nọrọ nanị ọnwa abụọ n’ụlọ ọgwụ. Ahụ́ gbasikwara ha ike.

Ihe Ịma Aka Dị n’Ịzụ Ụmụ Ejima Anọ

Mụ na Mary haziri ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị iji hụ na ihe na-aga n’usoro. Ụmụ anyị ndị nwanyị anọ bụ́ ndị nke okenye nyere aka n’ilekọta ha. Okwu dọkịta ahụ mezukwara—ụmụnna dị njikere inye aka ọbụna n’obere ihe. Tupu anyị akpọlata ụmụ ejima ahụ, otu enyi m mụ na ya kpateworo aka nke aha ya bụ John MacArthur, mere ndokwa ka Ndịàmà na-arụ ụlọ mee ka ụlọ anyị bukwuo ibu. Ìgwè ụmụnna nwanyị nyere aka ilekọta ụmụ ahụ mgbe a kpọlatara ha. Obiọma nile a ha gosiri anyị gosiri na Ndị Kraịst hụrụ onwe ha n’anya.—1 Jọn 3:18.

Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ụmụ ejima a ghọrọ “ụmụ ọgbakọ.” Ọbụna ruo taa, ụmụ ejima a na-ewere ọtụtụ ụmụnna ndị ahụ jiri ịhụnanya nyere anyị aka dị ka ndị ezinụlọ anyị. Mary n’onwe ya kpara àgwà na-egosi na ọ bụ nwunye na nne pụrụ iche nke ji achọghị ọdịmma onwe ya nanị na-egbo mkpa ụmụ ya. N’ezie, o tinyere ihe ọ mụtara site n’Okwu Chineke na ná nzukọ ya n’ọrụ. Ọ dịghị ebe ọzọ a pụrụ isi nweta ndụmọdụ ka mma ma ọ̀ bụghị n’Okwu Chineke na nzukọ ya!—Abụ Ọma 1:2, 3; Matiu 24:45.

Anyị nọgidere na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na ozi ọma anya, ọ bụ ezie na ọ dịghịrị anyị mfe ịkpọ ụmụ ọhụrụ anọ na-aga ha. Otu ihe nyeere anyị aka n’oge ahụ bụ ọmụmụ Bible ndị anyị duziiri di na nwunye abụọ, bụ́ ndị ji obiọma na-abịa n’ụlọ anyị maka ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụ ezie na nke a mere ka ihe dịtụrụ anyị mfe, ma mgbe ụfọdụ ike na-agwụcha Mary mgbe a na-amụ ihe ahụ nke na ụra na-eburu ya ka o ku otu nwatakịrị na-ehi ụra. Di na nwunye abụọ ahụ mesiri ghọọ ụmụnna anyị n’ụzọ ime mmụọ.

Anyị Malitere n’Oge Ha Bụ Ụmụaka Nyewe Ha Ọzụzụ n’Ụzọ Ime Mmụọ

Mụ na Mary na ụmụ anyị ndị nwanyị toworo eto, kpọọrọ ụmụ ahụ na-aga ozi ọma tupu ha amalitedị ịga ije. Ha abụghịrị anyị ibu arụ n’oge ahụ ha mụtara ịga ije, ana m akpọrọ abụọ n’ime ha, Mary akpọrọkwa abụọ. N’ezie, anyị na ndị nwe ụlọ nwere omume enyi na-ejikarị ha amalite nkwurịta okwu. Otu ụbọchị, ezutere m otu nwoke nke kwuru na ndị a mụrụ n’otu ụbọchị ga na-akpa otu ụdị àgwà. Agaghị m rụwa ya ụka kama ajụrụ m ya ma m̀ nwere ike ịlọghachi ma e mesịa. O kwetara, ya mere, agara m kpọrọ ụmụ ejima anọ ahụ bịaghachi. Ka o ji mgbagwoju anya na-ele ihe na-emenụ, eguzowere m ha otú e si mụọ ha site n’onye buru ụzọ pụta ruo n’onye nke ikpeazụ. Anyị kparịtaziri ụka dị ka enyi na enyi, ọ bụghị nanị banyere otú ha si dị iche n’ọdịdị elu ahụ́ ha kamakwa banyere nnukwute ọdịiche dị n’otú ha si akpa àgwà, bụ́ nke mere ka ozizi ya kụọ afọ n’ala. Nwoke ahụ kwuziri, sị, “Ịgwa gị ihe a yiri nnọọ ka ọ̀ bụ ihe nzuzu. Aga m emekwu nnyocha n’okwu a.”

Mgbe ha dị obere, obi anaghị adị ha mma ma a gbazie ha n’ìgwè ma ha mee ihe ọjọọ, n’ihi ya anyị na-agbazi ha iche iche. Ka o sina dị, ha na-aghọta na iwu a na-enye ha bụ maka ha nile. Mgbe ọ bụla ha zutere okwu ndị chọrọ ka ha jiri akọnuche ha mee ihe n’ụlọ akwụkwọ, ha na-akwụrụ chịm n’ụkpụrụ ndị dị na Bible ma na-enyeritara ibe ha aka, Cindy na-abụ ọnụ na-ekwuru ha. N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ bịara ghọta na ejima anọ abụghị agwọ e ji akpụka mma egbu.

Mụ na Mary nwetara ihe ịma aka ndị mụrụ ụmụ na-enwekarị n’inyere ụmụ ha aka ịnọgide na-erubere Jehova isi n’oge ha ka na-eto eto. Ọrụ ahụ gaara ata akpụ ma e wezụga enyemaka ụmụnna ji ịhụnanya nye nakwa ụbara nri ime mmụọ anyị na-enweta site n’aka akụkụ nzukọ Jehova nke a na-ahụ anya. Anyị gbalịsiri ike ịhụ na anyị na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya ma hụ na anyị na-ekwurịta okwu n’ezinụlọ anyị, ọ bụ ezie na nke a anaghị adịcha mfe. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbalị nile ahụ anyị tinyere abụghị n’efu n’ihi na ụmụ anyị asatọ ahụ họọrọ ijere Jehova ozi.

Ịnagide Ihe Ndị Ha na Ime Agadi So Aga

Enwewo m ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi kemgbe ọtụtụ afọ m soworo ọgbakọ na-eje ozi: okenye ọgbakọ, nwanna na-elekọta obodo, na onye na-enyere onye nlekọta sekit aka. Esokwa m na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ nke dị n’ógbè anyị. Ọrụ kọmitii a bụ inye aka hụ na ndị dọkịta na-ekwenyere Ndịàmà mgbe e nwere okwu metụtara mmịnye ọbara. Kemgbe iri afọ atọ na anọ, enwewokwa m ihe ùgwù nke ịdị na-eduzi ememe alụmdi na nwunye. Eduziwokwa m narị ememe alụmdi na nwunye atọ na iri ise, tinyere nke ụmụ m ndị nwanyị isii.

Ana m ekele Jehova mgbe nile maka otú Judy si nyere m aka, nakwa otú Mary si na-enyere m aka ugbu a. (Ilu 31:10, 30) Ha setịpụkwara ezi ihe nlereanya n’ozi ubi ka ha na-akwado m n’ọrụ m dị ka okenye ọgbakọ, ha nyekwara aka n’ịkụnye àgwà iji ihe ndị metụtara ofufe Jehova kpọrọ ihe n’ime ụmụ anyị.

Na 1996, a chọpụtara na m nwere nsogbu n’ụbụrụ bụ́ nke mere ka aka na-ama m jijiji, meekwa ka ụkwụ ghara isi m ike n’ala. N’ihi ya, akwụsịrị m ọrụ ide saịn bọọdụ. N’agbanyeghị nke a, m ka nwekwara nnọọ ọṅụ n’ozi Jehova, ọ bụ ezie na mụ adịghị emelizi ihe ndị m na-emebu. Nke a emewo ka m na-enwekwu mmetụta n’ebe ndị agadi ndị ọzọ nọ.

Ka m na-atụgharị uche n’ihe ndị meworo ná ndụ m, ana m ekele Jehova mgbe nile otú o si nyere mụ na ezinụlọ m aka iji ọṅụ na-emerị ọtụtụ ihe ịma aka ndị anyị na ezute. (Aịsaịa 41:10) Mụ na Mary na ụmụ anyị asatọ, nwekwara ekele n’otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ si kwadoo anyị. Ọtụtụ n’ime ha esiwo n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ anyị na-apụghị ịkọcha gosi na ha hụrụ anyị n’anya.—Jọn 13:34, 35.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 17 Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1973, peeji nke 208-213.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ka mụ na mama m, nwanne m nwoke nke tọrọanyị bụ́ Garth na nwanne m nwanyị bụ́ Dawn, na-achọ ịga mgbakọ distrikti e nwere na Sydney na 1941

[Foto dị na peeji nke 13]

Mụ na Judy na nwa ọhụrụ anyị bụ́ Kim mgbe m nọ n’ọrụ sekit na Queensland

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe a mụsịrị ụmụ ejima anọ ahụ, ụmụ anyị ndị nwanyị anọ bụ́ ndị nke okenye na ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị njikere inyere anyị aka