Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
“Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.”—ABỤ ỌMA 27:14.
1. Olee otú olileanya dịruru ná mkpa, oleekwa otú e si jiri okwu a mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ?
EZIGBO olileanya dị ka ọkụ na-enwusi ike. Ọ na-enyere anyị aka ịghara ikwe ka ihe isi ike ndị anyị na-enwe ugbu a kụda anyị mmụọ, ọ na-enyekwara anyị aka iji obi ike na ọṅụ na-elega anya n’ọdịnihu. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime ka anyị nwee olileanya e ji n’aka, ọ na-emekwa nke a site n’Okwu ya e dere site n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16) N’ezie, ụdị dị iche iche nke okwu ahụ bụ́ olileanya pụtara ọtụtụ ugboro na Bible, ha na-ezochakwa aka n’atụmanya siri ike na nke e ji n’aka na ezi ihe ga-abịa n’ọdịnihu nakwa atụmanya nke ezi ihe ahụ n’onwe ya. * Ụdị olileanya a e ji n’aka karịrị ọchịchọ nkịtị, bụ́ nke na-enweghị ebe o hiwere isi ma ọ bụ nke a na-ejighị n’aka na ọ ga-emezu.
2. Olee otú olileanya si metụta ndụ Jizọs?
2 Mgbe Jizọs chere ule na ihe isi ike ihu, o lere anya gabiga ihe ndị ọ na-ezute mgbe ahụ ma nwee olileanya inweta ihe Jehova kwere ya ná nkwa. “N’ihi ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, na-eleda ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) Ebe ọ bụ na o tinyere nnọọ uche n’otú ọ pụrụ isi gosipụta na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị dị ka eze nakwa n’otú ọ pụrụ isi doo aha Ya nsọ, ọ dịghị mgbe Jizọs kwụsịrị irubere Chineke isi n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ya.
3. Olee otú olileanya si emetụta ndụ ndị ohu Chineke?
3 Eze Devid kwuru otú olileanya na obi ike si nwee njikọ mgbe ọ sịrị: “Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.” (Abụ Ọma 27:14) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ike, anyị agaghị anwa anwa nwee obi abụọ ma ihe anyị na-ele anya ya ọ̀ ga-emezukwa kama nke ahụ, anyị kwesịrị iburu ya n’uche ma jiri ya kpọrọ oké ihe mgbe nile. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka iṅomi Jizọs n’igosipụta obi ike na ịnụ ọkụ n’obi ka anyị na-arụ ọrụ nkwusa o nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ezie, n’otu ebe ahụ e depụtara okwukwe na ịhụnanya, e denyekwara olileanya dị ka àgwà dị oké mkpa na-adịgide adịgide bụ́ nke e ji mara ndị ohu Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 13:13.
Ì ‘Jupụtara n’Olileanya’?
4. Gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ na-atụsi anya ya ike?
4 Ndị Chineke nwere ọdịnihu magburu onwe ya. Ndị Kraịst e tere mmanụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-eche ka oge ruo ka ha soro Kraịst jewe ozi n’eluigwe, ebe “atụrụ ọzọ” ahụ na-ele anya mgbe a ‘ga-emekwa ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke ndị nọ n’ụwa.’ (Jọn 10:16; Ndị Rom 8:19-21; Ndị Filipaị 3:20) ‘Nnwere onwe ahụ dị ebube’ gụnyere nnapụta a ga-anapụta anyị site n’aka mmehie na ajọ ihe ndị ha na ya so aga. N’ezie, Jehova bụ́ Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè,” ga-enye ndị nọgidesiri ike na-eme uche ya onyinye kasị mma.—Jems 1:17; Aịsaịa 25:8.
5. Olee otú anyị si ‘ejupụta n’olileanya’?
5 Mmetụta ha aṅaa ka olileanya kwesịrị inwe ná ndụ anyị dị ka Ndị Kraịst? Ná Ndị Rom 15:13, anyị na-agụ, sị: “Ka Chineke onye na-enye olileanya mee ka unu jupụta n’ọṅụ na udo nile site n’unu ịbụ ndị kwerenụ, ka unu wee jupụta n’olileanya n’ike nke mmụọ nsọ.” Ee, a pụrụ iji olileanya tụnyere ìhè anyanwụ ụtụtụ nke na-enwusi ike, ọ bụghị kandụl a mụnyere n’ebe gbara ọchịchịrị, n’ihi na ọ na-eme ka ndụ mmadụ nwee nzube, mee ka ahụ́ ruo onye ahụ ala, meekwa ka onye ahụ nwee obi ụtọ na obi ike. Cheta na anyị ‘na-ejupụta n’olileanya’ nanị mgbe anyị kweere n’ihe e dere n’Okwu Chineke ma nata mmụọ nsọ ya. Ndị Rom 15:4 na-ekwu, sị: “N’ihi na ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” Ya mere, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-eburu olileanya m n’uche mgbe nile site n’ịdị na-amụchi Bible anya ma na-agụ ya kwa ụbọchị? M̀ na-ekpechi ekpere anya ka Chineke nye m mmụọ ya?’—Luk 11:13.
6. Iji mee ka olileanya anyị dịgide anyị n’uche, gịnị ka anyị na-aghaghị izere?
6 Jizọs, bụ́ Onye Nlereanya anyị, nwetara ume site n’ịgụ Okwu Chineke. Site n’ichesi echiche ike banyere ya, anyị ga-ezere ịbụ ‘ndị ike gwụrụ na ndị dara mba ná mkpụrụ obi anyị.’ (Ndị Hibru 12:3) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ọ bụrụ na ọ dị otú olileanya ahụ Chineke nyere anyị si na-apụtụ anyị n’uche ma ọ bụkwanụ e nwee ihe ọ bụla na-adọpụ uche anyị na ya—ikekwe ihe onwunwe ma ọ bụ ọrụ—ike pụrụ ịgwụ anyị n’ụzọ ime mmụọ, nke a pụkwara imesị mee ka anyị kwụsị ime omume ọma ma ọ bụ kwụsị inwe obi ike. Ọ bụrụ na nke a emee, anyị pụrụ ọbụna ịbụ ndị ‘ụgbọ ha kpuru n’ihe banyere okwukwe anyị.’ (1 Timoti 1:19) N’aka nke ọzọ, ezigbo olileanya na-eme ka okwukwe anyị sie ike.
Olileanya Dị Oké Mkpa Iji Nwee Okwukwe
7. N’ụzọ dị aṅaa ka olileanya si dị oké mkpa iji mee ka mmadụ nwee okwukwe?
7 Bible na-ekwu, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1) Olileanya abụghị nanị ihe a gụnyekọtara ya na okwukwe; ọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke okwukwe. Tụlee ihe banyere Ebreham. N’anya mmadụ, ya na nwunye ya bụ́ Sera agafeela ịmụ nwa mgbe Jehova kwere ha nkwa na ha ga-amụta onye nketa. (Jenesis 17:15-17) Gịnị ka Ebreham mere? “N’agbanyeghị na olileanya adịkwaghị, ma n’ịdabere n’olileanya, o nwere okwukwe, ka o wee ghọọ nna nke ọtụtụ mba.” (Ndị Rom 4:18) Ee, olileanya Chineke nyere Ebreham mere ka okwukwe Ebreham nwere na ya ga-amụta nwa sikwuo ike. Okwukwe ya meziri ka olileanya ya sie ike. Ọbụna Ebreham na Sera katara obi hapụ ụlọ ha na ndị ikwu ha jee biri n’ụlọ ntu ná mba ọzọ ruo mgbe ha nwụrụ.
8. Olee otú ịnọgide na-atachi obi pụrụ isi mee ka olileanya anyị sikwuo ike?
8 Ebreham mere ka olileanya ya sikwuo ike site n’irube isi n’ihe nile Jehova gwara ya, ọbụna mgbe o siri ike ime otú ahụ. (Jenesis 22:2, 12) N’ụzọ yiri nke ahụ, site n’irubere Jehova isi na iji ntachi obi nọgide na-ejere ya ozi, anyị pụrụ ijide n’aka na anyị ga-anata ụgwọ ọrụ anyị. Pọl dere na “ntachi obi” na-arụpụta “ọnọdụ a nwapụtara anwapụta,” bụ́ nke na-arụpụtazi olileanya, “olileanya ahụ adịghịkwa eduga ná mmechuihu.” (Ndị Rom 5:4, 5) Ọ bụ nke a mere Pọl jikwa dee, sị: “Anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.” (Ndị Hibru 6:11) Inwe olileanya dị otú ahụ, bụ́ nke hiwere isi ná mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova, pụrụ inyere anyị aka iji obi ike, ọbụna ọṅụ, na-anagide ihe isi ike ọ bụla bịara anyị.
“Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ”
9. Ịnọgide na-eme gịnị pụrụ inyere anyị aka ‘ịṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ’?
9 Olileanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ karịrị nnọọ ihe ọ bụla ụwa pụrụ inye anyị. Abụ Ọma 37:34 na-asị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala; mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.” Ee, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji “na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ.” (Ndị Rom 12:12) Otú ọ dị, iji mee nke ahụ, olileanya anyị aghaghị ịdị anyị n’uche mgbe nile. Ị̀ na-atụgharị uche n’olileanya a anyị nwere n’ebe Chineke nọ mgbe nile? Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ onwe gị na Paradaịs ebe ahụ́ gbasiri gị nnọọ ike, ebe ọ na-adịghị ihe na-echegbu gị, ebe ndị ị hụrụ n’anya gbara gị gburugburu, na ebe i so na-arụ ọrụ ndị na-enye afọ ojuju n’ezie? Ị̀ na-atụgharị uche n’ihe osise Paradaịs ndị dị n’akwụkwọ anyị? Isi otú a na-eche banyere ya mgbe nile ga-adị ka ihicha windo glas bụ́ nke ga-eme ka ị hụ ụzọ nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ihicha glas ahụ, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eru unyí, nke a ga-egbochikwa anyị ịhụ ebe ndị mara mma nke ọma. Ihe ndị ọzọ pụziri ịdọrọ uche anyị. Ya adịla mgbe anyị ga-ekwe ka nke ahụ mee anyị!
10. Olee otú anyị ịtụ anya ụgwọ ọrụ anyị si eme ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike?
10 N’ezie, isi ihe mere anyị ji na-ejere Jehova ozi bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ. (Mak 12:30) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ịtụsi anya ụgwọ ọrụ ahụ ike. N’ezie, Jehova na-atụ anya ka anyị mee otú ahụ! Ndị Hibru 11:6 na-asị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị lee ya anya dị ka Onye na-akwụghachi ụgwọ ọrụ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị maara Nna anyị nke eluigwe nke ọma. Ọ bụ onye na-emesapụ aka na onye hụrụ ụmụ ya n’anya. Cheedị otú obi gaara esi jọọ anyị njọ nakwa otú anyị gaara esi nwee nkụda mmụọ ma a sị na anyị enweghị “ọdịnihu na ntụkwasị obi [ma ọ bụ olileanya].”—Jeremaịa 29:11.
11. Olee otú olileanya Chineke debere Mozis n’ihu si nyere ya aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha?
11 Ihe atụ dị ịrịba ama nke onye lekwasịrị anya n’olileanya ya nke sitere n’aka Chineke bụ Mozis. Dị ka “nwa ada Fero,” Mozis pụrụ inweta ikike, Ndị Hibru 11:24-26) N’ezie, Mozis ji nnọọ olileanya ahụ Jehova debere ya n’ihu kpọrọ ihe.
ùgwù, na akụ̀ na ụba nke ndị Ijipt ma ọ chọọ. Ọ̀ ga-achụwa ihe ndị a ka ọ̀ ga-ejewere Jehova ozi? Mozis ji obi ike họọrọ ijere Jehova ozi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” (12. N’ihi gịnị ka olileanya Ndị Kraịst ji dị ka okpu ígwè?
12 Pọl onyeozi ji olileanya tụnyere okpu ígwè. Okpu ígwè ihe atụ anyị na-echebe ikike iche echiche anyị, na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha, na-enyekwara anyị aka ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, ma nọgidesie ike na-eme ezi ihe. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Ị̀ na-ekpu okpu ígwè ihe atụ gị mgbe nile? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, mgbe ahụ, dị ka Mozis na Pọl, okwukwe gị ga-adaberesi ike, “ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” N’ezie, ọ chọrọ obi ike iji na-eme ihe dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eme site n’ịjụ ịchụso ihe ndị ga-abara nanị onwe anyị uru, ma nke a ruru mgbalị ọ bụla e tinyere maka ya! A sị kwuwe, gịnị mere ị ga-eji nara ihe na-erughị “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” nke ndị na-ele anya Jehova ma nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ na-aga inweta n’ọdịnihu?—1 Timoti 6:17, 19.
“M Gaghị Ahapụ Gị Ma Ọlị”
13. Olee mmesi obi ike Jehova na-enye ndị ohu ya nọgidesiri ike na-eme uche ya?
13 Ndị tụkwasịrị obi n’usoro ihe a aghaghị ichebara ajọ ihe na-eche ha ihu ka ụwa a nọgidere ‘na-ahụju anya’ echiche. (Matiu 24:8) Ma ndị olileanya ha dị n’ebe Jehova nọ adịghị atụ ụjọ. Ha ga-anọgide ‘na-ebi ná ntụkwasị obi, ha ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.’ (Ilu 1:33) Ebe ọ bụ na olileanya ha adịghị n’usoro ihe a, ha ji ọṅụ na-aṅa ntị ná ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’”—Ndị Hibru 13:5.
14. Gịnị mere ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst na-echegbubiga onwe ha ókè banyere ihe ha ga-eji gboo mkpa anụ ahụ́ ha?
14 “M gaghị ahapụ gị ma ọlị,” “m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị”—otú a e si mesie okwu a ike na-eme ka o doo anya na Chineke ga-elekọta anyị. Jizọs mesikwara anyị obi ike na Chineke nwere ịhụnanya n’ebe anyị nọ. Ọ sịrị: “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile [ihe ndị dị mkpa iji bie ndụ]. N’ihi ya, unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya.” (Matiu 6:33, 34) Jehova maara na ọ dịghị mfe anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-adọgakwa iji kpata ihe anyị ga-eji gboo mkpa anụ ahụ́ anyị. Ya mere, ka anyị nwee nnọọ obi ike na o nwere ikike igboro anyị mkpa anyị nakwa na ọ chọrọ ime otú ahụ.—Matiu 6:25-32; 11:28-30.
15. Olee otú Ndị Kraịst si ‘elegide anya otu ebe’?
15 Anyị na-egosi na anyị dabeere n’ebe Jehova nọ site ‘n’ilegide anya otu ebe.’ (Matiu 6:22, 23) Onye nwere anya na-ele otu ebe na-akwụwa aka ya ọtọ, buru ezi ihe n’obi, ọ dịghị anyaukwu, ọ dịghịkwa achọ ọdịmma onwe ya nanị. Ilegide anya n’otu ebe apụtaghị ịbụ ogbenye ọnụ ntụ ma ọ bụ ileghara ibu ọrụ anyị nke bụ́ igbo mkpa anụ ahụ́ anyị anya. Kama nke ahụ, ọ pụtara iji “uche zuru okè” na-eme ihe ka anyị na-ebute ozi Jehova ụzọ.—2 Timoti 1:7.
16. N’ihi gịnị ka okwukwe na obi ike ji dị mkpa iji legide anya otu ebe?
16 Okwukwe na obi ike dị mkpa iji legide anya otu ebe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ị na-arụrụ ọrụ esie ọnwụ na ị ga na-arụ ọrụ n’oge nile i ji aga ọmụmụ ihe, ị̀ ga-eji obi ike nọgide na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ? Ọ bụrụ na obi esichaghị mmadụ ike na Jehova ga-emezu nkwa O kwere ilekọta ndị ohu Ya, Setan ga-anọgide na-eme ka ihe na-esikwuru onye ahụ ike, onye ahụ pụziri ịkwụsịcha ịga ọmụmụ ihe. Ee, enweghị okwukwe pụrụ ime ka ọ bụrụzie Setan ga na-atụrụ anyị ihe anyị ga na-eme, kama ịbụ Jehova. Lee ka nke ahụ ga-esi kpata ọdachi!—2 Ndị Kọrịnt 13:5.
“Na-ele Anya Jehova”
17. Olee otú e si agọzi ndị tụkwasịrị Jehova obi ọbụna ugbu a?
17 Akwụkwọ Nsọ egosiwo ugboro ugboro na ọ dịbeghị mgbe Jehova gbahapụrụ ndị tụkwasịrị Ilu 3:5, 6; Jeremaịa 17:7) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ha pụrụ inwe ihe onwunwe dị nta, ma ha na-ele nke a anya dị ka ịchụ obere ihe n’àjà ma e jiri ya tụnyere ngọzi ndị ha ga-enweta n’ọdịnihu. N’ụzọ dị otú a, ha na-egosi na ha “na-ele anya Jehova,” na-egosikwa na ha nwere obi ike na ọ ga-emezuru ndị nile nọgidere na-eme uche ya ọchịchọ ha nile ndị kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 37:4, 34) N’ihi ya, ha nwere obi ụtọ n’ezie ọbụna ugbu a. “Nchere ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ: ma olileanya ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.”—Ilu 10:28.
ya obi. (18, 19. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova ji ịhụnanya na-enye anyị? (b) Olee otú anyị si edebe Jehova “n’aka nri” anyị?
18 Mgbe nwatakịrị jidere aka nna ya soro ya na-eje ije, ahụ́ na-eru ya ala. Otú ahụ ka ọ na-adị anyị ka anyị so Nna anyị nke eluigwe na-eje ije. Jehova gwara Izrel, sị: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere . . . M ga-enyere gị aka. . . . N’ihi na Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka.”—Aịsaịa 41:10, 13.
19 Lee ka okwu ndị ahụ si na-emetụ nnọọ n’ahụ́. Cheedị ihe ọ dị ka ya Jehova ijide mmadụ n’aka. Devid dere, sị: “Edowo m Jehova n’ihu m mgbe nile: n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, a gaghị ewezụga m n’ọnọdụ m.” (Abụ Ọma 16:8) Olee otú anyị si edebe Jehova “n’aka nri” anyị? Anyị na-eme nke ahụ ma ọ dịkarịa ala n’ụzọ abụọ. Nke mbụ, anyị na-ekwe ka Okwu ya na-eduzi anyị n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ; nke abụọ, anyị na-elekwasị anya n’ihe nrite dị ebube Jehova debere anyị n’ihu. Ọbụ abụ bụ́ Esaf bụrụ, sị: “Mụ onwe m nọ n’aka Gị mgbe nile: I jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ Gị na-edu m, e mesịa Ị ga-ejikwa nsọpụrụ nara m.” (Abụ Ọma 73:23, 24) Ebe anyị nwere mmesi obi ike dị otú a, anyị na-eji obi ike elepụ anya n’ihu.
“Mgbapụta Unu Na-eru Nso”
20, 21. Gịnị ka ndị na-ele anya Jehova ga-enweta n’ọdịnihu?
20 Ka ụbọchị na-agafe ka ọ na-adịwanye mkpa ka anyị debe Jehova n’aka nri anyị. N’isi nso, oké mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya na-adịtụbeghị ga-adakwasị ụwa Setan. Nke a ga-amalite site ná mbibi nke okpukpe ụgha. (Matiu 24:21) Egwu ga-ejide ụmụ mmadụ ndị na-enweghị okwukwe. Ma, n’oge ọgba aghara ahụ, ndị ohu Jehova nwere obi ike ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi olileanya ha. Jizọs sịrị: “Mgbe ihe ndị a nile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.
21 Ya mere, ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi olileanya Chineke debere anyị n’ihu ma ghara ikwe ka Setan jiri aghụghọ dọpụ uche anyị ma ọ bụ rata anyị. Tụkwasị na nke ahụ, ka anyị na-agbalịsi ike ịzụlite okwukwe, ịhụnanya na egwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-enwe obi ike irubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe ndị anyị na-eche ihu, ma guzogide Ekwensu. (Jems 4:7, 8) Ya mere, “dịnụ ike, ka obi unu nweekwa ume, unu nile ndị na-echere Jehova.”—Abụ Ọma 31:24.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ebe e ji okwu ahụ bụ́ “olileanya” mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ na-ezo aka n’ụgwọ ọrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enweta n’eluigwe, n’isiokwu a, a tụlere ihe olileanya gụnyere n’ozuzu ya.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
• N’ụzọ dị aṅaa ka olileanya Jizọs nwere si nyere ya aka inwe obi ike?
• Olee ihe jikọrọ okwukwe na olileanya?
• Olee otú olileanya na okwukwe pụrụ isi mee ka Onye Kraịst nwee obi ike ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ ná ndụ ya?
• N’ihi gịnị ka ndị “na-ele anya Jehova” pụrụ iji jiri obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 28]
Ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ì mewo agadi, ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ onwe gị na Paradaịs?