Gosipụta Okwukwe Gị Site n’Otú I Si Ebi Ndụ
Gosipụta Okwukwe Gị Site n’Otú I Si Ebi Ndụ
“Okwukwe, ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, nwụrụ anwụ n’onwe ya.”—JEMS 2:17.
1. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst oge mbụ ji lebara ma okwukwe ma ọrụ ha anya?
IHE ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst oge mbụ gosipụtara okwukwe ha site n’otú ha si bie ndụ. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems gbara Ndị Kraịst nile ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghịkwa ndị na-anụ nanị ọnụnụ.” O kwukwara, sị: “Dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ nke nwụrụ anwụ, otú ahụkwa ka okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ nke nwụrụ anwụ.” (Jems 1:22; 2:26) Ihe dị ka afọ 35 mgbe o desịrị ihe ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst nọgidere na-egosipụta okwukwe ha site n’ịrụ ọrụ ndị kwekọrọ na ha. Ma, ọ bụ ihe dị mwute na ụfọdụ emeghị otú ahụ. Jizọs jara ọgbakọ dị na Smụana mma; ma, ọ gwara ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Sadis, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na i nwere aha na ị dị ndụ, ma ị nwụrụ anwụ.”—Mkpughe 2:8-11; 3:1.
2. Olee ajụjụ Ndị Kraịst pụrụ ịjụ onwe ha banyere okwukwe ha?
2 N’ihi ya, Jizọs gbara ndị nọ na Sadis ume—bụ́kwa agbamume metụtara ndị nile ga-emesị gụọ okwu ya—ka ha ghara ịhapụ ịhụnanya mbụ ha nwere maka eziokwu Ndị Kraịst ma nọgide na-abụ ndị enyi Chineke. (Mkpughe 3:2, 3) Onye nke ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú omume m dị? Ihe ndị m na-eme hà na-egosi nnọọ na m na-eme ike m nile igosipụta okwukwe m site n’ihe nile m na-eme, ọbụna n’ihe ndị na-emetụtachaghị ọrụ nkwusa na ọmụmụ ihe Ndị Kraịst?’ (Luk 16:10) Ọ dị ọtụtụ ihe a na-eme ná ndụ bụ́ ndị anyị pụrụ ịtụle, ma ka anyị lekwasị anya nanị n’otu: nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, nke gụnyere ndị a na-emekarị n’agbamakwụkwọ Ndị Kraịst.
Obere Nnọkọ Oriri
3. Olee otú Bible si ele ịga nnọkọ oriri anya?
3 Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-enwe obi ụtọ mgbe a kpọrọ anyị òkù ịbịa nnọkọ oriri nke Ndị Kraịst nwere obi ụtọ. Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ndị na-ejere ya ozi nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) O mere ka Solomọn denye eziokwu a na Bible: “Mụ onwe m wee jaa ọṅụ, n’ihi na ọ dịghị ezi ihe mmadụ nwere n’okpuru anyanwụ ma ọ́ bụghị iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nke ahụ ga-arapara n’ahụ́ ya n’ime ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ụbọchị nile nke ndụ ya.” (Eklisiastis 3:1, 4, 13; 8:15) A pụrụ ịṅụrị ọṅụ dị otú ahụ mgbe ezinụlọ na-erikọ nri ọnụ ma ọ bụ n’obere nnọkọ oriri ndị ọzọ nke ezi Ndị Kraịst.—Job 1:4, 5, 18; Luk 10:38-42; 14:12-14.
4. Olee ihe onye na-akpọ oriri kwesịrị ilebara anya?
4 Ọ bụrụ na ị na-akpọ oriri dị otú ahụ ma ọ bụ ya abụrụ gị ka ọ dị n’aka, i kwesịrị iji nlezianya tụlee ihe e mere atụmatụ ime, ya bụrụgodị na ị ga-akpọ nanị ndị kwere ekwe ole na ole ka unu nọrịa ma rikọọ nri. (Ndị Rom 12:13) I kwesịrị ịhụ na ‘ihe nile weere ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị,’ nakwa na “amamihe nke sitere n’elu” duziri ihe nile. (1 Ndị Kọrint 14:40; Jems 3:17) Pọl onyeozi dere, sị: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto. Unu [abụla] ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ.” (1 Ndị Kọrint 10:31, 32) Olee ebe ụfọdụ e kwesịrị ilebara anya karịsịa? Ịtụle ihe ndị dị otú ahụ tupu oge eruo nwere ike inyere gị aka ịhụ na ihe gị na ndị ọbịa gị ga-eme ga-egosi na ị na-adị ndụ kwekọrọ n’okwukwe gị.—Ndị Rom 12:2.
Olee Otú Nnọkọ Oriri ahụ Ga-adị?
5. N’ihi gịnị ka onye kpọrọ oriri kwesịrị iji chesie echiche ike iji kpebie ma ọ̀ ga-enye ndị ọbịa ya mmanya na-aba n’anya nakwa ma ọ̀ ga-akpọ egwú?
5 Ọtụtụ ndị kpọrọ oriri anọwo na-eche ma hà ga-enye ndị ọbịa ha mmanya na-aba n’anya ka hà ga-ahapụ. Ọ bụghị mmanya na-aba n’anya na-eme ka nnọkọ tọọ ụtọ. Cheta na Jizọs nyere ìgwè mmadụ bịakwutere ya nri—ọ mụbaara ha achịcha na azụ. Akụkọ ahụ ekwughị na o ji ụzọ ọrụ ebube nye ha mmanya, ọ bụ ezie na anyị maara na o nwere ikike ime ya. (Matiu 14:14-21) Ọ bụrụ na i kpebie inye ndị bịaara gị oriri mmanya na-aba n’anya, ya agafela ókè, hụkwa na e nwere ụdị ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ dị mma na-adịghị aba n’anya maka ndị na-agaghị achọ ịṅụ ndị nke na-aba n’anya. (1 Timoti 3:2, 3, 8; 5:23; 1 Pita 4:3) Amanyekwala onye ọ bụla ịṅụ ihe nwere ike ịta “dị ka agwọ.” (Ilu 23:29-32) Gịnị banyere ịkpọ egwú na ịgba ya agba? Ọ bụrụ na a ga-akpọ egwú n’oriri gị, ị ga-akpachara nnọọ anya họta egwú ndị a ga-akpọ, na-atụle ma ụda ha ma ihe ndị ha na-ekwu. (Ndị Kọlọsi 3:8; Jems 1:21) Ọtụtụ Ndị Kraịst achọpụtala na ịkpọ abụ Kingdom Melodies ma ọ bụ ọbụna ịbụkọ abụ ndị dị otú ahụ ọnụ na-eso eme ka nnọkọ tọọ ụtọ. (Ndị Efesọs 5:19, 20) Na-aṅakwa ntị site n’oge ruo n’oge iji hụ na ụda egwú ahụ egbochighị ezigbo mkparịta ụka ndị mmadụ na ibe ha na-enwe ma ọ bụ na-adachi ndị agbata obi gị ntị.—Matiu 7:12.
6. Olee otú onye kpọrọ oriri nwere ike isi gosi na okwukwe ya dị ndụ mgbe a bịara n’ihe metụtara nkwurịta okwu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ?
6 Mgbe Ndị Kraịst gara oriri, ha nwere ike ikwurịta ihe dị iche iche, gụpụta ihe ụfọdụ n’ihu ọha, ma ọ bụ kọọ ahụmahụ ndị dị ụtọ. Ọ bụrụ na mkparịta ụka ha adawa ka nke ndị ụwa, onye kpọrọ oriri ahụ nwere ike iji akọ chegharịa ya ihu. O kwesịkwara ịkpachara anya ka ọ ghara ịbụ otu onye na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ọ hụ na nke ahụ emewela, o nwere ike iji akọ kwupụta ya ma mee ka ndị ọzọ tinye ọnụ, ikekwe site n’ịjụ ndị na-eto eto ihe bụ́ uche ha ma ọ bụ ikwulite okwu ga-eme ka ndị dị iche iche tinye ọnụ. Ụdị nkwurịta okwu ahụ ga-atọ ma ndị agadi ma ụmụaka bịara oriri ahụ ụtọ. Dị ka onye kpọrọ oriri, ọ bụrụ na i jiri amamihe na akọ duzie ihe nile, ndị bịaranụ ‘ga-ahụ nnọọ ezi uche gị.’ (Ndị Filipaị 4:5) Ha ga-ahụ na okwukwe gị dị ndụ, na-emetụtakwa akụkụ nile nke ndụ gị.
Agbamakwụkwọ na Oriri Agbamakwụkwọ
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya mgbe anyị na-ahazi agbamakwụkwọ na oriri ya na ya na-eso?
7 Agbamakwụkwọ Ndị Kraịst bụ otu oge pụrụ iche nke na-enye ọṅụ. Ndị ohu Chineke n’oge ochie, gụnyere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, ji obi ha nile gaa nnọkọ obi ụtọ ndị dị otú ahụ, sorokwa n’oriri na ọṅụṅụ e mere na ha. (Jenesis 29:21, 22; Jọn 2:1, 2) Ma, ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi nnọọ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka oriri agbamakwụkwọ anyị gosi imeru ihe n’ókè e ji mara Ndị Kraịst, anyị aghaghị ime mgbalị pụrụ iche. Ma, ọ dịghị ihe dị njọ n’oriri ndị a, kama, ha na-enye Onye Kraịst ohere igosipụta okwukwe ya.
8, 9. Olee otú ihe ndị a na-eme n’ọtụtụ agbamakwụkwọ si egosi na ihe e kwuru na 1 Jọn 2:16, 17 bụ eziokwu?
8 Ọtụtụ ndị na-amaghị ụkpụrụ Chineke bụ́kwanụ ndị na-achọghị ịma na-ele agbamakwụkwọ anya dị ka oge ha nwere ike imebiga ihe ókè, ma ọ bụ ma eleghị anya oge mmadụ nwere ike imere otú ọ sọrọ ya. N’otu magazin a na-ebipụta na Europe, otu nwanyị a lụrụ ọhụrụ kwuru banyere alụmdi na nwunye “ndị oké ozu” o mere, sị: ‘Ụgbọ nke ịnyịnya anọ na-adọkpụ bu anyị, ụgbọ ịnyịnya 12 na nke ndị egwú nọ na ya sokwa anyị n’azụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị riri nri ndị oké ozu ma gbaa egwu tọgburu onwe ya; ọ kpọtụrụ akpọtụ. Abụ m eze nwanyị n’ụbọchị ahụ, bụ́kwanụ nnọọ ihe m chọrọ.’
9 Ọ bụ ezie na ihe a na-eme n’ala dị iche iche abụghị otu, okwu ndị ahụ na-egosi nnọọ na ihe a Jọn onyeozi dere bụ eziokwu: “Ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa.” Ị̀ ga-echetụ n’echiche na Ndị Kraịst tozuru okè na-achọ ịlụ onwe ha ga-achọ ime agbamakwụkwọ “ndị oké ozu” ma jiri ụdị oké oriri a na-akọ n’akụkọ ifo sochie ya? Kama nke ahụ, mgbe ha na-eme atụmatụ ha, ha kwesịrị iburu n’uche na “onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:16, 17.
10. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mma mmadụ ịhazi ihe nke ọma ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime agbamakwụkwọ aka ya ga-eru? (b) Olee otú e kwesịrị isi kpebie ndị a ga-akpọ?
10 Ndị Kraịst na-achọ ịlụ di na nwunye kwesịrị ikowe akpa ha ebe aka ha ga-eru, Bible nwekwara ike inyere ha aka ime otú ahụ. Ọ bụ ezie na ụbọchị agbamakwụkwọ bụ ụbọchị dị mkpa, ha maara na ọ bụ nanị mmalite nke alụmdi na nwunye dị n’etiti Ndị Kraịst abụọ nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi. Ọ bụghị iwu na ha ga-eme nnukwu oriri agbamakwụkwọ. Ọ bụrụ na ha ekpebie ịkpọ oriri, ha kwesịrị ịgbakọ ego ole ọ ga-ewe ma tụlee otú ọ ga-adị. (Luk 14:28) Mgbe ha malitere ibikọ ọnụ dị ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst, ọ bụ di ka Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ ga-abụ onyeisi. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:22, 23) N’ihi ya, ọ bụ nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ karịsịa ka oriri agbamakwụkwọ ahụ dị n’isi. Ee, ịhụnanya ga-akpali ya ịjụta ihe bụ́ echiche nwanyị ọ na-aga ịlụ n’ihe banyere ndị ha ga-achọ ịkpọ n’oriri agbamakwụkwọ ha ma ọ bụ mmadụ ole ha ga-akpọli. O nwere ike ọ gaghị ekwe omume ma ọ bụ kwesị ekwesị ịkpọ ndị ikwu na ibe ha nile; n’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka ha kowe akpa ha ebe aka ha ga-eru mgbe ha na-eme mkpebi ụfọdụ. Di na nwunye kwesịrị inwe obi ike na ọ bụrụ na ha akpọlighị ụfọdụ Ndị Kraịst ibe ha, na ha ga-aghọta ma ghara iwe iwe.—Eklisiastis 7:9.
“Onye Nhazi Oriri”
11. Olee ọrụ “onye nhazi oriri” nwere ike ịrụ n’agbamakwụkwọ?
11 Ọ bụrụ na di na nwunye kpebiri ịkpọ oriri iji ṅụrịa ọṅụ maka agbamakwụkwọ ha, olee otú ha ga-esi jide n’aka na ememe ahụ ga-adị ùgwù? Ruo ọtụtụ iri afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova aghọtala na ọ bụ ihe amamihe dị na ya inwe otu ihe e kwuru na e nwere n’oriri ahụ Jizọs gara na Kena. E nwere “onye nhazi oriri” na ya, bụ́ onye o doro anya na ọ bụ onye kwere ekwe ji ihe akpọrọ ihe. (Jọn 2:9, 10) Onye na-alụ nwanyị ọhụrụ nke maara ihe ga-ahọrọ Onye Kraịst ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ka ọ rụọrọ ya ọrụ a dị mkpa. Mgbe onye nhazi oriri ahụ matachara ihe onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ chọrọ, ọ ga-ahụ na e mere ihe nile otú ahụ tupu a malite oriri ahụ na n’oriri ahụ.
12. Gịnị ka onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ kwesịrị ịtụle banyere mmanya na-aba n’anya?
12 N’ikwekọ n’ihe e kwuru na paragraf nke 5, ụfọdụ di na nwunye na-ahọrọ ịghara inye ndị bịaara ha oriri agbamakwụkwọ mmanya na-aba n’anya ka mmadụ ghara ịṅụbiga ya ókè wee mee ihe ga-ewute ndị bịara ebe ahụ ma ọ bụ kpasaa ememe ahụ. (Ndị Rom 13:13; 1 Ndị Kọrint 5:11) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ha enye ndị bịaranụ mmanya na-aba n’anya, onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ kwesịrị ịhụ na ọ gabigaghị ókè. A ṅụrụ mmanya n’agbamakwụkwọ ahụ Jizọs gara na Kena, o nyekwara ha mmanya dị ụtọ. Onye nhazi oriri ahụ kwudịrị, sị: “Onye ọ bụla ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma, mgbe mmanya gbuwakwara ndị mmadụ, ọ na-ebupụta nke na-adịchaghị mma. I debewo mmanya dị mma ruo ugbu a.” (Jọn 2:10) O doro anya na Jizọs emeghị ka mmanya gbuo onye ọ bụla, n’ihi na o lere nke ahụ anya dị ka ihe na-adịghị mma. (Luk 12:45, 46) Mgbe onye nhazi oriri ahụ na-egosi otú ụtọ mmanya ahụ si ju ya anya, ihe o kwuru gosiri nnọọ na ọ hụla ebe ndị a kpọrọ òkù n’agbamakwụkwọ ṅụbigara mmanya ókè. (Ọrụ 2:15; 1 Ndị Tesalonaịka 5:7) N’ihi ya, ma onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ma Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi o nyere ọrụ ịbụ onye nhazi oriri kwesịrị ijide n’aka na ndị nile bịaranụ gbasoro ndụmọdụ a doro anya: “Unu adịla na-aṅụ mmanya gabiga ókè, bụ́ nke ndụ ịla n’iyi dị na ya.”—Ndị Efesọs 5:18; Ilu 20:1; Hosea 4:11.
13. Gịnị ka ndị na-alụ di na nwunye kwesịrị ịtụle ma ọ bụrụ na ha kpebiri ịkpọ egwú n’oriri agbamakwụkwọ ha, n’ihi gịnịkwa?
13 Dị ka ọ na-adị ná nnọkọ ndị ọzọ, ọ bụrụ na a ga-akpọ egwú, e kwesịrị nnọọ ilebara otú ọ ga-adaru ụda anya ka o nwee ike ikwe ndị mmadụ ịkparịta ụka nke ọma. Otu okenye ọgbakọ Ndị Kraịst kwuru, sị: “Ka chi na-ejikwu, mgbe mkparịta ụka na-atọkwu ụtọ ma ọ bụ mgbe a malitere ịgba egwú, mgbe ụfọdụ a na-agbalikwu ụda egwú. Egwú na-egbochighị ndị mmadụ ịkparịta ụka ná mmalite nwere ike dachiwezie ha ntị ma mee ka o siere ha ike ịnụ ihe ibe ha na-ekwu. Oriri agbamakwụkwọ na-enye ndị mmadụ ohere ịkparịta ụka. Ọ bụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya ma ọ bụrụ na egwú na-ada oké ụda emebie ohere a!” N’akụkụ a kwa, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na onye nhazi oriri ya kwesịrị ikpebi ụdị egwú a ga-akpọ na otú ọ ga-adaru n’ụda, ọ bụghị ịhapụrụ ya onye na-akpọ egwú, ma ọ bụ onye e goro ego ma ọ bụ na ọ bụghị. Pọl dere, sị: “Ihe ọ bụla unu na-emekwa n’okwu ma ọ bụ n’ọrụ, na-emenụ ihe nile n’aha Onyenwe anyị Jizọs.” (Ndị Kọlọsi 3:17) Mgbe ndị a kpọrọ oriri lara, hà ga na-echeta egwú a kpọrọ ebe ahụ dị ka nke na-egosi na di na nwunye ahụ mere ihe nile n’aha Jizọs? Nke ahụ bụ otú o kwesịrị ịdị.
14. Olee ihe kwesịrị ime Ndị Kraịst obi ụtọ mgbe ha chetara agbamakwụkwọ ha gara?
14 Ee, ndị mmadụ nwere ike inwe obi ụtọ mgbe ha chetara agbamakwụkwọ a haziri nke ọma. Adam na Edyta, bụ́ ndị lụrụla di na nwunye ruo afọ 30, kwuru banyere otu agbamakwụkwọ, sị: “Ị ga-ama na ọ bụ agbamakwụkwọ Ndị Kraịst. A
kpọrọ abụ ndị na-eto Jehova, ma e nwekwara ihe ndị ọzọ kwesịrị ekwesị e ji mee ndị mmadụ obi ụtọ. Ịgba egwú na ịkpọ egwú abụghị ihe kasị mkpa na ya. Ọ tọrọ ụtọ ma na-ewuli elu, ihe nile e mere kwekọkwara n’ụkpụrụ Bible.” O doro anya na onye ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na onye ọ na-alụ nwere nnọọ ọtụtụ ihe ha nwere ike ime iji gosi na ha na-egosipụta okwukwe ha site n’ọrụ ha.Onyinye Agbamakwụkwọ
15. Olee ndụmọdụ Bible a pụrụ iji mee ihe banyere onyinye agbamakwụkwọ?
15 N’ọtụtụ ala, ndị ikwu na ibe nke ndị na-alụ di na nwunye ọhụrụ na-enyekarị ha onyinye. Ọ bụrụ na i kpebie inye onyinye dị otú ahụ, gịnị ka i nwere ike iburu n’uche? Cheta ihe Jọn onyeozi kwuru banyere “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” O jikọtara oké ngosi dị otú ahụ na ‘ụwa nke na-agabiga agabiga,’ o jikọtaghị ya na Ndị Kraịst na-egosipụta okwukwe ha site n’omume ha. (1 Jọn 2:16, 17) N’ihi ihe ahụ Jọn kwuru n’ike mmụọ nsọ, di na nwunye ọhụrụ ahụ hà kwesịrị ịgwa mmadụ nile onye nyere onyinye nke ọ bụla? Ndị Kraịst nọ na Masedonia na Akea nyere ụmụnna ha nọ na Jeruselem onyinye, ma ọ dịghị ihe gosiri na a gwara mmadụ nile aha ndị nyere onyinye ndị ahụ. (Ndị Rom 15:26) Ọtụtụ Ndị Kraịst nyere ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ onyinye ga-achọ ka a ghara ịma ihe ha nyere kama ime ka ndị mmadụ jawa ha mma. Gụghachi ihe Jizọs kwuru nke metụtara nke a na Matiu 6:1-4.
16. Olee otú ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ pụrụ isi zere iji ihe metụtara onyinye agbamakwụkwọ mechuo ndị ọzọ ihu?
16 Ịgwa ndị mmadụ aha ndị nyere onyinye nwere ike ‘ịkpali ịsọ mpi’ n’ihe banyere onyinye ka mma ma ọ bụ nke ka fuo ego. N’ihi ya, Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ọhụrụ bụ́ ndị maara ihe ga-ezere ịma aha ndị nyere ha onyinye n’ọkwa. Ịma aha ndị nyere onyinye n’ọkwa nwere ike imechu ndị ọ pụrụ ịbụ na ha enweghị ego ha ga-eji zụnye ha onyinye ihu. (Ndị Galeshia 5:26; 6:10) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na di na nwunye ahụ ịma ndị nyere ha onyinye. Ha nwere ike ịhụ nke ahụ na kaadị e tinyere n’onyinye ahụ nke a na-agaghị agụpụta n’ihu ọha. Mgbe anyị na-azụ, na-enye ma na-anara onyinye agbamakwụkwọ, anyị nile na-enwe ohere igosipụta na ọbụna n’ihe dị otú ahụ ndị ọzọ na-adịghị ahụ, okwukwe anyị na-emetụta ihe anyị na-eme. *
17. Olee ihe mgbaru ọzọ Ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ihe banyere okwukwe na ọrụ ha?
17 Ọ bụghị nanị ibi ndụ dị ọcha, ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, na ikwusa ozi ọma ka anyị ga-eji gosipụta okwukwe anyị. Ka onye nke ọ bụla n’ime anyị nwee okwukwe dị ndụ nke na-emetụta ihe nile anyị na-eme. Ee, anyị nwere ike iji ‘imezu ihe ndị anyị na-eme’ gosi okwukwe anyị, nke ahụ gụnyekwara ihe ndị anyị na-eme n’ihe ndị ahụ e kwuru n’elu.—Mkpughe 3:2.
18. Olee otú ihe e kwuru na Jọn 13:17 pụrụ isi metụta agbamakwụkwọ na oriri Ndị Kraịst?
18 Mgbe Jizọs setipụsịịrị ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ezi ihe nlereanya site n’ịrụ ọrụ dị ala nke bụ́ ịsa ha ụkwụ, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu emee ha.” (Jọn 13:4-17) N’ógbè ebe anyị bi, o nwere ike ọ gaghị abụ omenala ịsa onye ọzọ ụkwụ, dị ka ịsa onye bịara n’ụlọ anyị ụkwụ. Ma, dị ka anyị tụleworo n’isiokwu a, e nwere ihe ndị ọzọ a na-eme ná ndụ bụ́ ebe ndị anyị pụrụ iji ịhụnanya na ichebara ndị ọzọ echiche gosipụta okwukwe anyị, nke ahụ gụnyekwara oriri agbamakwụkwọ Ndị Kraịst na ụdị oriri ndị ọzọ. Nke ahụ metụtara anyị ma ànyị na-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ànyị bụ ndị a kpọrọ ịbịa oriri obi ụtọ ga-esochi ya nke Ndị Kraịst chọrọ iji omume ha gosipụta okwukwe ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 A tụlere ihe ndị ọzọ banyere agbamakwụkwọ na oriri ya n’isiokwu na-eso nke a, nke bụ́, “Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù.”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
Olee otú ị pụrụ isi gosipụta okwukwe gị
• mgbe ị na-akpọ oriri?
• mgbe ị na-akpọ oriri agbamakwụkwọ?
• mgbe ị na-enye ma ọ bụ na-anara onyinye agbamakwụkwọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọbụna mgbe ị kpọrọ mmadụ ole na ole, ka “amamihe nke sitere n’elu” duzie gị