Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Pụrụ Ịdọ Ọkàikpe Aka ná Ntị?

À Pụrụ Ịdọ Ọkàikpe Aka ná Ntị?

À Pụrụ Ịdọ Ọkàikpe Aka ná Ntị?

A GWARA Sladjana, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova na Croatia, ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ụlọikpe n’ihi okwu ego. Ọ gara n’ụlọikpe ahụ n’ezi oge ịhụ onye ọkàikpe. Ma, onye ya na ya nwere okwu ikpe ahụ bịara n’azụ oge. Ọ dị Sladjana ọkụ n’obi ịgba àmà, ya mere, ka mmadụ nile nọ na-eche, o jiri obi ike gwa ọkàikpe ahụ okwu.

Ọ jụrụ ọkàikpe ahụ, sị: “Nna anyị ukwu, ị̀ maara na n’oge na-adịghị anya a gaghịzi enwe ndị ọkàikpe na ụlọikpe n’ụwa?” N’ezie, ọ na-ekwu banyere ndị ọkàikpe dị ka anyị maara ha taa.

Ọkàikpe ahụ tụgharịrị lee ya anya ma o kwughị ihe ọ bụla n’ihi na ihe Sladjana kwuru juru ya anya. Ozugbo ahụ, a malitekwara ikpe. Mgbe ha mechara, Sladjana bilitere ịga bịanye aka n’akwụkwọ, ọkàikpe ahụ hulatarạ ma takwụnyere ya, sị: “Ihe a ị gwara m na n’oge na-adịghị anya, a gaghịzi enwe ndị ọkàikpe na ụlọikpe n’ụwa, ọ̀ bụ eziokwu?”

Sladjana zara ya, sị: “Ee nna anyị ukwu, ọ bụ eziokwu!”

Ọkàikpe ahụ jụrụ ya, sị: “Olee ihe mere i ji kwuo otú ahụ?”

Sladjana zara ya, sị: “Ọ dị n’ime Bible.”

Ọkàikpe ahụ kwuru na ya ga-achọ ịgụ ebe nke a dị na Bible ma na ya enweghị Bible. Ya mere, Sladjana kwere ya nkwa na ya ga-ewetere ya otu Bible. Ndịàmà gara leta ọkàikpe ahụ ma nye ya Bible, gbaakwa ya ume ka ọ na-enwe ọmụmụ Bible kwa izu. Ọkàikpe ahụ kwetara, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Okwu amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 2:10 na-asị: “Ugbu a, ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa.” Ọ na-enye nnọọ obi ụtọ mgbe ndị dị otú a jiri obi umeala nakwere ntụziaka ịhụnanya Jehova.

[Foto dị na peeji nke 32]

Sladjana na ọkàikpe ahụ