Kporie Ndụ N’ụwa Anyị Mara Mma
Kporie Ndụ N’ụwa Anyị Mara Mma
NDỊ na-enyocha mbara igwe achọpụtala na ụwa dị nnọọ ka kpọm na mbara igwe nke na-enweghị nsọtụ. Ọ dịbeghị ebe ọzọ a hụrụ ndụ na mbara igwe anya na-ahụ. Ọ bụ nanị n’Ụwa ka e nwere ọnọdụ ga-eme nnọọ ka ihe dịgide ndụ.
Ọzọkwa, anyị nwere ike ịdị ndụ obi ụtọ n’ụwa a magburu onwe ya. Lee otú o si atọ ụtọ ịnyaratụ anwụ n’oge oyi! Olee onye n’ime anyị ọ na-adịghị amasị ikiri ka anyanwụ na-ada ma ọ bụ na-awa? Ma ọrụ anyanwụ anyị na-arụ abụghị nanị ikpo anyị ahụ́ ọkụ na ịdọrọ mmasị anyị. O ji anyị nnọọ ndụ.
Kemgbe ọtụtụ nde afọ, ikike sitere n’anyanwụ emewo ka ụwa na mbara ala ndị ọzọ dịgide n’ebe ha dị. Dịkwa ka a na-akụziri ụmụ akwụkwọ, usoro mbara igwe dum na-agba etiti ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way gburugburu. Ma a bịa n’ụyọkọ kpakpando nke anyị, anyanwụ bụ otu n’ime otu narị ijeri kpakpando ndị na-emekọ njem a ọnụ.
E jikọtara ụyọkọ kpakpando Milky Way na ihe dị ka ụyọkọ kpakpando 35 ndị ọzọ. E nwere ụyọkọ kpakpando ndị e jikọtara ha na ọtụtụ puku ụyọkọ kpakpando. O yiri ka usoro mbara igwe anyị agaraghị akwụsi ike otú ọ kwụsiri ma a sị na ọ nọ n’ụyọkọ kpakpando e jikọtara ya na ọtụtụ ụyọkọ kpakpando. Ma, dị ka Guillermo Gonzalez na Jay W. Richards kwuru n’akwụkwọ ha bụ́ The Privileged Planet, ọ bụ nanị ebe ole na ole na mbara igwe “ka mmadụ nwere ike ịdị ndụ na ha.”
Ndụ ọ̀ bịara dịrị n’ụwa a na mberede? Ka è nwere ezigbo ihe mere e ji nwee ndụ n’Ụwa anyị mara mma?
Ọtụtụ ndị ekwubiela na e kere ụwa anyị kpọmkwem iji mee ka ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ dịgide ndụ. * Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu onye Hibru na-ede egwú kwuru okwu banyere ụwa na eluigwe. O dere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ?” (Abụ Ọma 8:3, 4) Onye a na-ede egwú kweere na ọ ghaghị ịbụ na e nwere Onye Okike. Ihe ahụ o kweere ọ̀ ka ziri ezi n’oge a e nwerela ọganihu dị ukwuu na nkà mmụta sayensị?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Gụọ akwụkwọ Abụ Ọma, karịsịa Abụ Ọma nke 8.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 3]
Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Science Encyclopedia—Amazing Planet Earth kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị nọrọ n’ebe dị anya na mbara igwe gbara ọchịchịrị lee Ụwa anya, o yiri ọla na-acha anụnụ anụnụ nke na-egbuke egbuke.”
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ụwa: U.S. Fish & Wildlife Service, Washington, D.C./NASA