Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe Chineke kwụsịrị ịhọrọ ndị ga-aga eluigwe?

Bible enyeghị azịza a kapịrị ọnụ maka ajụjụ a. Ihe anyị maara bụ na ọ bụ n’afọ 33 O.A. ka a malitere ite ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ iji kwadebe ha ịga eluigwe. (Ọrụ 2:1-4) Ihe ọzọ anyị maara bụ na ka ndịozi nwụsịrị, Ndị Kraịst adịgboroja bụ́ “ata” malitere iso ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ “ọka wit” “tokọọ.” (Matiu 13:24-30) Ná ngwụsị afọ ndị 1800, Ndị Kraịst e tere mmanụ maliteghachikwara ịrụsi nnọọ ọrụ ike. N’afọ 1919, e bidoro ịghọrọ “ihe ubi nke ụwa,” nke gụnyere ịchịkọta ndị ikpeazụ so ná ndị e tere mmanụ.—Mkpughe 14:15, 16.

Malite ná ngwụsị afọ ndị 1800 ruo afọ 1931, nzube bụ́ isi e ji na-ekwusa ozi ọma bụ iji chịkọta ndị fọdụrụ ná ndị so n’ahụ́ Kraịst. Na 1931, Ndị Mmụta Bible malitere ịza aha ahụ sitere na Bible bụ́ Ndịàmà Jehova. N’Ụlọ Nche nke November 15, 1933, a kọwara na aha a pụrụ iche ha malitere ịza bụ “dinarịọs” ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ilu ahụ e dekọrọ na Matiu 20:1-16. E weere na awa iri na abụọ ahụ a kpọtụrụ aha n’ilu ahụ bụ afọ iri na abụọ malitere na 1919 ruo 1931. Ọtụtụ afọ ka e kwusịrị nke a, nghọta e nwere bụ na ọ bụ na 1931 ka Chineke kwụsịrị ịhọrọ ndị ga-aga eluigwe nakwa na ndị a họọrọ n’agbata afọ1930 na afọ 1931 iso Kraịst chịa bụ ‘ndị ikpeazụ’ a kpọrọ. (Matiu 20:6-8) Otú ọ dị, na 1966 a bịara gbanwee otú e si akọwabu ilu ahụ, ọ bịakwara doo anya na ọ dịghị ihe jikọrọ ilu ahụ na mgbe Chineke kwụsịrị ịhọrọ ndị e tere mmanụ.

Na 1935 a bịara ghọta na “oké ìgwè mmadụ” ahụ a kpọrọ aha ná Mkpughe 7:9-15 bụ ha mejupụtara “atụrụ ọzọ” ahụ, nke bụ́ Ndị Kraịst nwere olileanya ibi n’ụwa, bụ́ ndị a ga-achịkọta “n’ụbọchị ikpeazụ,” nakwa ndị ga-alanarị Amagedọn. (Jọn 10:16; 2 Timoti 3:1; Mkpughe 21:3, 4) Ka afọ ahụ gasịrị, nzube bụ́ isi e ji na-ekwusa ozi ọma bụzi iji chịkọta ndị ga-emejupụta oké ìgwè mmadụ ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ka afọ 1966 gasịrị ka e chere na ọ bụ na 1935 ka Chineke kwụsịrị ịhọrọ ndị ga-aga eluigwe. O yiri ka ihe mere e ji kwenyesie ike na nke a bụ eziokwu bụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile e mere baptizim n’afọ ndị sochiri 1935 chere na ha nwere olileanya ibi n’ụwa. Malite n’oge ahụ gawa, e weere ya na ndị ọ bụla a họọrọ ịga eluigwe ugbu a bụ ndị e ji edochi anya Ndị Kraịst e tere mmanụ dapụrụ n’okwukwe.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụrụ na e nwee onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ dapụrụ n’eziokwu na Jehova ga-eji onye ọzọ dochie ya. (Ndị Rom 11:17-22) Otú ọ dị, o yiri ka ọnụ ọgụgụ ezigbo ndị e tere mmanụ si n’eziokwu dapụ ehighị nne. N’aka nke ọzọ, ka oge na-aga, mmụọ nsọ gbaara ụfọdụ Ndị Kraịst e mere baptizim n’afọ ndị sochiri 1935 àmà na ha ga-aga eluigwe. (Ndị Rom 8:16, 17) N’ihi ya, o yiri ka anyị agaghị enwe ike ikwu kpọmkwem oge a kwụsịrị ịhọrọ ndị ga-aga eluigwe.

Olee otú e kwesịrị isi lee onye kweere na ya so ná ndị e tere mmanụ ma malite ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs anya? O kwesịghị ka onye ọ bụla kpee ya ikpe. Okwu ahụ dịịrị ya na Jehova. (Ndị Rom 14:12) Otú ọ dị, ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ adịghị achọ ka e mesowe ha ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ha adịghị eche na n’ihi na ha bụ ndị e tere mmanụ, na ha nwere “nghọta” pụrụ iche karịa ụfọdụ ndị nwere ahụmahụ so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. Ha adịghị eche na ha nwere mmụọ nsọ Chineke karịa ka ndị ibe ha so n’atụrụ ọzọ ahụ nwere; ha adịghịkwa atụ anya ka a na-enye ha nsọpụrụ pụrụ iche ma ọ bụ chewe na ha karịrị ndị okenye ọgbakọ n’ihi na ha na-eri achịcha ma na-aṅụ mmanya ememe ncheta. Ha na-eji obi umeala echeta na e nwere ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ na narị afọ mbụ bụ́ ndị na-erughị eru ịbụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. (1 Timoti 3:1-10, 12, 13; Taịtọs 1:5-9; Jems 3:1) E nwedịrị ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-adịghị emecha nke ọma n’ozi Jehova. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ụmụnna nwanyị ndị e nwekwara n’oge ahụ adịghị mgbe ha ghọrọ ndị na-ezi ihe n’ọgbakọ n’agbanyeghị na ha bụ ndị e tere mmanụ.—1 Timoti 2:11, 12.

N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ ha na ha na-arụkọ ọrụ na-agbalịsi ike ịhụ na mmekọrịta ha na Jehova nọgidere na-esi ike, ha kwesịkwara ịgbalị ịhụ na ha na-akpa àgwà dị ka ndị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ ná ndụ ha, nakwa na ha na-akwalite udo n’ọgbakọ. Ndị Kraịst nile, ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ, na-agbalịsi ike ikwusa ozi ọma na ime ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-agbaso nduzi nke Òtù Na-achị Isi. Ndị Kraịst e tere mmanụ dị njikere ịnọgide n’ụwa a na-ejere Chineke ozi ruo mgbe ọ bụ uche ya ka ha kwụsị ozi ha na-eje n’ụwa.