Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Anyị Chụrụ Nta Ya Ewetara Anyị Ngọzi Na-adịghị Agwụ Agwụ
Akụkọ Ndụ
Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa Anyị Chụrụ Nta Ya Ewetara Anyị Ngọzi Na-adịghị Agwụ Agwụ
Dị ka Dorothea Smith na Dora Ward si kọọ
Olee ụdị akụ̀ dị oké ọnụ ahịa anyị chụrụ nta ya? Anyị bụ ụmụ agbọghọ abụọ ọ na-anụ ọkụ n’obi iso mezuo iwu Jizọs, bụ́: ‘Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.’ (Matiu 28:19) Ka anyị kọọrọ gị otú ịchụ nta akụ̀ a dị oké ọnụ ahịa si wetara anyị ngọzi na-adịghị agwụ agwụ.
DOROTHEA: A mụrụ m na 1915, obere oge ka Agha Ụwa nke Mbụ malitesịrị. Abụ m nwa nke atọ a mụrụ n’ezinụlọ anyị. N’oge ahụ, anyị bi nso obodo Howell, Michigan, nke dị na United States. Papa m ejighị okpukpe kpọrọ ihe, ma mama m bụ nwanyị na-atụ egwu Chineke. Ọ gbalịrị ịkụziri anyị ịdị na-edebe Iwu Iri ahụ, ma ọ na-ewute ya na nwanne m nwoke bụ́, Willis; nwanne m nwanyị, bụ́ Viola; na mụ onwe m adịghị nke na-aga chọọchị ọ bụla.
Mgbe m dị afọ iri na abụọ, mama m kpebiri ka m mee baptizim na chọọchị Presbyterian iji bụrụ onye òtù ha. M ka na-echeta nnọọ ụbọchị ahụ e mere m baptizim. E mekọrọ mụ na ụmụ ọhụrụ abụọ nne ha ka ku n’aka baptizim. Ihere mere m nke ukwuu n’ihi na e mekọtara mụ na ụmụ ọhụrụ baptizim. Ụkọchukwu fesara m mmiri n’isi ma tamuo ihe m na-aghọtaghị. Nke bụ́ eziokwu bụ na amaghị m ihe ọ bụla banyere baptizim dị nnọọ ka ụmụ ọhụrụ abụọ ahụ e mekọrọ mụ na ha baptizim!
Otu ụbọchị na 1932, otu ụgbọala kwụsịrị n’ihu ụlọ anyị. Mama m pụtara ka ọ mara ndị bịaranụ. Ọ hụrụ ụmụ okorobịa abụọ na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Bible. Otu onye n’ime ha kwuru na aha ya bụ Albert Schroeder. O gosiri
mama m ụfọdụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara o ji bịa. Mama m naara akwụkwọ ndị ahụ. Ọ bụ akwụkwọ ndị ahụ nyeere ya aka ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke.Anyị Amalite Ịchọ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa
Emesịrị m gaa ibinyere nwanne m nwanyị na Detroit. N’ebe ahụ, e nwere otu nwanyị katarala ahụ́ na-abịa akụziri nwanne m nwanyị Bible. Mkparịta ụka ndị mụ na ya nwere mere ka m cheta otu okwu a na-ekwu na redio kwa izu nke mụ na mama m na-adị na-ege. Ọ bụ okwu na-ewe minit 15 nke J. F. Rutherford, bụ́ onye na-edu ndú n’etiti Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, na-adị na-ekwu. Na 1937, anyị malitere iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova mbụ e nwere na Detroit na-amụ ihe. E mere m baptizim n’afọ sochirinụ.
Ná mmalite afọ ndị sochiri 1940, a mara ọkwa na Ndịàmà Jehova ga-amalite otu ụlọ akwụkwọ a kpọrọ Gilead na South Lansing, New York, bụ́ ebe a ga-anọ na-azụ ndị ozi ala ọzọ. Mgbe m nụrụ na a ga-eziga ụfọdụ ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ ije ozi ná mba ofesi, echere m n’ime obi m, sị, ‘Ọ ga-amasị m ije ụlọ akwụkwọ Gilead a!’ Esetịpụrụ m ịga Gilead dị ka ihe mgbaru ọsọ m. Ọ ga-abụrụ m nnukwu ihe ùgwù ịchọ “akụ̀ dị oké ọnụ ahịa,” nke bụ́ ụmụ mmadụ ndị nọ ná mba ndị ọzọ bụ́ ndị chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs!—Hegaị 2:6, 7.
Iji Nwayọ Nwayọ Na-eru Ihe Mgbaru Ọsọ M
N’April 1942, agbara m arụkwaghị m n’ebe m na-arụ ọrụ ma soro ụmụnna nwanyị ise ndị ọzọ na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova malite ọrụ ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ọrụ izisa ozi ọma oge nile n’obodo Findlay, Ohio. N’ebe ahụ, enweghị ọgbakọ na-enwezu ọmụmụ ihe ise dị ka o kwesịrị, ma anyị na-agbarịta onwe anyị ume site n’ịdị na-agụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ anyị dị iche iche. N’ọnwa mbụ m malitere ọrụ ọsụ ụzọ, enyefere m akwụkwọ iri itoolu na ise! Ihe dị ka otu afọ na ọkara m malitesịrị ọrụ ọsụ ụzọ, e zigara m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Chambersburg, Pennsylvania. N’ebe ahụ, esonyeere m ụmụnna nwanyị ise ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ndị ọzọ nke gụnyere Dora Ward, bụ́ nwanna nwanyị si obodo Iowa. Dora ghọrọ onye mụ na ya na-ejekọ ozi. E mere anyị abụọ baptizim n’otu afọ, anyị abụọ nwekwara ọchịchọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead nakwa ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ.
Ná mmalite afọ 1944, ihe ukwu mere! Anyị abụọ natara akwụkwọ e ji kpọọ anyị ịga klas nke anọ nke Gilead. Ọ bụ n’August afọ ahụ ka e debara aha anyị n’akwụkwọ. Ma tupu m gaa n’ihu, ka Dora kọọrọ gị otú o si ghọọ onye mụ na ya so na-achụkọ nta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa kemgbe ọtụtụ afọ.
Ọ Dị Anyị Ọkụ n’Obi Ịmalite Ozi Oge Nile
DORA: Mama m chọrọ ịghọta Okwu Chineke nke
ọma. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere banyere ya. N’otu ụbọchị Sunday, mụ na ya nọ mgbe J. F. Rutherford malitere ikwu okwu na redio. Mgbe o kwusịrị okwu ahụ, mama m kwuru, sị, “Ihe a bụ eziokwu ahụ!” Ọ dịghị anya, anyị amalite ịmụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Na 1935, mgbe m dị afọ iri na abụọ, egere m okwu baptizim otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru, nke a mekwara ka ọ gụọ m agụụ ịrara onwe m nye Jehova. Afọ atọ ka e mesịrị, e mere m baptizim. Nraranye na baptizim nyeere m aka n’afọ ndị ahụ m nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ịnọgidesi ike na-achọ iru ihe mgbaru ọsọ ndị m setịpụụrụ onwe m. Ọ dị m ọkụ n’obi ka m gụsịa akwụkwọ ọsọ ọsọ wee nwee ike ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ.N’oge ahụ, Ndịàmà anyị na-eso amụ ihe na-aga ọmụmụ ihe na Fort Dodge, Iowa. Ịga ọmụmụ ihe n’oge ahụ chọrọ mgbalị dị ukwuu. N’oge ahụ, isiokwu ndị a na-amụ n’Ụlọ Nche adịghị enwe ajụjụ a ga-eji mụọ ha n’ọgbakọ. A na-agwa ndị nkwusa nile ka ha depụta ajụjụ a ga-ajụ ma nye ya nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. N’abalị Monday ọ bụla, mụ na mama m na-akwadebe ajụjụ maka paragraf nke ọ bụla, anyị na-enyekwa ha nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ka o wee nwee ike isi na ha họrọ ndị ọ ga-ajụ.
Ndị nlekọta sekit na-abịa eleta ọgbakọ anyị site n’oge ruo n’oge. Otu n’ime ha, bụ́ John Booth, kụziiri m otú e si ezi ozi ọma ụlọ n’ụlọ mgbe m dị afọ iri na abụọ. Mgbe m dị afọ iri na asaa, ajụrụ m ya otú e si edejupụta akwụkwọ maka ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ, o nyekwaara m aka idejupụta ya. Àmakwanụ m na mụ na ya ga-emesi zute ọzọ, nakwa na anyị ga-emesị ghọọ ezigbo enyi ná ndụ anyị nile!
Oge m malitere ọrụ ọsụ ụzọ, mụ na nwanna nwanyị Dorothy Aronson jekọrọ ozi ọtụtụ ugboro. Nwanna nwanyị a bụ onye ọsụ ụzọ, o jikwa afọ iri na ise tọọ m. Mụ na ya jekọrọ ozi ruo mgbe a kpọrọ ya ka ọ bịa klas nke mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead na 1943. Mgbe ọ gawara, nanị m nọgidekwara na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ.
Mmegide Akwụsịlighị Ozi Anyị
Anyị nwetara ọtụtụ ihe isi ike n’afọ ndị sochiri 1940 n’ihi mmụọ ala nna m efula, bụ́ nke Agha Ụwa nke Abụọ kụnyere n’obi ndị mmadụ. Mgbe anyị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ, ndị mmadụ na-adịkarị atụ anyị àkwá rere ere, tomato chara acha, mgbe ụfọdụkwa ha atụọ anyị okwute! Ihe isi ike nke kadị njọ bịara mgbe anyị nọ n’okporo ámá na-ekesa magazin Ụlọ Nche na Consolation (nke a na-akpọ Teta! ugbu a). Ndị mmegide ranyere ndị uwe ojii ka ha baara anyị mba ma yie anyị egwu na ha ga-ejide anyị ma ọ bụrụ na ha ahụ anyị ebe anyị na-ekwusa ozi ọma n’okporo ámá ọzọ.
Ma anyị jụrụ ịkwụsị ikwusa ozi ọma, ha kpụụrụ Aịsaịa 61:1, 2 gosi ihe mere anyị ji nọgide na-ekwusa ozi ọma. N’otu oge, otu onye uwe ojii bụ́ nwa okorobịa bịakwutere m, n’agbanyeghị na ụjọ ji m, agụpụtaara m ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. O juru m anya mgbe ọ tụgharịrị pụwa! O yiri m nnọọ ka ọ bụ ndị mmụọ ozi na-echebe anyị.
anyị gaa n’ụlọ ndị uwe ojii iji gbaa anyị ajụjụ ọnụ. Mgbe a tọhapụrụ anyị, anyị laghachikwara n’okporo ámá ahụ iji kesaa magazin anyị. Anyị mere ihe ụmụnna tozuru okè gwara anyị, nke bụ́ ijiỤbọchị M Na-agaghị Echefu Echefu
Na 1941, enwere m ọṅụ ịga mgbakọ were ụbọchị ise nke Ndịàmà Jehova nwere na St. Louis, Missouri. Ná mgbakọ ahụ, Nwanna Rutherford gwara ụmụaka nile dị n’agbata afọ ise ruo afọ iri na asatọ ka ha gbakọta n’akụkụ kasị ibu n’ámá egwuregwu ahụ a nọ na ya na-eme mgbakọ. Ọtụtụ puku ụmụaka gbakọtara. Nwanna Rutherford kelere anyị nile site n’ifegharịrị anyị hankachif ya. Anyị nile feghachikwaara ya. Mgbe o kwusịrị okwu were otu awa, ọ sịrị: “Ụmụaka ndị kweere ime uche Chineke ma kwere ịkwado ọchịchị ya nke Kraịst Jizọs ga-achị ma si otú ahụ kwere irubere Chineke na Eze ya isi, biko bilienụ ọtọ.” Puku ụmụaka iri na ise nọ ebe ahụ biliri ọtọ n’otu oge—abụ m otu n’ime ha! Ọkà okwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Unu nile ndị ga-eme ihe nile unu pụrụ ime iji gwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke na ngọzi ndị ọ ga-eweta, biko sịnụ Ee.” Anyị nile jiri olu dara ụda tie, Ee. Ozugbo ahụkwa, mmadụ nile kụwara aka dara ezigbo ụda.
Mgbe ahụ, e wepụtaziri akwụkwọ ahụ bụ́ Children *. Ụmụaka nile ahụ kwụụrụ n’ahịrị gaa n’ikpo okwu, bụ́ ebe Nwanna Rutherford ji aka ya nye onye ọ bụla n’ime anyị otu akwụkwọ ọhụrụ ahụ. Ụbọchị ahụ tọgburu anyị atọgbu! Ruokwa taa, ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị natara akwụkwọ ahụ n’ụbọchị ahụ ka nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi n’ụwa nile, na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke na ezi omume ya.—Abụ Ọma 148:12, 13.
Mgbe m rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ atọ, obi tọrọ m ụtọ mgbe m natara akwụkwọ ozi e ji gwa m ka m malite ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Chambersburg! Ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ hụ Dorothea, ọ dịghịkwa anya, anyị abụọ aghọọ ahụghị ma erighị. Obi dị anyị nnọọ ọkụ n’ihi na anyị ka bụ ụmụ agbọghọ, ume jukwara anyị n’ahụ́. Anyị chọsikwara ike ikerekwu òkè n’ozi karịa ka anyị na-emebu. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, anyị abụọ malitere iso na-achụkọ nta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa.—Abụ Ọma 110:3.
Ọnwa ole na ole ka anyị malitesịrị ọsụ ụzọ pụrụ iche, anyị matara Albert Mann bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke mbụ nke Gilead. Ọ na-achọ ịga mba e zigara ya ije ozi. Ọ gbara anyị ume ka anyị nabata mba ọ bụla e zigara anyị ije ozi na ya.
Anyị Abụọ Agakọọ Akwụkwọ
DORA NA DOROTHEA: Anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe a malitere ịzụ anyị ije ozi ala ọzọ. N’ụbọchị mbụ anyị rutere n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ọ bụ Albert Schroeder, bụ́ nwanna nwoke ahụ nyere mama Dorothea akwụkwọ Studies in the Scriptures afọ iri na abụọ gara aga, debara aha anyị n’akwụkwọ. Anyị hụkwara nwanna John Booth n’ebe ahụ. Ọ bụzi ya na-elekọta Ugbo Alaeze, bụ́ ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị. Ụmụnna abụọ a mesịrị jee ozi dị ka ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.
Mgbe anyị nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, anyị mụrụ eziokwu ndị miri emi dị na Bible. Ihe ndị anyị mụrụ ebe ahụ magburu onwe ha. E nwere otu narị ụmụ akwụkwọ na anọ na klas anyị, otu n’ime ha bụ nwa akwụkwọ mbụ na-abụghị onye America, bụ́ onye si Mexico. Ọ nọ na-amụ asụsụ Bekee ebe anyị onwe anyị na-amụ asụsụ Spanish. Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu ụbọchị Nwanna Nathan H. Knorr nyere onye ọ bụla akwụkwọ e ji gwa ya ebe ọ ga-aga ozi ala ọzọ. E zigara ihe ka ọtụtụ n’ime anyị Ebe Etiti America na Ebe Ndịda America; ebe e zigara anyị bụ Chile.
Ịchọ Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa na Chile
Iji banye Chile, ọ dị mkpa na anyị ga-enweta visa, bụ́ nke were ogologo oge. N’ihi ya, mgbe
anyị gụsịrị akwụkwọ na January 1945, anyị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ na Washington, D.C. ruo otu afọ na ọkara. Mgbe anyị nwetara visa anyị, anyị na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ dị mmadụ asaa gawara Chile. Mmadụ asaa ndị a so na klas Gilead ndị nke bu nke anyị ụzọ.Mgbe anyị rutere n’isi obodo ebe ahụ bụ́ Santiago, ọtụtụ ụmụnna bịara zute anyị. Otu onye n’ime ha bụ Albert Mann, bụ́ nwanna ahụ gụsịrị akwụkwọ na Gilead, onye gbara anyị ume afọ ole na ole gara aga. Ihe dị ka otu afọ tupu anyị abịa ka e zitere ya na Chile, e zitere ya na Joseph Ferrari, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke abụọ nke Gilead. E nwere ihe na-erughị otu narị ndị nkwusa na Chile n’oge ahụ anyị bịara. Ọ dị anyị ọkụ n’obi ịchọtakwu akụ̀ dị oké ọnụ ahịa—nke bụ́ ndị nwere obi eziokwu—n’ebe ọhụrụ a anyị malitere ije ozi.
E kenyere anyị ije ozi n’otu ụlọ ndị ozi ala ọzọ bi na Santiago. Anyị na ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ibikọ ọnụ bụụrụ anyị ahụmahụ ọhụrụ. Tụkwasị n’ịhụ na anyị na-arụzu awa a chọrọ n’aka ndị ozi ala ọzọ, onye ọ bụla n’ime anyị na-eketa oge ọ ga-esi nri mmadụ nile ga-eri otu ugbo n’izu. N’otu oge anyị mere ihe buteere anyị ihere. Otu ụbọchị, mgbe o ruuru anyị isi nri ụtụtụ, anyị ghere biskiiti, ma mgbe anyị wepụtara biskiiti ahụ n’ọkụ, anyị chọpụtara na ọ na-esi ísì ọjọọ. Anyị amaghị na ihe anyị ji ghee biskiiti ahụ abụghị baking powder, bụ́ ihe e kwesịrị iji mee ya kama anyị ji baking soda bụ́ ihe a naghị eji eme biskiiti! Anyị amaghị na ọ dị onye weere baking soda tinye ná mkpọ baking powder gwụrụ agwụ.
Ihe kadị menye anyị ihere bụ okwu ụfọdụ ndị anyị kpọhiere mgbe anyị na-amụ asụsụ Spanish. Ọ fọrọ nke nta ka otu nnukwu ezinụlọ anyị na ha na-amụ Bible kwụsị ịmụ ihe n’ihi na ha adịghị aghọta ihe anyị na-ekwu. Ma site n’iji Bible nke ha na-esonye mgbe anyị na-ezi ha ihe, ha jisiri ike mụta eziokwu ahụ, mmadụ ise n’ime ha ghọkwara Ndịàmà. N’oge ahụ, ọ dịghị ndokwa e mere iji na-akụziri ndị ozi ala ọzọ bịara ọhụrụ asụsụ mba ebe ha bịara. Anyị malitere ọrụ nkwusa ozugbo ma gbalịwa isi n’ọnụ ndị anyị na-ezi ozi ọma mụta asụsụ obodo ahụ.
Anyị mụụrụ ọtụtụ mmadụ Bible, ụfọdụ n’ime ha nabatakwara ihe a kụziiri ha ozugbo. Ndị ọzọkwa chọrọ ka e jiri ndidi na-eso ha. Otu nwanyị aha ya bụ Teresa Tello, gere nnọọ ntị n’ozi anyị, ma mesịa, kwuo, sị, “Biko bịanụ mgbe ọzọ bịa kọwakwuoro m.” Anyị lọghachiri ugboro iri na abụọ ma anyị ahụghị ya. Afọ atọ bịara gafee. Otu ụbọchị, e mere mgbakọ n’ebe a na-ekiri sinima nke dị na Santiago. Ka anyị si ná mgbakọ ahụ na-alọta na Sunday, anyị nụrụ ka mmadụ na-akpọ, “Nwaada Dora, Nwaada Dora!” Ka anyị tụgharịrị, lekwa Teresa! Ọ bịara ileta nwanne ya nwanyị bi n’ofe nke ọzọ n’okporo ámá ahụ ụlọ ihe nkiri sinima ahụ dị. Ọ hụrụ ka ndị mmadụ gbakọrọ n’ebe ahụ a na-eme ihe nkiri wee bịa nso ka ọ mara ihe a na-eme, ọ bụkwa otú ahụ ka o si hụ anyị. Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ ịhụ ya ọzọ! Anyị mere ndokwa ịmalitere ya ọmụmụ Bible, ọ dịghịkwa anya e mee ya baptizim. O mesịrị bụrụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Taa, ka ihe dị ka afọ iri anọ na ise gasịrị, Teresa ka nọkwa na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche.—Eklisiastis 11:1.
Ịchọta Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Obodo “Ájá”
Na 1959, e zigara anyị obodo Punta Arenas, nke pụtara “Obodo Ájá”—nke dị na ndịda ndịda ikpere mmiri Chile nke ogologo ya dị kilomita puku anọ na narị atọ. Punta Arenas bụ ókèala pụrụ iche. N’oge okpomọkụ, ọchịchịrị adịghị agba ngwa ngwa—ìhè na-adịgide ruo mgbe o ji ọkara gafee elekere iri na otu nke abalị. Nke a na-enyere anyị aka ịnọte aka n’ozi ọma anyị. Ma e nwekwara ihe isi ike ndị ha na ya so n’ihi na a na-adị na-enwe ajọ ikuku jụrụ ezigbo oyi n’oge a. N’oge oyi, a na-enwe oké oyi, ọchịchịrị na-agbakwa ngwa ngwa.
N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, Punta Arenas makwara mma n’ụdị nke ya. N’oge okpomọkụ, i lee anya n’urukpuru, ebe nile na-adị ka mmiri ọ ga-ezo. Mgbe ụfọdụ, mmiri ga na-atasasị gị n’isi, ma ozugbo ahụkwa, ikuku na-eku ma gbakọọ ya. Ozugbo anyanwụ pụtara, a na-ahụ ọmarịcha eke na egwurugwu n’eluigwe. Mgbe ụfọdụ eke na egwurugwu a na-anọ ruo ọtụtụ awa, ọ na-abụ anyanwụ chawa, ya apụta otú a ga-ahụ ya nke ọma, emekwaa ya abakpuo.—Job 37:14.
N’oge ahụ, e nwere ndị nkwusa ole na ole na Punta Arenas. Ọ bụ anyị bụ́ ụmụnna nwanyị na-eduzi nzukọ ndị a na-enwe n’obere ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Jehova gọziri mgbalị anyị. Ka afọ iri atọ na asaa gafere, anyị bịaghachiri n’obodo a iji leta ndị anyị kwusabuuru ozi ọma. Gịnị ka anyị hụrụ? E nweziri ọgbakọ isii na-eme nke ọma na Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ mara mma n’ebe ahụ! Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịmara na Jehova kwere ka anyị chọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’obodo ndị a dị n’ebe ndịda bụ́ ájá ájá.—Zekaraịa 4:10.
Anyị Achọtakwuo Akụ̀ Dị Oké Ọnụ Ahịa “n’Ụsọ Osimiri Sara Mbara”
Ka anyị jesịrị ozi ruo afọ atọ na ọkara na Punta Arenas, e zigara anyị obodo Valparaiso, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Ugwu iri anọ na otu ndị gbara otu ọnụ mmiri gburugburu chere Oké Osimiri Pacific ihu, dị n’obodo a. Ọ bụ n’otu n’ime ugwu ndị a nke a na-akpọ Playa Ancha, nke pụtara “Ụsọ Osimiri Sara Mbara” ka anyị nọ jee ozi anyị. N’ime afọ iri na isii anyị nọrọ n’ebe ahụ, anyị hụrụ ka ọtụtụ ụmụnna nwoke malitere ime nke ọma n’ụzọ ime mmụọ nke na ugbu a ha na-ejezi ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nakwa dị ka ndị okenye n’ọgbakọ ndị dị na Chile.
Ebe ọzọ e zigara anyị bụ na Viña del Mar. Anyị jere ozi ebe ahụ afọ atọ na ọkara ruo mgbe ala ọma jijiji bịara bibie ụlọ anyị na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ bi. Anyị laghachiri Santiago, bụ́ ebe anyị nọ malite ozi ala ọzọ ihe dị ka afọ iri anọ gara aga. Ọtụtụ ihe agbanweela. A rụọla alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ, e jizikwa nke ochie mere ụlọ ebe ndị ozi ala ọzọ ka nọ ná mba ahụ na-ebi. Ka e mesịrị, a malitere iji ụlọ ahụ mere Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. N’oge ahụ, Jehova gosikwara anyị obi ọma ya. A gwara anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ merela agadi dị mmadụ ise ka anyị gaa biri na Betel. N’oge a anyị jere ozi na Chile, e zigawo anyị n’ebe iri na ise. Anyị ahụwo ka ọrụ nkwusa ahụ si mụbaa site n’ihe n’erughị otu narị ndị nkwusa ruo ihe dị ka ndị nkwusa puku iri asaa! Ọ bụụrụ anyị nnukwu ọṅụ ịnọ na Chile chọọ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ruo afọ iri ise na asaa!
Anyị weere ya dị ka ngọzi dị ukwuu na Jehova kwere ka anyị chọta ọtụtụ mmadụ, nke bụ́ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’ezie—ndị a abụrụkwala ndị Jehova ji rụọ ọrụ ná nzukọ ya. N’ime afọ iri isii anyị jekọrọ ozi ọnụ, anyị ji obi anyị nile kweta ihe ahụ Eze Devid, dere, sị: “Lee ka ezi ihe Gị si baa ụba, nke Ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu Gị, nke Ị rụworo nye ndị na-agbaba n’ime Gị n’ihu ụmụ mmadụ!”—Abụ Ọma 31:19.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 24 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma adịghịzi ebipụta ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Dorothea, na 2002 na mgbe ọ nọ n’ozi na 1943
[Foto dị na peeji nke 10]
Mgbe Dọra nọ ozi ọma n’okporo ámá dị na Fort Dodge, Iowa, na 1942
[Foto dị na peeji nke 10]
Dora, 2002
[Foto dị na peeji nke 12]
Ebe Dorothea na Dora nọ n’ihu ụlọ ebe ndị ozi ala ọzọ bi na Chile, 1946