Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
“Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—LUK 12:21.
1, 2. (a) Olee ihe ndị mmadụ dị njikere ịchụ ọtụtụ ihe n’àjà iji nweta? (b) Ihe ịma aka na ihe ize ndụ ndị dị aṅaa na-eche Ndị Kraịst ihu?
KEMGBE ụwa, ụmụ mmadụ n’ebe dị iche iche na-achụ akụ̀ na ụba ka à na-anwụ anwụ n’ihi na ha chọrọ ịba ọgaranya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị si n’ebe dị iche iche hapụrụ ụlọ ha na ndị ha hụrụ n’anya ma gbaga Australia, South Africa, Canada, na United States ịga chụọ akụ̀ na ụba n’ala ha na-amaghị, bụ́ ebe ndị na-adịghịkwa mfe obibi. N’ezie, ọtụtụ ndị dị njikere ime ihe ọ bụla a sịrị ha mee na ịtụfu ihe kasị dịrị oké ọnụ ahịa nye ha iji kpata akụ̀ na ụba na-agụsi ha agụụ ike.
2 Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mmadụ nile na-achụ akụ̀ na ụba ọnwụ ọnwụ otú a, onye ọ bụla aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji kpata ihe ọ ga-eri. Ọrụ dị n’ịkpata ihe e ji ebi ndụ taa abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ dị mfe mmadụ ichegbuwe nnọọ onwe ya banyere ihe oriri, uwe, na ụlọ nke na ọ ga-elegharazi ihe ndị ka mkpa anya, ma ọ bụdị chefuo ha kpamkpam. (Ndị Rom 14:17) Jizọs tụrụ ilu nke kọwara nnọọ nsogbu a ụmụ mmadụ nwere. A na-achọta ilu ahụ na Luk 12:16-21.
3. Kọọ ná mkpirikpi ilu Jizọs nke e dekọrọ na Luk 12:16-21.
3 Jizọs tụrụ ilu a n’otu oge ahụ o kwuru okwu banyere mkpa ọ dị iche nche megide inwe anyaukwu, bụ́ nke anyị tụletụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ. Mgbe Jizọs dọsịrị aka ná ntị banyere inwe anyaukwu, ọ kọrọ akụkọ banyere otu ọgaranya nke ebe ndị ọ na-akwakọba ihe jupụtara n’ihe onwunwe ma kama ihe ndị ahụ ga-eju ya afọ ọ kwaturu ebe ndị ahụ ọ na-akwakọba ihe ka o wee nwee ike iwusakwu ya ka ọ bakwuo ihe onwunwe ka ukwuu. Luk 12:21) Gịnị ka anyị pụrụ isi n’ilu a mụta? Olee otú anyị pụrụ isi tinye ihe anyị na-amụta n’ilu a n’ọrụ ná ndụ anyị?
Mgbe ọ dị ya ka o ruola mgbe ọ ga-ekporiwezi ndụ, Chineke gwara ya na ọ na-aga ịnwụ, ihe nile nwoke ahụ kwakọbara ga-aghọzi nke onye ọzọ. Jizọs gbakwụnyeziri okwu ikpeazụ a, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Nwoke nke Nọ ná Mgbagwoju Anya
4. Ụdị mmadụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ikwu na nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu Jizọs bụ?
4 A maara ilu ahụ Jizọs tụrụ nke ọma n’ọtụtụ ebe. Anyị ga-ahụ na Jizọs malitere akụkọ ya site n’ikwu, sị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma.” Jizọs ekwughị na nwoke ahụ nwetara akụ̀ na ụba ya n’ụzọ na-ezighị ezi. Ya bụ na o kwughị na nwoke ahụ bụ ajọ mmadụ. A sịdị kwuwe, ihe Jizọs kwuru na-egosi na nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu ahụ rụsiri ọrụ ike. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, site n’ihe Jizọs kwuru, anyị pụrụ ịhụ na ọ bụ nwoke mere ezigbo ndokwa maka ọdịnihu. Ikekwe, o bu ọdịmma nke ezinụlọ ya n’uche mee ya. N’ihi ya, dị ka mmadụ si ele ihe anya, anyị pụrụ ịsị na ọ bụ nwoke na-arụsi ọrụ ike nke ji ibu ọrụ ya kpọrọ ihe.
5. Olee nsogbu chere nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu Jizọs ihu?
5 Otú o sina dị, Jizọs kpọrọ nwoke ahụ ọgaranya, nke na-egosi na o nweelarị ihe onwunwe n’ụba. Ma, dị ka Jizọs kọwara, e nwere nsogbu chere ọgaranya ahụ ihu. Ihe ala ya mepụtara karịrị ihe ọ tụrụ anya ya, ọ karịkwara nnọọ ihe dị ya mkpa na ihe ọ ga-elekọtali. Gịnị ka ọ gaara eme?
6. Mkpebi ndị dị aṅaa na-eche ọtụtụ ndị ohu Chineke ihu taa?
6 Ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova taa na-eche nsogbu ndị yiri nnọọ nke ọgaranya ahụ ihu. Ezi Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ime ihe n’eziokwu, ịdị uchu na iji obi ha dum na-arụ ọrụ ha. (Ndị Kọlọsi 3:22, 23) Ma è were ha n’ọrụ ma hà na-arụrụ onwe ha, ha na-emekarị nke ọma, ọbụna na-eme nke ọma karịa ndị ibe ha. Mgbe a chọrọ ibuli ha n’ọkwà ma ọ bụ ha enwee ohere ndị ọzọ ha ga-esi kpatakwuo ego, ọ na-adị mkpa ka ha mee mkpebi ụfọdụ. Hà ga-ekwe ka e bulie ha n’ọkwà ahụ ma ọ bụ tinye aka n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji akpata ego? Ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto na-emekwa nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, a pụrụ inye ha ihe nrite ma ọ bụ nye ha ohere ịgụkwu akwụkwọ dị elu n’efu n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-anụ aha ha. Hà ga-eme nnọọ ihe ndị ọzọ na-eme ma nakwere ohere ahụ?
7. Gịnị ka nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu Jizọs mere banyere nsogbu chere ya ihu?
7 Ka anyị laghachi n’ilu Jizọs. Gịnị ka ọgaranya ahụ mere mgbe ala ya mepụtara ihe dị ukwuu nke na o nweghịzi ebe ọ ga-akwakọba ha? O kpebiri ịkwatu ebe ndị ọ na-akwakọba ihe ma wuo ndị ka ha ibu ka o wee nwee ike ichekwa ihe nile ala ya mepụtara. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na atụmatụ ahụ mere ka o chee na ihe adịrịla ya mma ma mee ka o nwee obi ụtọ nke na o chere n’obi ya sị: “M ga-agwakwa mkpụrụ obi m, sị: ‘Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe a kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.’”—Luk 12:19.
Gịnị Mere E Ji Kpọọ Ya “Onye Na-enweghị Ezi Uche”?
8. Olee ihe dị oké mkpa nke nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu Jizọs leghaara anya?
8 Dị ka ilu Jizọs gosiri, atụmatụ ọgaranya ahụ dabeere n’ihe a na-ejighị n’aka. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ezi uche ọ̀ dị n’atụmatụ nwoke ahụ, ọ dị otu ihe dị oké mkpa o chefuru—uche Chineke. Nwoke ahụ nọ na-eche nanị banyere onwe ya, otú ọ ga-esi tụsara ahụ́, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, ma kporie ndụ. O chere na ebe ya nwere “ọtụtụ ezi ihe,” na ya ga-ebikwa “ọtụtụ afọ.” Ma ọ dị mwute na ihe agaghị otú o si chee. Dị nnọọ ka Jizọs kwuru ná mbụ, “ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” (Luk 12:15) N’abalị ahụ, ihe nile nwoke ahụ nwere ghọrọ ihe efu n’ihi na Chineke gwara ya, sị: “Onye na-enweghị ezi uche, n’abalị a ka ha na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?”—Luk 12:20.
9. Gịnị mere e ji kpọọ nwoke ahụ Jizọs kọrọ akụkọ ya onye na-enweghị ezi uche?
9 Ka anyị leba anya ugbu a n’isi ihe mere Jizọs ji tụwa ilu a. Chineke kpọrọ nwoke ahụ onye na-enweghị ezi uche. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Exegetical Dictionary of the New Testament na-akọwa na ụdị okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a “na-egosi nnọọ na onye a na-ekwu okwu ya enweghị nghọta.” Akwụkwọ ahụ kọwara na n’ilu a, Chineke ji okwu ahụ gosi na “atụmatụ ndị ọgaranya na-eme maka ọdịnihu enweghị isi.” Okwu ahụ adịghị ezo aka n’onye na-enweghị ọgụgụ isi kama ọ na-ezo aka ‘n’onye na-aghọtaghị na ọ pụghị imeli ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na Chineke anọnyeghịrị ya.’ Ihe Jizọs kwuru banyere ọgaranya ahụ chetaara anyị ihe o mesịrị gwa ọgbakọ dị na Laodisia nke dị n’Eshia Maịnọ na narị afọ mbụ: “Ị na-asị: ‘Abara m ọgaranya, enwetawokwa m akụ̀ na ụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,’ ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.”—Mkpughe 3:17.
10. N’ihi gịnị ka mmadụ inwe “ọtụtụ ezi ihe” na-ejighị pụta na onye ahụ ga-ebi “ọtụtụ afọ”?
10 Ọ ga-adị mma ma anyị jisie ike mụta ihe n’akụkọ a. Ànyị dị ka nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu a—na-arụsi ọrụ ike iji hụ na anyị nwere “ọtụtụ ezi ihe” ma ghara ime ihe anyị kwesịrị ime iji nwee olileanya nke ibi “ọtụtụ afọ”? (Jọn 3:16; 17:3) Bible na-ekwu, sị: “Akụ̀ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe” nakwa na “onye na-atụkwasị obi n’akụ̀ ya, onye ahụ ga-ada.” (Ilu 11:4, 28) N’ihi ya, Jizọs gbakwụnyere ndụmọdụ ikpeazụ a n’ilu ahụ: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:21.
11. Gịnị mere mmadụ ịtụkwasị obi n’ihe onwunwe ji bụrụ ihe efu?
11 Mgbe Jizọs sịrị “otú ahụ ka ọ ga-adịrị,” ọ na-egosi na ihe mere ọgaranya ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu ahụ ga-emekwa ndị olileanya na ọdịnihu ha hiwere isi kpamkpam n’akụ̀ na ụba. Ebe nsogbu dị abụghị ná ‘mmadụ ịkpakọbara onwe ya akụ̀’ kama ọ bụ ná mmadụ ịghara ịbụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” Jems onye na-eso ụzọ nyekwara ịdọ aka ná ntị yiri nke a mgbe o dere, sị: “Ugbu a, bịanụ, unu ndị na-asị: ‘Taa ma ọ bụ echi anyị ga-eje obodo a, nọọkwa otu afọ n’ebe ahụ, anyị ga-azụkwa Jems 4:13-15) N’agbanyeghị otú mmadụ baruru ọgaranya ma ọ bụkwanụ otú ihe onwunwe ya baruru n’ụba, ha nile ga-abụ ihe efu ọ gwụla ma onye ahụ ọ̀ bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. Gịnịzi ka ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ pụtara?
ahịa, ritekwa uru,’ ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.” Gịnị ka ha kwesịrị ime? “Kama nke ahụ, unu kwesịrị ikwu, sị: ‘Ọ bụrụ uche Jehova, anyị ga-adị ndụ wee meekwa nke a ma ọ bụ nke ọzọ.’” (Ịbụ Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
12. Gịnị ka ọ ga-abụ anyị na-eme anyị abụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ?
12 N’okwu Jizọs, e gosiri na ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ dị iche ná mmadụ ịkpakọbara onwe ya akụ̀. Ya mere, ihe Jizọs nọ na-ekwu bụ na ihe bụ́ isi kwesịrị ịdị na-echegbu anyị abụghị otú anyị ga-esi kpakọba akụ̀ na ụba ma ọ bụ otú anyị ga-esi na-ekpori ndụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iji ihe ọ bụla anyị nwere mee ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike. N’ezie, ime otú ahụ ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eme ka anyị nweta ọtụtụ ngọzi n’aka ya. Bible na-agwa anyị, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.
13. Olee otú ngọzi Jehova si ‘eme mmadụ ọgaranya’?
13 Mgbe ọ bụla Jehova nyere ndị ya ihe, ọ na-enyekarị ha ndị nke kasị mma. (Jems 1:17) Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova nyere ndị ya ala, ọ bụ “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Ọ bụ ezie na e sikwa otú a kọwaa ala Ijipt, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ala Jehova nyere ndị Izrel nwere otu ihe dị mkpa o ji dị iche. Mozis gwara ụmụ Izrel na ọ bụ “ala nke dị Jehova, bụ́ Chineke gị, n’obi.” Ya bụ na ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ihi na Jehova ga na-elekọta ha. Oge nile ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova, Jehova gọziri ha n’ụba, ha bikwara ndụ ka nke ndị mba nile gbara ha gburugburu mma. Ee, ọ bụ ngọzi Jehova “na-eme mmadụ ọgaranya”!—Ọnụ Ọgụgụ 16:13; Deuterọnọmi 4:5-8; 11:8-15.
14. Gịnị ka ndị bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ na-enweta?
14 A sụgharịkwara okwu ahụ bụ́ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ” ịbụ “ọgaranya n’ihu Chineke” (Today’s English Version) ma ọ bụ “ọgaranya n’anya Chineke.” (The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips sụgharịrị) Ihe na-echegbukarị ndị bara ọgaranya bụ otú ndị ọzọ si ele ha anya. A na-ahụkarị nke a n’otú ha si ebi ndụ. Ha na-eme ihe Bible kpọrọ “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” iji mee ka ndị ọzọ na-asọpụrụ ha. (1 Jọn 2:16) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ na Chineke dị na mma, Jehova na-egosikwa ha obiọma n’ụba, ha na ya na-akpachikwa anya. Nke a na-emekwa ka ahụ́ ruo ha ala ma na-enye ha obi ụtọ karịa ka ihe onwunwe nkịtị pụrụ inye ha. (Aịsaịa 40:11) Ajụjụ fọrọnụ bụzi, Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ọgaranya n’anya Chineke?
Ịbụ Ọgaranya n’Anya Chineke
15. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ọgaranya n’anya Chineke?
15 N’ilu Jizọs, nwoke ahụ mere atụmatụ ma rụsie ọrụ ike iji nwee akụ̀ na ụba, a kpọkwara ya onye na-enweghị ezi uche. N’ihi ya, iji bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ, anyị Matiu 28:19) A pụrụ iji ojiji anyị ji oge anyị, ume anyị, na nkà anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị na-eso ụzọ kama iji ya na-akpakọba akụ̀, tụnyere ịzụ ahịa. Ndị merela otú ahụ eritewo uru dị ukwuu n’ụzọ ime mmụọ dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi.—Ilu 19:17.
aghaghị ịgbalị ịrụsi ọrụ ike ma na-ekerechi òkè anya n’ọrụ ndị Chineke weere dị ka ọrụ bara uru n’ezie. Otu n’ime ọrụ ndị a bụ ihe a Jizọs nyere iwu ka anyị mee: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (16, 17. Olee ahụmahụ ndị ị pụrụ ịkọ iji gosi ụdị ndụ na-eme ka mmadụ bụrụ ọgaranya n’anya Chineke?
16 Tụlee ihe banyere otu Onye Kraịst nke bi n’otu mba dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Ọ na-arụzi kọmputa, a na-akwụkwa ya ezigbo ụgwọ na ya. Ma ọ fọrọ nke nta ka ọrụ ya na-ewekọrọcha oge ya, nke na ọ naghị eriju nri ime mmụọ afọ. Ka e mesịrị, kama ịgbalị ịrịgo n’ọkwà n’ọrụ ya, ọ kwụsịrị ọrụ ahụ ma malite ime ice cream ma na-ere ya n’okporo ámá ka o wee nwee ike inwe ohere ilebara ozi Jehova na ibu ọrụ ndị ọzọ o nwere anya. Ndị ya na ha na-arụbu ọrụ mere ya akaje, ma gịnị ka mkpebi ahụ o mere rụpụtara? O kwuru, sị: “N’ezie ego m na-akpata ugbu a karịrị nke m na-akpata mgbe m na-arụzi kọmputa. O meela ka m nwekwuo obi ụtọ n’ihi na anaghịzi m echegbu onwe m ma na-enye ndụ m nsogbu dị ka m na-eme mgbe m na-arụzi kọmputa. Nke kasị mkpa bụ na mụ na Jehova dịkwu ná mma ugbu a.” Mgbanwe a nwanna nwoke a mere nyeere ya aka ịbanye n’ozi oge nile, ọ na-ejekwa ozi ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị ná mba ya. N’ezie, ngọzi Jehova “na-eme mmadụ ọgaranya.”
17 Ihe atụ ọzọ bụ nke otu nwanyị toro n’ezinụlọ ji agụmakwụkwọ dị elu kpọrọ oké ihe. Ọ gara mahadum na France, Mexico, na Switzerland ma nweekwa ohere inweta ọrụ na-enye ezigbo oge. O kwuru, sị: “Ihe na-agaziri m nnọọ; a na-akwanyere m ùgwu, e sokwa m ná ndị ọnụ ha na-eru n’okwu, ma n’ime onwe m, adị m ka onye ọtụtụ ihe kọrọ, adịghịkwa m enwe obi ụtọ.” Ka oge na-aga, ọ mụtara banyere Jehova. Ọ sịrị: “Ka m na-amụtakwu banyere Jehova, ọchịchọ m ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na iji ihe ndị o nyere m jeere ya ozi nyeere m aka ịma ihe m ga-eme, nke bụ́ ijere ya ozi oge nile.” Ọ gbara arụkwaghị m n’ọrụ ya, e mekwara ya baptizim obere oge ka e mesịrị. Kemgbe afọ iri abụọ, o ji obi ụtọ na-eje ozi oge nile. Ọ na-akọ, sị: “Ụfọdụ na-eche na akwụkwọ nile m gụrụ furu ọhịa, ma ha chọpụtara na m nwere obi ụtọ, otú m si ebi ndụ m na-amasịkwa ha. Kwa ụbọchị, ana m arịọ Jehova ka o nyere m aka ịdị umeala n’obi ka mụ na ya wee nwee ike ịnọgide na-adị ná mma.”
18. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ dị ka Pọl?
18 Sọl, onye ghọrọ Pọl onyeozi, nwere ọrụ na-enye ezigbo ego. Ma o mesịrị dee, sị: “Ana m agụkwa ihe nile n’ezie dị ka mfu n’ihi abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m.” (Ndị Filipaị 3:7, 8) N’anya Pọl, akụ̀ na ụba o nwetara n’aka Kraịst karịrị ihe ọ bụla ọ pụrụ inweta n’ụwa a. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ahapụ ịchụso ihe ndị ga-adịrị nanị anyị mma ma gbalịsie ike ịbụ ndị na-asọpụrụ Chineke, anyị onwe anyị ga-abụkwa ọgaranya n’anya Chineke. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Olee nsogbu chere nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya n’ilu Jizọs ihu?
• Gịnị mere e ji kpọọ nwoke ahụ onye na-enweghị ezi uche?
• Gịnị ka ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ pụtara?
• Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Gịnị mere e ji kpọọ ọgaranya ahụ onye na-enweghị ezi uche?
[Foto dị na peeji nke 27]
Olee otú ohere dapụtaara anyị inwekwu ọganihu n’ụwa pụrụ isi bụrụ nnukwu ọnwụnwa?
[Foto dị na peeji nke 28, 29]
“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya”