Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hosea
Okwu Jehova Dị Ndụ
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hosea
Ọ FỌRỌ obere ka ọ bụrụ na ezi ofufe apụọla n’anya n’alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu. N’oge ọchịchị Jeroboam nke Abụọ, ndị Izrel bara ọgaranya, ma nke ahụ kwụsịrị obere oge ka ọ nwụsịrị. Ihe sochiri ya bụ oge ọgba aghara na ọtụtụ nkwatu ọchịchị. E gburu anọ n’ime eze isii ndị chịrị mgbe ọ nwụsịrị egbu. (2 Ndị Eze 14:29; 15:8-30; 17:1-6) Ozi ibu amụma Hosea nke dịruru iri afọ ise na itoolu, bụ́ nke malitere n’afọ 804 T.O.A., dịruru n’oge ọgba aghara a.
Ihe mere n’alụmdi na nwunye Hosea gosiri nnọọ otú obi dị Jehova n’ebe mba Izrel ahụ na-enupụ isi dị. Isi ihe ndị dị n’ozi Hosea bụ mkpughe nke njehie Izrel na amụma banyere ikpe Jehova mara ya na alaeze Juda. Hosea ji okwu ndị dị nro ma na-egosi ịhụnanya na okwu ndị siri ike ma na-agba ihe n’anwụ dee ihe a nile n’akwụkwọ bú aha ya. Ebe akwụkwọ ahụ so n’Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, ozi ya dị ndụ ma na-akpa ike.—Ndị Hibru 4:12.
“LỤRỤ N’ONWE GỊ NWUNYE NKE NA-AKWA IKO”
Jehova gwara Hosea, sị: “Jee, lụrụ n’onwe gị nwunye nke na-akwa iko.” (Hosea 1:2) Hosea rubere isi, nwunye ya ahụ bụ́ Gomea amụtakwara ya otu nwa nwoke. Ihe àmà na-egosi na ọ kwatara ụmụ abụọ ndị ọzọ ọ mụrụ n’iko. Ihe aha ha, bụ́ Lo-ruhama na Lo-ami, pụtara gosiri na Jehova ga-ajụ imere Izrel ebere ma jụ ndị ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi.
Ma olee nnọọ otú obi dị Jehova n’ebe ndị ya na-enupụ isi nọ? Ọ gwara Hosea, sị: “Jeekwa, hụ nwanyị n’anya nke iko hụworo ya n’anya, nke bụ́kwa nwanyị a lụrụ na nwunye na-akwa iko, dị ka Jehova si ahụ ụmụ Izrel n’anya, ọ bụ ezie na ha onwe ha na-eche ihu na chi ọzọ dị iche iche.”—Hosea 3:1.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
1:1—Olee ihe mere Hosea ji kpọchaa eze anọ chịrị Juda n’oge ọ na-eje ozi aha ma kpọọ nanị aha otu eze Izrel? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ nanị ndị eze sitere n’ezinụlọ Devid ka a nabatara dị ka ndị ruru eru ịchị ndị Chineke họpụtara. Ndị eze nke alaeze ebe ugwu ahụ esiteghị n’ezinụlọ Devid, ebe ndị nke Juda sitere.
1:2-9—Hosea ọ̀ lụrụ nwunye nke na-akwa iko n’ezie? Ee, Hosea lụrụ nwanyị mesịrị ghọọ onye na-akwa iko. Ọ dịghị ihe Hosea kwuru iji gosi na ihe ndị ọ kọrọ banyere ihe mere n’ezinụlọ ya bụ nrọ ma ọ bụ ọhụụ.
1:7—Olee mgbe e nwere obi ebere n’ahụ́ ụlọ Juda ma zọpụta ya? Nke a mezuru n’afọ 732 T.O.A., n’oge Eze Hezekaịa. N’oge ahụ, Jehova mere ka ndị Asiria kwụsị inye Jeruselem nsogbu site n’izipụ otu mmụọ ozi nke gara gbuo otu narị na iri puku ndị agha asatọ na ise n’otu abalị n’etiti ndị iro Izrel. (2 Ndị Eze 19:34, 35) Jehova si otú ahụ napụta Juda, n’ejighị “ụta, ma ọ bụ mma agha, ma ọ bụ agha, ma ọ bụ ịnyịnya, ma ọ bụ ndị ịnyịnya,” kama site n’aka otu mmụọ ozi.
1:10, 11—Ebe ọ bụ na alaeze Izrel nke dị n’ebe ugwu dara n’afọ 740 T.O.A., olee otú e si ‘chịkọta ndị Izrel na ndị Juda ọnụ’? Ọtụtụ ndị esila n’alaeze ebe ugwu ahụ gaa Juda tupu ndị Babilọn adọrọ ndị bi n’ala Juda n’agha n’afọ 607 T.O.A. (2 Ihe E Mere 11:13-17; 30:6-12, 18-20, 25) Mgbe ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha lọghachiri n’ala nna ha n’afọ 537 T.O.A., ụmụ ụmụ nke ndị ahụ si n’alaeze Izrel nke dị n’ebe ugwu so na ha.—Ezra 2:70.
2:21-23—Olee ihe Jehova na-ebu n’amụma mgbe o kwuru, sị: “M ga-aghakwara [Jezril] Onwe m n’ala ya dị ka mkpụrụ ọghịgha; M ga-enwekwa obi ebere n’ahụ́ [ya]”? Aha nwa nwoke mbụ Gomea mụụrụ Hosea bụ Jezril. (Hosea 1:2-4) Ihe aha ahụ pụtara, nke bụ́ “Chineke Ga-agha Mkpụrụ,” bụ amụma nke na-egosi na Jehova ga-achịkọta ndị kwesịrị ntụkwasị obi fọdụrụnụ n’afọ 537 T.O.A. ma ghaa ha dị ka mkpụrụ na Juda. Ọ ga-adịzi mkpa ka ala ahụ nke tọgbọrọla n’efu ruo iri afọ asaa mepụta mkpụrụ akụ́kụ́, mmanya dị ụtọ, na mmanụ. Amụma ahụ ji okwu ndị yiri okwu ndị e ji agụ uri kwuo na ihe ọma ndị a ga-arịọ ala arịrịọ ka o nye ha ihe ndị ga-eme ka ha mee nke ọma bụ́ ndị dị n’ime ya, nakwa na ala ga-arịọ eluigwe ka o nye ya mmiri ozuzo. Eluigwe ga-arịọkwanụ Chineke ka o nye ya mmiri ozuzo. Ihe a nile ga-abụ iji nye nnọọ ndị ahụ fọrọ afọ na-alọta alọta ihe nile dị ha mkpa n’ụba. Ndịozi bụ́ Pọl na Pita jiri Hosea 2:23 mee ihe mgbe ha na-ekwu banyere nchịkọta nke Izrel nke Chineke.—Ndị Rom 9:25, 26; 1 Pita 2:10.
Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:
1:2-9; 3:1, 2. Chee echiche banyere ihe ndị Hosea diri iji nọgide n’alụmdi na nwunye ya iji mee ihe kwekọrọ n’uche Chineke! Mgbe a bịara n’ime uche Chineke, ruo ókè ha aṅaa ka anyị dị njikere ịhapụ ihe ndị anyị gaara achọ?
1:6-9. Jehova kpọrọ ịkwa iko okpukpe asị, dị nnọọ ka ọ kpọrọ ịkwa iko nkịtị asị.
1:7, 10, 11; 2:14-23. Ihe Jehova buru n’amụma banyere Izrel na Juda mezuru. Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.
2:16, 19, 21-23; 3:1-4. Jehova dị njikere ịgbaghara ndị ji obi ha nile chegharịa ná mmehie ha. (Nehemaịa 9:17) Dị ka Jehova, anyị kwesịrị ịdị na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị ọzọ ma na-emere ha ebere.
“IKPE KA JEHOVA . . . GA-EKPE”
“Ikpe ka Jehova na ndị bi n’ala nke a ga-ekpe.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ọ dịghị eziokwu, ọ dịghịkwa ebere, ọ dịghịkwa ọmụma Chineke, dị n’ala nke a.” (Hosea 4:1) Ndị Izrel na-enupụ isi etinyela aka n’ịghọ aghụghọ na ịkwafu ọbara, ha akwawokwa iko ma n’ụzọ ihe atụ ma n’ụzọ nkịtị. Kama ilegara Chineke anya maka enyemaka, “Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekwuworo.”—Hosea 7:11.
Jehova kwupụtara ikpe ọmụma ya, sị: “E lodawo Izrel.” (Hosea 8:8) Ikpe makwara alaeze Juda. Hosea 12:2 kwuru, sị: “Jehova nwekwara ikpe Ya na Juda ga-ekpe, Ọ ga-ejikwa mmehie Jekọb leta ya dị ka ụzọ ya nile si dị; dị ka omume ya nile si dị ka Ọ ga-enyeghachi ya.” Ma Chineke ga-eweghachirịrị ha n’ọnọdụ ha, n’ihi na o kwere nkwa, sị: “N’aka ala mmụọ [“Shiol”] ka M ga-esi gbapụta ha; n’aka ọnwụ ka M ga-eme ka ha si pụọ nwere onwe ha.”—Hosea 13:14.
Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:
6:1-3—Olee onye nọ na-ekwu, sị: “Bịanụ, ka anyị laghachikwute Jehova”? O nwere ike ịbụ na ndị Izrel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ na-agba ibe ha ume ka ha laghachikwute Jehova. Ya bụrụ otú ahụ, ha ma ụma na-eme ka ndị chegharịrị echegharị. Ebere ha adịteghị aka, ọ pụkwara n’anya ngwa ngwa dị ka “igwe ojii ụtụtụ, na . . . igirigi nke na-ala n’isi ụtụtụ.” (Hosea 6:4) N’aka nke ọzọ, o nwere ike ịbụ Hosea na-arịọ ndị ahụ arịrịọ ka ha laghachikwute Jehova. N’agbanyeghị onye kwuru okwu ndị ahụ, ọ dị ndị nnupụisi ahụ bi n’alaeze ebo iri nke Izrel mkpa ichegharị n’ezie ma laghachikwute nnọọ Jehova.
7:4—Olee otú ndị Izrel ahụ na-akwa iko si dị ka “ite ọkụ ukwu nke osi ite meworo ka ọ dị ọkụ”? Ihe atụ a na-egosi otú ọchịchọ ọjọọ dị ha n’obi siruru n’ike.
Ihe Ndị Anyị Na-amụta na Ya:
4:1, 6. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị nọgide na-adị Jehova mma, anyị aghaghị ịnọgide na-amụ ihe banyere ya ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị anyị na-amụta.
4:9-13. Jehova ga-ekpe ndị na-akwa iko ma na-efe ofufe na-adịghị ọcha ikpe.—Hosea 1:4.
5:1. Ndị na-edu ndú n’etiti ndị Chineke kwesịrị ịjụ ndapụ n’ezi ofufe kpamkpam. Ma ọ́ bụghị ya, ha nwere ike ịrata ụfọdụ ndị itinye aka n’ofufe ụgha, si otú ahụ ghọọrọ ha ‘igbudu na ụgbụ.’
6:1-4; 7:14, 16. Ichegharị nanị n’egbugbere ọnụ bụ ihu abụọ, o nweghịkwa isi. Ọ bụrụ na onye mere ihe ọjọọ chọrọ inweta ebere Chineke, ọ ghaghị iji obi ya nile chegharịa, bụ́ nke ọ ga-egosipụta site n’ilaghachikwute onye “nọ n’elu,” ya bụ, ịlaghachi n’ụdị ofufe e buliri elu. Àgwà ya aghaghị ikwekọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Chineke.—Hosea 7:16.
6:6. Mmadụ ịnọgide na-eme mmehie na-egosi na onye ahụ ejighị ikwesị ntụkwasị obi hụ Chineke n’anya. Ọ dịghị àjà mmadụ ga-achụ n’ofufe Chineke nke ga-anọchi anya ụdị ịhụnanya a.
8:7, 13; 10:13. Ụkpụrụ ahụ bụ́ na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa” mezuru n’ahụ́ ndị Izrel na-efe arụsị.—Ndị Galeshia 6:7.
8:8; 9:17; 13:16. Amụma ndị e buru banyere alaeze ebe ugwu ahụ mezuru mgbe ndị Asiria weghaara isi obodo ya, bụ́ Sameria. (2 Ndị Eze 17:3-6) Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-eme ihe o kwuru na ọ ga-eme ma mezuo okwu ya.—Ọnụ Ọgụgụ 23:19.
8:14. Jehova zigara “ọkụ n’obodo [Juda] nile” n’afọ 607 T.O.A. site n’aka ndị Babilọn, weta mbibi ahụ e buru n’amụma banyere Jeruselem na ala Juda. (2 Ihe E Mere 36:19) Okwu Chineke na-emezu mgbe nile.—Joshua 23:14.
9:10. Ọ bụ ezie na ndị Izrel raara onwe ha nye ezi Chineke ahụ, ha “bịakwutere Bel-Peoa, kewapụta onwe ha nye ihere ahụ.” Anyị ga-abụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị amụta ihe site n’ihe nlereanya ọjọọ ha ma kpachara anya ịghara ime ihe ga-emegide nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova.—1 Ndị Kọrint 10:11.
10:1, 2, 12. Anyị kwesịrị iji obi na-ekesaghị ekesa fee Chineke. Mgbe ‘anyị ghaara onwe anyị mkpụrụ n’ezi omume, anyị na-ewe ihe ubi dị ka ebere Chineke si dị.’
10:5. Bet-even (nke pụtara “Ụlọ Ihe Ike”) bụ aha mweda n’ala e nyere Betel (nke pụtara “Ụlọ Chineke”). Mgbe e buuru arụsị Bet-even gaa mba ọzọ, ndị bi na Sameria ruuru chi ahụ ha na-efe újú. Lee ka o si bụrụ iberibe mmadụ ịtụkwasị arụsị na-adịghị ndụ nke na-enwedịghị ike ichebe onwe ya obi!—Abụ Ọma 135:15-18; Jeremaịa 10:3-5.
11:1-4. Jehova na-eji ịhụnanya emeso ndị ya ihe mgbe nile. Ọ dịghị mgbe mmadụ ido onwe ya n’okpuru Chineke ga-abụ mmegbu.
11:8-11; 13:14. Okwu Jehova banyere mweghachi nke ndị ya n’ezi ofufe ‘alaghachikwuteghị ya n’efu.’ (Aịsaịa 55:11) N’afọ 537 T.O.A., oge ndị Izrel ga-ebi na Babilọn gwụrụ, ihe fọdụrụnụ n’etiti ha lọghachikwara Jeruselem. (Ezra 2:1; 3:1-3) Ihe ọ bụla Jehova kwuru site n’ọnụ ndị amụma ya ga-emezurịrị.
12:6. Anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ebere, ikpe ikpe ziri ezi, na ịtụkwasị Jehova obi mgbe nile.
13:6. “Afọ juru [ndị Izrel], obi ha wee dị elu; n’ihi nke a ka ha chezọworo [Jehova].” Anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị bulie onwe anyị elu.
“ỤZỌ NILE NKE JEHOVA ZIRI EZI”
Hosea rịọrọ arịrịọ, sị: “Izrel, laghachikwute Jehova, bụ́ Chineke gị; n’ihi na ị sụwo ngọngọ site n’ajọ omume gị.” Ọ gbara ndị ahụ ume ka ha sị Jehova: “Bupụ ajọ omume nile anyị, nara ezi ihe: anyị ewee kwụghachi egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi.”—Hosea 14:1, 2.
Onye mmehie chegharịrị echegharị kwesịrị ịbịakwute Jehova, nabata ụzọ ya, ma chụọrọ ya àjà otuto. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ụzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndị ezi omume ga-ejekwa ije n’ime ya.” (Hosea 14:9) Lee ka obi si atọ anyị ụtọ na ọtụtụ ndị ka “ga-ejikwa oké egwu bịakwute Jehova, bịaruokwa ịdị mma Ya na mgbe ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”!—Hosea 3:5.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe mere n’ezinụlọ Hosea bụ ihe atụ nke otú Jehova si mesoo ndị Izrel ihe
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe Sameria dara n’afọ 740 T.O.A., alaeze ebo iri nke Izrel kwụsịrị ịdị