Ọnụnọ Kraịst—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
Ọnụnọ Kraịst—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
“Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?”—MAT. 24:3.
1. Olee ajụjụ na-adọrọ mmasị ndịozi Jizọs jụrụ ya?
E NWERE otu ajụjụ mmadụ anọ n’ime ndịozi Jizọs jụrụ Onyenwe ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga mgbe naanị ha na ya nọ na-akparịta ụka n’elu Ugwu Oliv. Ha jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Mat. 24:3) E nwere okwu abụọ na-adọrọ mmasị n’ajụjụ ahụ ndịozi jụrụ, ha bụ, “ọnụnọ gị” na “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Olee ihe okwu ndị a pụtara?
2. Olee ihe okwu ahụ bụ́ “ọgwụgwụ” na-ezo aka na ya?
2 Ka anyị buru ụzọ tụlee okwu nke abụọ bụ́ “ọgwụgwụ” nke e si n’okwu Grik bụ́ syn·teʹlei·a sụgharịta. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, a sụgharịrị okwu Grik a ka ọ bụrụ “ọgwụgwụ” n’ebe niile ọ pụtara. E nwekwara okwu Grik ọzọ ya na ya yiri bụ́ te’los, nke pụtara mgbe ‘ihe gasịrị.’ E nwere ike iji okwu ihu ọha a na-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kọwaa ọdịiche dị n’okwu abụọ a. Ọgwụgwụ nke okwu ihu ọha bụ akụkụ ikpeazụ nke okwu ahụ mgbe ọkà okwu na-agbalị ichetara ndị na-ege ya ntị ihe ndị o kwurula ma gosi otú ihe ndị ahụ si metụta ha. Mgbe okwu ahụ gasịrị bụ mgbe ọkà okwu si n’elu ikpo okwu rịtuo. N’otu aka ahụ, n’ime Baịbụl, okwu ahụ bụ́ “ọgwụgwụ usoro ihe a” na-ezo aka n’oge nke na-eduga ná mgbe usoro ihe a ga-agwụsị na mgbe ọ gwụsịrị kpamkpam.
3. Olee ụfọdụ ihe ndị na-eme n’oge ọnụnọ Jizọs?
3 Oleekwanụ banyere “ọnụnụ” Jizọs nke ndịozi jụrụ ajụjụ ya? E si n’okwu Grik bụ́ pa·rou·siʹa sụgharịta ya. * Pa·rou·siʹa Kraịst, ma ọ bụ ọnụnọ ya, malitere mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe na 1914, ọ ga-agụnyekwa oge “oké mkpagbu ahụ,” bụ́ mgbe ọ ga-abịa ibibi ndị ajọ mmadụ. (Mat. 24:21) Ọtụtụ ihe dịgasị iche iche, ndị gụnyere ‘oge ikpeazụ’ nke usoro ihe ọjọọ a, ịchịkọta ndị a họpụtara, na ịkpọlite ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe, na-eme n’oge ọnụnọ Jizọs. (2 Tim. 3:1; 1 Kọr. 15:23; 1 Tesa. 4:15-17; 2 Tesa. 2:1) A pụrụ ikwu na oge ahụ bụ́ “ọgwụgwụ usoro ihe a” (syn·teʹlei·a) na oge ọnụnọ Kraịst (pa·rou·siʹa) na-agakọ.
Oge Dị Ogologo
4. Olee otú oge ọnụnọ Jizọs si yie ihe ndị mere n’ụbọchị Noa?
4 Ihe Jizọs kwuru banyere oge ọnụnọ ya gosiri nnọọ n’eziokwu na pa·rou·siʹa na-ezo aka n’oge dị ogologo. (Gụọ Matiu 24:37-39.) Cheta na Jizọs ekwughị na oge ọnụnọ ya ga-adị ka oge ahụ Iju Mmiri ji zoo n’ụbọchị Noa. Kama nke ahụ, o ji oge ọnụnọ ya tụnyere oge ndị gaferenụ tupu Iju Mmiri ahụ amalite. Ihe ndị mere n’oge ahụ gụnyere Noa iwu ụgbọ ahụ na ikwusa ozi ọma, ruokwa mgbe Iju Mmiri ahụ n’onwe ya malitere. Ihe ndị a niile were ọtụtụ iri afọ. N’otu aka ahụ, ọnụnọ Kraịst gụnyere ihe ndị ga-eme tupu oké mkpagbu ahụ amalite tinyekwara oké mkpagbu ahụ n’onwe ya.—2 Tesa. 1:6-9.
5. Olee otú ihe e dekọrọ ná Mkpughe isi 6 si gosi na oge ọnụnọ Jizọs bụ oge dị ogologo?
5 Amụma ndị ọzọ e dekọrọ na Baịbụl gosiri nnọọ na oge ọnụnọ Kraịst ga-adị ogologo, ọ gaghị abụ naanị oge ọ ga-abịa ibibi ndị ajọ omume. Akwụkwọ Mkpughe kọwara Jizọs dị ka onye nọ n’elu ịnyịnya ọcha, kwuokwa na e nyere ya okpueze. (Gụọ Mkpughe 6:1-8.) Ka e chisịrị Jizọs Eze na 1914, a kọwara ya dị ka onye “na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.” Akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu na e nwere ndị ịnyịnya ọzọ sochirinụ bụ́ ndị nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ndị nwere ụcha dị iche iche. Ịnyịnya ndị a na-anọchi anya agha, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe, bụ́ ihe ndị na-eme n’ime oge dị ogologo nke a kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ Anyị na-ahụkwa mmezu amụma a n’oge anyị a.
6. Gịnị ka Mkpughe isi 12 na-akọwara anyị banyere oge ọnụnọ Kraịst?
6 Mkpughe isi 12 kọwakwuru otú e si hiwe Alaeze Chineke n’eluigwe. N’ebe ahụ, a kọọrọ anyị banyere otu agha a lụrụ n’eluigwe. Maịkel—nke bụ́ Jizọs Kraịst mgbe ọ nọ n’eluigwe—na ndị mmụọ ozi ya lụsoro Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya agha. Agha ahụ dugara n’ịchụda Setan bụ́ Ekwensu na ndị òtù ya n’ụwa. Akụkọ ahụ gara n’ihu ịgwa anyị na nke ahụ mere ka Ekwensu na-ewe oké iwe “ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Gụọ Mkpughe 12:7-12.) Ihe ndị a gosiri nnọọ na ihe sochiri nhiwe nke Alaeze Kraịst n’eluigwe bụ otu oge mgbe a ga-enwe “ahụhụ” dị ukwuu nke ga-adịrị ụwa na ndị bi n’ime ya.
7. Gịnị ka abụ ọma nke abụọ kwuru okwu ya, oleekwa ohere a kọwara n’ime ya na a ga-enye ndị mmadụ?
7 Abụ Ọma nke Abụọ bukwara amụma banyere oge a ga-echi Jizọs Eze n’Ugwu Zayọn nke eluigwe. (Gụọ Abụ Ọma 2:5-9; 110:1, 2.) Otú ọ dị, abụ ọma a gosikwara na e nwere oge a ga-enye ndị ọchịchị ụwa na ndị ha na-achị ohere ido onwe ha n’okpuru ọchịchị Kraịst. A dụrụ ha ọdụ ka ha ‘jiri nghọta mee ihe’ nakwa ka ha kwe ka a “gbazie” ha. N’ezie n’oge ahụ, ‘obi ụtọ ga-adịrị ndị niile ga-agbaba n’ime Chineke’ site n’ịbịa jewere Jehova na Eze ya ọ họpụtara ozi. N’ihi ya, n’oge ọnụnọ Jizọs dị ka eze, a ga-enye nnọọ ndị mmadụ ohere ịgbanwe ndụ ha.—Ọma 2:10-12.
Ịmata Ihe Ịrịba Ama Ahụ
8, 9. Olee ndị ga-amata ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst ma ghọta ihe ọ pụtara?
8 Mgbe ndị Farisii jụrụ Jizọs mgbe Alaeze ahụ ga-abịa, ọ zara ha na ọ ‘gaghị abịa n’ụzọ pụtara oké ìhè’ dị ka ha chere. (Luk 17:20, 21) Ndị na-ekweghị ekwe agaghị aghọta mgbe ọ ga-abịa. Oleekwanụ otú ha ga-esi ghọta ya? Ha ekweghịdị na Jizọs bụ eze gaje ịchị ha n’ọdịnihu. Oleezi ndị ga-amata ihe àmà na-egosi na ọnụnọ Kraịst amalitela ma ghọta ihe ọ pụtara?
9 Jizọs kwukwara na ndị na-eso ụzọ ya ga-ahụ nnọọ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya dị nnọọ ka ha na-ahụ ‘àmụ̀mà ma o gbuo, ìhè ya esi n’otu akụkụ n’okpuru eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ.’ (Gụọ Luk 17:24-29.) E kwesịkwara icheta na Matiu 24:23-27 gosiri nnọọ na ihe Jizọs na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya.
Ọgbọ nke Na-ahụ Ihe Ịrịba Ama Ahụ
10, 11. (a) Olee otú e sibu kọwaa “ọgbọ” ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:34? (b) Olee ndị ka obi abụọ na-adịghị ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ha so ‘n’ọgbọ’ ahụ?
10 Ụlọ Nche ebula ụzọ kọwaa na na narị afọ mbụ, “ọgbọ a” e kwuru okwu ya na Matiu 24:34 bụ “ndị Juu na-ekweghị ekwe ndị biri ndụ n’otu oge.” * O yiri ka otú a e si kọwaa ya kwesịrị ekwesị n’ihi na n’ebe ndị ọzọ Jizọs ji okwu ahụ bụ́ ọgbọ mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ, ọ na-enye echiche ihe na-adịghị mma, ọtụtụ mgbe kwa, Jizọs jiri nkọwaaha na-adịghị mma, dị ka “ọjọọ” kọwaa ọgbọ ahụ. (Mat. 12:39; 17:17; Mak 8:38) Ma Ụlọ Nche gosiri na ná mmezu ya nke oge a, Jizọs na-ekwu banyere “ọgbọ” ọjọọ, bụ́ ndị na-ekweghị ekwe ndị ga-ahụ ma ihe ịrịba ama nke “ọgwụgwụ usoro ihe a” (syn·teʹlei·a) ma mgbe usoro ihe a ga-agwụsị kpamkpam (teʹlos).
11 N’ezie mgbe Jizọs kwuru banyere “ọgbọ” n’ụzọ na-adịghị mma, ọ nọ na-agwa ndị ajọ mmadụ nke oge ya ma ọ bụkwanụ na-ekwu banyere ha. Ma ọ̀ bụ ndị ajọ mmadụ nke oge Jizọs ka “ọgbọ” ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:34 na-ekwu banyere ya? Cheta na mmadụ anọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya “naanị ha.” (Mat. 24:3) Ebe ọ bụ na Jizọs ejighị okwu dị njọ kọwaa ọgbọ ahụ mgbe ọ na-agwa ndịozi ya okwu, ọ ga-abụ na ndị ozi ya ghọtara na ha na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs so ‘n’ọgbọ’ ahụ nke na-agaghị agabiga “ruo mgbe ihe ndị a niile [ga-eme].”
12. Olee otú ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru si gosi ndị ọ na-ekwu okwu ha mgbe o ji okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” mee ihe?
12 Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru mgbe o kwuru okwu ahụ. Dị ka e dekọrọ na Matiu 24:32, 33, Jizọs kwuru, sị: “Dị ka ihe atụ, sinụ n’osisi fig mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.” (Tụlee Mak 13:28-30; Luk 21:30-32.) Na Matiu 24:34, anyị na-agụ, sị: “N’ezie, ana m asị unu na ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.”
13, 14. Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na ọ ga-abụrịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ọ kpọrọ “ọgbọ” ahụ?
13 Jizọs kwuru na ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya a gaje iji mmụọ nsọ tee mmanụ n’oge na-adịghị anya, ga-aghọta ihe na-aganụ mgbe ha hụrụ ka “ihe ndị a niile” na-eme. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jizọs na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.”
14 Ndị na-eso ụzọ Jizọs adịghị ka ndị na-ekweghị ekwe. Ha ga-ahụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs ghọtakwa ihe ọ pụtara. Ha “ga-amụta ihe” site n’ihe ndị mejupụtara ihe ịrịba ama ahụ ma “mata” ihe ha pụtara. Ha ga-aghọta nnọọ na “[Jizọs] nọ nso n’ọnụ ụzọ.” Ọ bụ ezie na ma ndị Juu na-ekweghị ekwe ma Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ mgbe okwu Jizọs mezuru nke mbụ ya na narị afọ mbụ, ọ bụ naanị ụmụazụ ya e tere mmanụ n’oge ahụ mụtara ihe site n’ihe ndị ahụ merenụ, ya bụ, ọ bụ naanị ha ghọtara ihe ihe ndị ahụ ha hụrụ pụtara n’ezie.
15. (a) Olee ndị bụ “ọgbọ” nke oge a Jizọs kwuru okwu ha? (b) Gịnị mere anyị agaghị agbakọtali kpọmkwem otú “ọgbọ a” ga-aharu n’ogologo? (Lee igbe dị na peeji nke 25.)
15 Ndị na-enweghị ike ịghọta eziokwu nke Chineke taa chere na ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs ‘agaghị apụta nnọọ oké ìhè.’ Ha kwuru na ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị n’oge gara aga. (2 Pita 3:4) Ma ụmụnna Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, bụ́ ndị òtù Jọn nke oge a, amatala ihe ịrịba ama ndị a dị nnọọ ka à ga-asị na ọ bụ àmụ̀mà, ha aghọtakwala ihe ha pụtara n’ezie. Ọ bụ ndị a e tere mmanụ n’ozuzu ha, dị ka otu ìgwè, mejupụtara “ọgbọ” nke oge a bụ́ ndị na-agaghị agabiga ma ọlị “ruo mgbe ihe ndị a niile mere.” * Nke a na-egosi na ụfọdụ n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ka ga-anọ ndụ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ahụ e buru amụma ya ga-amalite.
“Na-echenụ Nche”
16. Gịnị ka ndị niile na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ime?
16 Ma e nwere ihe ọzọ dị mkpa karịa ịmata ihe ịrịba ama ndị ahụ. Jizọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:37) Ọ dị oké mkpa ka anyị niile na-eme nke a taa ma ànyị so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ n’oké ìgwè mmadụ ahụ. Ọ karịala iri afọ itoolu kemgbe e chiri Jizọs eze n’eluigwe na 1914. N’agbanyeghị na ọ dịghị mfe ime ihe a Jizọs kwuru, anyị aghaghị ịdị njikere ma nọgide na-eche nche. Ịghọta na Kraịst amalitela ịchị n’Alaeze ya n’eluigwe n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya na-enyere anyị aka ime ihe a e kwuru. Ọ na-emekwa ka anyị mata na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-abịa bibisịa ndị iro ya “n’oge awa [anyị] na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ.”—Luk 12:40.
17. Olee otú ihe a anyị ghọtara kwesịrị ịdị anyị n’obi, gịnịkwa ka o kwesịrị ịkpali anyị ime?
17 Nghọta anyị ghọtara ihe ọnụnọ Kraịst pụtara na-enyere anyị aka ịma na oge anyị a chọkwuru ka e mee ihe ngwa ngwa. Anyị maara na ọnụnọ Jizọs amalitela kemgbe nakwa na ọ malitela ịchị n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya dị ka eze n’eluigwe kemgbe 1914. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-abịa ibibi ndị ajọ mmadụ ma mee ka e nwee mgbanwe dị ukwuu n’ụwa a niile. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpebisikwu ike ugbu a ịnọgide n’ọrụ ahụ Jizọs buru n’amụma mgbe o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa [ma ọ bụ ihe niile ga-agwụsị, teʹlos].”—Mat. 24:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A pụrụ ịghọta ihe pa·rou·siʹa pụtara site n’ọdịiche e nwere n’ihe banyere “ọnụnọ” Pọl onyeozi na mgbe ọ “na-anọghị ya” bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná 2 Ndị Kọrịnt 10:10, 11 na ná Ndị Filipaị 2:12. Ị chọọ ịgụkwu banyere isiokwu a, gaa n’akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 676-679.
^ par. 10 Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1995, peeji nke 11-15, 19, 30, 31.
^ par. 15 O yiri ka oge “ọgbọ a” dịrị ndụ kwekọrọ n’ogologo oge ọhụụ mbụ ahụ dị n’akwụkwọ Mkpughe were. (Mkpu. 1:10–3:22) Ihe ndị a e ji ama ụbọchị Onyenwe anyị malitere na 1914 ọ ga-anọrukwa mgbe onye ikpeazụ ná ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ ga-anwụ a kpọlitekwa ya n’ọnwụ.—Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 24, paragraf nke 4.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee otú anyị si mara na oge ọnụnọ Jizọs ga-adị ogologo?
• Olee ndị matara ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs ma ghọta ihe ọ pụtara?
• Olee ndị mejupụtara ọgbọ nke oge a e kwuru okwu ya na Matiu 24:34?
• Gịnị mere anyị enweghị ike ịgbakọtali otú “ọgbọ a” ga-aharu n’ogologo?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe dị na peeji nke 25]
Ànyị Nwere Ike Ịgbakọtali Otú “Ọgbọ A” Ga-aharu n’Ogologo?
Okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” na-ezokarị aka ná ndị nọ n’afọ ndụ dịgasị iche ma ha biri ndụ n’otu oge. Dị ka ihe atụ, Ọpụpụ 1:6 na-agwa anyị, sị: “E mesịa, Josef nwụrụ, tinyere ụmụnne ya niile nakwa ọgbọ ahụ dum.” Afọ ndụ Josef na ụmụnne ya ahaghị ma ha biri ndụ n’otu oge. Ndị so ‘n’ọgbọ ahụ’ gụnyere ụfọdụ ụmụnne Josef ndị a mụrụ tupu a mụọ ya. Josef bu ụfọdụ n’ime ha ụzọ nwụọ. (Jen. 50:24) E wezụga Benjamin, e nwekwara ndị ọzọ so ‘n’ọgbọ ahụ’ bụ́ ndị a mụrụ ka a mụsịrị Josef, o yikwara ka ha dịgidere ndụ mgbe Josef nwụsịrị.
Ya mere, mgbe e ji okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” akọwa ndị biri ndụ n’otu oge, agaghị enwe ike ikwuli kpọmkwem ogologo oge ọ haruru ma otu ihe doro anya bụ na ọ ga-agwụ agwụ, ọ gaghịkwa etogbu onwe ya n’ogologo. N’ihi ya, mgbe Jizọs kwuru okwu banyere “ọgbọ a,” dị ka e dekọrọ na Matiu 24:34, ọ dịghị agwa ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi gbakọọ mgbe ‘oge ikpeazụ’ ahụ ga-agwụ. Kama nke ahụ, Jizọs kwudịrị na ha agaghị ama “ụbọchị ahụ na oge awa ahụ.”—2 Tim. 3:1; Mat. 24:36.
[Foto dị na peeji nke 22, 23]
Ka e chisịrị Jizọs Eze na 1914, a kọwara ya dị ka onye “na-emeri”
[Foto dị na peeji nke 24]
“Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere”