Ị̀ Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
Ị̀ Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
“Ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́ . . . ka akụkụ ya niile wee na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ.”—1 KỌR. 12:25.
1. Olee otú obi dị gị mgbe ị batara ọhụrụ na paradaịs ime mmụọ?
MGBE anyị kwụsịrị iso ụwa na-akpakọrịta ma soro ndị Jehova kpawa, ikekwe anyị nwere obi ụtọ mgbe anyị hụrụ otú ha si hụ nnọọ ibe ha n’anya. Nke a dị nnọọ iche ná ndị Setan na-achị bụ́ ndị na-akparị mmadụ, ndị nwere mkpọrọmasị ma na-ese okwu! Anyị abatala na paradaịs ime mmụọ, bụ́ ebe udo na ịdị n’otu jupụtara.—Aịza. 48:17, 18; 60:18; 65:25.
2. (a) Olee ihe nwere ike ime ka anyị na-ele ụmụnna anyị anya n’ụzọ dị iche? (b) Olee ihe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee?
2 Ma n’ihi ezughị oké, ka oge na-aga anyị nwere ike malite inwe echiche na-ezighị ezi banyere ụmụnna anyị. Ezughị okè anyị nwere ike ime ka anyị na-enyochapụta ebe ụmụnna anyị na-adịghị emecha nke ọma kama ịdị na-elekwasị anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma n’iṅomi Jehova. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, anyị na-echefu ile ha anya otú Jehova si ele ha. Ọpụ. 33:13.
Ọ bụrụ na otú a ka anyị si eme, ugbu a bụ oge anyị kwesịrị ichebara otú anyị si ele ụmụnna anyị anya echiche ma mee ka o kwekọọ n’otú Jehova si ele ha anya.—Otú Jehova Si Ele Ụmụnna Anyị Anya
3. Olee ihe Baịbụl jiri ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere?
3 Dị ka e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrịnt 12:2-26, Pọl onyeozi jiri ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ahụ́ nke nwere “ọtụtụ akụkụ.” Dị nnọọ ka akụkụ ahụ́ nke ọ bụla si dị iche n’ibe ya, otú ahụ ka ndị nọ n’ọgbakọ si nwee àgwà dịgasị iche, ike ha ahaghịkwa otu. Ma, Jehova na-anabata ha niile. Ọ hụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. N’ihi ya, Pọl dụkwara ndị nọ n’ọgbakọ ọdụ ka ha “na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ.” Nke a nwere ike isiri anyị ike n’ihi na otú ndị ọzọ si akpa àgwà nwere ike ịdị iche n’otú anyị si akpa.
4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ile ụmụnna anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
4 Anyị nwedịrị ike ịchọ ịdị na-elekwasịkarị anya n’ebe ndị ụmụnna anyị na-adịghị eme nke ọma. Ọ bụrụ na anyị na-eme nke a, a pụrụ ikwu na anyị ji kamera na-enyokwasị naanị n’otu ntakịrị ebe. Ma ihe Jehova ji ele nke ya bụ kamera na-ahụ otu ihe na ihe ndị gbara ya gburugburu. Anyị nwere ike ịchọ ịdọta ihe na-amasịghị anyị n’ebe onye ahụ nọ nso ka o buo ibu, ma Jehova na-ahụ onye ahụ n’ozuzu ya, tinyere àgwà ọma niile o nwere. Ka anyị na-agbalịsi ike ịdị ka Jehova, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu ike ime ka e nwekwuo ịhụnanya na udo n’ọgbakọ.—Efe. 4:1-3; 5:1, 2.
5. Gịnị mere ikpe ndị ọzọ ikpe ekwesịghị ekwesị?
5 Jizọs maara nnọọ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekpekarị ndị ọzọ ikpe. O kwuru, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” (Mat. 7:1) Ghọta na Jizọs asịghị: “Ekpela ikpe”; ọ sịrị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe.” Ọ maara na ikpe ndị ọzọ ikpe amarala ọtụtụ n’ime ndị na-ege ya ntị ahụ́. Ọ̀ ga-abụ na anyị nwere ụdị àgwà a? Ya bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike kwụsị ya, ka a ghara ikpekwa anyị onwe anyị ikpe. Ònyedị ka anyị bụ ikpewe onye Jehova họpụtara ije ozi n’ọgbakọ ikpe ma ọ bụ kwuo na o kwesịghị ịnọ n’ọgbakọ? Nwanna nwere ike inwe ebe ndị ọ na-adịghị emecha nke ọma, ma ọ bụrụ na Jehova kwere ka ọ nọgide na-ejere ya ozi, ò kwesịrị ekwesị ka anyị jụ ya? (Jọn 6:44) Ànyị kweere n’ezie na ọ bụ Jehova na-eduzi ọgbakọ ya, nakwa na ọ ga-eme ihe n’oge kwesịrị ekwesi ma ọ bụrụ na e nwere ihe ndị chọrọ mmezi?—Gụọ Ndị Rom 14:1-4.
6. Olee otú Jehova si ele ndị ohu ya anya?
6 Otu ihe magburu onwe ya banyere Jehova bụ na ọ pụrụ ịhụ ihe Onye Kraịst nke ọ bụla ga-emeli ma o zuo okè n’ụwa ọhụrụ. Ọ makwa otú ha tinyerurula ihe ndị ha mụtara na Baịbụl n’ọrụ. N’ihi ya, ọ dịghị ya mkpa ilegide anya n’ebe onye nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-adịghị emecha nke ọma. Anyị na-agụ n’Abụ Ọma 103:12, sị: “Dị nnọọ ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị nnọọ inwe obi ụtọ maka nke a!—Ọma 130:3.
7. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si were Devid?
1 Eze 14:8) Ma anyị maara n’ezie na e nwere oge Devid mere ihe ụfọdụ na-adịghị mma. Ma Jehova họọrọ ilekwasị anya n’àgwà ọma Devid n’ihi na ọ maara na obi Devid ziri ezi.—1 Ihe 29:17.
7 N’akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ebe na-egosi anyị na Jehova na-elekarị anya n’àgwà ọma mmadụ. Chineke kpọrọ Devid “ohu m Devid, bụ́ onye debere ihe m nyere n’iwu, onye jikwa obi ya dum soro m site n’ime naanị ihe ziri ezi n’anya m.” (Na-ele Ụmụnna Gị Anya Otú Jehova Si Ele Ha
8, 9. (a) Olee ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie Jehova? (b) Olee ihe atụ na-egosi nke a, oleekwa ihe anyị ga-esi na ya mụta?
8 Jehova nwere ikike ịma ihe dị mmadụ n’obi ma anyị apụghị ime otú ahụ. Naanị nke a ezuola ime ka anyị ghara ikpe ndị ọzọ ikpe. Anyị amaghị ihe niile mere onye ọzọ ji mee ihe o mere. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iṅomi Jehova site n’ịghara ịdị na-elekwasị anya n’ezughị okè mmadụ, bụ́ nke ga-emecha pụọ n’anya. Ọ́ gaghị amagbu onwe ya ma anyị ṅomie àgwà Jehova a? Ọ bụrụ na anyị emee nke a, ọ ga-enye nnọọ aka mee ka anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu n’udo.—Efe. 4:23, 24.
9 Dị ka ihe atụ, were ya na ọ dị otu ụlọ merela ochie—ọwa mmiri ya emebisịala, windo ya adakasịala, mmiri emebiekwala uko ya. Ọtụtụ ndị hụrụ ụlọ ahụ nwere ike ikwubi na e kwesịrị ịkwatu ya; na ọ na-asọ oyi n’anya. Ma e nwere ike inwe otu onye ọzọ na-echeghị otú ahụ. O nwere ike ghara ilekwasị anya n’otú ụlọ ahụ dị n’anya ma hụ na ọ ka siri ike nakwa na e nwere ike ịrụzi ya. Ya azụrụ ụlọ ahụ, rụzie ihe ụfọdụ chọrọ nrụzi ma mee ka ọ dịkwa mma n’anya. Mgbe ọ rụzichara ya, ndị na-agafe n’ụzọ na-ekwuzi na ụlọ ahụ amagbuola onwe ya. Ànyị nwere ike ịdị ka onye a rụsiri ọrụ ike iji hụ na ọ rụziri ụlọ ahụ? Kama ilegide anya n’ebe ndị ụmụnna anyị na-adịghị emecha nke ọma, ànyị nwere ike ịchọpụta ebe ndị ha na-emezi emezi ma ghọta na ha ka nwere ike imekwu nke ọma n’ozi Jehova? Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị ga-abịa hụ ụmụnna anyị n’anya n’ihi mma ha mara n’ụzọ ime mmụọ, dị nnọọ ka Jehova si hụ ha n’anya.—Gụọ Ndị Hibru 6:10.
10. Olee otú ndụmọdụ ahụ e nyere ná Ndị Filipaị 2:3, 4 pụrụ isi nyere anyị aka?
10 Pọl onyeozi gwara anyị ihe ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma. Ọ gbara Ndị Kraịst ume, sị: “[Unu] ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Fil. 2:3, 4) Ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ile ndị ọzọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na ịdị na-achọpụta ebe ndị ha na-eme nke ọma ga-enyekwara anyị aka ile ha anya otú Jehova si ele ha.
11. Olee ndị mejupụtara ụfọdụ ọgbakọ taa?
11 N’oge ndị na-adịbeghị anya, mmepeanya emeela ka ọtụtụ mmadụ na-akwafe n’ebe ọzọ. Taa, ndị bijupụtara n’ụfọdụ obodo ukwu bụ ndị si ná mba dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ndị kwabatara ọhụrụ n’ebe anyị bi na-enwe mmasị n’eziokwu Baịbụl, ha esorokwala anyị na-efe Jehova. Ha si “ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.” (Mkpu. 7:9) N’ihi ya, n’ọtụtụ ọgbakọ, anyị nwere ndị si ná mba dị iche iche.
12. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ibe anyị anya, gịnị mekwara ọ pụrụ iji sie ike ime nke a mgbe ụfọdụ?
12 N’ọgbakọ anyị, anyị kwesịkwuru ịdị na-ele ibe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Iji mee nke a anyị kwesịrị icheta ndụmọdụ ahụ Pita onyeozi nyere ka anyị nwee “ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ” nakwa ka anyị ‘nwee ịhụnanya siri ike n’ebe ibe anyị nọ site n’obi anyị.’ (1 Pita 1:22) Ọ pụrụ isiri anyị ike ịhụ ndị niile si mba dị iche iche nọ n’ọgbakọ n’anya site n’obi. O nwere ike ịbụ na omenala anyị dị nnọọ iche na nke ha, nweekwa ike ịbụ na anyị na ha agụrughi akwụkwọ otu ebe, anyị na ha ahaghị n’ego, anyị esikwa n’agbụrụ dịrịta iche. Ọ̀ na-esiri gị ike ịghọta otú ụfọdụ n’ime ha si eche echiche ma ọ bụ na-eme ihe? O nwekwara ike ịdị ha onwe ha otú ahụ. N’agbanyeghị ọdịiche ndị a niile, a gbara anyị niile ume, sị: “Hụnụ otú ụmụnna dum n’anya.”—1 Pita 2:17.
13. Olee mgbanwe ndị o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee n’otú anyị si eche echiche?
13 O nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ele ụmụnna anyị anya iji nwee ike megheere ụmụnna anyị niile obi anyị n’ịhụnanya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:12, 13.) Ànyị na-ekwukarị ihe dị ka “akpọghị m ndị ọzọ asị, ma . . . ” ma malitezie ikwupụta àgwà ụfọdụ na-adịchaghị mma anyị weere na ndị si n’otu agbụrụ na-akpakarị? Ime otú a nwere ike igosi na a ka nwere mkpọrọmasị nọ anyị n’ime obi bụ́kwanụ nke anyị kwesịrị ịkwụsị. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-agbalị mgbe niile ịmatakwu ndị mụ na ha na-esighị n’otu agbụrụ?’ Inyocha onwe anyị n’ụzọ dị otú a nwere ike inyere anyị aka ịnabata ụmụnna anyị si ná mba dị iche iche ma hụ ha n’anya.
14, 15. (a) Nye ihe atụ nke ndị gbanwere otú ha sibu ele ndị ọzọ anya. (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ha?
14 Baịbụl gwara anyị banyere ụfọdụ ndị gbanwere echiche ha, bụ́ ndị otu onye n’ime ha bụ Pita onyeozi. Ebe ọ bụ na Pita bụ onye Juu, ọ ga na-ezere ịbanye n’ụlọ onye Jentaịl. Chetụkwala otú obi dị ya mgbe a gwara ya gaa n’ụlọ onye Jentaịl a na-ebighị ùgwù bụ́ Kọniliọs! Pita gbanwere echiche ya, na-aghọta na Chineke chọrọ ka ndị si ná mba niile bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 10:9-35) Sọl, bụ́ onye mechara ghọọ Pọl onyeozi, mekwara mgbanwe ụfọdụ, ma kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. O kwetara na ọ dị mgbe ya kpọrọ Ndị Kraịst asị nke ukwuu nke na ya “nọgidere na-akpagbu ọgbakọ Chineke ma na-agbalị ibibi ya, ọbụna gabiga ókè.” Ma mgbe Onyenwe anyị bụ́ Jizọs gbaziri Pọl, o mere nnọọ mgbanwe, malitedị ịnara ntụziaka site n’aka ndị ahụ ọ kpagbuburu.—Gal. 1:13-20.
15 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmụọ nsọ Jehova pụrụ inyere anyị aka ime mgbanwe ụfọdụ n’otú anyị si akpa àgwà. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị ka nwetụrụ mkpọrọmasị n’obi anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ na anyị kwụsịrị ya ma “nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Efe. 4:3-6) Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘yiri ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.’—Kọl. 3:14.
Iṅomi Jehova n’Ozi Anyị
16. Gịnị ka Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mee?
16 Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Rom 2:11) Jehova chọrọ ka ndị si mba niile soro na-efe ya. (Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.) Iji hụ na nke a mere, o meela ndokwa ka e zisaara “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” “ozi ọma ebighị ebi.” (Mkpu. 14:6) Jizọs kwuru, sị: “Ubi ahụ bụ ụwa.” (Mat. 13:38) Olee ihe nke a chọrọ n’aka gị na ndị ezinụlọ gị?
17. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ụdị mmadụ niile aka?
17 Ọ bụghị mmadụ niile nwere ike ịga n’ebe ndị kasị anya n’ụwa kwusaara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze. Ma anyị nwere ike ikwusara ndị si n’akụkụ niile nke ụwa bi n’ókèala anyị ozi ọma a. Ànyị na-eji ohere ọ bụla pụtaranụ agbara ụdị mmadụ ọ bụla anyị hụrụ àmà, n’abụghị naanị ndị anyị na-ekwusara ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ? Gịnị ma ị gbalịa hụ na i ziri ndị na-anụbeghị ozi ọma otú kwesịrịnụ ozi ọma?—Rom 15:20, 21.
18. Olee otú Jizọs si gosi na ọnọdụ ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi?
18 Jizọs maara nnọọ mkpa ọ dị inyere mmadụ niile aka. O kwusaghị ozi ọma naanị n’otu ebe. Otu akụkọ dị na Baịbụl na-agwa anyị na ọ ‘malitere ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile.’ Ka ọ nọ na-eme nke a, “ọ hụrụ ìgwè mmadụ, o nweekwa ọmịiko n’ebe ha nọ” chọọkwa inyere ha aka.—Mat. 9:35-37.
19, 20. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi ụdị ọmịiko Jehova na Jizọs nwere n’ebe ụdị mmadụ niile nọ?
19 Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi gosi na ị na-echekwa banyere ndị mmadụ? Ụfọdụ ekpebiela ịdị na-aga ekwusa ozi ọma n’ókèala ha ebe a na-adịghị ekwusakarị ozi ọma na ya. Ebe ndị a nwere ike ịgụnye ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa na ụlọ ọrụ, ogige ntụrụndụ, ọdụ ụgbọala, ma ọ bụ n’ihu ụlọ ndị ọ na-esi ike ịbanye hụ ndị bi na ha. Ndị ọzọ agbalịala mụọ asụsụ ọhụrụ iji nwee ike ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ bịara biri n’ógbè ha ozi ọma ma ọ bụkwanụ ndị nke a na-adịghị ekwusakarịrị ozi ọma ná mbụ. Ịmụta ikele ndị ahụ n’asụsụ ha ga-eme ka ha ghọta nnọọ na i nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụrụ na anyị agaghị enwe ike ịmụ asụsụ ọzọ, ànyị nwere ike ịgba ndị na-eme otú ahụ ume? Anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-akụda ndị ọzọ mmụọ ma ọ bụ nyowe ihe mere ndị ọzọ ji eme mgbalị a iji kwusaara ndị si mba ọzọ ozi ọma. Ndụ onye ọ bụla dị Chineke mkpa, o kwesịkwara ka anyị were ya otú ahụ.—Kọl. 3:10, 11.
20 Ile ndị ọzọ anya otú Chineke si ele ha pụtakwara na anyị ga na-ekwusara mmadụ niile ozi ọma n’agbanyeghị otú ụwa dịịrị ha. Anyị nwere ike ịhụ ndị na-enweghị ebe ha bi, ndị ruru unyí n’anya, ma ọ bụkwanụ ndị na-ebi ndụ ruru arụ. Ọ bụrụ na ụfọdụ emesoo anyị omume ọjọọ, nke ahụ ekwesịghị ime ka anyị kwubie na ọ bụ otú ahụ ka ndị obodo ha ma ọ bụ agbụrụ ha niile dị. Ụfọdụ ndị ji obi ọjọọ mesoo Pọl ihe, ma o kweghị ka nke ahụ kwụsị ya ikwusara ndị ọzọ bụ́ ndị agbụrụ ahụ ozi ọma. (Ọrụ 14:5-7, 19-22) O nwere olileanya na a ga-enwe ndị ga-egosipụta ekele ma gee ya ntị.
21. Olee otú ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha ga-esi nyere gị aka?
21 O dokwuola anyị anya ugbu a na ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị—nke bụ́ ile ya anya otú Jehova si ele ya—dị ezigbo mkpa mgbe anyị na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-emekọ ihe, mgbe anyị na ụmụnna anyị ndị si mba dị iche iche na-emekọ ihe, na mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Ka anyị na-agbalịsi ike ịdị na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, otú ahụ ka anyị ga-abụ ndị na-eme ka e nwee udo na ndị na-eme ka a dị n’otu. Ọ ga-adịkwukwara anyị mfe inyere ndị ọzọ aka ịbịa hụ Jehova n’anya, bụ́ Chineke “na-adịghị ele ndị isi anya n’ihu” kama ọ na-egosi ịhụnanya n’ebe ihe niile nọ “n’ihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.”—Job 34:19.
Ị̀ Ga-azali Ajụjụ Ndị A?
• Olee otú anyị na-ekwesịghị isi na-ele ụmụnna anyị anya?
• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova ma a bịa n’otú anyị si ele ụmụnna anyị anya?
• Olee ihe ndị ị mụtara banyere otú anyị kwesịrị isi na-ele òtù ụmụnna anyị anya?
• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova n’otú anyị si ele ndị ọzọ anya mgbe anyị nọ n’ozi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Olee otú ị pụrụ isi mata ndị si agbụrụ ọzọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Olee otú ị pụrụ isi zikwuo ọtụtụ ndị ọzọ ozi ọma?